Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 10/1 p. 24-27
  • Achọtara M Ihe Ka Ọlaedo Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Achọtara M Ihe Ka Ọlaedo Mma
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Efuo M n’America
  • E Jikọtara Mụ na Ụmụnne M
  • Otu Ezinụlọ na Otu Olili Ozu
  • Ịmụta Eziokwu Ahụ
  • Ịchọta Ebe A Mụrụ M
  • Ibute Eziokwu ahụ Ụzọ
  • Icheta Onye Keworo Anyị Site n’Oge Ntorobịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ịzụlite Ụmụ Asatọ n’Ụzọ Jehova Na-eweta Ma Ihe Ịma Aka ma Ọṅụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Gịnị Ka M Nwere Ike Iji Kwụọ Jehova Ụgwọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ịtụkwasị Anya na Obi n’Ihe Nrite Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 10/1 p. 24-27

Achọtara M Ihe Ka Ọlaedo Mma

DỊ KA CHARLES MYLTON SI KỌỌ

Otu ụbọchị nna m sịrị: “Ka anyị ziga Charlie America bụ́ ebe osisi na-amị ego. Ọ pụrụ inweta ụfọdụ ma zilatara anyị ha!”

N’EZIE, ndị mmadụ chere na e ji ọlaedo tee okporo ámá ndị dị n’America. Ndụ siiri ha ike nke ukwuu n’ebe ọwụwa anyanwụ Europe n’oge ndị ahụ. Ndị mụrụ m nwere obere ubi ma na-akpa ehi ole na ole na ọkụkọ. Anyị enweghị ọkụ eletrik ma ọ bụ paịpụ mmiri nke ime ụlọ. Ma, mgbe ahụ, ndị nile bi anyị nso enweghịkwa.

A mụrụ m na Hoszowczyk na January 1, 1893, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 106 gara aga. Obodo anyị dị na Galicia, bụ́ ógbè nke bụ akụkụ nke alaeze ukwu Austria na Hungary n’oge ahụ. Ugbu a Hoszowczyk dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Poland, bụ́ ebe na-adịghị anya site na Slovakia na Ukraine. Oge oyi n’ebe ahụ na-akpụ ọkụ n’ọnụ, snow ya na-ebukwa ibu. Mgbe m dị ihe dị ka afọ asaa, m ga-eje ije ihe dị ka ọkara kilomita iji ruo n’ọwara mmiri, werekwa anyụike gwupuo ice iji nweta mmiri. M ga-eburu ya lọta n’ụlọ, Mama ga-ejikwa ya sie nri ma sachaa ihe. Ọ na-asa ákwà n’ọwara mmiri ahụ, na-eji mpekere ice ndị ka ibu mere ihe a na-asa ákwà n’elu ya.

Ọ dịghị ụlọ akwụkwọ dị na Hoszowczyk, ma amụtara m ịsụ Polish, Russian, Slovak, na Ukrainian. A zụlitere anyị dị ka ndị chọọchị Ọtọdọks nke Gris, ejekwara m ozi dị ka nwa okoro na-eje ozi n’ọlta. Ma ọbụna mgbe m ka bụ nwata, ewere m iwe megide ndị ụkọchukwu bụ́ ndị sịrị na anyị ekwesịghị iri anụ n’ụbọchị Friday ma ha onwe ha na-eri.

Ụfọdụ ndị enyi anyị ejiriwo ego si n’ọrụ ha gara na United States lọta iji rụzie ụlọ ha na iji zụta ngwá ọrụ e ji arụ ọrụ ubi. Nke a bụ ihe mere nna m ji kwuo okwu banyere iziga m America, ka m soro ụfọdụ ndị agbata obi anyị bụ́ ndị na-eme atụmatụ ịga ebe ahụ ọzọ. Nke ahụ bụ na 1907 mgbe m dị afọ 14.

Efuo M n’America

N’oge na-adịghị anya anọ m n’ụgbọ mmiri, n’izu abụọ kwa anyị agafewo Atlantic. N’oge ahụ, ị ga-eji dollar 20, ma ọ bụghị ya ha ga-ezighachi gị n’ala a mụrụ gị. Eji m ọlaọcha ọnụ ego ya bụ dollar 20, esikwa m otú a ghọọ otu n’ime ọtụtụ nde ndị si n’Àgwàetiti Ellis, New York gafee, bụ́ ọnụ ụzọ e si abanye America. N’ezie, osisi amịghị ego, e jighịkwa ọlaedo tee okporo ámá ndị ahụ. N’ezie, e tedịghị ọtụtụ n’ime ha ete ma ọlị!

Anyị banyere ụgbọ okporo ígwè na-aga Johnstown, Pennsylvania. Ndị ikom ahụ mụ na ha so agawo ebe ahụ mbụ, ha makwaara ụlọ ndị ọbịa ebe m pụrụ ịnọ. Ihe e bu n’uche bụ ka m chọta nwanne m nwanyị nke tọrọ m bụ́ onye bi na Jerome, Pennsylvania, bụ́ nke m mesịrị mara na ọ dị nanị ihe dị ka kilomita 25 site n’ebe ahụ. Ma m ga-asị Yarome, kama ịsị Jerome, n’ihi na a na-akpọpụta “J” dị ka “Y” n’asụsụ ala m. Ọ dịghị onye nụworo banyere Yarome, ya mere n’ebe ahụ ka m nọ n’ala ọzọ, na-apụghịkwa ịsụ Bekee ọ bụla na n’ejighị ego dị ukwuu.

Eji m ụtụtụ ọ bụla na-achọ ọrụ. N’ọfịs ebe a na-ewe ndị mmadụ n’ọrụ, nanị mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ ka a na-ego ọrụ n’ime ìgwè mmadụ ahụ kwụ n’ezi. Ya mere, kwa ụbọchị ana m alọghachi n’ụlọ ndị ọbịa ahụ iji mụọ Bekee site n’enyemaka nke akwụkwọ enyemaka onwe onye ụfọdụ. Mgbe ụfọdụ ana m achọta ọrụ m na-atụghị anya ya, ma ọtụtụ ọnwa gafere, ego m ji fọkwara nke nta ka ọ gwụsịa.

E Jikọtara Mụ na Ụmụnne M

Otu ụbọchị agafere m otu ụlọ oriri nwere ụlọ mmanya nke dị nso n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè. N’ezie, nri ahụ siri isisi ọma! A na-enye mmadụ bred, anụ e gwere egwe, na ihe ndị ọzọ n’ụlọ mmanya ahụ n’efu ma ọ bụrụ na mmadụ azụọ biya, bụ́ nke a na-ere cent ise maka otu nnukwu iko. Ọ bụ ezie na abụ m nwata, onye na-elekọta ụlọ mmanya ahụ nwere ọmịiko n’ahụ m ma resị m biya.

Ka m nọ na-eri nri, ụfọdụ ndị ikom batara na-asị: “Mee ngwa ngwa ṅụọ mmanya gị! Ụgbọ okporo ígwè na-aga Jerome na-abịa.”

“Ị̀ na-ekwu Yarome?” ka m jụrụ.

“Ee e, Jerome,” ka ndị ikom ahụ sịrị. Ọ bụ mgbe ahụ ka m matara ebe nwanne m nwanyị bi. N’ezie, n’ụlọ mmanya ahụ, ezutere m otu nwoke nke bi nanị ọnụ ụlọ atọ site na nke ya! Ya mere, agbatara m tiketi ụgbọ okporo ígwè ma mesịa chọta nwanne m nwanyị.

Nwanne m nwanyị na di ya na-elekọta otu ụlọ ebe ndị na-egwupụta coal bi, esokwa m ha biri. Ha nwetaara m ọrụ ilekọta pọmpụ nke na-eme ka mmiri ghara ịbanye ebe e si egwupụta coal. Mgbe ọ bụla ọ kwụsịrị ịrụ ọrụ, aga m aga kpọọ onye mekanik. A na-akwụ m cent 15 kwa ụbọchị n’ọrụ ahụ. E mesịa, arụrụ m ọrụ n’ụzọ ụgbọ okporo ígwè, n’ebe a na-akpụ brik, na ọbụna dị ka onye na-arụrụ ndị inshọransị ọrụ. Mgbe e mesịrị, akwagara m Pittsburgh bụ́ ebe nwanne m nwoke bụ́ Steve bi. N’ebe ahụ, anyị rụrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ na-emepụta ígwè. Ọ dịghị mgbe ọ bụla m nwetara ego zuru ezu izilaga ụlọ.

Otu Ezinụlọ na Otu Olili Ozu

Ka m na-aga ọrụ otu ụbọchị, ahụrụ m otu nwa agbọghọ na-eje ozi n’ụlọ ka o guzo n’ihu ebe obibi ahụ ọ na-arụ ọrụ. Echere m n’onwe m, sị, ‘Chei, ọ mara ezigbo mma.’ Izu atọ mgbe nke a gasịrị, na 1917, mụ na Helen lụrụ. N’ime afọ iri sochirinụ, anyị mụtara ụmụ isii, bụ́ nke otu n’ime ha nwụrụ mgbe ọ ka bụ nwa ọhụrụ.

Na 1918 ụlọ ọrụ Pittsburgh Railways goro m ọrụ dị ka ọkwọ bọs. Na nso ebe a na-edebe bọs ka e nwere otu ụlọ erimeri ebe mmadụ pụrụ inweta iko kọfị. N’ime ya, ndị Gris abụọ bụ́ ndị nwe ebe ahụ adịghị eyi ka hà chọrọ ịma ma ọ̀ dị ihe ị sị ka e wetara gị ọ bụrụhaala na ha pụrụ ikwusara gị site na Bible. M ga-asị: “Ùnu chọrọ ịgwa m na ụwa nile na-agha ụgha na ọ bụ nanị unu abụọ bụ ndị na-ekwu eziokwu?”

“Chọpụta ya n’ime Bible!” ka ha ga-asị. Ma n’oge ahụ, ha apụghị ime ka m kwenye.

N’ụzọ dị mwute, na 1928, Helen m hụrụ n’anya dara ọrịa. Iji hụ na ụmụ anyị nwetara nlebara anya ka mma, akpọgara m ha na Jerome ka ha soro nwanne m nwanyị na di ya biri. N’oge a, ha azụtawo ugbo. Eletara m ụmụaka ahụ ugboro ugboro, wetakwa ego kwa ọnwa iji kwụọ ụgwọ ihe oriri ha. Ezigakwaara m ha ákwà. N’ụzọ dị mwute, ọnọdụ Helen kawanyere njọ, ọ nwụkwara n’August 27, 1930.

Enwere m mmetụta nke onye nọ nanị ya n’enweghịkwa enyemaka. Mgbe m gakwuuru ụkọchukwu iji mee ndokwa maka olili ozu, ọ sịrị: “Ị nọghịzi na chọọchị a. Ị tụbeghị ụtụ ruo ihe karịrị otu afọ.”

Akọwara m na nwunye m anọwo na-arịa ọrịa ruo ogologo oge nakwa na enyere m ụmụaka m ego ọ bụla mapụtaranụ ka ha wee nwee ike inye onyinye na chọọchị nke dị na Jerome. Ma, tupu onye ụkọchukwu ahụ ekwere ikwu okwu olili ozu ahụ, aghaghị m ịgbazite dollar 50 iji tụọ ụtụ m ndị gara aga. Ụkọchukwu ahụ chọkwara dollar 15 ọzọ iji doo Mas n’ụlọ nwanne nwunye m nke nwanyị bụ́ ebe ndị enyi na ezinụlọ meworo atụmatụ izukọta iji kwanyere Helen ùgwù ikpeazụ. Apụghị m inweta dollar 15 ahụ, ma ụkọchukwu ahụ kwere ido Mas ahụ ma ọ bụrụ na mụ enye ya ego ahụ n’ụbọchị ịkwụ ụgwọ.

Mgbe ụbọchị ịkwụ ụgwọ ruru, eji m ego ahụ zụtara ụmụaka m akpụkpọ ụkwụ na uwe ha ji aga ụlọ akwụkwọ. Ihe dị ka izu abụọ mgbe nke a gasịrị, ụkọchukwu ahụ batara na bọs m. “Ị ka ji m ụgwọ dollar 15 ahụ,” ka ọ sịrị. Ya mere, mgbe ọ rịturu ebe ọ na-akwụsị, o yiri m egwu, sị, “Ana m agakwuru ọga gị ka o si n’ụgwọ ọnwa gị sepụ ego ahụ.”

Mgbe ọrụ nke ụbọchị ahụ gasịrị, agakwuuru m onye nlekọta m ma gwa ya ihe meworonụ. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye Katọlik, ọ sịrị, “Ọ bụrụ na onye ụkọchukwu ahụ abata ebe a, aga m agwa ya otú ọ dị m n’obi!” Nke ahụ mere ka m malite iche, ‘Ndị ụkọchukwu na-achọ nanị ego anyị, ma ha akụzitụbeghịrị anyị ihe ọ bụla banyere Bible.’

Ịmụta Eziokwu Ahụ

Oge ọzọ m nọ n’ụlọ erimeri ahụ ndị ikom Gris abụọ ahụ nwe, anyị kparịtara banyere ahụmahụ m nwere n’ebe onye ụkọchukwu ahụ nọ. N’ihi ya, amalitere m iso Ndị Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, amụ ihe. Ana m amụ anya abalị dum na-agụ Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Amụtara m na Helen anaghị ata ahụhụ na pọgatrị, dị ka onye ụkọchukwu ahụ kwuworo, kama ọ nọ n’ụra ọnwụ. (Job 14:13, 14; Jọn 11:11-14) N’ezie, achọtawo m ihe ka ọlaedo mma nke ukwuu—ọ bụ eziokwu ahụ!

Izu ole na ole mgbe nke a gasịrị, ná nzukọ mbụ m so Ndị Mmụta Bible gaa na Garden Theatre dị na Pittsburgh, eweliri m aka ma sị, “Amụtawo m ihe ka ukwuu banyere Bible n’abalị a karịa ka m mere n’afọ ndụ m nile na chọọchị.” E mesịa, mgbe ha jụrụ banyere ndị chọrọ ikere òkè n’ọrụ nkwusa n’echi ya, eweliri m aka ọzọ.

Mgbe ahụ, n’October 4, 1931, egosipụtara m nraranye m nye Jehova site na baptism ime mmiri. Ka ọ dị ugbu a enwere m ike ịkwụ ụgwọ ụlọ ma kpọlata ụmụaka m ka mụ na ha biri, na-ego onye nlekọta ụlọ ka o nye aka n’ilekọta ha. N’agbanyeghị ibu ọrụ m nwere n’ime ezinụlọ, site na January 1932 ruo June 1933, ekeere m òkè n’ụdị ozi pụrụ iche nke a na-akpọ nke inyeaka, bụ́ mgbe m tinyere hour 50 ruo 60 kwa ọnwa n’ịgwa ndị ọzọ banyere Bible.

Ihe dị ka n’oge a amalitere m ịrịba otu nwa agbọghọ mara mma ama, bụ́ onye yiri ka ọ na-abakarị na bọs m ma ọ na-aga ma na-ala ọrụ. Anya mụ na ya na-akụkọta n’enyo ụgbọala m e ji ahụ ihe dị n’azụ. Nke ahụ bụ otú mụ na Mary si zute. Anyị mere mbedo, lụọkwa n’August 1936.

Ka ọ na-erule 1949, afọ ole m nọworo n’ọrụ mere ka m nwee ike ịhọrọ ndokwa ọrụ nke nyere m ohere ịsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ozi oge nile. Nwa m nwanyị nke kasị nta, bụ́ Jean, amaliteworị ịsụ ụzọ na 1945, anyị sụkọkwara ụzọ ọnụ. Mgbe e mesịrị, Jean zutere Sam Friend, bụ́ onye na-eje ozi na Betel, bụ́ isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York.a Ha lụrụ na 1952. Anọgidere m na-asụ ụzọ na Pittsburgh ma duzie ọtụtụ ọmụmụ Bible, n’otu oge, eduziiri m ezinụlọ 14 ọmụmụ Bible kwa izu. Na 1958, alara m ezumike nká n’ọrụ m nke ịkwọ bọs. Mgbe nke ahụ gasịrị, ịsụ ụzọ dịrị mfe, ebe ọ bụ na anaghịzi m arụ ọrụ ego hour asatọ kwa ụbọchị.

Na 1983, Mary dara ọrịa. Agbalịrị m ilekọta ya anya nke ọma dị ka o lekọtaworo m anya nke ọma n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 50. N’ikpeazụ, na September 14, 1986, ọ nwụrụ.

Ịchọta Ebe A Mụrụ M

Na 1989, Jean na Sam kpọọrọ m gaa mgbakọ na Poland. Anyị letakwara ógbè ebe m nọ tolite. Mgbe ndị Russia weghaara akụkụ ụwa ahụ, ha gbanwere aha obodo ndị ahụ ma gbaara ndị mmadụ ụgbọ nwa mkpi gaa mba ndị ọzọ. A gbaara otu n’ime ụmụnne m nwoke ụgbọ nwa mkpi gaa Istanbul nakwa nwanne m nwanyị gaa Russia. Ndị anyị jụrụ amaghịkwa aha obodo m.

Mgbe ahụ ụfọdụ ugwu ndị dịpụrụ adịpụ yiri ndị m maara. Ka anyị na-abịarukwu nso, amatara m ihe nhụwa ama ndị ọzọ—ugwu, ebe ụzọ gbara mkpị, ụlọ chọọchị, àkwà mmiri. Na mberede, n’ijuanya nye anyị, anyị hụrụ otu ihe nduzi ụzọ nke sịrị “Hoszowczyk”! N’oge na-adịbeghị anya tupu mgbe ahụ, ndị ọchịchị Kọmunist enwekwaghị ikike, e weghachiwokwa aha mbụ nke obodo dị iche iche.

Ụlọ anyị adịghịzi, ma ovun nke e jiworo mee ihe n’isi nri n’èzí ka dị, ọ fọrọ nke nta ka ájá kpuchichaa ya. Mgbe ahụ atụrụ m aka n’otu osisi ukwu ma sị: “Lee osisi ahụ. Akụrụ m ya tupu m gawa America. Lee nnọọ otú o toruworo!” Mgbe nke ahụ gasịrị, anyị letara ebe ndị a na-eli ozu, na-achọ aha ndị òtù ezinụlọ anyị, ma ọ dịghị nke anyị hụrụ.

Ibute Eziokwu ahụ Ụzọ

Mgbe di Jean nwụrụ na 1993, ọ jụrụ m ma m chọrọ ka ya hapụ Betel iji lekọta m. Agwara m ya na nke ahụ ga-abụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe kasị njọ ọ pụrụ ime, mmetụta m ka bụkwa otu ihe ahụ. Ebiiri m onwe m ruo mgbe m dị afọ 102, ma mgbe ahụ ọ ghọziri ihe dị mkpa ka a kpọga m ebe a na-elekọta ndị agadi. Aka m bụ okenye n’Ọgbakọ Bellevue dị na Pittsburgh, ụmụnna na-abịakwa akpọrọ m aga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ụbọchị Sunday. Ọ bụ ezie na ọrụ nkwusa m ugbu a bụ nnọọ nke a kpaara ókè, aka m nọ ná ndepụta ndị ọsụ ụzọ ahụ na-adịkwaghị ike.

N’ime afọ ndị gafeworonụ, eritewo m uru n’ụlọ akwụkwọ ndị pụrụ iche maka ịzụ ndị nlekọta bụ́ nke Watch Tower Society dokwara. Na December gara aga, agara m ụfọdụ n’ime nnọkọ nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze maka ndị okenye ọgbakọ. N’April 11 a gakwara aga, Jean kpọọrọ m gaa Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst, bụ́ ememe nke m werewooro dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa ikere òkè na ya kwa afọ kemgbe 1931.

Ụfọdụ n’ime ndị m duziiri Bible na-eje ozi ugbu a dị ka ndị okenye, ndị ọzọ bụ ndị ozi ala ọzọ na Ndịda America, ụfọdụ bụkwa ndị nne na nna ochie, bụ́ ndị ha na ụmụ ha na-ejere Chineke ozi. Atọ n’ime ụmụ m—Mary Jane, John, na Jean—tinyere ọtụtụ n’ime ụmụ na ụmụ ụmụ ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova Chineke ozi. Ekpere m bụ na otu ụbọchị ka nwa m nwanyị nke ọzọ tinyere ụmụ ụmụ na ụmụ ụmụ ụmụ m ndị ọzọ mee otu ihe ahụ.

Ugbu a m gbara afọ 105, aka m na-agba onye ọ bụla ume ịmụ Bible na ịgwa ndị ọzọ ihe ha mụtaworo. Ee, ekwenyesiri m ike na ọ bụrụ na ị nọrọ Jehova nso, ọ dịghị mgbe ị ga-abụ onye e mechuru ihu. Mgbe ahụ, gị onwe gị kwa pụrụ inweta ihe ka ọlaedo nke na-emebi emebi mma—eziokwu ahụ nke na-eme ka anyị na Onye Na-enye Ndụ anyị, bụ́ Jehova Chineke nwee mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Akụkọ ndụ Sam Friend pụtara ná mbipụta Ụlọ Nche nke March 1, 1987, peji nke 22-26.

[Foto dị na peeji nke 25]

Mgbe m na-anya bọs

[Foto dị na peeji nke 26]

N’ebe a na-elekọta ndị agadị bụ́ ebe m bi ugbu a

[Foto dị na peeji nke 27]

Ihe nduzi ụzọ ahụ anyị chọtara na 1989

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya