Akụkọ Ndụ
Icheta Onye Keworo Anyị Site n’Oge Ntorobịa
DỊ KA DAVID Z. HIBSHMAN SI KỌỌ
“Ọ bụrụ na abịaruwo m ná njedebe nke ndụ m, ana m enwe olileanya n’ezie na ekwesịwo m ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ. Ana m arịọ ya ka o lekọta David ezigbo di m. Ekelee m gị n’ihi ya, Jehova, nakwa n’ihi alụmdi na nwunye anyị. Ọ magburu onwe ya, wetakwa nnọọ obi ụtọ!”
CHEE nnọọ banyere mmetụta ndị m nwere mgbe m hụrụ ihe odide ikpeazụ nke a n’akwụkwọ ndetu ihe nke nwunye m mgbe e lisịrị ya na March 1992. Nanị ọnwa ise tupu mgbe ahụ, anyị ka mesịrị ememe mgbaafọ nke 60 n’ozi oge nile nke Helen.
Echetara m nke ọma ụbọchị ahụ na 1931 mgbe mụ na Helen nọdebere ibe anyị ná mgbakọ ahụ e nwere na Columbus, Ohio, U.S.A. Helen eruchabeghị afọ 14, ma ọ ghọtara ịdị mkpa nke ihe omume ahụ ọbụna karịa otú m ghọtara. Ịnụ ọkụ n’obi Helen nwere maka ije ozi pụtara ìhè nwa oge mgbe e mesịrị, mgbe ya na nne ya bụ́ onye di ya nwụnahụrụ ghọrọ ndị ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị na-ezisa ozi ọma oge nile n’etiti Ndịàmà Jehova. Ha hapụrụ ọmarịcha ebe obibi ha ịga mee nkwusa n’ime ime obodo ndị dị n’ebe ndịda United States.
Ihe Nketa M Dị Ka Onye Kraịst
Na 1910 ndị mụrụ m kpọọrọ ụmụntakịrị ha abụọ ka dị obere si n’ebe ọwụwa anyanwụ Pennsylvania kwaga Grove City, n’ebe ọdịda anyanwụ nke steeti ahụ. N’ebe ahụ, ha kwụrụ ụgwọ maka otu ụlọ dị mma ma ghọọ ndị òtù Reformed Church na-ejechi ụka anya. Nwa oge mgbe nke ahụ gasịrị, otu Onye Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, bụ́ William Evans bịara leta ha. Nna m, nke nọ n’etiti afọ ndị nke iri abụọ ya n’oge ahụ, na nne m, bụ́ onye o ji afọ ise tọọ, gere onye Wales nke a nwere omume enyi ntị ma kpọọ ya òkù isoro ha rie nri. N’oge na-adịghị anya, ha nabatara eziokwu Bible nke ha na-amụ.
Iji nọrọ ọgbakọ nso karị, nna m kpọọrọ ezinụlọ ya kwaga ebe dị ihe dị ka kilomita 40 n’obodo Sharon. Ọnwa ụfọdụ mgbe e mesịrị, na 1911 ma ọ bụ 1912, e mere nne na nna m baptism. Ọ bụ Charles Taze Russell, onyeisi oche mbụ nke Watch Tower Society, kwuru okwu baptism ahụ. Amụrụ m na December 4, 1916, mgbe ndị mụrụ m mụsịworo ụmụ anọ. N’oge a mụrụ m, e kwuru, sị: “E nweela nwanne ọzọ a ga-ahụ n’anya.” Nke a kpatara aha m ji bụrụ David, nke pụtara “Onye A Hụrụ n’Anya.”
Mgbe m dị izu anọ, a kpọọrọ m gaa mgbakọ mbụ m. N’oge ndị mbụ ahụ, nna m na ụmụnne m ndị nwoke tọrọ m ji ụkwụ aga ọtụtụ kilomita maka nzukọ ọgbakọ, ebe nne m na-akpọrọ mụ na nwanne m nwanyị abanye ụgbọala. Nzukọ na-enwe nke ụtụtụ na nke ehihie. N’ụlọ, mkparịta ụka na-adaberekarị n’isiokwu ndị dị n’Ụlọ Nche na Golden Age, bụ́ aha mbụ a kpọrọ Teta!
Irite Uru Site n’Ezi Ihe Nlereanya
Ọtụtụ ndị pilgrim, dị ka a na-akpọ ndị ọkà okwu na-ejegharị ejegharị na mgbe ahụ, bịara leta ọgbakọ anyị. Ha na-anọnyekarịrị anyị otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ. Otu onye ọkà okwu m na-echeta nke ọma bụ Walter J. Thorn, bụ́ onye chetara Onye keworo ya ‘mgbe ọ dị n’okorobịa.’ (Eklisiastis 12:1) Mgbe m bụ nwa okoro, m sooro nna m gaa igosi “Foto Ihe Nkiri nke Okike,” bụ́ ihe ngosi nwere akụkụ anọ banyere mmalite nke ihe a kpọrọ mmadụ.
Ọ bụ ezie na Nwanna Evans na nwunye ya, bụ́ Miriam, enweghị ụmụ, ha ghọọrọ ezinụlọ anyị nne na nna nakwa nne nne na nna nna ime mmụọ. William anaghị ahapụ ịkpọ nna m “Nwa m,” ya na Miriam kụbanyekwara n’ime ezinụlọ anyị mmụọ nke ikwusa ozi ọma. Ná mmalite nke narị afọ nke 20, Nwanna Evans gara Wales ọtụtụ ugbo iwega eziokwu Bible n’ebe dị gburugburu Swansea. N’ebe ahụ, a maara ya dị ka onye ozi ọma si America.
Na 1928, Nwanna Evans gbara arụkwaghịm n’ọrụ ya ma malite ime nkwusa n’ebe ugwu ndị dị na West Virginia. Ụmụnne m ndị nwoke abụọ tọrọ m, bụ́ Clarence nke dị afọ 21 na Carl nke dị afọ 19, sonyeere ya. Anyị anọ ndị bụ́ ụmụ okoro tinyere ọtụtụ afọ n’ozi oge nile. N’ezie, anyị nile jechara ozi dị ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova n’oge ntorobịa anyị. N’oge na-adịbeghị anya, nwanne mama m nke nwanyị nke ha tọsịrị, bụ́ Mary, nke gamiworo ugbu a n’afọ ndị nke 90 ya, detaara m akwụkwọ, sị: “Lee aha obi ekele anyị nwere na Nwanna Evans nwere ịnụ ọkụ n’obi maka ozi ahụ ma bịa leta Grove City!” Nwanne mama m bụ́ Mary bụkwa onye ọzọ chetara Onye keworo ya site n’oge ọ dị na ntorobịa.
Ije Mgbakọ Dị Iche Iche
Nanị nna m na Clarence nwere ike ịga mgbakọ Cedar Point, Ohio ahụ mere ihe akụkọ, na 1922. Otú ọ dị, ka ọ na-erule 1924, anyị nwetara ụgbọala, ezinụlọ anyị nile jekwara mgbakọ e nwere na Columbus, Ohio. A tụrụ anya n’aka anyị bụ́ ụmụntakịrị iji ego anyị dokọtara kwụọ ụgwọ maka nri anyị ná mgbakọ ụbọchị asatọ ahụ. Echiche ndị mụrụ m bụ na mmadụ nile n’ezinụlọ ahụ aghaghị ịmụta ịkwado onwe ha. Ya mere anyị zụlitere ọkụkọ na òké bekee, nweekwa akwụ aṅụ, anyị bụ́ ụmụ okoro nwekwara ebe ndị anyị na-aga ere akwụkwọ akụkọ.
Mgbe oge ruru maka mgbakọ Toronto, Canada, na 1927, anyị nwere nwanne nwoke ka dị ọnwa isii nke aha ya bụ Paul. E nyere m ọrụ ịnọrọ n’ụlọ ma lekọta Paul, nwanne mama m nke lụworo di ga-enyekwara m aka, ebe ndị mụrụ m na ụmụntakịrị ndị ọzọ gawara Toronto. E nyere m dollar iri maka ọrụ m, bụ́ nke m jiri zụọrọ onwe m kootu na traụza. E nyere anyị ọzụzụ mgbe nile iji ezigbo ejiji maka nzukọ na ilekọta uwe anyị.
Ka ọ na-erule oge mgbakọ 1931 ahụ kwesịrị ncheta na Columbus, Ohio, Clarence na Carl lụrụ nwunye ma na-asụkwa ụzọ, ha na ndị nwunye ha. Nke ọ bụla n’ime ha bi n’ebe obibi a na-adọkpụgharị adọkpụgharị nke ha ji aka ha wuo. Carl lụrụ Claire Houston, onye si Wheeling, West Virginia, ọ bụkwa ya mere m ji nọdebe nwanne nwanyị Claire nke ọ tọrọ, bụ́ Helen, ná mgbakọ Columbus ahụ.
Ozi Oge Nile
Agụsịrị m ụlọ akwụkwọ dị elu na 1932 mgbe m dị afọ 15, n’afọ sochiri ya, ebunyere m nwanne m nwoke bụ́ Clarence, bụ́ onye na-asụ ụzọ na South Carolina, ụgbọala a gbatụrụla agbatụ. Etinyere m akwụkwọ maka ozi ịsụ ụzọ ma malite isoro Clarence na nwunye ya na-eje ozi. N’oge ahụ, Helen na-asụ ụzọ na Hopkinsville, Kentucky, edekwaara m ya akwụkwọ na nke mbụ ya. Ná nzaghachi ya, ọ jụrụ, sị: “Ị̀ bụ onye ọsụ ụzọ?”
N’akwụkwọ ozi m—Helen jigidere ya ruo mgbe ọ nwụrụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 60 n’ihu—m zara, sị: “Abụ m, m nwekwara olileanya ịnọgide na-abụ.” N’akwụkwọ ozi ahụ, agwara m Helen banyere nkesa m kesaara ndị ndú okpukpe na ndị ọrụ ụlọikpe akwụkwọ nta ahụ bụ́ The Kingdom, the Hope of the World n’ebe m na-arụ ọrụ nkwusa.
Na 1933, nna m rụọrọ m obere ụlọ nwere wheel—ụlọ ụgbọala na-adọkpụ nke dị mita 2.4 n’ogologo na mita 2 n’obosara, nke e ji ákwà siri nnọọ ike e kere gburugburu ya meere mgbidi, nke nwekwara windo ma n’ihu ma n’azụ. Nke ahụ bụ nwa ebe obibi m ruo afọ anọ sochirinụ nke ịsụ ụzọ.
Na March 1934, Clarence and Carl, ndị nwunye ha, Helen na nne ya, Nwanne nwunye Clarence nke nwanyị na mụ—anyị mmadụ asatọ—tinyere isi n’ebe ọdịda anyanwụ ije mgbakọ e nwere na Los Angeles, California. Ụfọdụ sonyere n’ụlọ m nke ụgbọala na-adọkpụ ma hie n’ime ya. M hiri n’ime obere ụgbọala, ebe ndị ọzọ kwụrụ ụgwọ ịnọ n’ụlọ ndị ọbịa. Ebe ọ bụ na anyị nwere nsogbu ụgbọala, anyị rutere Los Angeles n’ụbọchị nke abụọ nke mgbakọ ụbọchị isii ahụ. N’ebe ahụ, na March 26, mụ na Helen mesịrị nwee ike igosipụta nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova site na baptism ime mmiri.
Ná mgbakọ ahụ, Joseph F. Rutherford, bụ́ onyeisi oche nke Watch Tower Society n’oge ahụ, bịara n’onwe ya soro ndị ọsụ ụzọ nwee nzukọ. Ọ gbara anyị ume, na-asị na anyị bụ ndị ji obi ike na-alụrụ eziokwu Bible ọgụ. Ná nnọkọ ahụ, e mere ndokwa inye ndị ọsụ ụzọ enyemaka ego ka ha wee nwee ike ịnọgide n’ozi ha.
Ihe Ọmụmụ Na-adịgide n’Oge Ndụ Nile
Mgbe anyị si mgbakọ Los Angeles ahụ lọta, anyị nile sooro ndị bi n’ógbè nile nke South Carolina, Virginia, West Virginia, na Kentucky kerịta ozi Alaeze ahụ. Ọtụtụ afọ n’ihu, Helen dere banyere oge ahụ, sị: “E nweghị ọgbakọ anyị ga-adabere na ya, anyị enweghịkwa ndị enyi ga-enyere anyị aka, n’ihi na n’ezie anyị bụ ndị ọbịa n’ala ọzọ. Ma amaara m ugbu a na m nọ na-enweta ihe ọmụmụ. M nọ na-aghọ ọgaranya.”
Ọ jụrụ, sị: “Gịnị ka nwa agbọghọ na-eto eto ga-eji oge ya mee mgbe ọ nọ ebe ndị enyi ya na-anọghị na ebe na-abụghị ebe a nọ zụlite ya? Ọ dịchaghị njọ otú ahụ. Apụghị m icheta mgbe ọ bụla ike ụwa gwụrụ m. Agụrụ m akwụkwọ nke ukwuu. Ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị hapụrụ ịgụ akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Bible na ịmụ ihe. M rapaara nne m n’ahụ, na-amụta ijizi ego anyị nwere ejizi, ịga ahịa, ịgbanwe taya dara afọ, isi nri, ịdụ ákwà, na ikwusa ozi ọma. Enweghị m ịkwa ụta ọ bụla, m ga-ejikwa ọṅụ meghachi ihe ahụ nile ọzọ.”
Helen na nne ya nwere afọ ojuju ibi n’obere ụlọ ụgbọala na-adọkpụ n’afọ ndị ahụ, n’agbanyeghị na nne ya nwere ọmarịcha ebe obibi. Mgbe e nwesịrị mgbakọ Columbus, Ohio, na 1937, ọnọdụ ahụ ike nke nne Helen kawanyere njọ, a kpọgakwara ya n’ụlọ ọgwụ. Ọ nwụrụ n’ebe o ketara ọrụ na Philippi, West Virginia, na November 1937.
Ịlụ Nwanyị na Ịnọgide n’Ozi
Na June 10, 1938, mụ na Helen lụrụ, anyị mere ememe dị nnọọ nta n’ụlọ a nọ mụọ ya na Elm Grove, nke dị nso na Wheeling, West Virginia. Ezigbo Nwanna anyị nwoke bụ́ Evans, bụ́ onye mere ka ezinụlọ m mata eziokwu ahụ ọtụtụ afọ tupu a mụọ m, kwuru okwu agbamakwụkwọ ahụ. Mgbe anyị gbasịrị akwụkwọ, mụ na Helen mere atụmatụ ịlaghachi n’ọrụ ịsụ ụzọ n’ebe ọwụwa anyanwụ Kentucky, ma ọ tụrụ anyị n’anya n’ụzọ dị ukwuu na a kpọrọ anyị ịrụ ọrụ zoonu. Ọrụ a gụnyere ileta ìgwè dị iche iche nke Ndịàmà Jehova n’ebe ọdịda anyanwụ Kentucky na akụkụ dị iche iche nke Tennessee iji nyere ha aka n’ozi ha. Mgbe ahụ e nwere nanị ndị nkwusa Alaeze 75 dị otú ahụ n’ebe nile anyị letara.
N’oge ahụ, mmụọ ịhụ mba n’anya kpaghasịrị echiche nke ọtụtụ ndị, a tụkwara m anya ịbụ onye a tụrụ mkpọrọ ngwa ngwa n’ihi nnọpụiche m dị ka onye Kraịst. (Aịsaịa 2:4) Otú ọ dị, n’ihi ịbụ onye e ji ọrụ ime nkwusa mara, òtù na-edebanye aha ndị mmadụ maka ije agha gụnyere m n’ebe mere ka o kwe m mee ịnọgide n’ozi oge nile.
Mgbe anyị malitere ozi njegharị, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na onye ọ bụla kwuru okwu banyere ịbụ nwata anyị. Na Hopkinsville, Kentucky, otu nwanna nwanyị bụ́ onye Kraịst ji ibi ọma kelee Helen ma jụọ, sị: “Ì chetara m?” Na 1933, Helen gbaara ya ama n’ụlọ ahịa ime obodo nke di ya na-elekọta. Ọ bụ onye nkụzi Sunday-school, ma mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ Helen nyere ya, o guzooro n’ihu klas ya ma rịọ mgbaghara n’ihi ịkụziworo ha ozizi ndị na-esiteghị na Bible. Mgbe ọ gbasịrị esokwaghịm na chọọchị ahụ, ọ malitere ikwusa eziokwu Bible n’ógbè ya. Mụ na Helen jere ozi ruo afọ atọ n’ebe ọdịda anyanwụ Kentucky, nwanna nwanyị ahụ na di ya mekwara ka ebe obibi ha bụụrụ anyị ebe obibi.
N’oge ahụ anyị na-enwe mgbakọ ndị dị nta na gburugburu ókèala anyị, A. H. Macmillan lekọtakwara otu n’ime nzukọ ndị a. Ọ nọtụwo n’ụlọ ndị mụrụ Helen mgbe Helen bụ nwata, ya mere ná mgbakọ ahụ, ọ họọrọ isoro anyị nọrọ n’ebe obibi anyị a na-adọkpụgharị adọkpụgharị nke dị mita ise n’ogologo, bụ́ ebe anyị nwere àkwà nke ọ na-adịghị onye na-edina na ya. Ya onwe ya kwa echetawo Onye keworo ya n’oge ọ dị n’okorobịa, ebe o rawooro ndụ ya nye Jehova na 1900, mgbe ọ dị afọ 23.
Na November 1941, a kwụsịrị ọrụ nke ụmụnna ndị na-ejegharị ejegharị ruo nwa oge, e kenyekwara m ọrụ dị ka onye ọsụ ụzọ na Hazard, Kentucky. Ọzọkwa, anyị na nwanne m nwoke bụ́ Carl na nwunye ya, bụ́ Claire rụkọkwara ọrụ. N’ebe a, Joseph Houston, bụ́ nwa nwanne Helen, sonyeere anyị ma malite ịsụ ụzọ. Ọ nọgidere n’ozi oge nile ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 50, ọ nwụrụ na mberede n’ihi obi nkụchi na 1992 ebe o ji ikwesị ntụkwasị obi na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova na Brooklyn, New York.
Na 1943 e kenyere anyị ịga Rockville, Connecticut. Nke a bụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ụwa dịwagara nnọọ iche nye mụ na Helen n’ihi na ije ozi n’ebe ndịda amarawo anyị ahụ. Na Rockville, Helen na-eduzi mgbe nile ọmụmụ Bible ebe obibi karịrị 20 kwa izu. Anyị mesịrị nweta obere ọnụ ụlọ iji mere Ụlọ Nzukọ Alaeze, a hazikwara mmalite nke obere ọgbakọ.
Mgbe anyị na-eje ozi na Rockville, a kpọrọ anyị ije klas nke ise nke ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead na South Lansing, New York. Ọ bụụrụ anyị ihe obi ụtọ ịchọpụta na Aubrey na Bertha Bivens, bụ ndị enyi anyị n’oge ndị ahụ anyị sụrụ ụzọ na Kentucky, na-aga ịbụ ụmụ klas anyị.
Ụlọ Akwụkwọ na Ọrụ Ọhụrụ Anyị
Ọ bụ ezie na anyị agbagotebeghị nnọọ n’afọ ndụ, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ klas anyị bụ ụmụaka ọbụna karị. Ee, ha na-echeta Onye keworo ha n’oge ntorobịa ha. Ngụcha akwụkwọ anyị bụ na July 1945, ka Agha Ụwa nke Abụọ na-abịa nnọọ ná njedebe. Ka anyị na-echere maka ebe a ga-ekenye anyị ozi ala ọzọ, anyị sonyeere Ọgbakọ Flatbush nke dị na Brooklyn, New York na-arụ ọrụ. E mesịa, n’October 21, 1946, anyị na ụmụ klas anyị isii ndị ọzọ, gụnyere ezinụlọ Bivens ji ụgbọelu fega n’ebe obibi ọhụrụ anyị na Guatemala City, Guatemala. N’oge ahụ e nwere Ndịàmà Jehova na-erughị 50 ná mba ahụ nile bụ́ nke dị na Kọntinent Ebe Etiti America.
N’April 1949, a kpọgara mmadụ ole na ole n’ime anyị bụ́ ndị ozi ala ọzọ na Quetzaltenango, bụ́ obodo nọ n’ọkwa nke abụọ n’ibu ibu na n’ịdị mkpa ná mba ahụ. Obodo a ji ihe karịrị mita 2,300 dị elu karịa elu oké osimiri, ikuku na-eku n’elu ugwu ahụ bụkwa nke a na-emetọghị emetọ. Helen chịkọtara ọrụ anyị ebe a, na-ede, sị: “Ọ bụụrụ anyị ihe ùgwù ikwusa ozi ọma n’ọtụtụ obodo na ime obodo dị iche iche. Anyị na-ebili n’ihe dị ka elekere anọ n’ụtụtụ ma banye bọs (nke na-enwekarị ákwà a fụdara afụda kama inwe windo) gaa n’obodo ndị dị anya. N’ebe ahụ, anyị na-eje ozi ihe dị ka awa asatọ tupu anyị alọghachite ná mgbede.” Taa, e nwere ọgbakọ dị iche iche n’ebe ndị a, gụnyere isii e nwere na Quetzaltenango.
N’oge na-adịghị anya, a kpọrọ òkù maka ndị ozi ala ọzọ ije ozi na Puerto Barrios, bụ́ obodo nke atọ kasị buo ibu na Guatemala, nke dị n’Ụsọ Oké Osimiri Caribbean. Ndị enyi anyị hụrụ n’anya bụ́ ezinụlọ Bivens, ndị anyị na ha jekọworo ozi na Guatemala, so ná ndị a kpọgara n’ókèala ọrụ ọhụrụ ahụ. Ntọsa ahụ wutere anyị nke ukwuu ma hapụ oghere ná ndụ anyị. Ebe ọ bụ nanị mụ na Helen fọdụrụ n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ ahụ, anyị kwagara n’ebe obibi dị nta. Na 1955, mụ na Helen nakweere ịga n’ókèala ọrụ ọhụrụ n’obodo Mazatenango nke na-ekpo ọkụ karị. Nwanne m nwoke nke anyị tọsịrị, bụ́ Paul, na nwunye ya, bụ́ Dolores, ndị gụsịrị akwụkwọ na Gilead na 1953, ejewo ozi ebe ahụ nwa oge tupu anyị erute.
Ka ọ na-erule 1958, anyị nwere ihe karịrị Ndịàmà 700, ọgbakọ 20, na sekit atọ na Guatemala. Ọzọkwa, mụ na Helen keere òkè n’ọrụ njegharị, na-eleta obere ìgwè dị iche iche nke Ndịàmà na ọtụtụ n’ime ọgbakọ ndị ahụ, gụnyere nke ahụ dị na Quetzaltenango. E mesịa, n’August 1959, a kpọrọ anyị ịlọghachite na Guatemala City, ebe anyị biri n’alaka ụlọ ọrụ. E kenyere m ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ, ebe Helen nọgidere n’ozi ala ọzọ ruo afọ 16 ọzọ. Mgbe ahụ, ya onwe ya kwa malitere ịrụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ.
Ngọzi Ndị Ọzọ
N’ime ọtụtụ afọ ndị gara aga o yiri ka m na-abụkarị onye a tọchara n’etiti ndị na-efe Jehova. Ugbu a, m na-abụkarị onye kasị okenye, dị ka o mere mgbe m jere ụlọ akwụkwọ ọzụzụ ndị ọrụ alaka na Patterson, New York, na 1996. Dị nnọọ ka m nwetara enyemaka dị ukwuu n’oge ntorobịa m n’aka ndị meworo okenye, ọ bụwooro m ihe ùgwù n’iri afọ ndị na-adịbeghị anya inyere ọtụtụ ndị na-eto eto aka bụ́ ndị nwere ọchịchọ icheta Onye keworo ha n’oge ntorobịa ha.
Jehovah anọgidewo na-awụkwasị ndị ya ngọzi n’ebe a na Guatemala. Na 1999, e nwere ihe karịrị ọgbakọ 60 na Guatemala City. N’ebe ugwu, ndịda, ọwụwa anyanwụ, na ọdịda anyanwụ, e nwekwara ọtụtụ ọgbakọ ndị ọzọ na ọtụtụ puku ndị nkwusa nke ozi ọma Alaeze Chineke. Ihe ahụ na-erughị ndị nkwusa Alaeze 50 mgbe anyị bịarutere ihe dị ka afọ 53 gara aga arịwo elu ruo ihe karịrị nnọọ 19,000!
Ihe Dị Ukwuu Mere M Ga-eji Nwee Ekele
Ọ dịghị onye ọ bụla na-adịcha ndụ ya nile n’enweghị nsogbu, ma anyị pụrụ ‘ịtụkwasị Jehova ibu’ anyị mgbe nile. (Abụ Ọma 55:22) Ọ na-anagidekarị anyị site ná nkwado nke ndị enyi na-ahụ n’anya. Dị ka ihe atụ, afọ ole na ole tupu ọnwụ ya, Helen nyere m onyinye nke otu obere ihe odide e wuuru ọbọ nke e dekwasịrị akụkụ Bible dị ná Ndị Hibru 6:10, sị: “Chineke abụghị onye na-ekpe ikpe na-ezighị ezi nke na ọ ga-echezọ ndọgbu n’ọrụ unu nakwa ịhụnanya nke unu gosipụtaworo n’ebe Ya Onwe Ya nọ site n’ijere ndị Ya ozi na n’ịnọgide na-ejere ha ozi.”—Weymouth.
Akụkụ nke ihe o dere gbakwụnye na ya na-agụ, sị: “Ezigbo onye m hụrụ n’anya, enweghị m ọtụtụ ihe m pụrụ inye gị karịa ỊHỤNANYA M NILE . . . Akụkụ akwụkwọ nsọ a kwesịrị gị nnọọ, m na-arịọkwa gị ka i debe ya n’elu tebụl gị, ọ bụghị n’ihi na ọ bụ m nyere gị ya, kama n’ihi na ọ bụ eziokwu n’ebe ị nọ n’ogologo afọ ndị i jeworo ozi.” Ruokwa taa, ihe ahụ ka dị n’elu tebụl ọfịs m n’alaka Guatemala.
Ejeworo m Jehova ozi site n’oge ntorobịa m, ugbu a kwa n’oge m meworo agadi, m na-ekele Jehova n’ihi ezi ahụ ike m nke na-eme ka o kwe m mee ịhụ maka ọrụ ndị e kenyere m. Ka m na-agụchi Bible m anya, m na-agụtakarị akụkụ akwụkwọ nsọ ndị m chere na Helen m hụrụ n’anya gaara akanyeworị akara n’okpuru ha na Bible ya. Nke ahụ mere mgbe m gụghachiri Abụ Ọma 48:14, sị: “Nke a bụ Chineke, bụ́ Chineke anyị, ruo mgbe nile ebighị ebi; Ya onwe ya ga na-edu anyị ruo n’ịnwụ ọnwụ.”
Ọ bụụrụ m ihe obi ụtọ isoro ndị ọzọ kerịta ọhụụ nke ụbọchị mbilite n’ọnwụ, mgbe ndị nke mba ochie nile ga na-anabataghachi ndị ha hụrụ n’anya site n’ọnwụ baa n’ụwa ọhụrụ. Lee aha olileanya magburu onwe ya ọ bụ! Lee anya mmiri ọṅụ ndị ga-agbapụta mgbe ahụ ka anyị na-echeta na Jehova bụ n’ezie Chineke nke “na-akasi ndị dị ala obi”!—2 Ndị Kọrint 7:6.
[Foto dị na peeji nke 25]
Malite n’elu aka ekpe gaa n’aka nri: Mama m, papa m, nwanne mama m nke nwanyị bụ́ Eva, na ụmụnne m ndị nwoke bụ́ Carl na Clarence, 1910
[Foto ndị dị na peeji nke 26]
Mụ na Helen na 1947 nakwa na 1992