Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w21 Febụwarị p. 25
  • Uru Ịmụmụ Ọnụ Ọchị Bara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Uru Ịmụmụ Ọnụ Ọchị Bara
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Icheta Onye Keworo Anyị Site n’Oge Ntorobịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ọtụtụ Ọrụ nke Ndị Nne
    Teta!—2002
  • Uru Iji Ihe Nkwagharị Ezi Ozi Ọma Na-aba n’Ụwa Niile
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
  • Ịhụnanya Ka E Ji Amata Ezigbo Ndị Kraịst—Mee Ka Ọgbakọ Na-adị n’Otu
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
w21 Febụwarị p. 25

Uru Ịmụmụ Ọnụ Ọchị Bara

Ebe Helen na-amụmụ ọnụ ọchị ka ọ kwụ n’akụkụ ihe a na-akwagharị akwagharị, ụmụ nwaanyị abụọ ana-agafe.

KA ỤMỤ agbọghọ abụọ nọ na-aga n’otu obodo a na-akpọ Bangui Siti, dị na Filipinz, ha hụrụ ihe a na-akwagharị akwagharị e ji ezi ozi ọma, ma ha erughị ya nso. Otu nwanna nwaanyị nọ n’akụkụ ihe nkwagharị ahụ aha ya bụ Helen mụmụụrụ ha ọnụ ọchị. Ụmụ agbọghọ ndị ahụ gawara ebe ha na-aga, ma ọnụ ọchị ahụ Nwanna Nwaanyị Helen mụmụụrụ ha masịrị ha.

Mgbe e mechara, ka ụmụ agbọghọ ahụ nọ n’ụgbọala na-ala, ha hụrụ ebe e dere jw.org n’ihu otu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha chetara na ọ bụ otu ihe ahụ ka e dere n’ihe nkwagharị ahụ ha hụrụ. Ha abụọ rịturu n’ụgbọala gaa lee oge ndị e dere n’ihu ebe ahụ ọgbakọ dị iche iche ji amụ ihe.

Ụmụ nwaanyị abụọ ahụ mụmụrụ ọnụ ọchị mgbe ha hụrụ Helen n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Ụmụ agbọghọ abụọ ahụ gara otu n’ime ọmụmụ ihe e nwere ebe ahụ. Ka ha na-abanye n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ị̀ ma onye ha hụrụ? Ọ bụ Nwanna Nwaanyị Helen. Ha chetara ozugbo na ọ bụ ya bụ onye ahụ mụmụụrụ ha ọnụ ọchị. Nwanna Nwaanyị Helen kwuru, sị: “Mgbe ha bịakwutere m, ụjọ tụtụrụ m. M nọ na-eche ma ò nweela ihe ọjọọ m mere.” Ma, ha kọwaara Helen otú ha si mata ya.

Ọmụmụ ihe ahụ tọrọ ụmụ agbọghọ ndị ahụ ụtọ. Otú ụmụnna si nabata ha mere ka obi ruo ha ala. Mgbe ha hụrụ ka a na-azacha Ụlọ Nzukọ Alaeze mgbe ọmụmụ ihe gbasara, ha jụrụ ma hà nwere ike inye aka. Ọ dịghị anya, otu n’ime ụmụ agbọghọ ndị ahụ apụọ n’obodo ahụ. Onye nke ọzọ bidoro ịbịa ọmụmụ ihe. Ọ malitekwala ịmụ Baịbụl. Ihe kpatara ihe ndị a bụ ọnụ ọchị ahụ a mụmụụrụ ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya