OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Uru Iji Ihe Nkwagharị Ezi Ozi Ọma Na-aba n’Ụwa Niile
Ọrụ Ndịozi isi ise kwuru na Ndị Kraịst oge mbụ na-aga n’ụlọ nsọ bụ́ ebe ndị mmadụ na-anọkarị ka ha nwee ike izi ha ozi ọma. (Ọrụ 5:19-21, 42) Taa, anyị ahụla na iji ihe a na-akwagharị akwagharị ezi ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị na-aba ezigbo uru.
LEENỤ VIDIO BỤ́ URU IJI IHE NKWAGHARỊ EZI OZI ỌMA NA-ABA N’ỤWA NIILE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee mgbe a malitere iji ihe nkwagharị ezi ozi ọma, oleekwa otú e si malite ya?
Olee ihe mere iji ihe nkwagharị edosa akwụkwọ anyị ji baa uru karịa iji tebụl?
Olee ihe anyị mụtara n’akụkọ Mi Jung You?
Olee otú akụkọ Jacob Salomé si gosi na iji ihe nkwagharị ekwusa ozi ọma bara uru?
Olee otú akụkọ Annies na di ya si kụziere anyị otú dị mma anyị kwesịrị isi na-ezi ozi ọma ma anyị jiri ihe nkwagharị?