Nleta Mere Ihe Akụkọ Emee Ka Otu Àgwàetiti Ṅụrịa
Na nso nso a, Cuba, bụ́ ọmarịcha àgwàetiti dị na Caribbean, hụrụ ụdị oge ume ọhụrụ ime mmụọ ha na-enwetụbeghị mbụ. Ngwụsị afọ 1998 wetaara Ndịàmà Jehova bi ná mba West Indies a ngọzi ha nọworo na-eche eri oge. Na nke mbụ ya n’ihe karịrị afọ 30, ndị so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova bịara nleta, ndị nnọchiteanya 15 ọzọ sokwa ha bịa. Ndị ọbịa ahụ bụ ụmụ amaala Australia, Austria, Belgium, Great Britain, Itali, New Zealand, na Puerto Rico.
NKE A bụ ihe omume dị oké mkpa nye ndị nkwusa Alaeze 82,258 nọ n’ebe ahụ nakwa mmadụ 87,890 bụ́ ndị sooro ha mee ememe Nri Anyasị nke Onyenwe anyị n’oge opupu ihe ubi nke 1998.
Site na December 1 ruo 7, 1998, Lloyd Barry, John Barr, na Gerrit Lösch letara Ebe Obibi Betel dị na Havana ma gaa ụfọdụ n’ime Mgbakọ Distrikti “Ụzọ Ndụ nke Chineke” ndị e nwere na Cuba. Obi dị ha ụtọ isoro ndị okenye na-ejegharị ejegharị zukọọ ma matakwuo ndị ọrụ obodo Cuba nke ọma.
“Nke a bụ ihe omume ọchịchị Chineke gbara ọkpụrụkpụ ná ndụ mụ na nwunye m,” ka John Barr kwuru. “Ezi ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nọ na Cuba nwere ịnụ ọkụ n’obi dị nnọọ ukwuu maka eziokwu ahụ! O mere ka m nwee mmetụta na òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ dị oké ọnụ ahịa n’ezie!” “Izu a dị mkpa nyeere m aka inweta nghọta ka mma banyere ọnọdụ ụmụnna anyị nọ na ya n’ebe ahụ,” ka Lloyd Barry gbakwụnyere.
N’ime afọ ise gara aga, e nyewo Ndịàmà Jehova nnwere onwe ka ukwuu nke ife ofufe na Cuba, ihe ndị ọchịchị kwukwara na-eme ka e kwere na ha chọrọ ka ọnọdụ a dịgide.
Na September 1994, a malitere ọrụ ibi akwụkwọ n’Ebe Obibi Betel dị na Havana. Ndịàmà Jehova nwere ike izukọtakwa ọzọ n’ezoghị ezo ma na-agba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Mgbe e mesịrị, na 1998, ndị ọchịchị nyere ikike maka nleta a ndị nnọchiteanya 18 bụ́ Ndịàmà Jehova si mba ọzọ mere, gụnyere mmadụ atọ so n’Òtù Na-achị Isi.
Njikọtaghachi Na-enye Obi Ụtọ
Mgbe ndị nnọchiteanya ahụ rutere n’ọdụ ụgbọelu José Martí dị na Havana, ndị ọrụ obodo na ìgwè ndị si n’Ebe Obibi Betel nabatara ha nke ọma, otu n’ime ha bụ nwanna nwoke chetara nleta ikpeazụ nke onye so n’Òtù Na-achị Isi—Milton Henschel—letara Cuba na 1961. Nwanna nwoke ahụ dị afọ 12 mgbe ahụ; ugbu a ọ bụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị.
Mgbe ndị ahụ bịaranụ rutere n’Ebe Obibi Betel ahụ, e ji ùkwù okooko osisi gladiolus, rose, jasmine, na daisy na-acha odo odo na ndị na-acha ọbara ọbara, bụ́ ndị otu nwanna nwoke kụrụ maka ihe omume a karịsịa, kelee ha. Anya mmiri jupụtara ndị mmadụ n’anya ka ezinụlọ Betel na-anabata ndị ahụ bịaranụ. Mgbe e mesịrị, ha riri anụ ezì Cuba a hụrụ n’ọkụ, osikapa na àgwà, salad, urodi e sikọrọ ya na mojo (ofe e ji garlic na mmanụ olive sie), na mkpụrụ osisi a ka ghọtara ọhụrụ. Mgbe ha risịrị nri, nke ọ bụla n’ime ndị ahụ so n’Òtù Na-achị Isi kwuru okwu na-ewuli elu banyere ịdị oké ọnụ ahịa nke ije ozi Betel. Okwu Nwanna Lösch kwuru na-akpali akpali karịsịa, ebe o ji asụsụ Spanish gwa ụmụnna ahụ okwu. Ọ bụ ndị ọrụ afọ ofufo oge nile dị 48 na ndị enyemaka nwa oge dị 18 mejupụtara ezinụlọ Betel ahụ.
Ọ bụ ezie na a na-ebiri ụmụnna nọ na Cuba akwụkwọ na Bible n’Itali, a na-eji ígwè mimeograph abụọ ebi magazin Ụlọ Nche na Teta! ndị tụrụ àgwà ojii na ọcha ná mba ahụ. Ọrụ ọkpụkpụ aka na-ewe ogologo oge bụ́kwa nke a na-arụ ugboro ugboro n’ebe dị mkpagide dị mkpa iji bipụta magazin nile a chọrọ. Ndị ọrụ afọ ofufo ahụ ji akụ̀ ha dị oké ọnụ ahịa nke ijere Jehova ozi kpọrọ ihe n’ụzọ pụrụ nnọọ iche.—2 Ndị Kọrint 4:7.
Ihe Ndị Pụtara Ìhè ná Mgbakọ
Ndị nnọchiteanya 18 ahụ kewara onwe ha ụzọ atọ iji gaa mgbakọ distrikti ndị e nwere n’ebe atọ—Havana, Camagüey, na Holguín. Na nke ọ bụla n’ime ụbọchị atọ ahụ, a kpọrọ nnukwu ìgwè ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị, gụnyere ọtụtụ ndị okenye na ndị ọsụ ụzọ, òkù ịga n’ebe mgbakọ nke ọ bụla. A gwawo Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ na nke a ga-abụ ihe omume pụrụ iche, ma ha amaghị na ndị so n’Òtù Na-achị Isi ga-abịa. Cheedị banyere ihe ijuanya ha nwere ịhụ ezigbo ụmụnna ndị a na nwunye ha ka ha si n’ụgbọala bọs ndị a naara ná ngo na-apụta n’ụtụtụ Friday!
E mere mgbakọ ndị ahụ n’ihe owuwu ndị gheere oghe bụ́ ndị ụmụnna wuru site n’ikike ndị ọchịchị. N’ebe mgbakọ dị na Havana, a kanyere “Abụ Ọma 133:1” n’otu n’ime nkume ndị dị n’ụzọ mbata: Nke a chetaara ụmụnna okwu ndị dị n’akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ: “Lee, ka o si dị mma, ka o si dịkwa ụtọ nke ukwuu, bụ́ mbikọ nke ụmụnne, ọbụna ibikọ n’otu!” N’ezie, n’oge mgbakọ ahụ, e nwere mkpakọrịta ndị Kraịst dị mma ma dị ụtọ nke ukwuu n’ebe ahụ.
Ndị ọbịa ahụ kwuru okwu banyere ụzọ magburu onwe ya e si kwuo okwu ma gbaa ajụjụ ọnụ ndị ahụ, otú e si mee ihe nkiri ahụ, bụ́ nke dabeere n’akụkọ Bible nke Daniel isi nke 3, nke mere na Babilọn oge ochie, masịkwara ha. Otu nwanna nwanyị kwuru, sị: “Ndị nile mere ihe nkiri ahụ bụ ọkpọka, ụzọ ha si na-emeghe ọnụ ha gakọrọ nnọọ nke ọma n’ụda olu ndị ahụ nke na ị gaghị ama na e buwo ụzọ kwunye ụda olu ahụ na tepụ. . . . Ndị Babilọn ọjọọ ahụ yiri ndị ọjọọ n’ezie, ndị Hibru atọ ahụ guzosikwara ike ma nwee mkpebi siri ike.”
Ndị nnọchiteanya nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Ndị Metụtara Okpukpe na ndị ọzọ bụ́ ndị ọrụ gọọmenti bụ́ ndị bịara ịhụ mgbakọ ahụ jara ụmụnna ahụ mma maka nhazi na àgwà ọma ha. Nwanna Barry kwupụtara ezi ekele ya maka mmeso magburu onwe ya nke ndị ọchịchị Cuba mesoro ndị nnọchiteanya ahụ bịaranụ. Ụmụnna ji oké ịkụ aka, bụ́ ndị a kụrụ mgbe mgbe ruo ọtụtụ minit, gosi ekele ha maka okwu ndị ahụ nakwa maka nkwere ndị ọchịchị kweere ka e nwee mgbakọ ndị ahụ. “Nke a karịrị ihe anyị tụrụ anya ya—obere mgbakọ mba nile!” ka otu ezinụlọ bụ́ ndị Kraịst kwuru. “Ọ dịwo ebube, n’ihi na ọ gbawo akaebe banyere ike ukwu Jehova nwere imezu nkwa ya.”
Mgbakọ ndị ahụ nyekwara ohere maka ndị ọzọ ịmata Ndịàmà nke ọma karị. Otu n’ime ndị ọkwọ ụgbọala bọs ahụ gara mgbakọ ahụ na Saturday nakwa na Sunday. O kwuru na ya anụwo ọtụtụ ihe banyere Ndịàmà Jehova, ma na ya amarawo ugbu a na ha bụ ezi ndị mmadụ, dị n’udo.
“Ihe Ndị Anyị Na-agaghị Echefu Ma Ọlị”
Ikpo ọkụ na omume enyi nke ndị Cuba masịrị ndị nnọchiteanya ahụ. Ndị Cuba na-agba mbọ, nwee ụkpụrụ, dịkwa obiọma. “Ihe karịrị otu ugboro, ndị anyị na-amabughị ma ọlị kwuru ka ha nyere anyị aka,” ka otu onye bịaranụ kwuru.
Okwukwe, obi ụtọ, na ịhụnanya Ndịàmà ibe ha nọ na Cuba gosipụtara masịrị ndị nnọchiteanya ahụ nke ukwuu. N’agbanyeghị ihe mgbochi ndị tara akpụ, ha emewo Jehova ebe ha e wusiri ike. (Abụ Ọma 91:2) John Barr kwuru, sị: “Ọtụtụ ihe juru m anya n’ụzọ tọrọ m ụtọ na nke mbụ a m letara Cuba—ịma mma nke mba ahụ, àgwà ọma nke ndị m zutere, nakwa karịsịa, oké obi ụtọ nke Ndịàmà nọ na Cuba. Anụtụbeghị m ná ndụ m ka a bụrụ abụ Alaeze anyị n’ụzọ na-eru n’obi otú ahụ nakwa ka a kụrụ aka ogologo oge otú ahụ mgbe ihe ime mmụọ metụrụ ha n’obi! Ihe ndị a bụ ihe ndị anyị na-agaghị echefu ma ọlị. Anyị ga na-echeta ha mgbe nile.”
Abụ Ọma 97:1 na-asị: “Ka ala bara ụba nke dị oké osimiri gburugburu ṅụrịa.” N’ezie, Ndịàmà Jehova nọ n’àgwàetiti Cuba na-aṅụrị ọṅụ ná nnwere onwe ha a mụbaara ha iji fee Chineke ofufe, nakwa ná nleta ahụ mere ihe akụkọ nke ndị nnọchiteanya a si mba ọzọ bịa.
[Foto ndị dị na peeji nke 8]
Ọtụtụ ezinụlọ gara Mgbakọ Distrikti “Ụzọ Ndụ nke Chineke” ahụ pụrụ iche na Cuba
[Foto ndị dị na peeji nke 8]
E mepeghachiri Ebe Obibi Betel ahụ dị na Havana na 1994
[Foto dị na peeji nke 8]
Ndị so n’Òtù Na-achị Isi ejiri aka denye ihe na Bible ndị ha nyere ndị ọrụ obodo