Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w00 9/15 p. 21-24
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-achụ Onwe Onye n’Àjà?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-achụ Onwe Onye n’Àjà?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jisọs Kraịst—Ihe Nlereanya Kasịnụ
  • “Nweenụ Uche A n’Ime Onwe Unu”
  • ‘Jụ Onwe Gị’
  • ‘Ọ Dị Ngọzi Karị Inye Ihe’
  • Na-enyere Ndị Ọzọ Aka Ka Jizọs
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Iji Mmụọ Ịchụ Onwe Onye N’àjà Na-ejere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • “Ọ Dịghị Onye Nwere Ịhụnanya Karịrị Nke A”
    ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • Ịghara Ịdị Ndụ Ọzọ Maka Onwe Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
w00 9/15 p. 21-24

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-achụ Onwe Onye n’Àjà?

Bill bụ nwoke nwere ezinụlọ, onye nọ n’afọ 50 na ụma ya, onye na-akụzi nkà iwu ụlọ. Mgbe nile n’afọ, n’ego akpa ya, ọ na-eji ọtụtụ izu na-enye aka n’ime atụmatụ nakwa n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze maka ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova. Emma bụ nwa agbọghọ na-alụbeghị di nke dị afọ 22, onye gụrụ ezigbo akwụkwọ, onye a zụkwara nke ọma. Kama ịchụso ihe mgbaru ọsọ na ihe ụtọ onwe onye nanị, ọ na-etinye ihe karịrị awa 70 kwa ọnwa dị ka onye ozi, na-enyere ndị mmadụ aka ịghọta Bible. Maurice na Betty alawo ezumike nká. Kama iselatatụ aka ugbu a, ha akwagawo ná mba ọzọ iji nyere ndị nọ n’ebe ahụ aka ịmụta nzube Chineke maka ụwa.

NDỊ a adịghị ele onwe ha anya dị ka ndị pụrụ iche. Ha bụ nnọọ ndị mmadụ nkịtị na-eme ihe ha weere dị ka ihe kwesịrị omume. N’ihi gịnị ka ha ji eji oge, ike, nkà na ihe onwunwe ha eme ihe maka ọdịmma ndị ọzọ? Ihe na-akwali ha bụ ịhụnanya miri emi maka Chineke nakwa ndị agbata obi ha. Ịhụnanya a akpaliela n’ime onye nke ọ bụla n’ime ha ezi mmụọ nke ịchụ onwe onye n’àjà.

Gịnị ka anyị bu n’obi mgbe anyị kwuru mmụọ nke ịchụ onwe onye n’àjà? Ịchụ onwe onye n’àjà adịghị achọ ibi ndụ ịnapụ onwe onye ihe. Ọ dịghị mkpa na ọ ga-agụnye ịnapụ onwe onye ihe, bụ́ nke ga-eme ka anyị ghara inwe ọṅụ na afọ ojuju. Dị ka akwụkwọ bụ́ The Shorter Oxford English Dictionary si kọwaa ya, ịchụ onwe onye n’àjà pụtara n’ụzọ dị mfe, “ịhapụ ọdịmma, obi ụtọ, na ọchịchọ onwe onye n’ihi na ọ bụ ihe a na-aghaghị ime ma ọ bụ maka ọdịmma ndị ọzọ.”

Jisọs Kraịst—Ihe Nlereanya Kasịnụ

Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya, bụ́ Jisọs Kraịst, bụ ihe atụ kasịnụ nke onye nwere mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà. N’ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ, ndụ ya aghaghị ịbụworị nke na-akpali akpali na nke na-eju afọ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasịnụ. O so Nna ya na ndị e kere eke bụ́ mmụọ nwee mkpakọrịta chiri anya. Ọzọkwa, Ọkpara Chineke ji ikike ndị o nwere mee ihe n’ịrụ ọrụ ndị siri ike ma na-enye obi ụtọ dị ka “onye ọkà.” (Ilu 8:30, 31) O biri ndụ kpọmkwem n’ọnọdụ ndị dị nnọọ mma karịa ihe ọ bụla nke ọbụna onye kasị baa ọgaranya n’ụwa pụrụ ịnụtụworị ụtọ ya. N’ịbụ osote Jehova Chineke, o nwere ọkwá dị elu, nke ùgwù dịkwa na ya n’eluigwe.

Otú ọ dị, Ọkpara Chineke “mere Onwe ya ihe efu, n’ịnara ụdị nke ohu, e wee mee ya n’oyiyi nke mmadụ.” (Ndị Filipaị 2:7) O ji ọchịchọ obi hapụ uru nke aka ya nile site n’ịghọ mmadụ na inye ndụ ya dị ka ihe mgbapụta iji gbanwee ihe ọjọọ ndị Setan kpatara. (Jenesis 3:1-7; Mak 10:45) Nke ahụ pụtara ịbịa biri n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ na-eme mmehie n’ime ụwa nke na-atọgbọ n’aka Setan bụ́ Ekwensu. (1 Jọn 5:19) Ọ pụtakwara idi enweghị ntụsara ahụ na nsogbu onwe onye. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe ọ bụla o were ya, Jisọs Kraịst kpebisiri ike ime uche Nna ya. (Matiu 26:39; Jọn 5:30; 6:38) Nke a tinyere ịhụnanya na iguzosi ike n’ihe nke Jisọs n’ule ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu. Ruo n’ókè ha aṅaa ka ọ dị njikere ịchụ onwe ya n’àjà? “O wedakwara onwe ya,” ka Pọl onyeozi kwuru, “wee bụrụ onye na-aṅa ntị ruo ọnwụ, bụ́ ọnwụ nke [osisi ịta ahụhụ, NW].”—Ndị Filipaị 2:8.

“Nweenụ Uche A n’Ime Onwe Unu”

A na-agba anyị ume ịgbaso ihe nlereanya Jisọs. “Nweenụ uche a n’ime onwe unu, nke dịkwa n’ime Kraịst Jisọs,” ka Pọl gbara ume ya. (Ndị Filipaị 2:5) Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a? Otu ụzọ bụ site ‘n’ịghara ile ihe nke aka anyị anya, kama anyị nile n’otu n’otu, ilekwa ihe nke mmadụ ibe anyị anya.’ (Ndị Filipaị 2:4) Ezi ịhụnanya ‘adịghị achọ ihe nke aka ya.’—1 Ndị Kọrint 13:5.

Ọtụtụ mgbe, ndị na-eche banyere ndị ọzọ egosipụtawo ntinye uche achọghị ọdịmma onwe onye nanị n’ijere ndị ọzọ ozi. Otú ọ dị, taa, ọtụtụ ndị na-achọkarị ọdịmma onwe ha nanị. Ụwa nwere àgwà nke mụ tupu ndị ọzọ. Ọ dị anyị mkpa iche nche megide mmụọ nke ụwa n’ihi na ọ bụrụ na ọ kpụzilie echiche na àgwà anyị, o yikarịrị ka anyị ga-ebute ọchịchọ onwe anyị ụzọ. Mgbe ahụ, ihe nile anyị na-eme—ụzọ anyị si eji oge anyị, ume anyị na ihe onwunwe anyị eme ihe—ga-abụ nke inwe nchegbu banyere ọdịmma onwe onye na-achịkwa. Ya mere, ọ dị anyị mkpa ịgbasi mgba ike megide mmetụta a.

Ọbụna aro sitere n’ezi obi pụrụ mgbe ụfọdụ ịkụda mmụọ anyị nke ịchụ onwe onye n’àjà. N’ịmata ebe ụzọ ịchụ onwe onye n’àjà nke Jisọs na-eduje, Pita onyeozi sịrị: “Meere [onwe] Gị ebere, Onyenwe anyị.” (Matiu 16:22) O yiri ka o siiri ya ike ịghọta njikere Jisọs dị iru ọbụna n’ọnwụ maka ọdịmma nke ọbụbụeze Nna ya na nzọpụta nke ihe a kpọrọ mmadụ. N’ihi ya, ọ nwara ịkụda Jisọs mmụọ ka ọ ghara ịgbaso ụzọ dị otú ahụ.

‘Jụ Onwe Gị’

Olee otú Jisọs si meghachi omume? Ihe ndekọ ahụ na-asị: “O chigharịrị, hụ ndị na-eso ụzọ Ya, Ọ baara Pita mba, sị, Gaa n’azụ m, Setan: n’ihi na ị dịghị atụkwasị uche gị n’ihe Chineke, kama ọ bụ n’ihe mmadụ.” Jisọs wee kpọọ ìgwè mmadụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya, o wee sị, “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ka o soo m n’azụ, ya jụ onwe ya, buliekwa [osisi ịta ahụhụ, NW] ya, na-esokwa m.”—Mak 8:33, 34.

Ihe dị ka afọ 30 mgbe o nyesịrị Jisọs ndụmọdụ a, Pita gosiri na ka ọ na-erule mgbe ahụ na ya aghọtala ihe ịchụ onwe onye n’àjà pụtara. Ọ gbaghị ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha jiri nwayọọ ná mgbalị ha ma na-emere onwe ha ebere. Kama nke ahụ, Pita gbara ha ume ike ihe okike n’úkwù nke uche ha ma ghara ịbụ ndị e mere ka ha dị ka agụụ ihe ọjọọ nke ụwa nke gụrụ ha na mbụ si dị. N’agbanyeghị ọnwụnwa, ha gaje ibute ime uche Chineke ụzọ ná ndụ ha.—1 Pita 1:6, 13, 14; 4:1, 2.

Ụzọ kasị enyeghachi ụgwọ ọrụ nke onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịgbaso bụ inyefe Jehova onwe anyị, na-eso ụzọ Jisọs Kraịst n’ikwesị ntụkwasị obi, na-ekwekwa ka Chineke na-eduzi ihe omume anyị. Na nke a, Pọl setịpụrụ ezi ihe nlereanya. Echiche ịdị ngwa ya na ekele o nwere n’ebe Jehova nọ kwaliri ya ịhapụ nchụso na atụmanya nke ụwa bụ́ ndị gaara adọpụ uche ya n’ime uche Chineke. Ọ sịrị, “Mụ onwe m ga-ewere obi ụtọ nile mefuo ihe m nwere kwekwa ka e mefusịa mụ onwe m” n’ije ozi maka ọdịmma nke ndị ọzọ. (2 Ndị Kọrint 12:15) Pọl ji ikike ya mee ihe iji mụbaa ọdịmma nke Chineke, ọ bụghị nke aka ya.—Ọrụ 20:24; Ndị Filipaị 3:8.

Olee otú anyị pụrụ isi nyochaa onwe anyị iji hụ ma anyị nwere echiche yiri nke Pọl onyeozi? Anyị pụrụ ịjụ onwe anyị ajụjụ ndị dị ka ndị a: Olee otú m si eji oge, ume, ikike m, na ihe ndị m nwere eme ihe? M̀ na-eji ihe ndị a na onyinye ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa eme ihe nanị iji mụbaa ọdịmma nke m, ka m̀ na-eji ha enyere ndị ọzọ aka? Àtụlewo m ikerekwu òkè zuru ezu n’ọrụ ahụ na-azọpụta ndụ nke ikwusa ozi ọma, ikekwe dị ka onye nkwusa Alaeze oge nile? Àpụrụ m itinyekwu onwe m n’ụzọ zuru ezu n’ọrụ ndị dị ka iwu ma ọ bụ ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze? Àna m eji ohere ndị dapụtaranụ eme ihe iji nyere ndị nọ ná mkpa aka? M̀ na-enye Jehova ihe kasị mma m nwere?—Ilu 3:9.

‘Ọ Dị Ngọzi Karị Inye Ihe’

Ma, amamihe ọ̀ dị n’ezie n’ịchụ onwe onye n’àjà? N’ezie ọ dị! Pọl maara site n’ahụmahụ nke ya na mmụọ dị otú ahụ na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu. O wetaara ya obi ụtọ dị ukwuu na afọ ojuju onwe onye buru ibu. Ọ kọwaara ndị okenye si n’Efesọs nke a mgbe ya na ha zukọrọ na Militọs. Pọl sịrị: “N’ihe nile egosiri m unu, na unu aghaghị ịdọgbu onwe unu n’ọrụ otú a, na inyere ndị na-adịghị ike aka [n’ụzọ ịchụ onwe onye n’àjà], na icheta okwu Onyenwe anyị Jisọs, na Ya onwe ya sịrị, Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ọtụtụ nde mmadụ achọpụtawo na igosipụta ụdị mmụọ a na-eweta nnukwu obi ụtọ ugbu a. Ọ ga-ewetakwa ọṅụ n’ọdịnihu mgbe Jehova ga-enye ndị butere ọdịmma ya nakwa nke ndị ọzọ ụzọ tupu nke aka ha, ụgwọ ọrụ.—1 Timoti 4:8-10.

Mgbe a jụrụ ya ihe mere o ji dọgbuo onwe ya n’ọrụ inyere ndị ọzọ aka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, Bill kwuru, sị: “Inyere ndị a na-ewerekarị dị ka obere ọgbakọ aka n’ụzọ dị otú a na-enye m afọ ojuju onwe onye dị ukwuu. Ọ na-atọ m ụtọ iji nkà na ihe ọmụma ọ bụla m nwere eme ihe maka abamuru nke ndị ọzọ.” N’ihi gịnị ka Emma jiworo họrọ itinye ume na ikike ya n’inyere ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu Akwụkwọ Nsọ? “Apụghị m iche n’echiche otú m pụrụ isi na-eme ihe dị iche. Mgbe m ka bụ nwa agbọghọ ma nwee ike ime ya, achọrọ m nnọọ ime ihe nile m nwere ike ime iji mee ihe na-atọ Jehova ụtọ ma nyere ndị ọzọ aka. Ịchụ uru ihe onwunwe ụfọdụ n’àjà abụghị nnọọ oké ihe. Ana m eme nanị ihe m chere na m kwesịrị ime n’ihi ihe Jehova mewooro m.”

Maurice na Betty adịghị akwa ụta ọ bụla n’ihi na ha ebighị ndụ ntụsara ahụ, mgbe ọtụtụ afọ nke ịrụsi ọrụ ike n’ịzụlite na ilekọta ezinụlọ ha gasịrị. Ugbu a ha laworo ezumike nká, ha chọrọ ịnọgide jiri ndụ ha na-eme ihe bara uru, nke nwekwara nzube. “Anyị achọghị nnọọ ịnọ nkịtị ma na-atụsara ahụ,” ka ha kwuru. “Inyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Jehova ná mba ọzọ na-enye anyị ohere ịnọgide na-eme ihe nwere nzube.”

Ì kpebisiela ike ịdị na-achụ onwe gị n’àjà? Nke a agaghị adị mfe. E nwere ibu agha dị mgbe nile n’agbata ọchịchọ mmadụ anyị na-ezughị òkè na agụụ anyị siri ike ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. (Ndị Rom 7:21-23) Ma, ọ bụ agha a pụrụ imerị na ya ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka Jehova na-eduzi ndụ anyị. (Ndị Galetia 5:16, 17) N’ezie ọ ga-echeta ọrụ ịchụ onwe onye n’àjà anyị rụrụ n’ije ozi ya, ọ ga-agọzikwa anyị n’ụba. N’ezie, Jehova Chineke ‘ga-emeghe windo nile nke eluigwe, wụsa anyị ngọzi ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.’—Malakaị 3:10; Ndị Hibru 6:10.

[Foto dị na peeji nke 23]

Jisọs nwere mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà. Ì nwere?

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Pọl tinyere mgbalị ya nile n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya