Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 10/1 p. 8
  • “Nke A Bụ Ihe Ọhụrụ!”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Nke A Bụ Ihe Ọhụrụ!”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Lee Okwukwe Ule na Poland
    Teta!—2000
  • Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha Hụ Jehova n’Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ndị Nne na Nna, Chebenụ Ihe Nketa Unu Dị Oké Ọnụ Ahịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ịzulite Ezinụlọ Siri Ike N’ụzọ Ime Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 10/1 p. 8

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

“Nke A Bụ Ihe Ọhụrụ!”

DOROTA, bụ́ onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova na Poland, sooro nwa ya nwoke dị afọ 14 gaa na nke dọkịta ụlọ akwụkwọ ha maka ile ahụ́ a na-eme mgbe nile. Mgbe dọkịta ahụ, bụ́ Janina,a na-ele nwa Dorota ahụ́, ọ jụrụ ya ihe nwa ya nwoke na-arụ n’ụlọ.

“Mgbe m na-enweghị ike isi nri, nwa m nwoke na-akwadebe ihe oriri maka anyị mmadụ isii nile nọ n’ezinụlọ anyị,” ka Dorota zara. “Ọ na-ehichakwa ụlọ ma na-enye aka n’idozi ihe ndị mebiri emebi n’ebe obibi anyị. Ọ na-enwe mmasị ịgụ akwụkwọ. Ọ bụ ezigbo nwata akwụkwọ.”

“Nke ahụ dị ịtụnanya,” ka Janina kwuru. “Anọwo m na-arụ ọrụ n’ebe a ruo afọ 12, anụtụbeghịkwa m ihe dị ka nke a.”

N’ịchọpụta na nke a bụ ohere iji gbaa àmà, Dorota kọwara, sị: “Ọtụtụ ndị nne na nna taa adịghị enye ụmụ ha ọzụzụ kwesịrị ekwesị. Ọ bụ ya mere ụmụ ha adịchaghị enwe ùgwù onwe onye.”

“Olee otú i si mara ihe a nile?” ka Janina jụrụ. “Ọtụtụ ndị nne na nna amaghị ihe ndị a.”

“Bible bụ ebe dị oké ọnụ ahịa e si enweta ihe ọmụma dị otú a,” ka Dorota zara. “Dị ka ihe atụ, Deuterọnọmi 6:6-9 na-egosi na inye ụmụ anyị ọzụzụ na-amalite n’inye onwe anyị ọzụzụ. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ibu ụzọ kụnye n’ime onwe anyị ụkpụrụ ndị anyị chọrọ ịkụnye n’ime ụmụ anyị?”

“Nke a dị ịtụnanya,” ka Janina kwuru. “Nke a dị ịtụnanya!” Ọ jụziri Dorota otú Bible si nyere ya aka ịzụlite ụmụ ya na ịkụziri ha ihe.

“Anyị na-eso ụmụ anyị amụ Bible kwa izu,” ka Dorota kọwara. “Anyị na-eji akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè eme ihe.”b Ọ gaziri n’ihu ịkọwa akwụkwọ ahụ ma kwuo ụfọdụ isiokwu ndị dị na ya.

“Nke a bụ ihe ọhụrụ!” ka Janina kwuru. “M̀ pụrụ ịhụ akwụkwọ ahụ?”

Mgbe otu awa gasịrị, Dorota ji akwụkwọ ahụ lọghachi.

“Olee okpukpe ị na-ekpe?” ka Janina jụrụ ka ọ na-enyocha akwụkwọ ahụ.

“Abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova.”

“Olee otú Ndịàmà Jehova si emeso ndị okpukpe ọzọ ihe?”

“Dị nnọọ ka m si mesoo gị—n’ụzọ nkwanye ùgwù,” ka Dorota zara, ọ gbakwụnyere, sị: “N’ezie, ọ na-adị anyị ka ya bụrụ na ha ga-abịa mara eziokwu Bible.”

“Enweedịla m afọ ojuju,” ka Janina kwupụtara.

Mgbe nleta ahụ bịara ná njedebe, Dorota gbara Janina ume ka ọ na-agụ Bible. “Ọ ga-eme ka ndụ gị nwee nzube ma nyere gị aka n’ọrụ gị.”

“Ị gbawo m ume n’ezie ime otú ahụ,” ka Janina kwetara.

Site n’iji akọ eme ihe na site n’ikpebisi ike ime ya, Dorota gbanwere ọgịga ọ na-aga n’ọfis dọkịta ahụ mgbe nile maka ile ahụ́ ịbụ ohere iji gbaa ezi àmà.—1 Pita 3:15.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụghị ezigbo aha ya.

b Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya