Ntinye Aka Chineke—Gịnị Ka Anyị Pụrụ Ịtụ Anya Ya?
NA NARỊ afọ nke asatọ T.O.A., Eze Hezekaịa nke Juda, onye dị afọ 39, chọpụtara na ya na-arịa ọrịa nke ga-egbu ya. N’ịbụ onye nke ahụ mapụrụ obi, Hezekaịa rịọrọ Chineke n’ekpere ka ọ gwọọ ya. Chineke zara ekpere ya site n’ọnụ onye amụma ya, sị: “Anụwo m ekpere gị, ahụwo m anya mmiri gị: lee, M na-atụkwasị afọ iri na ise n’ụbọchị gị.”—Aịsaịa 38:1-5.
N’ihi gịnị ka Chineke ji nnọọ tinye aka n’oge ahụ? Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, Chineke ekwewo nwoke ezi omume ahụ bụ́ Eze Devid nkwa, sị: “Ụlọ gị na alaeze gị ga-ekwesị ntụkwasị obi n’ihu gị ruo mgbe ebighị ebi: a ga-eme ka ocheeze gị bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.” Chineke kpughekwara na a ga-amụ Mezaịa ahụ n’eriri Devid. (2 Samuel 7:16; Abụ Ọma 89:20, 26-29; Aịsaịa 11:1) Mgbe Hezekaịa dara ọrịa, ọ mụtabeghị nwa. N’ihi ya, usoro ndị eze sitere n’eriri Devid na-achọ ịbịa ná njedebe. Chineke itinye aka n’ọnọdụ Hezekaịa mezuru otu nzube nke ichebe usoro ọmụmụ nke ga-eduga na Mezaịa ahụ.
Iji mezuo nzube ya, a kpaliri Jehova itinye aka n’ihi ndị ya ọtụtụ mgbe tupu oge Ndị Kraịst. Mozis kwuru banyere nnapụta a napụtara Izrel site n’ohu n’Ijipt, sị: “Ọ bụ n’ihi na Jehova hụrụ unu n’anya, na n’ihi na O debere iyi Ọ ṅụụrụ nna unu hà, ka Jehova weere aka dị ike mee ka unu pụta, O wee gbapụta unu n’ụlọ ndị ohu, n’aka Fero, bụ́ eze Ijipt.”—Deuterọnọmi 7:8.
Na narị afọ mbụ, ntinye aka Chineke mekwara ka e mezuo nzube ya. Dị ka ihe atụ, n’ụzọ Damaskọs, onye Juu aha ya bụ Sọl hụrụ ọhụụ n’ụzọ ọrụ ebube iji kwụsị ya ịkpagbu ndị na-eso ụzọ Kraịst. Ntọghata nke nwoke a, bụ́ onye ghọrọ Pọl onyeozi, keere òkè dị oké mkpa n’ịgbasa ozi ọma ahụ n’etiti mba dị iche iche.—Ọrụ 9:1-16; Ndị Rom 11:13.
Chineke Ọ̀ Na-etinye Aka Mgbe Nile?
Chineke ọ̀ na-etinye aka mgbe nile ka ọ̀ na-eme otú ahụ mgbe ụfọdụ? Akwụkwọ Nsọ gosiri n’ụzọ doro anya na Chineke adịtụghị etinye aka mgbe nile. Ọ bụ ezie na Chineke napụtara ndị Hibru atọ na-eto eto ka a ghara igbu ha n’ọkụ na-enwu ajọ onwunwu, napụtakwa Daniel onye amụma n’olulu ọdụm, o meghị ihe iji napụta ndị amụma ndị ọzọ n’ọnwụ. (2 Ihe E Mere 24:20, 21; Daniel 3:21-27; 6:16-22; Ndị Hibru 11:37) A napụtara Pita n’ụzọ ọrụ ebube site n’ụlọ mkpọrọ bụ́ ebe Herọd Agripa nke Mbụ tụkpuru ya. Otú ọ dị, otu eze a mere ka e gbuo Jems onyeozi, Chineke etinyekwaghị aka iji gbochie mpụ a. (Ọrụ 12:1-11) Ọ bụ ezie na Chineke nyere ndịozi ikike ịgwọ ndị ọrịa na ọbụna ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, o kweghị iwepụ “ogwu n’anụ ahụ́” nke tiri Pọl onyeozi ihe otiti, bụ́ nke pụrụ ịbụwo nsogbu ahụ́ ike.— 2 Ndị Kọrint 12:7-9; Ọrụ 9:32-41; 1 Ndị Kọrint 12:28.
Chineke etinyeghị aka iji gbochie mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ nke Eze Ukwu Nero nke Rom kpagburu ndị na-eso ụzọ Kraịst. E mekpọrọ Ndị Kraịst ọnụ, gbaa ha ọkụ ná ndụ, ma tụbara ha anụ ọhịa. Otú ọ dị, mmegide a atụghị Ndị Kraịst oge mbụ n’anya, o meghịkwa ma ọlị ka okwukwe ha nwere na Chineke dị adị daa mbà. E kwuwerị, Jizọs ebuwo ụzọ dọọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị na a ga-akpọga ha n’ụlọikpe nakwa na ha kwesịrị ịdị njikere ịta ahụhụ na ọbụna ịnwụ n’ihi okwukwe ha.—Matiu 10:17-22.
Dị nnọọ ka o mere n’oge gara aga, n’ezie, taa Chineke nwere ike ịnapụta ndị ohu ya n’ọnọdụ ndị dị ize ndụ, e kwesịghịkwa ịkatọ ndị chere na ha enwetawo nchebe ya. Otú ọ dị, o siri ike ikwu kpọmkwem ma Chineke o tinyere aka n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ ma ọ bụ na o tinyeghị. Ihe ahụ gbawara na Toulouse merụrụ ọtụtụ ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi ahụ́, ọtụtụ puku Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi nwụkwara n’ogige ndị Nazi na nke ọchịchị Kọmunist ma ọ bụ n’ọnọdụ ndị jọgburu onwe ha bụ́ ndị Chineke na-etinyeghị aka iji gbochie. Gịnị mere Chineke adịghị etinye aka mgbe nile n’ihi ndị nile nwere ihu ọma ya?—Daniel 3:17, 18.
“Mgbe na Ihe Ndapụta”
Mgbe e nwere ọdachi, ọ pụrụ imetụta onye ọ bụla, ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke abụghịkwa ihe na-ekpebi onye ọ ga-emetụta ma ọ bụ onye ọ na-agaghị emetụta. Mgbe ihe ahụ gbawara na Toulouse, bụ́ nke na-emetụtaghị Alain na Liliane, mmadụ 30 nwụrụ, ọtụtụ narị mmadụ merụkwara ahụ́, ọ bụ ezie na ọ bụghị n’ihi ihe ha metara. N’ụzọ karịrị nke ahụ, ọtụtụ iri puku mmadụ na-anwụ n’ihi mpụ, n’ihi ịkwọ ụgbọala ara ara, ma ọ bụ agha, ha apụghịkwa ịta Chineke ụta n’ihi ihe ndị dabaara ha. Bible na-echetara anyị na “mgbe na ihe ndapụta na-adabara” onye ọ bụla.—Eklisiastis 9:11.
Tụkwasị na nke ahụ, ụmụ mmadụ na-arịa ọrịa, na-aka nká, ma na-anwụ anwụ. Ọbụna ụfọdụ ndị cheworo na Chineke chebere ndụ ha n’ụzọ ọrụ ebube ma ọ bụ na-ekwu na ọ bụ ya mere ha ji gbakee n’ọrịa ha n’ụzọ ha na-atụghị anya ya na-emesị chee ọnwụ ihu. Mwepụ nke ọrịa na ọnwụ na ‘nhicha nke anya mmiri nile’ n’anya ụmụ mmadụ ka ga-abụ n’ọdịnihu.—Mkpughe 21:1-4.
Ka nke ahụ wee mee, a chọrọ ihe ga-ezu ebe nile ma sie ike karịa itinye aka n’oge ụfọdụ. Bible na-ekwu banyere otu ihe omume nke a kpọrọ “oké ụbọchị Jehova.” (Zefanaịa 1:14) N’oge a Chineke ga-eme ihe ga-ezu ebe nile, ọ ga-ewepụ ajọ omume nile. A ga-enye ihe a kpọrọ mmadụ ohere ịdị ndụ ebighị ebi n’ọnọdụ zuru okè, bụ́ mgbe ‘a na-agaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi.’ (Aịsaịa 65:17) Ọbụna a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ, si otú ahụ na-akwụsị ihe bụ́ n’ezie ọdachi kasịnụ nke dakwasịtụworo ụmụ mmadụ. (Jọn 5:28, 29) Mgbe ahụ, n’ihi ịhụnanya ya na ịdị mma ya nke na-enweghị ọgwụgwụ, Chineke ga-agwọta nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ kpam kpam.
Otú Chineke Si Etinye Aka Taa
Otú ọ dị, nke a apụtaghị na nanị ihe Chineke na-eme ugbu a bụ ịnọ na-ekiri ka ihe e kere eke na-ata ikikere ezé, n’egosighị mmetụta ọ bụla. Taa, Chineke na-enye mmadụ nile, n’agbanyeghị agbụrụ na ọnọdụ ha ná ndụ, ohere nke ịbịa mara ya na ịbịa soro ya nwee mmekọrịta chiri anya. (1 Timoti 2:3, 4) Jizọs ji okwu ndị a kọwaa otú O si eme nke a: “Mmadụ ọ bụla apụghị ịbịakwute m ọ gwụla ma Nna m, bụ́ onye zitere m, ọ̀ dọtara ya.” (Jọn 6:44) Chineke ji ozi Alaeze ahụ nke ndị ohu ya na-ekwusa n’ụwa nile na-adọtara onwe ya ndị nwere obi eziokwu.
Tụkwasị na nke ahụ, Chineke na-eme ihe kpọmkwem ná ndụ nke ndị dị njikere ịnakwere nduzi ya. Site ná mmụọ nsọ ya, Chineke ‘na-emeghepụ obi ha’ ịghọta uche ya na ime ihe ọ na-achọ. (Ọrụ 16:14) Ee, site n’inye anyị ohere nke ịbịa mara ya, Okwu ya, na nzube ya, Chineke na-enye ihe àmà nke mmasị ịhụnanya o nwere n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.—Jọn 17:3.
N’ikpeazụ, Chineke na-enyere ndị ohu ya aka taa, ọ bụghị site n’ịnapụta ha n’ụzọ ọrụ ebube, kama site n’inye ha mmụọ nsọ ya na “ike karịrị ike nkịtị” iji nagide ọnọdụ ọ bụla ha pụrụ iche ihu. (2 Ndị Kọrint 4:7) Pọl onyeozi dere, sị: “Maka ihe nile enwere m ume site n’onye ahụ [Jehova Chineke] nke na-enye m ike.”—Ndị Filipaị 4:13.
N’ihi ya, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-ekele Chineke kwa ụbọchị maka ndụ na olileanya o mere ka anyị nwee bụ́ nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa nke nhụjuanya ọ bụla na-agaghị adị na ya. “M̀ ga-esi aṅaa nyeghachi Jehova mmeso ọma Ya nile O mesoworo m?” ka ọbụ abụ ahụ jụrụ. “Iko nke nzọpụta nile ka m ga-ebuli, ọ bụkwa aha Jehova ka m ga-akpọku.” (Abụ Ọma 116:12, 13) Ịdị na-agụ magazin a mgbe nile ga-enyere gị aka ịghọta ihe Chineke meworo, ihe ọ nọ na-eme, na ihe ọ ka ga-eme bụ́ ndị pụrụ iwetara gị obi ụtọ ugbu a na olileanya e ji n’aka maka ọdịnihu.—1 Timoti 4:8.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
“A gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi.”—Aịsaịa 65:17
[Foto ndị dị na peeji nke 5]
N’oge Bible, Jehova egbochighị nkume a tụrụ Zekaraịa . . .
o gbochighịkwa ogbugbu Herọd gburu ndị aka ha dị ọcha
[Foto dị na peeji nke 7]
Oge eruwela mgbe nhụjuanya na-agaghị adịkwa ọzọ; ọbụna ndị nwụrụ anwụ ga-adịghachi ndụ