Ịrịgo Obodo The Bottom nke Saba
Ọ DỊ mgbe obodo ndị Netherlands bụ́ agwaetiti Saba bụ ebe mgbaba nke ndị ohi oké osimiri bụ́ ndị na-eji ụgbọ mmiri agagharị n’Oké Osimiri Caribbean, na-achọ ihe ha ga-akwakọrọ. Taa, ihe dị ka otu puku mmadụ na narị isii bi n’obere agwaetiti a nke dị ihe dị ka narị kilomita abụọ na iri anọ site n’ebe ọwụwa anyanwụ Puerto Rico, mmadụ ise n’ime ndị a bikwa na ya bụ Ndịàmà Jehova. Otú ọ dị, ndị ozi a egwu na-adịghị atụ na-achọ ihe dị oké ọnụ ahịa karịa ihe nkwakọrọ. Ha ji ịdị uchu na-achọ ndị “nwere ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị ebi.”—Ọrụ 13:48.
Ozi ọma nke Alaeze Chineke rutere agwaetiti a nke mbụ ya na June 22, 1952, mgbe obere ụgbọ mmiri dị mita 18 n’ogologo bụ́ Sibia nke Ndịàmà Jehova na-akwọ kwụsịrị n’ụsọ oké osimiri na Saba. (Matiu 24:14) Ndị ozi ala ọzọ bụ́ Gust Maki na Stanley Carter rịgoro The Ladder, bụ́ ụzọ nke nwere narị steepụ okwute ise iji ruo The Bottom, bụ́ isi obodo Saba.a Ruo ọtụtụ narị afọ, ụzọ a dị warara bụ nanị ụzọ a pụrụ isi jekwuru ndị bi n’agwaetiti a.
Akụkọ mbụ Ndịàmà Jehova bipụtara banyere ọrụ ịgba àmà Ndị Kraịst na Saba pụtara na 1966 Yearbook of Jehovah’s Witnesses. Dị ka akụkọ ahụ si kwuo, e nwere nanị otu Onyeàmà na-eje ozi n’agwaetiti ahụ. Ka e mesịrị, otu ezinụlọ si Canada jiri afọ ole na ole kwusaa ozi ọma n’ebe ahụ. N’oge na-adịbeghị anya, Russel na Kathy, bụ́ di na nwunye larala ezumike nká na United States, gara Saba ma kere òkè n’ọrụ nkwusa n’ebe ahụ. Gụọ akụkọ ha.
Ileta Saba
Mụ na nwunye m ji ụgbọelu rute ebe a dị ka ndị ọbịa Ronald, bụ́ onye nanị ya bụ Onyeàmà nọ n’agwaetiti a n’ihe ka ukwuu n’afọ ndị 1990. Onye anyị na-abịa ileta nọ n’ọdụ ụgbọelu na-eche anyị. Obere igbe akwụkwọ nri anyị wetaara ya dị ka onyinye mere ya obi ụtọ n’ihi na ọ dịghị onye nọ n’agwaetiti a nke na-ere ihe ọ na-akọpụta n’ubi ya ere. Anyị bara n’otu ụdị ụgbọala pikọpụ ma jiri nwayọọ nwayọọ na-agba n’ụzọ gbara ngọrịngọ nke dị n’akụkụ Ugwu Scenery iji ruo ọnụ ọnụ ugwu a na-agbọpụ ọkụ nke na-adịghịzi akpa ike.
Anyị kwụsịrị n’obodo Hell’s Gate, Ronald gakwara lee ma akwụkwọ ịkpọ òkù maka okwu ihu ọha Sunday ọ̀ ka dịkwa na bọọdụ ịma ọkwa ọha na eze. Obi dị anyị ụtọ ịhụ na ọ ka dị ya. Ọ mabataghachiri n’ime ụgbọala, anyị maliteghachikwara njem anyị ịga n’obodo kasị ukwuu n’agwaetiti a, bụ́ Windwardside [Ebe Ikuku Na-eche Ihu]. Dị ka aha ya na-egosi, ọmarịcha obodo a dị n’ebe ikuku na-eche ihu n’agwaetiti a ma jiri narị mita anọ dị elu karịa oké osimiri. Ka anyị nyabatara n’ihu ụlọ Ron, anyị hụrụ ọmarịcha ihe odide dị n’ihu ụlọ ya nke na-egosi na ebe ahụ bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova.
Ka anyị na-eri nri ehihie, ewelitere m ajụjụ kpaliri anyị ileta ebe a, bụ́, “Olee otú i si ghọọ onye nkwusa Alaeze na Saba?”
Ron kwuru, sị: “Mgbe e wusiri alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na Puerto Rico na 1993, mụ na nwunye m nwere mmasị ịnọgide n’ozi mba ọzọ. Tupu mgbe ahụ, anyị na di na nwunye ọzọ bụ́ ndị ọsụ ụzọ letara Saba ma nụ na otu puku mmadụ na narị anọ bi na ya ma na e nweghị Onyeàmà ọ bụla n’ebe ahụ. N’ihi ya, anyị gwara Kọmitii Alaka Puerto Rico ka anyị kwafeta ebe a.
“Otu ihe dugara n’ibe ya, e mesịkwara kwe ka anyị kwafeta. Ọ bụ ihe dị mwute na ka afọ abụọ gasịrị, nwunye m dara oké ọrịa, anyị laghachikwara California. Mgbe ọ nwụsịrị, alọghachiri m Saba. Otu ihe banyere m bụ na anaghị m achọ ịmalite ihe m na-agaghị emechali.”
Àmà Ụlọ n’Ụlọ na Saba
E jikwa palọ nke ụlọ Ron nke nọworo otu narị afọ mere Ụlọ Nzukọ Alaeze.b Ka anyị na-eri nri ụtụtụ ma na-akwado ịga ozi, mmiri zoro ma maa ebe isi nri dị n’èzí. Ka anyị risịrị nri ụtụtụ, anyị gawara obodo The Bottom ịgba àmà ụlọ n’ụlọ. N’ụlọ nke ọ bụla, Ron na-akpọ onye nwe ụlọ aha ka ọ na-ekele ya. Nkwurịta okwu anyị lekwasịrị anya n’ihe a kọrọ n’akụkọ n’oge na-adịbeghị anya n’ebe a. Ihe ka ọtụtụ maara Ron, marakwa banyere ozi ya, ọtụtụ na-ejikwa obi ụtọ anara akwụkwọ ndị e ji amụ Bible.
Ọ ga-esiri gị ike idekọ ihe banyere ndị gosiri mmasị n’ozi Alaeze ahụ ma ọ bụrụ na ị maghị ndị obodo a nke ọma. N’ihi gịnị? Ron kwuru na ọ bụ n’ihi na “iwu obodo ahụ kwuru na ụlọ nile ga-ebu otu ụdị ágbá.” N’ikwukwanụ eziokwu, elegharịrị m anya ma hụ na ụlọ nile dị na Saba na-achacha ọcha ma nwee gbamgbam uhie.
Mgbe anyị na onye nwe ụlọ kwurịtasịrị okwu site na Bible, anyị na-akpọ ya òkù ịbịa gere okwu ihu ọha dabeere na Bible a ga-ekwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na Sunday. Mgbe Ron na-emeghị njem, ọ na-ekwu okwu ihu ọha kwa izu. Ugbu a, a na-eduzi ọmụmụ Bible 17 na Saba. Iri mmadụ abụọ bịara Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst n’afọ 2004. Ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ ahụ pụrụ iyi ka ò pere mpe, ọ bụ 1 pasent nke ndị nile bi na Saba!
N’ezie, Ndịàmà Jehova emeela ihe nile ha pụrụ ime iji jiri ozi nzọpụta nke Chineke jekwuru ọtụtụ mmadụ dị ka o kwere mee. Ma ọ̀ bụ n’obere agwaetiti dị ka Saba ma ọ̀ bụ n’ebe buru nnọọ ibu dị ka kọntinent, Ndịàmà Jehova ji ikwesị ntụkwasị obi na-arụ ọrụ e nyere ha nke ‘ime ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.’—Matiu 28:19.
Ọ na-ewute anyị na nleta anyị abịala ná njedebe. Ka anyị bara n’ụgbọelu anyị ji ala, anyị feere ndị mmadụ aka ma sị ha nọrọ nke ọma. Ọ dịghị mgbe anyị ga-echefu nleta anyị letara Saba na oge anyị ji rịgoo obodo The Bottom!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a O yiri ka ndị ohi oké osimiri hà kpọrọ ya The Bottom [nke pụtara “Ala Ala”] n’ihi na ha chere na ọ bụ ala ala nke oghere dị n’etiti ugwu na-agbọpụ ọkụ.
b Na September 28, 2003, ndị ọrụ afọ ofufo si Florida, U.S.A., gara Saba ma wuzigharịa otu ụlọ dịdebere nke Ron, bụ́zi nke e ji eme ihe dị ka Ụlọ Nzukọ Alaeze.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 10]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
PUERTO RICO
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 10]
N’azụ: www.sabatourism.com