Ikwusa Ozi Ọma n’Obodo Haiti nke Mara Mma
HAITI na Dominican Republic nọcha n’ógbè Hispaniola na-ekpo ọkụ nke mmiri gbara gburugburu, bụ́ ógbè nwere ugwu ndị kasị elu n’Oké Osimiri Caribbean. Ọtụtụ ugwu ndị dị ebe ahụ dị nnọọ ihe karịrị puku mita abụọ na narị anọ n’elu. “N’oge oyi,” mmiri kpụkọrọ akpụkọ nwere ike ikpuchi elu obere ọdọ mmiri ndị dị n’elu ugwu.
Oké ọhịa kpuchiri ugwu na ndagwurugwu ndị dị n’ebe ndịda Haiti. N’ebe ndị ọzọ, ọtụtụ ugwu na-eghe oghe n’ihi na e gbutusiela osisi ndị dị na ha. Ma ị̀ gara n’ebe ugwu ma ọ bụ n’ebe ndịda, ị ga-ahụ na Haiti mara nnọọ mma. Ọ bụrụ na ị gbaa n’ụzọ ụfọdụ dị warara ma gbaa ngọrịngọ, ị ga-ahụ ịma mma nke ala na mmiri ya ruo ebe dị anya. Ị ga-ahụ ụdị okooko osisi dị iche iche n’ebe nile.
Ihe ka ọtụtụ na nde mmadụ asatọ na narị puku atọ bi n’ala a mara mma bụ ndị sitere n’agbụrụ ndị Africa, ha bikwa n’ime obodo. Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ n’ime ha dara nnọọ ogbenye, ha dị nnọọ obiọma ma na-ele ọbịa. Kemgbe ihe dị ka afọ 60, Ndịàmà Jehova ji obi ụtọ na-ekwusara ha ozi ọma nke Alaeze Chineke, ha na-anabatakwa ha nke ọma.—Matiu 24:14.
Ikwusa Ozi Ọma n’Otu Ime Obodo
Ahụmahụ otu onye ozi ala ọzọ nwere mgbe mbụ o letara otu ime obodo bụ ụdị ahụmahụ a na-enwekarị ná mba a. O dere, sị:
“Otu ụbọchị na March 2003, anyị gara ozi ọma na Casale, bụ́ obere obodo nke ga-ewe ihe dị ka ọkara awa site na Cabaret, bụ́ ebe anyị bi na-eje ozi ala ọzọ anyị ugbu a, bụ́ nke dị ihe dị ka kilomita 30 site n’isi obodo Haiti, bụ́ Port-au-Prince. Mgbe ikpeazụ Ndịàmà Jehova kwusara ozi ọma na Casale bụ na 1999, n’ihi ya, obi dị anyị nnọọ ụtọ ka anyị malitere njem anyị n’elekere asaa nke ụtụtụ. Anyị mmadụ 22—bụ́ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile nọ n’ọgbakọ anyị—bajuru n’ụgbọala jip abụọ. Anyị nile ji obi ụtọ na-ekwurịta okwu ma na-achị ọchị ka ụgbọala anyị kpọdara ugwu ndị uzuzu juru na ha ma rute n’otu ndagwurugwu nwere ọtụtụ nnukwu osisi. Otu osimiri si na ndagwurugwu ahụ na-asọfe, osimiri ahụ sikwa n’etiti obodo Casale gafee.
“Akụkọ obodo a dị jụụ malitere ná mmalite afọ ndị 1800 mgbe ụfọdụ ndị agha bụ́ ndị Poland bụ́ ndị bịara inyere ndị bụ́bu ndị ohu na Haiti aka inwere onwe ha kpọọrọ ndị nwunye ha bụ́ ndị Haiti bịa biri na ndagwurugwu a na-eme nri. Nke a mere ka e nwee ụdị ndị dị iche iche n’ebe a. Ọ na-enye obi ụtọ ịhụ ndị obodo ahụ bụ́ ndị nwere ụcha akpụkpọ ahụ́ dị iche iche na anya nwere ụcha dị iche iche.
“Onye mbụ anyị zutere n’ụlọ mbụ anyị kụrụ aka na ya enweghị mmasị. Ka anyị na-apụ, otu nwoke bịakwutere anyị. Ọ chọrọ ịma ma ànyị kweere na Jizọs dị iche na Chineke. Anyị gwara ya ka o weta Bible ya, ihe ndị anyị na ya kwurịtara site n’Akwụkwọ Nsọ mere ka o doo ya anya na Jizọs bụ Ọkpara Chineke nakwa na Jehova bụ ‘nanị ezi Chineke ahụ.’ (Jọn 17:3) Ọtụtụ ndị nyere anyị oche ka anyị nwee ike izi ha ozi ọma. Ụfọdụ jụrụ anyị, sị, ‘Olee mgbe ọzọ unu ga-abịa ịmụrụ anyị Bible?’
“Mgbe elekere iri na abụọ nke ehihie kụrụ, anyị chọtara otu ebe mara mma nke nwere ndò ma jikere iri nri ehihie. Ụmụnna nwanyị abụọ siiri anyị otu nnukwu ite azụ. Ọ tọrọ nnọọ ụtọ! Ka anyị ji nwayọọ na-eri nri ma na-akparịta ụka, anyị nọkwa na-ezi ndị na-agafe agafe ozi ọma. Mgbe anyị risịrị, anyị gafere osimiri ahụ ma banye n’akụkụ nke ọzọ nke obodo ahụ. Ọ tọrọ anyị ụtọ izi ndị a nwere obiọma ozi ọma ka ha nọ n’okpuru osisi ndị dịdebere obere ụlọ ha. O mere anyị nnọọ obi ụtọ ịnụ olu ụmụaka na-egwu egwu, ndị inyom na-asụ ákwà n’osimiri ahụ, na ndị agadi nwanyị na-egwe kọfị!
“O teghị aka, elekere anọ nke mgbede akụọ, anyị ji obi ụtọ banyeghachi n’ụgbọala anyị iji laghachi Cabaret. Njem mbụ ahụ mụ na di m mere gaa Casale, nke ndị nwere obiọma bi na ya, tọrọ anyị nnọọ ụtọ.”
Kemgbe Onyeàmà mbụ bụ́ onye ozi ala ọzọ bịara na Haiti n’afọ 1945, ọnụ ọgụgụ nke ndị nkwusa Alaeze nọ n’ala a anọgidewo na-amụba, nke mere na e nwere puku mmadụ iri na anọ na-ekwusa ozi ọma ebe a ugbu a ma na-eduziri ihe karịrị iri puku mmadụ abụọ na abụọ ọmụmụ Bible ebe obibi. Ndị nkwusa ahụ emetụtawo ndụ nke mmadụ puku iri ise na itoolu, narị atọ na iri asaa na abụọ bụ́ ndị bịara Ncheta ọnwụ Jizọs na March 2005 ma mee ka ọhaneze nwee ike ịnụ ozi ọma banyere Alaeze Chineke. Ka anyị tụlee ọtụtụ ụzọ ọrụ Ndịàmà Jehova siworo metụta ndụ ndị mmadụ.
Ozi Ọma Ndị Dị n’Ọmarịcha Ihe Ndị E Sere Ese
Ihe ka ọtụtụ ná ndị Haiti na-enwe mmasị n’ihe ndị nwere àgwà na-egbuke egbuke. Ị ga-ahụ nke a n’ákwà ha, n’ágbá ndị ha tere n’ụlọ ha, n’okooko osisi dị iche iche ha na-akụ, na n’ihe osise ha. N’okporo ámá nile dị na Port-au-Prince, a na-ekowe ákwà ndị e sere ihe na ha n’ụzọ pụrụ iche ndị obodo ahụ si ese ihe bụ́ nke a na-akpọ L’Art Haitien. Ndị mmadụ na-esi n’ọtụtụ ebe n’ụwa abịa azụ ha.
Ọ bụghị nanị n’ákwà ndị e sere ihe na ha ka a na-ahụ àgwà ndị na-egbuke egbuke. Ụgbọala ndị na-ebu ndị njem a na-akpọ tap-tap, bụ́ ndị e sere ọtụtụ ihe mara mma na ha, na-agbagharị n’ebe nile na Port-au-Prince. A na-ahụkarị ihe osise ndị dabeere na Bible na ha.
Ka ị na-aga n’okporo ụzọ, i nwere ike ịhụ ihe osise ị mabu ama n’otu ntabi anya—dị ka ihe osise nke Adam na Iv ebe ha nọ n’ogige Iden. Ee, o nwere ike ịbụ na e sere ya n’azụ tap-tap gbafere gị n’oge na-adịbeghị anya. A na-ahụkarị ebe e dere ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ nwere aha ahụ bụ́ Jehova n’ụgbọala ndị a ma ọ bụ ebe a gbakwụnyere ha n’aha ụlọ ahịa dị iche iche.
Ikwusa Ozi Ọma n’Ụlọ Akwụkwọ
Ndịàmà na-eto eto e nwere na Haiti na-enwe ezigbo ohere iji nyere ụmụ akwụkwọ ibe ha aka ịmụtakwu ihe banyere Bible. Ihe na-esonụ nke otu nwata nwanyị bụ́ Onyeàmà dị afọ 17 kọrọ bụ ihe atụ nke otú ha si na-eme ya.
“Otu nwa klas m bịakwutere m otu ụbọchị ma jụọ m ihe bụ́ ‘ịkwa iko.’ Echere m na ọ chọrọ ka mụ na ya kpawa, n’ihi ya, atụpụụrụghị m ya ọnụ. Ma, mgbe ọ jụrụ nwa klas anyị ọzọ bụ́ nwoke otu ajụjụ ahụ, ndị klas anyị nile bịara nwee mmasị ịmata azịza ya. N’ihi ya, n’izu na-eso ya, mgbe m gụworo ihe ụfọdụ banyere isiokwu ahụ, agwara m klas anyị okwu n’isiokwu ahụ, kọwaara ha ihe mere Ndịàmà Jehova ji agba mbọ ịdị ọcha n’omume, n’ofufe ha, nakwa n’anụ ahụ́ ha.
“Ndị klas anyị jụrụ m ọtụtụ ajụjụ, ha nabatakwara azịza ndị m nyere ha site na Bible. Ọbụna onyeisi ụlọ akwụkwọ anyị, bụ́ onye obi na-akachaghị na mbụ ikwe ka m kwuo okwu ahụ, jụrụ ọtụtụ ajụjụ ma mee ndokwa ka m gwakwa klas ndị ọzọ okwu. Egosiri m ha akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè,a ọ masịkwara ọtụtụ n’ime ha. N’echi ya, ụmụ akwụkwọ ibe m naara m akwụkwọ 45. Ọtụtụ gụpụrụ nke ha n’egbughị oge, ụfọdụ n’ime ha na Ndịàmà bi ha nso na-amụkwa Bible ugbu a. Otu n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ bi anyị nso na-abịa ọmụmụ ihe nile ugbu a.”
Iji Asụsụ Creole Ezi Ozi Ọma
Ndị bi n’obodo a bụ ndị gwara ọgwa ma na-adọrọ mmasị, otú ahụkwa ka ọ dị asụsụ Haitian Creole, nke bụ́ ngwakọta nke asụsụ French na asụsụ nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa. Ọ bụ ya bụ asụsụ ala nna ndị Haiti, asụsụ na-eru ha n’obi. Ọ bụ asụsụ a bụ asụsụ bụ́ isi Ndịàmà Jehova ji ezi ozi ọma, a na-emekwa ndokwa ịhụ na a ga na-ebipụtakwu akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’asụsụ Haitian Creole.
N’afọ 1987, a sụgharịrị broshuọ bụ́ Idi Ndu n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi! gaa n’asụsụ Haitian Creole, e mesịakwa sụgharịa akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi nakwa broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Akwụkwọ ndị a enyerela ndị a malitere ịmụrụ Bible ọhụrụ bụ́ ndị chọrọ ịmata ihe ndị bụ́ isi dị n’Okwu Chineke aka nke ukwuu. Malite na September 1, 2002, e bipụtawakwara Ụlọ Nche na Haitian Creole. A ka na-eji akwụkwọ ndị dị n’asụsụ French eme ihe, ma ọtụtụ ndị na-aka enwe mmasị ịgụ akwụkwọ ndị e dere n’asụsụ nke ha.
Ikwusara Ndị Nọ n’Ụlọ Mkpọrọ Ozi Ọma
N’oge na-adịbeghị anya, Ndịàmà Jehova malitere ịga n’ụlọ mkpọrọ gọọmenti iji zie ndị nwoke na ndị nwanyị e ji eji n’ebe ndị ahụ ozi ọma. Ndịàmà na-aga ebe ahụ na-enwe obi ụtọ ikwusara ndị nọ n’ọnọdụ ọjọọ a ozi nkasi obi. Otu Onye Kraịst na-akọ, sị:
“Oge mbụ anyị gara ozi ọma n’otu ụlọ mkpọrọ, a kpọbatara ndị mkpọrọ n’otu nnukwu ọnụ ụlọ ka anyị na ha nọrọ ebe ahụ kparịa. Anyị amaghị ihe ha ga-eche banyere ozi ọma anyị. Mgbe anyị gwara ha na anyị bịara inyere ha aka ịghọta Bible, mmadụ 50 nọ ebe ahụ nabatara anyị nke ọma. Anyị gosiri ha broshuọ ndị bụ́ Apply Yourself to Reading na Idi Ndu n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi! n’asụsụ Creole ma malitere mmadụ 26 n’ime ha ọmụmụ Bible. Iri n’ime ndị anyị na ha kwurịtara okwu amaghị akwụkwọ, ma obi tọrọ ha ụtọ mgbe anyị gosiri ha otú e nwere ike isi jiri ihe osise ndị dị na broshuọ ndị ahụ mata ihe ndị e dere na ha.”
Mgbe Ndịàmà ahụ gaghachiri, otu nwoke kwuru, sị: “Agụchaala m broshuọ ahụ gụgharịa ya. Ana m eche echiche mgbe nile banyere ihe ndị o kwuru, anọkwa m na-eche unu kemgbe.” Otu nwoke e ji eji maka iji égbè ezu ohi kwuru na ya chọrọ ịgbanwe, ọ rịọkwara ka e ziga mmadụ ka ọ ga mụọrọ nwunye ya Bible. Otu nwoke mụrụ ụmụ abụọ nke nọ mkpọrọ rịọkwara otu arịrịọ ahụ ka nwunye ya nwee ike ịhụ ọdịiche dị n’etiti ezi nkwenkwe na nkwenkwe ụgha. Otu onye ụkọchukwu Protestant bụ́ onye a mara ikpe maka igwunara ndị chọọchị ya nnukwu ego kwuru na ya achọtala eziokwu, nakwa na mgbe ya nọsịrị mkpọrọ ya, ya ga-enyere ndị chọọchị ya aka ịghọ Ndịàmà Jehova.
Onye mkpọrọ ọzọ nke na-enweghị broshuọ Na-achọ nke ya n’asụsụ Creole depụtaghachiri broshuọ ahụ n’akwụkwọ ọzọ site n’ilere anya na nke onye mkpọrọ ya na ya nọ n’otu ọnụ ụlọ mkpọrọ ma buru ihe nile dị na ya n’isi. Otu onye mkpọrọ bụ́ nwanyị malitere ịkọrọ mmadụ itoolu ha na ya nọ n’otu ọnụ ụlọ mkpọrọ ihe ndị ọ na-amụta, ọbụna mụwara ha ihe. Otu nwoke bụ́ onye mkpọrọ mụchara broshuọ ahụ, mgbe ọ gafekwara n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, ọ malitere ikwusara ndị mkpọrọ ndị ọzọ ozi ọma. N’oge na-adịghị anya, ọ malitere iduziri mmadụ anọ n’ime ha ọmụmụ Bible.
Merconyb na-amụbu Bible ma nwee ndị ikwu bụ́ Ndịàmà Jehova. Ọ gbara ndị mkpọrọ ndị ọzọ ume ịgụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ndị ndị ikwu ya wetaara ya. O kwuru, sị: “Ọ na-abụ m nye ndị mkpọrọ akwụkwọ, ha akpọwa m Onyeàmà Jehova. M na-agwa ha na ọ dịghị Onyeàmà m bụ, ebe m ma ihe ọ pụtara ịbụ Onyeàmà. Achọkwaghị m iji okwu a egwuri egwu ugbu a, achọrọ m ịmụ ihe ma mee baptizim. Mgbe m na-eto eto, a sị na m gbasoro ụmụnne m ndị tọrọ m, agaraghị m anọ n’ụlọ mkpọrọ ebe a ugbu a.”
Otu n’ime ndị mkpọrọ natara Mercony akwụkwọ gwara Onyeàmà letara ya, sị: “Tupu unu abịa ebe a na Monday gara aga, ike ụwa gwụrụ m, m nọkwa na-eme atụmatụ igbu onwe m. Ma mgbe m gụsịrị magazin ndị ahụ, arịọrọ m Chineke ka ọ gbaghara m ihe ọjọọ ndị m merela ma zitere m onye ga-ezi m ezi ụzọ ahụ. Obi tọrọ m nnọọ ụtọ mgbe unu bịara n’echi ya ma kwuo na unu chọrọ ịmụwara ndị mkpọrọ Bible! Aga m achọ ka ị kụziere m otú e si efe Jehova.”
Teta! Emee Ka Ọtụtụ Ndị Nụ Ozi Ọma
Teta! nke November 8, 2000, kwuru banyere ọrụ nọọsụ. Otu nwanyị nwetara Teta! ahụ puku abụọ ma kee ya ndị nọọsụ bịara nnọkọ na Port-au-Prince. E nyere ọtụtụ ndị uwe ojii na Port-au-Prince Teta! nke July 8, 2002, bụ́ nke kwuru banyere ndị uwe ojii na ọrụ ha. Magazin a tọrọ ha ụtọ, ruokwa taa, ụfọdụ ndị ka na-akwụsị Ndịàmà n’okporo ụzọ ma gwa ha ka ha nyekwuo ha magazin ahụ.
Na nso nso a, onye ọrụ Òtù Ahụ́ Ike Ụwa mere ndokwa maka otú a ga-esi kụziere ndị mmadụ banyere ọrịa AIDS. A kpọrọ ya òkù ka ọ bịa n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, bụ́ ebe a nọ gosi ya ihe ndị e kwurula na Teta! banyere ọrịa ahụ. Obi tọrọ ya nnọọ ụtọ ịhụ isiokwu ndị ji Bible kwuo ụzọ kasị mma isi gbochie ọrịa AIDS na otú e nwere ike isi nyere ndị butere ọrịa ahụ aka idi ya. O kwuru na ọ bụ Teta! bụ akwụkwọ kasị akọwa ihe banyere ọrịa ahụ.
Ee, n’ọtụtụ ụzọ, Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’obodo Haiti nke mara mma, dị nnọọ ka ha na-eme na narị ala abụọ na iri atọ na anọ ndị ọzọ gburugburu ụwa. Ọtụtụ ndị na-egosi mmasị n’ozi a na-enye olileanya, a na-enyekwara ha aka ịghara ilekwasị anya ná nsogbu ndị a na-enwe ná ndụ kama ka ha lepụ anya n’ihu maka ụwa ọhụrụ, bụ́ ebe ndị nile na-efe nanị ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, ga-adị ndụ ebighị ebi ma nwee ihe nile n’ụba.—Mkpughe 21:4.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ ndị e depụtara aha ha n’isiokwu a.
b A gbanwere aha ya agbanwe.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 9]
N’azụ: ©Adalberto Rios Szalay/photodisc/age fotostock