Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w07 6/1 p. 3
  • Ihe Ọjọọ—Ọ̀ Gafewala Ókè?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ọjọọ—Ọ̀ Gafewala Ókè?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ọma Megide Ihe Ọjọọ—Agha Nọworo Ogologo oge
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ọ̀ Dị Mgbe Ihe Ọma Ga-emeri Ihe Ọjọọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Gịnị Na-eme Ka Mmadụ Bụrụ Ezigbo Mmadụ ma Ọ Bụ Ajọ Mmadụ?
    Teta!—2010
  • Otú Ezi Ihe Ga-esi Merie Ihe Ọjọọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
w07 6/1 p. 3

Ihe Ọjọọ—Ọ̀ Gafewala Ókè?

Otu obere nwa nwoke na-egwuri egwu atụtụrụ otu ihe ọ hụrụ n’ala n’amaghị na ọ bụ ogbunigwe. Ogbunigwe ahụ gbawara ma gbakpọọ ya anya, gbajipụkwa ya aka. Otu nne atụnye nwa ọ mụrụ ọhụrụ n’ihe e ji ekpofu ihe nke dị n’akụkụ ụzọ. Otu onye a chụrụ n’ọrụ alaghachi n’ụlọ ọrụ ya ma gbagbuo ndị nile ọ hụrụ ebe ahụ, gbagbuokwa onwe ya. Otu nwa amaala a na-akwanyere ùgwù edinaa obere ụmụaka na-amabeghị nke a na-akọ.

Ọ DỊ mwute ikwu na a na-anụ ụdị akụkọ ọjọọ a ebe nile taa. Nke ka njọ bụ na akụkọ banyere ebe e gbuchapụrụ otu agbụrụ, ebe a sụrụ ndị mmadụ akwụ nakwa ndị na-eyi ọha egwu, na-ekpuchi ụdị akụkọ ime mpụ ndị a dị n’elu. Na 1995, otu onye na-ede akụkọ dere, sị: “Narị afọ nke 20 a bụ nnọọ narị afọ Setan n’ihi na ihe ndị a kasị njọ n’oge a. Ọ dịtụbeghị mgbe ụmụ mmadụ kpọruru ibe ha asị otú ha kpọrọ ha n’oge a ruo n’ókè nke igbu ọtụtụ nde mmadụ n’ihi agbụrụ ha si, okpukpe ha, ma ọ bụkwanụ ọnọdụ ha ná ndụ.”

Ka a na-ekwu ndị nke mere eme, ụmụ mmadụ nọ na-emetọ ikuku, emebi ala, agwụbilata akụ̀ ndị dị n’ime ala, ma na-egbukpọ ụmụ anụmanụ dịgasị iche iche dị n’ụwa. Ụmụ mmadụ hà nwere ike ịkwụsị arụrụala a nile ma mee ka ụwa bụrụ ebe mmadụ ga-anọ ahụ́ eruo ya ala? Ka ịgbalị ime otú ahụ ọ̀ ga-adị ka mmadụ ịnwa iji nkata ekute mmiri? Otu prọfesọ bụ́ onye derela ọtụtụ ihe banyere ihe ọjọọ ndị na-emenụ kwuru, sị: “Ọ batala m nnọọ n’obi ịgbanwe ọtụtụ ihe ma mee ka ụwa ka mma. Ma ụwa enweghị mmekwata.” Ikekwe prọfesọ a kwuru ihe dị gị n’obi.

A pụrụ iji otú ụwa a debere ihu tụnyere ụgbọ mmiri na-ese n’oké osimiri na-amali n’ike n’ike ma na-aka njọ ka ụbọchị na-aga. Ọ bụ ezie na ọ dịghị onye ga-achọ iche ihu n’ebe ahụ ụgbọ ahụ na-aga, ma mgbalị nile a na-eme iji chigharịa ya ekweghị enwe isi. Nanị ihe ụgbọ ahụ na-eme bụ itinyekwu nnọọ isi n’ebe mmiri ahụ na-asọsikwu ike.

Ruo n’ókè ụfọdụ, a pụrụ ịsị na ọ bụ ezughị okè mmadụ kpatara ọnọdụ ụwa a na-akawanye njọ. (Ndị Rom 3:23) Ma, otú ihe ọjọọ na ịkpọ asị si karịa akarịa n’ụwa, ju ebe nile, ma jụ ịkwụsị mere ka o yie nnọọ ka ọ bụghị nanị ezughị okè mmadụ na-akpata ya. Ọ̀ ga-abụ na e nwere mmụọ a na-adịghị ahụ anya obi fere azụ nke ji ụmụ mmadụ na-arụ ọrụ? Ọ bụrụ na e nwere, gịnị ka ọ bụ, oleekwa otú anyị pụrụ isi chebe onwe anyị? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

© Heldur Netocny/Panos Pictures

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya