Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
È nwere olileanya na nwa nwụrụ n’afọ nne ya ga-ebilite n’ọnwụ?
O nwere ike isiri ndị ụdị ihe a na-emetụbeghị ike ịghọta otú obi na-adị nwaanyị ma ime pụọ ya ma ọ bụ nwa anwụọ ya n’afọ. Nke a na-agbawa ndị nne na nna ụfọdụ obi. O nwere otu nwaanyị ime pụrụ ugboro ise. Ka oge na-aga, o nwere obi ụtọ na ọ mụtara ụmụ nwoke abụọ ahụ́ gbasiri ike. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ka na-echeta ụmụ ya ise ahụ nwụrụ anwụ. Site n’oge ruo n’oge, ọ na-echeta afọ ole ha gaara adị ma a sị na ha nọ ndụ. Ndị Kraịst ụdị ihe a mere hà nwere olileanya na a ga-akpọlite ụmụ ndị ahụ n’ọnwụ?
Anyị amaghị azịza nke ajụjụ a. Baịbụl ekwughị ihe ọ bụla kpọmkwem ma à ga-akpọlite ụmụaka ndị nwụrụ n’afọ nne ha ma ọ bụ ndị nwụrụ mgbe ime pụrụ nne ha. Ma, Okwu Chineke kwuru ihe ndị metụtara ajụjụ a, bụ́ ndị ga-akasị anyị obi.
Ka anyị tụlee ajụjụ abụọ metụtara okwu a. Nke mbụ, n’anya Jehova, olee mgbe ndụ mmadụ na-amalite, ọ̀ bụ mgbe a tụụrụ ime ya ka ọ̀ bụ mgbe a mụrụ ya? Nke abụọ, olee otú Jehova si ele ụmụ e bu n’afọ anya, ọ̀ na-ele ha anya ka mmadụ ka ọ̀ na-ele ha anya ka naanị mkpụrụ ndụ ndị dị n’akpa nwa? Ihe ndị e kwuru na Baịbụl zara ajụjụ abụọ a nke ọma.
Iwu Mozis mere ka o doo anya na ọ bụghị mgbe a mụrụ mmadụ ka ndụ ya malitere, kama, ọ bụ tupu a mụọ ya. Gịnị ka Iwu ahụ kwuru? O kwuru na e nwere ike igbu onye gburu nwa e bu n’afọ. Ọ sịrị: “Ị ga-eme ka mkpụrụ obi laara mkpụrụ obi.”a (Ọpụ. 21:22, 23) Nke a na-egosi na nwa e bu n’afọ dị ndụ bụrụkwa mkpụrụ obi dị ndụ. Nghọta ọtụtụ nde Ndị Kraịst ghọtara nke a mere ha anaghị akwado isi ime, ha ma na ọ bụ mmehie dị oké njọ n’anya Chineke.
O doro anya na nwa e bu n’afọ dị ndụ, ma, olee otú Jehova si ele ndụ ya anya? Iwu ahụ anyị kwuru okwu ya na mbụ kwuru na a ga-egbu onye torola eto ma ọ bụrụ na o mere ka nwa e bu n’afọ nwụọ. Ya mere, o doro anya na ndụ nwa e bu n’afọ abụghị obere ihe n’anya Chineke. Ihe ọzọ bụ na ọtụtụ amaokwu ndị dị na Baịbụl na-egosi na nwa e bu n’afọ bụ mmadụ n’anya Jehova. Dị ka ihe atụ, Eze Devid ji ike mmụọ nsọ kwuo banyere Jehova, sị: “I kpuchiri m ekpuchi n’ime afọ nne m. . . . Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ, e dekwara akụkụ ahụ́ m niile n’akwụkwọ gị, bụ́ ụbọchị a kpụrụ ha.”—Ọma 139:13-16; Job 31:14, 15.
Jehova na-ahụ àgwà nwa e bu n’afọ, nwa ahụ nwekwara ike ịba ezigbo uru n’ọdịnihu. Mgbe nwunye Aịzik, bụ́ Ribeka, dị ime ụmụ ejima, Jehova buru amụma banyere ụmụ nwoke abụọ ahụ nọ n’afọ ya na-agbarịta mgba. Amụma ahụ o buru gosiri na ọ hụlarị àgwà ha, bụ́ nke ga-emetụta ọtụtụ mmadụ n’ọdịnihu.—Jen. 25:22, 23; Rom 9:10-13.
Onye ọzọ anyị ga-atụle banyere ya bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim. Oziọma Luk sịrị: “Ka Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya n’afọ maliri; Elizabet jupụtakwara na mmụọ nsọ.” (Luk 1:41) Mgbe ọgwọ ọrịa bụ́ Luk na-ede akụkọ ahụ, okwu Grik ọ kpọrọ “nwa” nwere ike ịpụta nwa e bụ n’afọ ma ọ bụ nwa a mụrụ ọhụrụ. Ọ bụ otu okwu ahụ ka ọ kpọrọ Jizọs mgbe a mụrụ ya wee nyiwe ya n’ụlọ anụ.—Luk 2:12, 16; 18:15.
N’ihe niile a e kwuru, Baịbụl ọ̀ na-egosi na e nwere ihe dị iche na nwa e bụ n’afọ na nke a mụrụla amụ? O yiri ka ọ naghị egosi nke a. Nke ahụ kwekọrọ n’ihe sayensị chọpụtarala n’oge a. Dị ka ihe atụ, ndị na-eme nnyocha achọpụtala na nwa nọ n’afọ na-ama ihe na-eme gburugburu ebe nne ya nọ, nke ahụ na-emekwa ka o megharịa ahụ́. Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na nwaanyị dị ime na nwa o bu n’afọ na-adị n’ezigbo mma.
Ọnwa ole nwa nọrọ n’afọ nne ya tupu a mụọ ya nwere ike ịdị iche n’ọnwa ole ụmụ ndị ọzọ nọrọ n’afọ nne ha. Tụlee ihe atụ a: Otu nwaanyị mụkworo nwa, nwa ahụ anwụọ ka ụbọchị ole na ole gara. Nwa nke nwaanyị ọzọ nwụrụ mgbe ọ nọzurula ọnwa itoolu n’afọ. Nwaanyị nke mbụ ahụ ò nwere olileanya na a ga-akpọlite nwa ya n’ọnwụ naanị n’ihi na ọ mụkworo ya amụkwo, ebe nwaanyị nke abụọ na-enweghị olileanya na a ga-akpọlite nwa ya?
Ná nchịkọta, o doro anya na Baịbụl kwuru na ndụ mmadụ malitere mgbe a tụụrụ ime ya nakwa na nwa e bu n’afọ dị ndụ ma baa uru n’anya Jehova. N’ihi eziokwu a dị na Baịbụl, ụfọdụ ndị nwere ike ikwu na mmadụ ikwu na nwa nwụrụ n’afọ nne ya agaghị ebilite n’ọnwụ na-emegide ihe dị na Baịbụl. N’ezie, ha nwere ike iche na ikwu otú ahụ ekwekọghị n’ozizi anyị na-ezi na isi ime adịghị mma, bụ́ nke sitere n’Akwụkwọ Nsọ.
N’oge gara aga, Ụlọ Nche jụrụ ajụjụ ndị yiri ka hà na-egosi na ụmụaka ndị nwụrụ n’afọ nne ha agaghị ebilite n’ọnwụ. Dị ka ihe atụ, na Paradaịs, Chineke ọ̀ ga-etinyeghachi nwa n’afọ nne ya, bụ́ nwa nọrọ izu ole na ole n’afọ nne ya tupu ya anwụọ? Ma, nnyocha Òtù Na-achị Isi mere mgbe ha kpechara ekpere ma tụgharịa uche mere ka ha kwuo na ihe dị otú ahụ adịghị mkpa ime tupu mmadụ ebilite n’ọnwụ. Jizọs sịrị: “Ihe niile kwere omume n’ebe Chineke nọ.” (Mak 10:27) Ihe mere ná ndụ Jizọs gosiri na nke a bụ eziokwu; e si n’eluigwe bufee ndụ ya n’afọ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. N’ezie, nke a bụ ihe na-agaghị ekwe omume n’anya mmadụ.
Ya mere, ihe a niile ọ̀ pụtara na Baịbụl na-ekwu na ụmụaka nwụrụ n’afọ nne ha ga-ebilite n’ọnwụ? Ihe anyị na-eme ka o doo anya bụ na e nweghị kpọmkwem ihe Baịbụl zara n’ajụjụ a, n’ihi ya, ndị mmadụ enweghị ebe ha ga-agbakwasị ụkwụ wee kwuo na a ghaghị ịkpọlite ụmụ ndị ahụ n’ọnwụ. Okwu a nwere ike ịkpalite ọtụtụ ajụjụ. Ma, ọ ga-akacha mma ka mmadụ ghara ikwu ihe o chere. Ihe doro anyị anya bụ nke a: Jehova Chineke, bụ́ onye obiọma ya na ebere ya dị ukwuu, ma ihe ọ ga-eme. (Ọma 86:15) Obi abụọ adịghị ya na ọ na-agụsi ya agụụ ike imezi ihe niile ọnwụ mebiri site n’ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ. (Job 14:14, 15) Obi siri anyị ike na ọ na-eme ihe ziri ezi mgbe niile. Ọ ga-eme ka ọtụtụ ihe mgbu anyị na-enwe ná ndụ anyị dị n’ajọ usoro ihe a kwụsị site n’iji ịhụnanya duzie Ọkpara ya ka o “bibie ọrụ Ekwensu.”—1 Jọn 3:8.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Otú ndị nsụgharị ụfọdụ si sụgharịa amaokwu a na-egosi na ọ bụ naanị mgbe mmadụ gburu nwaanyị dị ime ka a ga-egbu onye ahụ. Ma, otú e si dee ya n’asụsụ Hibru e si sụgharịta amaokwu a na-egosi na a ga-egbu onye ahụ ma ọ bụrụ na o mere ka nwa e bu n’afọ ma ọ bụ nne ya nwụọ.
[Foto dị na peeji nke 13]
Jehova ga-eme ka ihe niile na-egbu ndị mmadụ mgbu kwụsị