Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g04 1/8 p. 17
  • N’ime Ụwa nke Jụrụ Oyi!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ime Ụwa nke Jụrụ Oyi!
  • Teta!—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Otú Ụmụaka Si Agbanwe Ndụ Di na Nwunye
    Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
  • Ihe Dị Ụmụ Ọhụrụ Mkpa na Ihe Ha Chọrọ
    Teta!—2004
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ite Ime?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2004
g04 1/8 p. 17

N’ime Ụwa nke Jụrụ Oyi!

ANA-AMỤ nwata n’ụwa nke dị obi ọjọọ, ụwa nke jụrụ oyi, ụwa nke nchekasị jupụtara na ya. Ọ bụ ezie na nwa ọhụrụ apụghị n’ezie ikwu otú obi dị ya, ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị kweere na ọbụna tupu a mụọ ya, nwa e bu n’afọ maara ihe na-aganụ.

Akwụkwọ bụ́ The Secret Life of the Unborn Child na-ekwu, sị: “Anyị maara ugbu a na nwa e bu n’afọ bụ mmadụ nke maara ihe na-aganụ ma na-emeghachi omume banyere ha, onye ihe na-emetụ n’ahụ́ malite n’ọnwa nke isii gawa (nakwa ma e leghị anya ọbụna mgbe ọ na-erubeghị ọnwa isii).” Ọ bụ ezie na nwa ahụ nwere ike ọ gaghị echeta, ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-eche ma ihe mgbu ndị a na-enwe mgbe a na-amụpụta nwa ọ̀ na-emetụta ndụ ya ka oge na-aga.

Mgbe a mụsịrị nwa, ọ na-anọgide na-enwe nrụgide. Mgbe a mụpụtara nwatakịrị, ọ naghịzi enweta nri site n’ahụ́ nne ya. Alọ nke o si enweta ikuku oxygen na ihe oriri adapụla. Iji na-adị ndụ, ọ ghaghị ịmalite iku ume na iri ihe n’onwe ya. Ọ dị ya mkpa inwe onye ga na-enye ya nri ma na-egbo mkpa anụ ahụ́ ya ndị ọzọ.

Nwa ọhụrụ aghaghịkwa ito eto n’ụzọ iche echiche, n’ụzọ mmetụta uche, nakwa n’ụzọ ime mmụọ. Ya mere, mmadụ aghaghị ilekọta ya. Olee onye nọ n’ọnọdụ kasị mma ime ya? Gịnị ka nwa ọhụrụ chọrọ n’aka ndị mụrụ ya? Olee ụzọ kasị mma a pụrụ isi gboo mkpa ndị a? Isiokwu ndị na-esonụ ga-enye aka n’ịza ajụjụ ndị a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya