Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w09 11/1 p. 8
  • Echiche Ụgha nke 5: Meri Bụ Nne Nke Chukwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Echiche Ụgha nke 5: Meri Bụ Nne Nke Chukwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Meri Ọ̀ Bụ Nne nke Chukwu?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ofufe nke Chi Nne Ọ̀ Ka Dị Adị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Meri Ọ̀ Bụ “Nne nke Chukwu”?
    Teta!—1996
  • Ọ̀ Dịwo Mgbe Ọ Bụla Ị Jụrụ?
    Teta!—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
w09 11/1 p. 8

Echiche Ụgha nke 5: Meri Bụ Nne Nke Chukwu

Olee ebe echiche ụgha a si? “A malitere inye nne nke Chukwu oké nsọpụrụ mgbe . . . ndị ọgọ mmụọ nubatara na chọọchị. . . . Ime nsọ nsọ ha na otú ha si ele okpukpere chi anya [ya bụ, ndị ọgọ mmụọ ghọrọ Ndị Kraịst] malitere kemgbe ọtụtụ puku afọ site n’ofufe chi nwaanyị a na-akpọ ‘nne ukwu’ na ‘chi nwa agbọghọ na-amaghị nwoke.’”—The New Encyclopædia Britannica (1988), Nke 16, peeji nke 326 na 327.

Gịnị ka Baịbụl kwuru? ‘Ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke, onye aha ị ga-agụ ya bụ Jisọs. Nwa nwoke a ga-abụ onye ukwu, onye a ga-akpọkwa Ọkpara Chineke kachasị elu. Mgbe ahụ, nwa ahụ ị ga-amụ ga-abụ onye dị nsọ. A ga-akpọkwa ya Ọkpara Chineke.’—Luk 1:31-35, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Ihe ndị e kwuru n’amaokwu Akwụkwọ Nsọ ahụ gosiri nke ọma na Meri bụ nne “Ọkpara Chineke,” ọ bụghị nne Chineke n’onwe ya. Meri ọ̀ ga-ebulinụ Onye ahụ ‘eluigwe nke eluigwe na-apụghị ịba’ n’afọ ya? (1 Ndị Eze 8:27) O nwetụghị mgbe o kwuru ụdị ihe ahụ. Ọ bụ ozizi Atọ n’Ime Otu kpatara nghọtahie e nwere banyere onye Meri bụ. Ọkpụkpọ Nzukọ Efesọs, nke e nwere n’afọ 431 Oge Anyị, kpọrọ Meri Theotokos (okwu Grik pụtara “onye mụrụ Chukwu”), ma ọ bụ “Nne nke Chukwu,” mere ka a malite ife Meri ofufe. Obodo Efesọs bụ́ ebe ndị chọọchị nọ nwee nzukọ ahụ bụ obodo e ji ife arụsị mara kemgbe ọtụtụ narị afọ, bụ́ ebe a na-efe chi nwaanyị ọmụmụ bụ́ Atemis.

Ọ bụ ya mere e ji webata ọtụtụ ihe a na-eme n’ofufe ihe oyiyi Atemis nke “si n’eluigwe daa,” dị ka ịga n’ahịrị, n’ofufe a na-efe Meri. (Ọrụ 19:35) Ihe ọzọ e ji nwayọọ nwayọọ webata n’ozizi Ndị Kraịst bụ iji ihe oyiyi Meri na ndị ọzọ efe ofufe.

Jiri amaokwu Baịbụl ndị a tụnyere ibe ha: Matiu 13:53-56; Mak 3:31-35; Luk 11:27, 28

NKE BỤ́ EZIOKWU:

Meri bụ nne Ọkpara Chineke, ọ bụghị nne Chineke n’onwe ya. Atọ n’Ime Otu bụ echiche ụgha nke mere ka e fewe Meri ofufe dị ka Nne nke Chukwu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya