Ọ̀ Dịwo Mgbe Ọ Bụla Ị Jụrụ?
GỊNỊ ka Bible na-ekwu n’ezie banyere Meri, nne Jisọs? Ihe ka ọtụtụ ná ndị kwere ekwe na Krisendọm kwetara na Nna ahụ bụ Chineke, Ọkpara ahụ bụ Chineke, Mmụọ Nsọ bụkwa Chineke, ma na ha abụghị chi atọ, kama atọ bụ otu. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Atọ n’Ime Otu. Nye akụkụ dị ukwuu nke Krisendọm (Katọlik, Anglịkan, na Orthodox), ozizi a dugara ná nkweta ahụ bụ na Meri, nne Jisọs, bụzi “Nne nke Chukwu.” Ọ̀ bụ otú ahụ n’ezie? Olee otú Jisọs si lee nne ya anya? Olee otú ndị na-eso ụzọ ya si lee ya anya? Ka anyị chọpụta otú Bible si aza:
1. Olee mgbe mbụ a kpọrọ Meri aha n’ime Bible?—Matiu 1:16.
2. Olee okpukpe Meri na-ekpe n’oge a mụrụ Jisọs?—Luk 2:39, 41.
3. Meri ọ̀ chụrụ àjà maka mmehie ya?—Luk 2:21-24; tụlee Levitikọs 12:6, 8.
4. Meri ọ̀ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke mgbe ọ tụụrụ ime Jisọs? N’ihi gịnị ka nke ahụ ji dị mkpa?—Matiu 1:22, 23, 25; Luk 1:34; Aịsaịa 7:14; Ndị Hibru 4:15.
5. Olee otú Meri si tụrụ ime?—Luk 1:26-38.
6. Olee otú Meri si meghachi omume n’ọnọdụ ya ndị pụrụ iche?—Luk 1:46-55.
7. Olee otú Meri si gosi na ya bụ nne ihe na-emetụ n’obi?—Luk 2:41-51.
8. Meri ò mesịrị mụọ ụmụ ndị ọzọ?—Matiu 13:55, 56; Mak 6:3; Luk 8:19-21; Jọn 2:12; 7:5; Ọrụ 1:14; 1 Ndị Kọrint 9:5.
9. Olee otú anyị si mara na ụmụnne ndị ikom na ndị inyom nke Jisọs abụghị ụmụ ụmụnne ndị mụrụ ya n’ezie?—Tụlee Mak 6:3; Luk 14:12; na Ndị Kọlọsi 4:10.
10. Jisọs ò lere Meri anya dị ka “Nne nke Chukwu”?—Jọn 2:3, 4; 19:26.
11. Meri ò lere onwe ya anya dị ka “Nne nke Chukwu”?—Luk 1:35; Jọn 2:4, 5.
12. Jisọs ò nyere nne ya otuto pụrụ iche ma ọ bụ ofufe?—Mak 3:31-35; Luk 11:27, 28; Jọn 19:26.
13. Olee otú Meri si lee òkè ya ná nzube Jehova anya?—Luk 1:46-49.
14. Meri ọ̀ bụ nwanyị bụ́ onye ogbugbo n’etiti Chineke na mmadụ?—1 Timoti 2:5.
15. N’ole n’ime 66 akwụkwọ Bible ka a kpọtụrụ Meri aha?
16. Ndị Kraịst dere akwụkwọ hà buliri Meri elu n’akwụkwọ na n’akwụkwọ ozi ha?—Jọn 2:4; 2 Ndị Kọrint 1:1, 2; 2 Pita 1:1.
17. Ugboro ole ka a kpọtụrụ Meri aha n’ime 21 akwụkwọ ozi ndị Pọl, Pita, Jemes, Jọn, na Jud dere?
18. Gịnị bụ olileanya Meri dị ka onye na-eso ụzọ Jisọs?—1 Pita 2:5; Mkpughe 14:1, 3.
19. Ọ̀ bụ Meri bụ nwanyị ahụ e zoro aka na ya na Jenesis 3:15 na Mkpughe 12:3-6?—Aịsaịa 54:1, 5, 6; Ndị Galetia 4:26.
20. Gịnị bụ ọkwá Meri ugbu a?—2 Timoti 2:11, 12.
Azịza Bible
1. “Jekọb wee mụọ Josef di Meri, nwanyị nke mụrụ Jisọs, Onye a na-akpọ Kraịst.”—Matiu 1:16.
2. “Mgbe ha mezuru ihe nile nke dị ka iwu Onyenwe anyị si dị, ha wee laghachi na Galili, ruo obodo nke aka ha, bụ́ Nazaret. Ndị mụrụ Ya na-eje Jerusalem kwa afọ n’ememe ngabiga.” (Luk 2:39, 41) Dị ka ndị Juu, ha gbasoro Iwu Mosis.
3. “Mgbe ụbọchị nile nke ime ha ka ha dị ọcha dị ka iwu nke Mosis si dị zuru, ha wee kuru Ya rịgoruo Jerusalem, iche Ya n’ihu Onyenwe anyị (dị ka e deworo ya n’iwu Onyenwe anyị, Nwa mbụ ọ bụla nke bụ oké nke gụghere akpa nwa, a ga-akpọ ya ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị).” (Luk 2:22, 23) “N’ozuzu ụbọchi nile nke ime ya ka ọ dị ọcha banyere nwa nwoke, ma ọ bụ banyere nwa nwanyị, ọ ga-ewetara onye nchụàjà nwa atụrụ nke gbara otu afọ ka ọ bụrụ àjà nsure ọkụ, na nwa kpalakwukwu, ma ọ bụ nduru, ka ọ bụrụ àjà mmehie, ruo ọnụ ụzọ nke ụlọikwuu nzute. Ma ọ bụrụ na aka ya erughị ihe ga-ezu nwa atụrụ, ọ ga-ewerekwa nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ; otu ka ọ bụrụ àjà nsure ọkụ, ibe ya ka ọ bụrụkwa àjà mmehie: onye nchụàjà ga-ekpuchikwara ya mmehie ya, a ga-emekwa ya ka ọ dị ọcha.”—Levitikọs 12:6, 8.
4. “Ọ [Josef] maghịkwa ya ruo mgbe ọ mụpụtara Nwa Nwoke: o wee kpọọ aha Ya Jisọs.” (Matiu 1:25) “Meri wee sị mmụọ ozi ahụ, Ihe a ga-esi aṅaa mee, ebe ọ dịghị nwoke m maara?” (Luk 1:34) “Onyenwe anyị onwe ya ga-enye unu ihe ịrịba ama; lee, nwa agbọghọ ahụ dị ime, ọ gajekwa ịmụ nwa nwoke, ọ ga-akpọkwa aha ya Immanuel.” (Aịsaịa 7:14) “Anyị enweghị onye isi nchụàjà onye na-apụghị iji obi soo anyị hụkọọ ahụhụ n’adịghị ike anyị; kama anyị nwere Onye a nwaworo n’ihe nile n’otu ụzọ ahụ a na-anwa anyị, ma O mehieghị.”—Ndị Hibru 4:15.
5. “Mmụọ ozi ahụ wee zaa, sị ya, Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị ihe nile elu ga-ekpuchikwa gị: n’ihi nke a Ihe dị nsọ nke ị dị ime Ya, a ga-akpọ Ya Ọkpara Chineke. . . . Ọ dịghị okwu ọ bụla si Chineke n’ọnụ pụta nke na-agaghị adị irè.”—Luk 1:35, 37.
6. “Meri wee sị, Mkpụrụ obi m na-eme ka Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ na-atọkwa mmụọ m ụtọ nke ukwuu na Chineke, bụ Onye nzọpụta m. . . . Onye dị ike emewo m ihe ukwuu dị iche iche; aha Ya dịkwa nsọ.”—Luk 1:46, 47, 49.
7. “Mgbe ha hụrụ Ya, ibubo wee nwụọ ha n’ahụ: nne Ya wee sị Ya, Nwa m, Gịnị mere I mesoo anyị otú a? lee, nna Gị na mụ onwe m na-achọ Gị n’obi ụfụ. O wee sị ha, Gịnị mere unu na-achọ m? ùnu amataghị na aghaghị m ịdị n’ihe nke Nna m?”—Luk 2:48, 49.
8. “Nwoke a, Ọ́ bụghị Nwa onyeọkà anyị? á dịghị akpọ nne Ya Meri? na ụmụnne Ya ndị ikom, Jemes, na Josef, na Saịmọn, na Judas? Na ụmụnne Ya ndị inyom, ha nile ánọghị n’etiti anyị?” (Matiu 13:55, 56) “Mgbe ihe a gasịrị Ọ rịdara na Kapanaum, Ya onwe ya, na nne Ya, na ụmụnne Ya [Grik, a·del·phoiʹ], na ndị na-eso ụzọ Ya [Grik, ma·the·taiʹ]: ha wee nọgide n’ebe ahụ ọ bụghị ọtụtụ ụbọchị.”—Jọn 2:12.
9. E nwere okwu Grik ndị dịgasị iche maka nwanne nwoke na ụmụ ụmụnne ndị mụrụ mmadụ. “Nwoke a, Ọ́ bụghị onyeọkà ahụ, nwa Meri, na nwanne [Grik, a·del·phosʹ] Jemes, na [Josef], na Judas, na Saịmọn? ụmụnne Ya ndị inyom [Grik, a·del·phaiʹ] ha ánọghịkwa n’ebe a n’etiti anyị? E wee mee ka ha ma n’ọnyà n’ahụ Ya.” (Mak 6:3) “Akpọla . . . ndị ikwu gị [Grik syg·ge·neisʹ].” (Luk 14:12) “Mak nwa nwanne [Grik, a·ne·psi·osʹ] Barnabas . . .” (Ndị Kọlọsi 4:10)—Lee The Kingdom Interlinear Translation of the Greek Scriptures.
10. “Jisọs wee sị ya, Nwanyị, gịnị ka Mụ na gị nwekọrọ? oge hour nke m aka-abịarughị.” “Mgbe Jisọs hụrụ nne Ya, na onye ahụ nke na-eso ụzọ Ya, onye Ọ hụrụ n’anya, ka ọ na-eguzo nso, Ọ sị nne Ya, Nwanyị, lee, nwa gị nwoke!” (Jọn 2:4; 19:26) Jisoṣ iji okwu ahụ bụ “nwanyị” mee ihe abụghị enweghị nkwanye ùgwù dị ka otú e si eji ya eme ihe n’oge ahụ si dị.
11. Ọ dịghị akụkụ Bible ọ bụla ji okwu ahụ bụ́ “Nne nke Chukwu” mee ihe.
12. “Otu nwanyị si n’etiti ìgwè mmadụ ahụ welie olu ya, sị Ya, Ngọzi na-adịrị afọ nke buru Gị, na ara nke Ị mịrị. Ma Ya onwe ya sịrị, Nke bụ eziokwu karị bụ, ngọzi na-adịrị ndị nụrụ okwu Chineke, debekwa ya.”—Luk 11:27, 28.
13. “Meri wee sị, Mkpụrụ obi m na-eme ka Onyenwe anyị dị ukwuu . . . n’ihi na O lere ọnọdụ dị ala nke ohu Ya nwanyị anya: n’ihi na lee, site n’ugbu a ọgbọ nile ga-akpọ m onye ngọzi dịịrị.”—Luk 1:46, 48.
14. “N’ihi na otu Chineke dị, otu Onye ogbugbo dịkwa n’agbata Chineke na mmadụ, Onye Ya onwe ya bụ mmadụ, bụ́ Kraịst Jisọs.”—1 Timoti 2:5.
15. Ise—Matiu, Mak, Luk, Jọn, na Ọrụ Ndị Ozi. Ọ pụtara ugboro 19 dị ka “Meri,” ugboro 24 dị ka “nne” Jisọs, na ugboro abụọ dị ka “nwanyị.”
16. E wezụga ndị dere Oziọma anọ ndị ahụ, ọ dịghị mgbe ọ bụla a kpọtụrụ Meri aha—ọ pụtaghị ọbụna n’okwu mmeghe nke akwụkwọ ndị ozi. “Pọl, onyeozi nke Kraịst Jisọs site n’ọchịchọ Chineke . . . Amara dịrị unu na udo nke si n’aka Chineke, bụ́ Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst pụta.” (2 Ndị Kọrint 1:1, 2) “Saịmọn Pita, ohu na onyeozi nke Jisọs Kraịst, . . . n’ezi omume Onye ahụ, bụ́ Chineke anyị na Onye nzọpụta anyị, Jisọs Kraịst.”—2 Pita 1:1.
17. Ma otu.
18. “E wee werekwa unu onwe unu, dị ka nkume dị ndụ, wuo, ka unu bụrụ ụlọ nke Mmụọ Nsọ, ka unu wee bụrụ òtù ndị nchụàjà dị nsọ, ịchụ àjà nke dị ka Mmụọ Nsọ si chọọ, nke dị Chineke ezi mma site na Jisọs Kraịst.” (1 Pita 2:5) “M wee hụ, ma lee, Nwa atụrụ ahụ ka Ọ na-eguzo n’ugwu Zaịọn, Ya na [puku narị na iri anọ na anọ], bụ́ ndị e deworo aha Ya na aha Nna Ya n’egedege ihu ha. Ha wee na-abụ dị ka a ga-asị na ọ bụ abụ ọhụrụ n’ihu ocheeze ahụ . . . , ọ dịghịkwa onye ọ bụla pụrụ ịmụta abụ ahụ ma ọ bụghị [puku narị na iri anọ na anọ] ahụ, bụ́ ndị a gbatararịị n’ụwa.”—Mkpughe 14:1, 3.
19. “Tie mkpu ọṅụ, gị nwanyị àgà, bụ́ nwanyị na-amụghị nwa; tiwaa mkpu ọṅụ, tisiekwa mkpu ike, gị onye ime nwa na-emeghị: n’ihi na ụmụ nke nwanyị a hapụrụ nanị ya dị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwanyị a lụrụ na nwunye, ka Jehova sịrị. N’ihi na di gị bụ Onye meworo gị; Jehova nke usuu nile nke ndị agha bụ aha Ya: ọzọ, onye mgbapụta gị bụ Onye Nsọ nke Israel; Chineke nke ụwa nile ka a na-akpọ Ya.” (Aịsaịa 54:1, 5) “Jerusalem nke dị n’elu nweere onwe ya, ya onwe ya bụkwa nne anyị.” (Ndị Galetia 4:26) E ji nwunye na nne, tụnyere nwanyị ihe atụ Chineke, Zaịọn dị n’eluigwe, nzukọ eluigwe nke Jehova, ọ bụkwa ya bụ “nwanyị” nke akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a.
20. “Okwu a kwesịrị ntụkwasị obi: N’ihi na a sị na anyị sooro Ya nwụkọọ ọnwụ, anyị ga-esokwa Ya dịkọọ ndụ: a sị na anyị na-enwe ntachi obi, anyị ga-esokwa Ya bụkọọ eze: a sị na anyị ga-agọnarị Ya, Ya onwe ya ga-agọnarịkwa anyị.” (2 Timoti 2:11, 12) Ọ bụrụ na Meri kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, ọ na-achị achị n’eluigwe ugbu a ya na ndị ọzọ so na 144,000, ndị na-eso Kraịst achị.—Mkpughe 14:1, 3.