Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 11/1 p. 22
  • A Gwọọ Otu Onye Ekpenta!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Gwọọ Otu Onye Ekpenta!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mbibi E Bibiri Sọdọm na Gọmọra
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Jizọs Meriri Ọnwụnwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Jizọs Gwọrọ Ndị Mmadụ Ọrịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Amamihe Jizọs Tụrụ Ndị Gere Ya Ntị n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 11/1 p. 22

Maka Ndị Na-eto Eto

A Gwọọ Otu Onye Ekpenta!

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ ebe ndị ahụ a chọrọ ka ị gụọ n’Akwụkwọ Nsọ, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri uche gị kirie ebe ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.

Ndị bụ́ isi n’akụkọ a: Neaman, Ịlaịsha, na nwatakịrị nwaanyị Izrel a na-akpọghị aha

Nchịkọta: A gwọrọ onyeisi ndị agha Siria, bụ́ Neaman, otu ọrịa na-asọ oyi mgbe otu nwatakịrị nwaanyị Izrel tụụrụ ya aro ka ọ gaa hụ Ịlaịsha.

1 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ 2 NDỊ EZE 5:1-19.

Olee otú i chere obi ga na-adị nwatakịrị nwaanyị Izrel ahụ ebe ọ bụ na a kpọpụrụ ya n’ezinụlọ ya bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke?

․․․․․

Olee otú i chere obi ga na-adị Neaman, bụ́ dike nke nwere ọrịa na-asọ oyi?

․․․․․

Olee otú i chere obi dị Neaman na ndị na-ejere ya ozi ka ha na-enwe mkparịta ụka ahụ dị n’amaokwu nke 11 ruo 13?

․․․․․

Olee otú i chere Neaman si gbanwee otú o si ele ihe anya malite n’amaokwu nke 15?

․․․․․

2 LEBAKWUO YA ANYA.

Olee ihe ndị o nwere ike ịbụ ha so mee ka Neaman dị mpako? (Gụghachi amaokwu 1.)

․․․․․

Jiri ihe ndị e ji eme nnyocha i nwere chọpụta ihe ụfọdụ banyere ihe a na-akpọ ekpenta n’oge Baịbụl.a (Dị ka ihe atụ, olee otú ọrịa ahụ jọruru ná njọ? Ọ̀ na-efe efe? Olee otú e si agwọ ya?)

․․․․․

Olee otú i chere ọgwụgwọ Neaman nwere ike isi metụta nwatakịrị nwaanyị Izrel ahụ?

․․․․․

Olee otú ihe Ịlaịsha zara nwere ike isi ghọọrọ Neaman ule? (Gụọ amaokwu 10.)

․․․․․

3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .

Nsogbu mpako na-eweta.

․․․․․

Iji obi ike ekwu ihe ndị i kweere.

․․․․․

Ike Jehova nwere ịgwọ ọrịa.

․․․․․

4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤ MAKA GỊNỊ?

․․․․․

Ọ BỤRỤ NA I NWEGHỊ BAỊBỤL, GWA NDỊÀMÀ JEHOVA KA HA NYE GỊ OTU, MA Ọ BỤ GỊ AMATAKWUO BANYERE YA NA www.watchtower.org na www.jw.org

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

a Ọrịa a na-akpọ ọrịa Hansen taa so n’ọrịa akpụkpọ ahụ́ a kpọrọ ekpenta n’oge Baịbụl.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya