Isiokwu Ndị Dị n’Akwụkwọ A
Jenụwarị 15, 2011
Nke A Na-amụ Amụ
ISIOKWU A GA-AMỤ N’IZU:
Febụwarị 28, 2011–Mach 6, 2011
PEEJI NKE 3
Mach 7-13, 2011
Ejila Alụmdi na Nwunye Egwu Egwu, Ọ Bụ Onyinye Si n’Aka Chineke
PEEJI NKE 13
Mach 14-20, 2011
Jiri Oge Ị Na-alụbeghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Mee Ihe Bara Uru
PEEJI NKE 17
Mach 21-27, 2011
Mmụọ Nsọ Na-enye Anyị Ike Idi Ọnwụnwa, Na-emekwa Ka Anyị Ghara Ịda Mbà
PEEJI NKE 22
Mach 28, 2011–Eprel 3, 2011
Mmụọ Nsọ Na-enyere Anyị Aka Idi Ihe Isi Ike
PEEJI NKE 26
Ihe Isiokwu Ndị A Ga-amụ Amụ Na-ekwu
ISIOKWU NKE 1 PEEJI NKE 3-7
Olee ebe anyị ga-agbaba n’oge a dị oké egwu? Baịbụl kwuru na anyị nwere ike ịgbaba n’aha Jehova. N’isiokwu a, a tụlere otú e nwere ike isi chebe anyị ma ugbu a ma mgbe “oké ụbọchị Jehova” ga-abịa. E kwukwara banyere isiokwu dịịrị afọ 2011.
ISIOKWU NKE 2, 3 PEEJI NKE 13-21
Ịlụ di ma ọ bụ nwunye na ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye bụcha onyinye si n’aka Chineke, nke ọ bụla n’ime ha nwere ihe dị mma dị na ya. Ma ànyị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụkwanụ na anyị alụghị, isiokwu ndị a tụlere ihe ndị mere anyị ga-eji na-enwe obi ụtọ maka onyinye abụọ a. Ha gosikwara otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ndị a.
ISIOKWU NKE 4, 5 PEEJI NKE 22-30
Enyemaka Jehova dị anyị mkpa ka anyị wee na-eme ihe anyị kwere ya ná nkwa mgbe anyị raara onwe anyị nye ya. Isiokwu ndị a tụlere otú mmụọ nsọ si enyere anyị aka imeri ọnwụnwa, idi nkụda mmụọ, mkpagbu, na ihe isi ike, nakwa imeri ndị ọgbọ anyị mgbe ha na-enye anyị nsogbu ka anyị tinye aka n’ihe ọjọọ.
ISIOKWU NDỊ ỌZỌ DỊ N’ỤLỌ NCHE A:
9 Obi Dị M Ụtọ na M Na-ejere Jehova Ozi n’Agbanyeghị Ule Ndị Bịaara M
31 Na-echebara Ihe Jehova Meere Gị Echiche
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]
© Stähli Rolf A/age fotostock