Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 8/1 p. 23
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Mkpagbu ahụ Ahụ Oké Ìhè
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Sọl Ezute Ndị Enyi Ya Ochie Na Ndị Bụ́bu Ndị Iro Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • ‘Obi Malitere Iru Ọgbakọ Niile Ala n’Oge Ahụ’
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Jizọs Họọrọ Sọl
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 8/1 p. 23

Ị̀ Maara?

Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ sịrị Sọl: “Ịnọgide na-agba ndụdụ e ji achị anụ ụkwụ na-eme ka ihe siere gị ike”?—Ọrụ 26:14.

▪ N’oge Baịbụl, ndị ọrụ ugbo na-eji ndụdụ e ji achị anụ eduzi ụmụ anụmanụ ha ji akọ ugbo. Ndụdụ ahụ bụ osisi pịrị ọnụ nke nwere ike iru mita abụọ na ọkara n’ogologo. Otu isi ndụdụ ahụ na-enwe ígwè dị nkọ n’ọnụ ọnụ ya. Ọ bụrụ na anụmanụ alaa azụ, ndụdụ ahụ na-adụ ya, merụọ ya ahụ́. Isi ya nke ọzọ na-enwe obere mmà e nwere ike iji wepụ ájá, ahịhịa ma ọ bụ ihe ndị ọzọ nyapagidere n’ọ́gụ̀ e ji na-akọ ala.

Mgbe ụfọdụ, a na-eji ndụdụ a e ji achị anụ emere ngwá ọgụ. Otu ọchịagha na onyeikpe e nwere n’Izrel, nke aha ya bụ Shamga, ji “ndụdụ e ji achị ehi” gbuo narị ndị Filistia isii.—Ndị Ikpe 3:31.

E jikwa ndụdụ a e ji achị ehi mee ihe atụ n’Akwụkwọ Nsọ. Dị ka ihe atụ, Eze Sọlọmọn dere na okwu onye maara ihe “dị ka ndụdụ e ji achị ehi,” nke mmadụ ji adụtụ enyi ya ka enyi ya nwee ike ime mkpebi dị mma.—Ekliziastis 12:11.

Mgbe Jizọs laghachiri n’eluigwe, o jikwa ndụdụ e ji achị anụ mee ihe atụ. Ọ gwara Sọl, bụ́ onye nọ na-akpagbu Ndị Kraịst, ka ọ kwụsị ‘ịgba ndụdụ e ji achị anụ ụkwụ.’ Ihe ga-agbata onye nụrụ ihe a Jizọs kwuru n’obi bụ anụmanụ dị isi ike nke jụrụ ịga ebe onye nwe ya na-agwa ya ka ọ gaa. Ọ dị mma na Sọl nabatara ndụmọdụ ahụ Jizọs nyere ya ma gbanwee ndụ ya, ghọzie Pọl onyeozi.

Olee otú ndị Juu nke oge Jizọs si amata ihe na-akụ n’abalị?

▪ Ọ bụrụ na anwụ na-acha, ndị Juu nke oge Jizọs nwere ike iji onyinyo amata ihe na-akụ n’ehihie. Ma, ọ bụrụ n’abalị ma ọ bụ oge mmiri ruru, ihe ha na-eji amata ihe na-akụ bụ ihe a na-akpọ klọọkụ mmiri. E wezụga ndị Juu, ndị Ijipt oge ochie, ndị Peshia, ndị Gris, na ndị Rom jikwara klọọkụ mmiri mata oge.

Akwụkwọ bụ́ The Jewish Encyclopedia kwuru na akwụkwọ iwu ndị Juu a na-akpọ Mishnah na nke a na-akpọ Talmud kwuru banyere klọọkụ mmiri ahụ ma kpọọ ya “aha dị iche iche. O nwere ike ihe mere ha ji kpọọ ya aha dị iche iche bụ na klọọkụ a dị n’ụdị n’ụdị. Ma aha niile ahụ pụtara otu ihe, ya bụ, mmiri ji nwayọọ na-atapụ kpọm kpọm kpọm.”

Olee otú klọọkụ a si arụ ọrụ? A na-agbanye mmiri n’ime karama abụọ, kpọpuo ha abụọ obere ka mmiri nwee ike isi na nke dị n’elu na-abanye na nke dị n’ala. A na-akanyekwa ihe n’ahụ́ karama ndị ahụ ka e nwee ike ịma ebe mmiri dị na ha ruru. Mmadụ nwere ike ịma ihe na-akụ ma o lee ebe mmiri dị na karama nke dị n’elu ma ọ bụ nke dị n’ala ruru.

Ndị agha ndị Rom na-eji ụdị klọọkụ a ama oge nche dị iche iche a na-enwe n’abalị. Mgbe ọ bụla oge nche nke ọ bụla ruru, ha afụọ opì. Onye ọ bụla nụrụ opì ahụ ga-eji ya mara mgbe nke ọ bụla n’ime oge nche anọ a na-enwe n’abalị bidoro na mgbe ọ gwụrụ.​—Mak 13:35.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya