Isiokwu Ndị Dị n’Akwụkwọ A
Ọktoba 15, 2011
Nke A Na-amụ Amụ
ISIOKWU A GA-AMỤ N’IZU:
Nọvemba 28, 2011–Disemba 4, 2011
Ntụrụndụ Ị Na-enwe Ọ̀ Na-abara Gị Uru?
PEEJI NKE 8
Disemba 5-11, 2011
Ezigbo Ndụmọdụ Maka Ndị Na-alụbeghị Di ma Ọ Bụ Nwunye na Ndị Lụrụla
PEEJI NKE 13
Disemba 12-18, 2011
Tụkwasị Jehova, Bụ́ “Chineke nke Nkasi Obi Niile,” Obi
PEEJI NKE 23
Disemba 19-25, 2011
“Ịkasi Ndị Niile Na-eru Uju Obi”
PEEJI NKE 27
Ihe Isiokwu Ndị A Ga-amụ Amụ Na-ekwu
ISIOKWU NKE 1 PEEJI NKE 8-12
N’agbanyeghị ebe anyị bi, anyị ga-enwe ike ịhọrọ ntụrụndụ ndị ga-abara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị emee ihe Baịbụl kwuru. N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú anyị ga-esi mara ma ihe ndị anyị chọrọ iji atụrụ ndụ hà kwesịrị ekwesị.
ISIOKWU NKE 2 PEEJI NKE 13-17
Mmadụ ikpebi ma ọ̀ ga-alụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na ọ gaghị alụ abụghị obere okwu n’ihi na ọ gbasara ndụ onye ahụ na adịm ná mma ya na Jehova. N’okwu a dị mkpa ná ndụ, isiokwu a ga-egosi ndị ohu Chineke niile, ma ndị nke lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ndị nke na-alụbeghị, otú ha ga-esi eme ihe e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt isi 7, ya abaara ha uru.
ISIOKWU NKE 3, 4 PEEJI NKE 23-31
N’ụbọchị ikpeazụ a, e nwere ọtụtụ nsogbu ndị na-abịara ndị ohu Jehova na ndị ọzọ bụ́ nsogbu ndị na-eme ka obi ghara iru ha ala. Olee ụfọdụ n’ime nsogbu ndị a? Ònye ga-akasi anyị obi mgbe nsogbu ndị a bịaara anyị? Isiokwu abụọ a kọwara otú Jehova na Ndịàmà ya si akasi ndị mmadụ obi n’oge a nsogbu juru ebe niile.
ISIOKWU NDỊ ỌZỌ DỊ N’ỤLỌ NCHE A
3 Gịnị Mere O Ji Dị Ezigbo Mkpa Ka Anyị ‘Na-eche Nche’?
5 Ka Anyị Soro Ndị Ọzọ Na-aṅụrị Ọṅụ!
18 Ijere Jehova Ozi Na-eme M Obi Ụtọ Kemgbe Ụwa
32 Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 2]
Map ụwa: A natara ikike n’aka Replogle Globes