Isiokwu Ndị Dị n’Akwụkwọ A
Disemba 15, 2011
Nke A na-amụ Amụ
ISIOKWU A GA-AMỤ N’IZU:
Jenụwarị 30, 2012–Febụwarị 5, 2012
Gịnị Ka Ị Na-amụta n’Àgwà Ọma Ya Nakwa n’Àgwà Ọjọọ Ya?
PEEJI NKE 8
Febụwarị 6-12, 2012
Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ikwe Ka Mmụọ Chineke Na-edu Anyị?
PEEJI NKE 13
Febụwarị 13-19, 2012
Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi n’Oge Ochie, Bụ́ Ndị Mmụọ Nsọ Duru
PEEJI NKE 18
Febụwarị 20-26, 2012
Otú Mmụọ Chineke Si Duo Ndị Kraịst na Narị Afọ Mbụ na Otú O Si Edu Ndị Kraịst Taa
PEEJI NKE 22
Ihe Isiokwu Ndị A Ga-amụ Amụ Na-ekwu
ISIOKWU NKE 1 PEEJI NKE 8-12
Ụfọdụ ndị a kpọrọ aha ha na Baịbụl kpara àgwà ndị anyị kwesịrị iṅomi, ma, ha kpakwara àgwà ndị anyị na-ekwesịghị iṅomi. N’isiokwu a, anyị ga-atụle àgwà Sọlọmọn ndị anyị kwesịrị iṅomi na ndị nke anyị na-ekwesịghị iṅomi. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka ya bụ́ nke ga-enyere anyị aka ịna-ebi ndụ ka Ndị Kraịst?
ISIOKWU NKE 2 PEEJI NKE 13-17
E nwere ike dị egwu nke nwere ike idu anyị ihe agaara anyị nke ọma n’ime ụwa ọjọọ a. Gịnị ka ike ahụ bụ, olee ihe mere anyị ji kwesị ikwe ka ọ na-edu anyị, gịnịkwa ka anyị nwere ike ime ka o nwee ike ịna-edu anyị mgbe niile?
ISIOKWU NKE 3, 4 PEEJI NKE 18-26
E nwere ọtụtụ ndị ohu Chineke n’oge ochie ndị jupụtara na mmụọ nsọ. Olee otú mmụọ nsọ si rụọ ọrụ n’ime ha? Ịmụ otú Jehova si duzie ha ga-agba anyị nnọọ ume n’ozi anyị.
ISIOKWU NDỊ ỌZỌ DỊ N’ỤLỌ NCHE A
3 Mgbanwe Ndị Anyị Mere Baara Anyị Uru
27 Ekwela Ka Ọrịa Mee Ka Ị Ghara Ịna-enwe Ọṅụ
31 Ì Chetara?
32 Isiokwu Ndị E Bipụtara n’Ụlọ Nche n’Afọ 2011