Maka Ndị Na-eto Eto
Ekwela Ka Ndị Mmụọ Ọjọọ Ghọgbuo Gị!
Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ amaokwu ndị a, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere, werekwa ya na ị na-ahụ ka ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.
1 CHEBARA OTÚ IHE NDỊ A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ JENESIS 6:1-6 NA ỌRỤ 19:11-20.
Kọwaa otú i chere ndị Nefilim dị.
․․․․․
Mgbe ị gụchara ihe a kọrọ n’Ọrụ 19:13-16, olee otú i chere ahụ́ dị ụmụ nwoke ahụ mgbe mmụọ ọjọọ ahụ merichara ha?
․․․․․
2 LEBAKWUO YA ANYA.
Jiri ihe e ji eme nchọnchọ ndị i nwere chọpụtakwuo banyere ndị Nefilim. Gịnị ka i chere mere ime ihe ike ji atọ ha ụtọ?
․․․․․
Olee otú o si bụrụ na ndị mmụọ ọjọọ ahụ “hapụrụ ebe obibi ha kwesịrị ekwesị”? (Gụọ Jud 6.) Gịnị ka i chere mere o ji bụrụ ihe na-ekwesịghị ekwesị na ihe jọgburu onwe ya na ndị mmụọ ọjọọ ahụ bịara n’ụwa lụọ nwaanyị?
․․․․․
Olee otú ihe ị gụtara na Jenesis 6:1-6 nakwa n’Ọrụ 19:11-20 si mee ka ị mata na ndị mmụọ ọjọọ nwere mmasị n’ịkwa iko nakwa n’ime ihe ike?
․․․․․
3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .
Otú ndị mmụọ ọjọọ si bụrụ ndị obi fere azụ na ndị na-achọ naanị ọdịmma onwe ha.
․․․․․
ỤZỌ NDỊ ỌZỌ Ị GA-ESI MEE IHE Ị MỤTARA.
Ebe ọ bụ na ndị mmụọ ọjọọ enweghịzi ike ịghọ mmadụ, olee ụzọ ndị ọzọ ha nwere ike isi ghọgbuo gị?
․․․․․
Olee ihe ndị e ji atụrụ ndụ taa ndị nwere ike ime ka mmadụ kpawa àgwà ọjọọ ka ndị mmụọ ọjọọ?
․․․․․
Olee otú i nwere ike isi gosi na i kpebisiela ike na ndị mmụọ ọjọọ agaghị aghọgbu gị? (Gụgharịa Ọrụ 19:18, 19.)
․․․․․
4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ NDỊ A? GỊNỊKWA MERE O JI BAARA GỊ URU?
․․․․․
Ọ bụrụ na i nweghị Baịbụl, gwa Ndịàmà Jehova ka ha nye gị otu, ma ọ bụ gị agụọ ya n’asụsụ bekee na www.watchtower.org na www.jw.org