Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 5/1 p. 3-4
  • Ka Anyị Jụọ Jizọs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ka Anyị Jụọ Jizọs
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Uru Ndị Na-eso Ụzọ Ya Ga-abara Ndị Mmadụ
  • “Ha Abụghị nke Ụwa”
  • Nnu—Ihe Bara Oké Uru
    Teta!—2002
  • Olee Otú Ihe Ndị Kraịst Na-akụzi Si Abara Obodo Uru?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Gịnị Mere Jizọs Ji Jụ Itinye Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 5/1 p. 3-4

Ka Anyị Jụọ Jizọs

Ọtụtụ ndị taa chere na Ndị Kraịst kwesịrị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ha chere na Ndị Kraịst ga-enye ezigbo aka n’ime ka nsogbu ndị mmadụ nwere taa kwụsị. Ma, e nwere ndị chere na Ndị Kraịst ekwesịghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Gịnị ka gịnwa chere? Ndị Kraịst hà kwesịrị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?

E KWURU na ọ bụ Jizọs Kraịst “kacha kụzie ihe ruru ndị mmadụ n’obi kemgbe ndị mmadụ kpewere okpukpe.” N’ihi ya, gịnị ka i chere Jizọs ga-aza ma anyị jụọ ya ma Ndị Kraịst hà kwesịrị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị? Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ihe ndị o kwuru na ihe ndị o mere zara ajụjụ ahụ. Dị ka ihe atụ, n’ozizi ahụ a ma ama Jizọs nọ n’elu ugwu zie, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ụfọdụ ga-enyere ha aka ịma ọrụ ha kwesịrị ịna-arụ n’obodo ha. Ka anyị lebagodị anya n’ụfọdụ ihe ọ gwara ha mgbe ahụ ọ nọ n’elu ugwu na-ezi ha ihe.

Uru Ndị Na-eso Ụzọ Ya Ga-abara Ndị Mmadụ

Jizọs kwuru uru ndị na-eso ụzọ ya ga-abara ndị mmadụ. Ọ gwara ha, sị: “Unu bụ nnu nke ụwa; ma ọ bụrụ na nnu adịkwaghị atọ ụtọ, olee otú a ga-esi mee ka ọ dịghachi ụtọ? A pụkwaghị iji ya mee ihe ọ bụla ma ọ́ bụghị ịwụfu ya n’èzí ka ndị mmadụ zọọ ya ụkwụ. Unu bụ ìhè nke ụwa. . . . Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha wee hụ ọrụ ọma unu wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.” (Matiu 5:13-16) Gịnị mere Jizọs ji jiri ndị na-eso ụzọ ya tụnyere nnu na ìhè?

Jizọs ji ihe atụ ahụ mee ka a ghọtakwuo uru ndị na-eso ụzọ ya ga-abara ndị obodo ha. Ọ bụ naanị mgbe e tinyere nnu ná nri ka ọ ga-eme ka nri ahụ ghara imebi. Ọ bụkwa naanị mgbe a dọbara oriọna n’ime ụlọ gbara ọchịchịrị ka ọ ga-enye ìhè n’ụlọ ahụ. Ihe a Jizọs kwuru mere ka anyị ghọta na ndị na-eso ụzọ ya ga-abụ nnu n’ebe mmadụ niile nọ, ọ bụghị n’ebe mmadụ ole na ole nọ. Ha ga-abụrụ ndị niile chọrọ ịhụ ụzọ nke ọma ìhè, ọ bụghị naanị mmadụ ole na ole. Jizọs agwaghị ndị na-eso ụzọ ya ka ha kwaga ebe ndị mmadụ na-ebighị, rụọ ụlọ ma biri ebe ahụ naanị ha. Ọ gwaghịkwa ha ka ha na ndị ọzọ ghara ịna-emekọ ihe. N’ihi ya, Ndị Kraịst kwesịrị ịbara ndị obodo ha uru otú ahụ nnu na-aba uru ma e tinye ya ná nri, nakwa otú ahụ oriọna na-eme ka ime ụlọ ghara ịgba ọchịchịrị ma a dọwa ya n’ime ụlọ.

“Ha Abụghị nke Ụwa”

Ebe ọ bụ na Jizọs sịrị na ndị na-eso ụzọ ya na ndị mmadụ kwesịrị ịna-emekọ ihe, ọ̀ pụtaziri na Ndị Kraịst kwesịrị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị? Obere oge tupu e gbuo Jizọs, o kpegaara Chineke ekpere maka ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ihe m na-arịọ gị abụghị ka ị kpọpụ ha n’ụwa, kama ka i chee ha nche n’ihi ajọ onye ahụ. Ha abụghị nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị nke ụwa.” (Jọn 17:15, 16) N’ihi ya, olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs na ndị obodo ga-esi na-emekọ ihe ma ha aghara ịbụ nke ụwa? Ka anyị leba anya n’ajụjụ atọ ọzọ ga-enyere anyị aka ịghọta azịza nke ajụjụ a. Ajụjụ atọ ndị ahụ bụ:

• Olee otú Jizọs si lee ndọrọ ndọrọ ọchịchị anya?

• Ndị Kraịst taa hà kwesịrị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?

• Olee otú ihe Ndị Kraịst na-akụzi si abara obodo uru?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

Jizọs mere ka o doo anya na ndị na-eso ụzọ ya na ndị mmadụ kwesịrị ịna-emekọ ihe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya