Olee Otú I Nwere Ike Isi Mee Ihe Ndị Ga-abara Gị Uru n’Ọdịnihu?
OLEE otú i nwere ike isi mee ihe ndị ga-abara gị ezigbo uru? Otu n’ime ihe ndị i nwere ike ime bụ iche echiche nke ọma banyere ihe ndị nwere ike isi ná mkpebi ndị ị na-eme ugbu a pụta.
O doro anya na o nwere ike isiri gị ike ime mkpebi ndị nwere ike ịbara gị uru ná ndụ gị niile. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na ọtụtụ ndị taa chọrọ inweta ihe ọ bụla dị ha mkpa n’otu ntabi anya. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ime ihe Baịbụl kwuru na-eme ka onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ nwee obi ụtọ. (Ndị Efesọs 5:22–6:4) Ma, ọ bụrụ na ị chọrọ ka ezinụlọ gị nwee obi ụtọ, i kwesịrị iwepụta oge mgbe niile ka gị na ezinụlọ gị na-anọkọ. I kwesịghị ịna-eji oge gị niile arụ ọrụ ma ọ bụ na-ekpori ndụ. I kwesịrị ikpebi ihe ị ga-eme otú ahụ i si eme mkpebi n’ihe ndị ọzọ ị na-eme. Ọ̀ bụ ime ihe ga-atọ gị ụtọ ugbu a ka ọ̀ bụ ihe ga-eme ka i nwee ezigbo obi ụtọ n’ọdịnihu. Gịnị ga-enyere gị aka ime mkpebi ga-abara gị uru? Mee ihe anọ na-esonụ.
1 Chee Echiche nke Ọma Banyere Ihe Ndị Nwere Ike Isi ná Mkpebi Gị Pụta
Mgbe ị na-eme mkpebi, chee echiche banyere ma ihe ọma ma ihe ọjọọ nwere ike isi na ya pụta. Baịbụl kwuru, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.” (Ilu 22:3) Ọ bụrụ na i chee echiche banyere ihe ọjọọ nwere ike isi ná mkpebi i na-eme pụta, o nwere ike inyere gị aka ka ị ghara ime ihe nwere ike ime ka ị baa ná nsogbu. Ọ bụrụkwa na i chee echiche banyere uru ime mkpebi dị mma ga-abara gị ná ndụ gị niile, ọ ga-eme ka i kpebisikwuo ike ime mkpebi dị mma.
Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee uru mkpebi m mere taa ga-abara m n’otu afọ, n’afọ iri ma ọ bụ n’afọ iri abụọ na-abịa abịa? Ọ̀ ga-eme ka m na-echegbu onwe m? Ọ̀ ga-akpatara m ọrịa? Olee otú obi ga-adị ndị ezinụlọ m na ndị ọzọ m hụrụ n’anya?’ Ihe kacha mkpa i kwesịrị ịjụ onwe gị bụ: ‘Mkpebi m mere ọ̀ ga-adị Chineke mma? Ọ̀ ga-eme ka mụ na ya dị ná mma ka ọ̀ ga-eme ka anyị ghara ịdị ná mma?’ Ebe ọ bụ na e si n’ike mmụọ nsọ dee Baịbụl, Baịbụl nwere ike inyere gị aka ịmata ihe dị Chineke mma, nyekwara gị aka ịmata ihe ụfọdụ ị na-echeghị na ha ga-akpatara gị nsogbu ma i mee ha.—Ilu 14:12; 2 Timoti 3:16.
2 Chebara Ihe Ị Chọrọ Ime Echiche Ma Jiri Aka Gị Kpebie Ya
Ọtụtụ ndị anaghị emeliri onwe ha mkpebi, ihe ha na-eme bụ ime ihe ndị ọzọ mere. Ma ihe ga-eme ka ihe mmadụ kpebiri ime ghara ịghọ ya ahịa abụghị n’ihi na ọtụtụ ndị na-eme ihe ahụ. Chebara ihe ị chọrọ ime echiche ma jiri aka gị kpebie ya. Were otu nwa agbọghọ aha ya bụ Natalie dị ka ihe atụ.a O kwuru, sị: “Achọrọ m ịlụta ezigbo di. Ma achọpụtara m na otú m si ebi ndụ ugbu a agaghị eme ka m lụta ezigbo di. Ụbụrụ na-aghọ ndị niile mụ na ha na-akpa n’ụlọ akwụkwọ nkọ. Ma ha na-emekarị mkpebi ndị na-aghọ ha ahịa. Ha na-agbanwe ndị enyi ha nwoke ma ọ bụ ndị enyi ha nwaanyị ka ebe mmadụ na-agbanwe uwe. Enwekwara m ọtụtụ ndị enyi nwoke ka ha. Ụdị ndụ a m na-ebi mere ka obi na-ajọ m njọ.”
Natalie na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. O kwuru, sị: “Achọpụtara m na ndị na-eto eto bụ́ Ndịàmà Jehova na-enwe obi ụtọ, chọpụtakwa na ndị di na nwunye bụ́ Ndịàmà Jehova hụrụ ibe ha n’anya. Ọ bụ eziokwu na ọ dịghịrị m mfe, m ji nwayọọ nwayọọ gbanwee otú m si ebi ndụ na otú m si ele ihe anya.” Olee uru nke a baara ya? O kwuru, sị: “M na-ekwukarị na onye m ga-alụ bụ onye m hụrụ n’anya. Emechakwara m lụọ Onyeàmà Jehova ibe m. O doro m anya na Chineke meere m ihe m na-atụdịghị anya ya, o nyere m ezigbo di.”
3 Chee Echiche Ma Mkpebi Ndị Ị Na-eme Ugbu A Hà Ga-abara Gị Uru n’Ọdịnihu
Ọ bụrụ na ị ghọta ihe ị chọrọ ime n’ọdịnihu ma kpebie otú ị ga-esi eme ya, ọ ga-enyere gị aka ka ị ghara ime mkpebi ga-abara gị uru ugbu a ma mechaa ghọ gị ahịa n’ọdịnihu. (Ilu 21:5) Mgbe ị na-eme mkpebi, ebula naanị iri afọ asaa ma ọ bụ iri afọ asatọ mmadụ na-adị ndụ n’obi. Kama, were ya na ị nọ ugbu a na paradaịs ahụ Baịbụl kwuru ndị ezi omume ga-enweta.
Baịbụl kwuru na ọ bụ àjà mgbapụta Kraịst Jizọs ka Chineke ga-eji mee ka ụmụ mmadụ nweta ndụ ebighị ebi. (Matiu 20:28; Ndị Rom 6:23) Chineke kwere nkwa na n’oge na-adịghị anya, na ya ga-emezu ihe o bu n’obi kee ụmụ mmadụ nakwa ụwa. Ndị hụrụ Chineke n’anya ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa e mere ka ọ ghọghachi paradaịs. (Abụ Ọma 37:11; Mkpughe 21:3-5) I nwere ike iso ná ndị ga-adị ndụ na paradaịs ahụ ma ọ bụrụ na ị chee echiche banyere ihe ga-esi ná mkpebi ị na-eme ugbu a pụta.
4 Gbalịsie Ike Mee Ihe I Kpebiri Ime
Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi Chineke kwere ná nkwa? Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịmata Chineke nke ọma. (Jọn 17:3) Ọ bụrụ na ị mụta eziokwu dị na Baịbụl, ọ ga-eme ka i kwetasie ike na Chineke ga-emezu nkwa ndị o kwere. I kwetasie ike na Chineke ga-emezu nkwa ya, ọ ga-eme ka i kpebisikwuo ike ịhapụ otú i si ebi ndụ ma biwe ndụ otú ọ chọrọ.
Ka anyị leba anya n’ihe mere Michael. Ọ sịrị: “Ebidoro m ịṅụ ọgwụ ọjọọ na oké mmanya mgbe m dị afọ iri na abụọ. Anọ m n’òtù ọjọọ, na-atụkwa anya na m ga-anwụ tupu mụ agbaa iri afọ atọ. Ike ụwa bịara gwụ m, iwe ejukwa m obi, n’ihi ya m nwara ọtụtụ ugboro igbu onwe m. Ama m na e nwere ụdị ndụ ka ndụ m na-ebi mma, ma amaghị m ihe m ga-eme iji bie ụdị ndụ ahụ.” Mgbe Michael nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ otu n’ime ndị òtù ya Baịbụl. Michael kwetakwara ka Ndịàmà Jehova mụwara ya Baịbụl.
Ihe Michael mụtara na Baịbụl mere ka ọ gbanwee otú o si ele ọdịnihu anya. O kwuru, sị: “Amụtara m na Chineke ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs, nakwa na ndị mmadụ ga-ebi n’udo, ghara ịna-echegbu onwe ha. Amalitere m tụwa anya ibi na paradaịs ahụ. Mkpa m bụzi ime ihe ndị ga-eme ka mụ na Jehova dịrị ná mma. Ma ọ dịghịrị m mfe mgbe niile. O nwere mgbe ụfọdụ m ṅụbigara mmanya ókè n’agbanyeghị na amalitela m ịmụ Baịbụl. E nwekwara mgbe mụ na otu nwa agbọghọ kwara iko.”
Gịnị nyeere Michael aka ịkwụsị otú o si ebi ndụ, gharakwa imeghachi ihe ndị ahụ ọzọ? Ọ sịrị: “Onye na-amụrụ m Baịbụl gwara m ka m na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, gwakwa m ka mụ na ndị na-agba mbọ ime uche Chineke na-akpa. M chọpụtara na ndị òtù m ka na-eme ka m na-eme ihe ọjọọ. N’ihi ya, mụ na ha kwụsịrị ịkpa n’agbanyeghị na ha dị ka ụmụnne m.”
Michael kpebiri ime ihe ụfọdụ na-agaghị ewecha ya oge ime. Ihe ndị ahụ nyeere ya aka ịgbanwe otú o si ebi ndụ ma biwezie ndụ otú Chineke chọrọ, bụ́ nke wetụrụ ya oge ime. I nwere ike ime ihe ahụ o mere. Detuo ihe ndị ga-ewetụ oge ị ga-achọ ime n’ọdịnihu nakwa ihe ndị ị ga na-eme ugbu a, bụ́ ndị ga-enyere gị aka ime ha. Kọọrọ ndị ị maara ga-enyere gị aka ihe ndị ahụ ị chọrọ ime, gwakwa ndị ahụ ka ha na-agwa gị ma ị̀ na-eme ha.
Na-amụ banyere Chineke, na-emekwa ihe o kwuru ugbu a, asịla mgbe e mere. Mee ihe ọ bụla i nwere ike ime ugbu a ka ị hụ Chineke na Okwu ya bụ́ Baịbụl n’anya. Baịbụl kwuru banyere onye na-eme ihe Chineke chọrọ, sị: “Ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.”—Abụ Ọma 1:1-3.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.