‘Ihe Ga-eme Ka I Nweta Ndụ Ebighị Ebi’
“Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—JỌN 17:3.
IHE mmadụ ma nwere ike ime ka ọ zọọ onwe ya ma ọ bụ onye ọzọ ndụ. Ná mba Naịja, mgbe otu nwa ọhụrụ dị ọnwa iri, nke aha ya bụ Nouhou, rịawara ọrịa, mama ya bụ́ nọọsụ maara ihe o kwesịrị ime. O tinyere nnu na shuga ná mmiri dị ọcha ma nye ya nwa ya ka ọ ṅụọ. Ụlọ ọrụ òtù mba ụwa nke na-ahụ maka ụmụaka kwuru na “ọ bụ ihe ahụ nwaanyị ahụ mere ozugbo mere ka nwa ya gbakee ngwa ngwa.”
Ihe mmadụ mụtara na Baịbụl nwekwara ike ime ka onye ahụ dị ndụ. Mozis, bụ́ onye mbụ so dee Baịbụl, kwuru, sị: “Ọ bụghịrị unu okwu na-abaghị uru, kama ọ bụ ndụ unu, unu ga-esitekwa n’okwu a mee ka ụbọchị unu dị ogologo.” (Diuterọnọmi 32:47) Ihe e dere na Baịbụl ò nwere ike ime ka anyị dịkwuo ogologo ndụ? Olee otú ihe Baịbụl kwuru ga-esi eme ka anyị nwee ndụ ebighị ebi?
Isiokwu ise bú nke a ụzọ gosiri na amụma niile e buru na Baịbụl na-emezu, na ihe ndị a kọrọ na ya mere eme, na ihe ndị e kwuru na ya dabara n’ihe ndị dọkịta chọpụtara, na ihe niile e dere na ya bụ otu, nakwa na ihe ndị e kwuru na ya baara anyị uru taa. Ihe a niile na-egosi na Baịbụl bụ akwụkwọ pụrụ iche. Ebe ọ bụ na o kwukwara ihe ị ga-eme ka ị dị ndụ ebighị ebi, ọ̀ bụ na i kwesịghị iwepụta oge mụọ ya nke ọma?
Biko, gbalịa ka ị mụta otú ihe Baịbụl kwuru ga-esi mee ka obi ruo gị ala ugbu a, meekwa ka i nwee obi ụtọ n’ọdịnihu. Obi ga-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ịmụta ihe Baịbụl na-ekwu.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]
Ihe ọzọ mere Baịbụl ji bụrụ akwụkwọ pụrụ iche bụ na ọ bụ naanị ya zara ajụjụ ndị a ndị mmadụ na-ajụkarị:
• Ànyị nọ n’ụwa a eme gịnị?
• Gịnị mere ndị mmadụ ji atagbu onwe ha n’ahụhụ?
• Ànyị ga-emecha hụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ?
Ị ga-ahụ otú Baịbụl si zaa ajụjụ ndị a n’akwụkwọ a Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ndịàmà Jehova bipụtara.