Isiokwu Ndị Dị n’Akwụkwọ A
Septemba 15, 2012
© 2012 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania. Naanị anyị ka ikike ibipụtaghachi ya dị n’aka.
Nke A na-amụ Amụ
ISIOKWU NDỊ A GA-AMỤ AMỤ
ỌKTOBA 22-28, 2012
ỌKTOBA 29, 2012–NỌVEMBA 4, 2012
Udo nke Ga-adịru Otu Puku Afọ Nakwa Mgbe Ebighị Ebi!
NỌVEMBA 5-11, 2012
Mụta Ihe n’Otú Jehova na Jizọs Si Enwe Ndidi
NỌVEMBA 12-18, 2012
“Unu Amaghị Ụbọchị Ma Ọ Bụ Oge Awa Ọ Ga-abụ”
NỌVEMBA 19-25, 2012
Jehova Na-akpọkọta Ndị Ya, Bụ́ Ndị Obi Dị Ụtọ
IHE ISIOKWU NDỊ A GA-AMỤ AMỤ NA-EKWU
ISIOKWU NKE 1, 2 PEEJI NKE 3-12
Ihe ndị dị egwu ga-eme n’oge na-adịghị anya. N’isiokwu ndị a, anyị ga-atụle ihe iri anyị kwesịrị iburu n’uche. Ise n’ime ha gbasara mbibi a ga-ebibi ụwa Setan, ise ndị ọzọ gbasara ụwa ọhụrụ.
ISIOKWU NKE 3 PEEJI NKE 18-22
Anyị niile na-atụsi anya ike ịhụ ọgwụgwụ ụwa ochie a, nke ga-eme ka Chineke weta Paradaịs o buru n’amụma. Ma ànyị echeela ọnwa ole na ole ma ọ bụ ọtụtụ afọ, gịnị mere ndidi ji dị anyị mkpa? Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịmụta inwe ndidi, bụ́ ihe dị anyị mkpa.
ISIOKWU NKE 4 PEEJI NKE 23-27
Ndị Chineke niile na-atụsi anya ọgwụgwụ ụwa ochie a ike. Isiokwu a ga-eme ka anyị mata na e nwere uru ndị anyị na-erite n’ihi na anyị amaghị kpọmkwem ụbọchị ma ọ bụ oge awa ọgwụgwụ ga-abịa.
ISIOKWU NKE 5 PEEJI NKE 28-32
Kemgbe ọtụtụ afọ, mgbakọ bụ ihe dị ezigbo mkpa n’ofufe Chineke. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ụfọdụ mgbakọ pụrụ iche e nwere ma n’oge Baịbụl ma n’oge anyị a nakwa uru ndị anyị na-erite n’ịga mgbakọ.
ISIOKWU ỌZỌ DỊ N’ỤLỌ NCHE A
13 Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Nwere ná Nzukọ Chineke—Na-egosi na Jehova Hụrụ Anyị n’Anya
IHE E SERE N’IHU ỤLỌ NCHE A: Ụmụnna nọ na Filipinz na-agba mbọ izi mmadụ niile ozi ọma, dị ka a na-ezi nwoke a nọ n’ọgba tum tum nwere ụkwụ atọ n’ebe ugwu Luzọn
FILIPINZ
NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA YA
177,635
NDỊ ỌSỤ ỤZỌ OGE NIILE
29,699
NDỊ E MERE BAPTIZIM N’AFỌ 2011
8,586
ASỤSỤ OLE A NA-ASỤGHARỊ AKWỤKWỌ ANYỊ NA HA
21