Ụlọikpe Ndị Yurop Ekpebiela Na Mmadụ Nwere Ike Ịjụ Ịbụ Onye Agha
A MA Ndịàmà Jehova ama n’ụwa niile na ha anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa na ha anaghị aga agha. Ha kweere na ha kwesịrị ‘ịkpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè,’ kwerekwa na ha ekwesịghị ‘ịmụ otú e si alụ agha.’ (Aịzaya 2:4) Ha anaghị agwa ndị chọrọ ịbụ ndị agha ka ha ghara ịbụ. Ma olee ihe Onyeàmà Jehova ga-eme ma ọ bụrụ na akọnuche ya ekweghị ya bụrụ onye agha, ma ya abụrụ na iwu mba o bi na ya kwuru na ọ ga-abụrịrị onye agha? Otu nwa okorobịa aha ya bụ Vahan Bayatyan nwere ụdị nsogbu a.
Ihe Ndị Mere Tupu E Wepụ Okwu Ya n’Ụlọikpe Ndị Yurop
A mụrụ Vahan n’ọnwa Eprel n’afọ 1983, ná mba a na-akpọ Aminia. N’afọ 1996, Ndịàmà Jehova malitere ịkụziri ya na ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ha Baịbụl. E mere Vahan baptizim mgbe ọ dị afọ iri na isii. Ihe Vahan mụtara na Baịbụl mere ka ọ malite irube isi n’iwu Jizọs Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya. Otu n’ime ha bụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs ekwesịghị ịlụ agha. (Matiu 26:52) Ọ bụ nke a mere ọnwụnwa ji bịara Vahan obere oge e mechara ya baptizim.
Iwu mba Aminia kwuru na nwa okorobịa ọ bụla ruru afọ iri na asatọ ga-abụrịrị onye agha. Ọ bụrụ na onye ahụ ajụ ime otú ahụ, a ga-atụ ya mkpọrọ afọ atọ. Vahan chọkwaranụ ịrụrụ obodo ya ọrụ. Ma, n’ihi ihe ndị ọ mụtara na Baịbụl, ọ chọghị ịrụ ọrụ ọ ga-abụ ya rụchaa, akọnuche ya apịawa ya ụtarị. Gịnị ka o meziri?
Ozugbo Vahan ma na oge a ga-akpọ ya ka ọ bụrụ onye agha eruola, ya bụ, n’afọ 2001, ọ malitere idegara ndị isi obodo ya akwụkwọ ozi. Ọ gwara ha n’akwụkwọ ozi ahụ na akọnuche ya na ihe ndị ọ mụtara na Baịbụl agaghị ekwe ya ka ọ bụrụ onye agha. Ọ gwakwara ha na ya ga-achọ ịrụrụ obodo ya ọrụ ọ bụla ọzọ na-abụghị ọrụ agha.
Vahan nọgidere na-arịọ ndị isi ahụ ruo ihe karịrị otu afọ. Ma n’ọnwa Septemba n’afọ 2002, a nwụchiri Vahan ma kpụpụ ya n’ụlọikpe maka na ọ sịrị na ya agaghị abụ onye agha. Mgbe e kpechara ya ikpe, a tụrụ ya mkpọrọ ọnwa iri na asatọ. Ma, obi adịghị ọkàiwu gbara ya akwụkwọ mma na ọ bụ naanị mkpọrọ ọnwa iri na asatọ ka a tụrụ ya. Naanị otu ọnwa a tụchara Vahan mkpọrọ, ọkàiwu ahụ gbara ya akwụkwọ n’ụlọikpe mkpegharị ikpe maka na ọ chọrọ ka ha tụọ ya mkpọrọ karịa ọnwa iri na asatọ ahụ. Ọ sịrị na ihe ahụ Vahan kwuru na ọ bụ ya mere ya ji jụ ịbụ onye agha “bụ okpookpo ụgha, jọgbuokwa onwe ya n’ihi na ọ ga-emebiri obodo ha ihe.” Ụlọikpe mkpegharị ikpe ahụ kwetara ihe ọkàiwu ahụ kwuru ma tụọ Vahan mkpọrọ ọnwa iri atọ.
Ihe ahụ ụlọikpe ahụ kpebiri adịghị Vahan mma, ya ewepụzie okwu ahụ n’ụlọikpe kasị elu n’Aminia. N’ọnwa Jenụwarị nke afọ 2003, ụlọikpe ahụ kasị elu kwuru na ha kwadoro ihe ụlọikpe mkpegharị ikpe ahụ kpebiri. Ozugbo e kpebiri ikpe ahụ, e buuru Vahan gaa n’ụlọ mkpọrọ ọzọ bụ́ ebe ndị gburu ọchụ, ndị na-ere ọgwụ ike, na ndị dinara ụmụ nwaanyị n’ike nọcha.
Ihe Ndị Mere n’Ụlọikpe Ndị Yurop
Mba Aminia sonyeere Òtù Na-ahụ Maka Udo na Yurop kemgbe afọ 2001. N’ihi ya, ụmụ amaala Aminia nwere ike iwepụ okwu ha n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop ka ha lebagharịa ya anya ma ọ bụrụ na ha echee na ụlọikpe ndị dị n’Aminia kpere ha ikpe mkpegbu. Ọ bụ ihe a ka Vahan mere. N’akwụkwọ o degaara Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop, o kwuru na mkpọrọ a tụrụ ya maka na ya achọghị ịbụ onye agha adabaghị n’Iwu nke Itoolu nke Nkwekọrịta Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Yurop. Ọ rịọrọ ụlọikpe ahụ ka ha kagbuo mkpọrọ ahụ a tụrụ ya ebe ọ bụ na iwu nke itoolu ahụ kwuru na mmadụ nwere ike ịjụ ịbụ onye agha n’ihi akọnuche ya. Tupu mgbe ahụ, o nwebeghị onye ụlọikpe a kwuru na o nwere ike ịjụ ịbụ onye agha n’ihi ihe iwu nke itoolu ahụ kwuru.
N’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa Ọktoba n’afọ 2009, ụlọikpe ahụ kpebiri ikpe ahụ. Ụlọikpe ahụ kwuru na ikpe ndị e kperela ekpe gosiri na iwu nke itoolu ahụ ekwughị na mmadụ nwere ike ịjụ ịbụ onye agha n’ihi akọnuche ya.
Tupu ụlọikpe ahụ ekpebie ikpe ahụ, Vahan agachaala mkpọrọ pụta, lụọ nwaanyị ma mụta nwa nwoke. Ihe a ụlọikpe ahụ kpebiri adịghị Vahan mma. Ma e nwere ihe abụọ o nwere ike ime n’okwu ahụ. Nke mbụ bụ na o nwere ike iwere ihe a ụlọikpe ahụ kpebiri. Nke abụọ abụrụ na o nwere ike iwega ya n’aka Òtù Ikpe Kacha Elu nke ụlọikpe ahụ na-ahụ maka ihe ruuru mmadụ na Yurop. O wegara okwu ahụ n’aka òtù ikpe ahụ kacha elu. Ma ọ bụghị okwu niile ka òtù ikpe a na-eleba anya. Ọ bụ ya mere obi ji tọọ Vahan ụtọ mgbe ha kwetara ileba okwu ya anya.
N’abalị asaa n’ọnwa Julaị n’afọ 2011, òtù ikpe ahụ kacha elu nọ n’ụlọikpe ha dị na Strasbọg, ná mba Frans, kpebie ikpe ahụ. Mmadụ iri na isii n’ime ndị ọkàikpe iri na asaa so n’òtù ikpe ahụ kwuru na mba Aminia kpere Vahan Bayatyan ikpe mkpegbu mgbe ha mara ya ikpe ma tụọ ya mkpọrọ maka na o kweghị abụ onye agha n’ihi akọnuche ya. Ọ bụ naanị otu ọkàikpe kwuru na e kpeghị ya ikpe mkpegbu. Ọkàikpe ahụ bụkwanụ onye Aminia.
Olee ihe mere ihe a ha kpebiri ji pụọ iche? Ọ bụ maka na ihe a bụ nke mbụ ụlọikpe ahụ kwuru na iwu nke itoolu ahụ kwadoro na mmadụ nwere ike ịjụ ịbụ onye agha n’ihi akọnuche ya. N’ihi ya, ụlọikpe ahụ weere ya na mba ọ bụla tụrụ nwa amaala ya mkpọrọ n’ihi na onye ahụ jụrụ ịbụ onye agha kpere onye ahụ ikpe mkpegbu.
Ebe ọ bụ na Ndịàmà Jehova anaghị abụ ndị agha n’ihi akọnuche ha, ụlọikpe ahụ kwuru, sị: “N’ihi ya, o doro ụlọikpe a anya na ihe mere Vahan ji jụ ịbụ onye agha bụ n’ihi ihe ndị o kweere. E kwesịghị iwere na ihe ndị a o kweere enweghị isi n’ihi na o ji obi ya niile kwere ha, ọ bụkwa ha mere na ọ chọghị ịbụ onye agha.”
Ihe Mba Aminia Mere Kemgbe E Kpechara Ikpe Ahụ
Kemgbe iri afọ abụọ gara aga, mba Aminia atụọla ihe karịrị narị Ndịàmà Jehova anọ na iri ise mkpọrọ maka na ha jụrụ ịbụ ndị agha n’ihi akọnuche ha. Mgbe a na-ede isiokwu a, e nwere ụmụ okorobịa iri ise na asatọ nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi otu ihe ahụ. Ọ bụ mgbe e kpecharala ikpe Vahan Bayatyan ka a tụrụ mmadụ ise n’ime ha mkpọrọ.a Mgbe a na-ekpe ikpe otu nwa okorobịa n’ime ụmụ okorobịa ise ahụ, nwa okorobịa ahụ dere akwụkwọ ma rịọ ọkàiwu gbara ya akwụkwọ ka ọ kagbuo akwụkwọ ọ gbara ya na ya bụ onye ọjọọ. Mgbe ọ rịọchara ọkàiwu ahụ arịrịọ, ọkàiwu ahụ dere, sị: “Ihe ahụ Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop kpebiri n’abalị asaa n’ọnwa Julaị n’afọ 2011 n’ikpe Bayatyan agbasaghị ikpe nke a n’ihi na ha abụọ abụghị otu.”
Gịnị mere ọkàiwu ahụ ji kwuo ihe ahụ o kwuru? Mgbe a gbara Vahan Bayatyan akwụkwọ n’ụlọikpe, e nweghị ọrụ ọzọ iwu mba Aminia kwuru na e nwere ike inye onye jụrụ ịbụ onye agha n’ihi akọnuche ya. Gọọmenti mba Aminia kwuru na kemgbe e kpechara ikpe Vahan Bayatyan, e nweela iwu kwuru ọrụ ọzọ e nwere ike inye onye jụrụ ịbụ onye agha n’ihi akọnuche ya. Ma, ọ bụ ndị agha na-ahụ maka ọrụ ọzọ ahụ a sị na e nwere ike inye onye jụrụ ịbụ onye agha, n’ihi ya, ọtụtụ n’ime ndị jụrụ ịbụ ndị agha enweghị mmasị n’ọrụ ọzọ ahụ n’ihi na ya na ịbụ onye agha ka bụkwa otu ihe.
Otú ikpe ahụ si bie tọrọ Vahan Bayatyan ụtọ. Ihe ahụ ụlọikpe ahụ kpebiri ga-eme ka mba Aminia kwụsị ịgba ndị jụrụ ịbụ ndị agha n’ihi akọnuche ha akwụkwọ na ịtụ ha mkpọrọ.
Ihe mere Ndịàmà Jehova ji ewepụ okwu ụfọdụ n’ụlọikpe abụghị ka ha gbanwee iwu mba ọ bụla. Kama, dị ka Vahan Bayatyan mere, ihe bụ́ mkpa ha bụ ka a hapụ ha ka ha na-efe Chineke ebe ọ bụ na iwu obodo ebe ha bi nyere ha ikike ka ha na-eme otú ahụ. Gịnị mere nke ahụ ji dị ha mkpa? Ọ bụ n’ihi na nke a ga-eme ka ha nwee ike ibi n’udo ma na-erube isi n’iwu niile Onye ndú ha bụ́ Jizọs Kraịst nyere ha.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a A mara mmadụ abụọ n’ime ha ikpe n’abalị asaa n’ọnwa Julaị n’afọ 2011, nke bụ́kwanụ ụbọchị Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop kpebiri ikpe Bayatyan.
[Foto dị na peeji nke 30]
Ebe Vahan Bayatyan nọ n’ihu ụlọ mkpọrọ dị na Nubarashen, n’Aminia
[Foto dị na peeji nke 30]
Ebe Bayatyan na ndị ọkàiwu ya nọ n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop, na Nọvemba 24, 2010
[Foto dị na peeji nke 31]
Bayatyan na nwunye ya Tsovinar, na nwa ha nwoke bụ́ Vahe