Isiokwu Ndị Dị n’Akwụkwọ A
Mach 15, 2013
© 2013 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania. All rights reserved.
NKE A NA-AMỤ AMỤ
EPREL 29, 2013–MEE 5, 2013
‘Ọ Dịghị Ihe Na-eme Ka Ndị Hụrụ Jehova n’Anya Sụọ Ngọngọ’
MEE 6-12, 2013
Ì Nwere ‘Obi Ị Ga-eji Mara’ Jehova?
MEE 13-19, 2013
“Ugbu A Unu Maara Chineke,” Gịnị Ka Unu Kwesịrị Ime?
MEE 20-26, 2013
MEE 27, 2013–JUN 2, 2013
ISIOKWU NDỊ A GA-AMỤ AMỤ
▪ ‘Ọ Dịghị Ihe Na-eme Ka Ndị Hụrụ Jehova n’Anya Sụọ Ngọngọ’
Ndị Kraịst niile na-agba ọsọ ndụ ebighị ebi. Ma, anyị niile na-asụ ngọngọ n’ihi ezughị okè. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịchọpụta ihe ise nwere ike ime ka anyị sụọ ngọngọ, meekwa ka anyị mata ihe anyị ga-eme ka ha ghara igbochi anyị inweta ndụ ebighị ebi.
▪ Ì Nwere ‘Obi Ị Ga-eji Mara’ Jehova?
Akwụkwọ Jeremaya gwara anyị ọtụtụ ihe banyere obi. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịghọta ihe ‘obi a na-ebighị úgwù’ bụ, na otú ụdị obi ahụ nwere ike isi kpatara Ndị Kraịst nsogbu. Anyị ga-amụtakwa otú anyị ga-esi nwee ‘obi anyị ga-eji mara’ Jehova.—Jere. 9:26; 24:7.
▪ “Ugbu A Unu Maara Chineke,” Gịnị Ka Unu Kwesịrị Ime?
Gịnị ka ịmara Chineke na ịbụ onye ọ maara pụtara? Olee otú anyị ga-esi na-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike ọ bụrụgodị na anyị bụ Ndị Kraịst kemgbe ọtụtụ afọ? Gịnịkwa mere anyị ga-eji na-eme otú ahụ? Isiokwu a ga-enyere gị aka ịza ajụjụ ndị a.
▪ Jehova Bụ Ebe Obibi Anyị
Ụwa a kpọrọ anyị asị, ma anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ. Isiokwu a ga-eme ka anyị mata na Jehova Chineke na-echebe ndị ohu ya.
▪ Na-akwanyere Aha Ukwu Jehova Ùgwù
Gịnị ka iso ná ndị a kpọkwasịrị aha Chineke pụtara? Gịnị ka ijegharị n’aha Chineke pụtara? Oleekwa otú Chineke si ele ndị na-anaghị akwanyere aha ya ùgwù anya? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a.
ISIOKWU NDỊ ỌZỌ DỊ N’ỤLỌ NCHE A
18 Kwe Ka A Kasie Gị Obi, Na-akasikwa Ndị Ọzọ Obi
29 Ọ̀ Bụ Josifọs Dere Ya n’Eziokwu?
IHE E SERE N’IHU ỤLỌ NCHE A: Ikpere mmiri dị na Finland toro ezigbo ogologo, e nwekwara ọtụtụ agwaetiti na ya. E nwekwara ọtụtụ puku ọdọ mmiri n’obodo ahụ, karịchaa n’ime ime Finland nakwa n’ebe ọwụwa anyanwụ ya. E nwere ndị nkwusa na-aga enye aka mgbe ụfọdụ n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. Ụfọdụ n’ime ha na-eji ụgbọ mmiri aga ekwusa ozi ọma
FINLAND
MMADỤ OLE BI NA YA:
5,375,276
MMADỤ OLE OTU ONYE NKWUSA KETARA:
283
NDI ỌSỤ ỤZỌ OGE NIILE:
1,824