Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 4/1 p. 16
  • AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Bible—Akwụkwọ E Mere Ka A Aghọta Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Olee Otú Anyị Si Ege Chineke Ntị?
    Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi
  • Mmadụ Ịghọtahie Ihe Baịbụl Kwuru, Ọ̀ Bụ Obere Ihe?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Olee Ihe Mere Anyị Ga-eji Mụta Ihe n’Aka Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 4/1 p. 16

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Mmadụ ò nwere ike ịghọta ihe e dere na Baịbụl?

[Foto dị na peeji nke 16]

Baịbụl bụ Okwu Chineke. Baịbụl dị ka akwụkwọ ozi nke nna hụrụ nwa ya n’anya detaara nwa ya. (2 Timoti 3:16) Na Baịbụl, Chineke kwuru ihe ndị anyị ga-eme ka obi na-atọ ya ụtọ, kwuokwa ihe mere o ji kwe ka ihe ọjọọ na-eme n’ụwa, nakwa ihe ọ ga-emere ụmụ mmadụ n’ọdịnihu. Ma ndị isi okpukpe dị iche iche na-asụgharị Baịbụl isi. Nke a emeela ka ọtụtụ ndị chee na mmadụ agaghị enwe ike ịghọta ihe e dere na Baịbụl.—Ọrụ Ndịozi 20:29, 30.

Jehova Chineke chọrọ ka anyị mata onye ọ bụ nke ọma. Ọ bụ ya mere o ji nye anyị Baịbụl nke bụ́ akwụkwọ anyị ga-aghọtali ihe e dere na ya.—Gụọ 1 Timoti 2:3, 4.

Olee otú i nwere ike isi ghọta ihe e dere na Baịbụl?

Ihe Jehova mere abụghị naanị inye anyị Baịbụl, ọ na-enyekwara anyị aka ịghọta ihe e dere na ya. O zitere Jizọs ka ọ kụziere anyị ihe. (Luk 4:16-21) Jizọs nyeere ndị ọ kụziiri ihe aka ka ha ghọta Akwụkwọ Nsọ. Jizọs kọwaara ha amaokwu dị iche iche na Baịbụl.—Gụọ Luk 24:27, 32, 45.

Jizọs malitekwara ọgbakọ Ndị Kraịst. Ihe mere o ji malite ya bụ ka Ndị Kraịst na-arụ ọrụ ahụ ọ malitere. (Matiu 28:19, 20) Taa, ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs na-enyere ndị mmadụ aka ka ha ghọta ihe Baịbụl kwuru banyere Chineke. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọta ihe e dere na Baịbụl, obi ga-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 8:30, 31.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya