Isiokwu Ndị Dị n’Akwụkwọ A
Nọvemba 15, 2013
© 2013 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania.
NKE A NA-AMỤ AMỤ
DISEMBA 30, 2013–JENỤWARỊ 5, 2014
“Mụrụnụ Anya Ka Unu Wee Na-ekpe Ekpere”
JENỤWARỊ 6-12, 2014
Olee Otú Anyị Ga-esi ‘Na-echere Chineke’?
JENỤWARỊ 13-19, 2014
Ole Ndị Taa Bụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ Asaa na Ndị Isi Asatọ?
JENỤWARỊ 20-26, 2014
Na-erubere Ndị Na-azụ Atụrụ Jehova Isi
JENỤWARỊ 27, 2014–FEBỤWARỊ 2, 2014
ISIOKWU NDỊ A GA-AMỤ AMỤ
▪ “Mụrụnụ Anya Ka Unu Wee Na-ekpe Ekpere”
Ebe ọ bụ na ọ fọrọ obere ka e bibie ụwa Setan, anyị kwesịrị ịmụrụ anya. Isiokwu a na-egosi na anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere ka anyị nwee ike ịmụrụ anya.
▪ Olee Otú Anyị Ga-esi ‘Na-echere Chineke’?
N’isiokwu a, anyị ga-amụta ihe n’otú Maịka onye amụma si nwee ndidi. Anyị ga-atụle ihe ndị ga-egosi na oge eruola ka Jehova bibie ụwa ochie a, tụleekwa otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka otú Chineke si nwee ndidi.
▪ Ole Ndị Taa Bụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ Asaa na Ndị Isi Asatọ?
E nwere ọtụtụ ihe bara uru anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Baịbụl kọrọ gbasara ọgụ Senakerib bịara ịlụso Jeruselem n’oge Hezekaya na-achị. Ihe e kwuru n’isiokwu a ga-abara ndị Chineke nyere ọrụ ilekọta ọgbakọ ya uru.
▪ Na-erubere Ndị Na-azụ Atụrụ Jehova Isi
▪ Ndị Ọzụzụ Atụrụ, Ṅomienụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ Kacha Ukwuu
Isiokwu nke mbụ kwuru otú Jehova na Jizọs si azụ atụrụ ha n’ụwa taa nakwa ihe anyị ga-eme ka otú ha si na-eduzi anyị ma na-elekọta anyị baara anyị uru. Isiokwu nke abụọ kwuru otú ndị okenye kwesịrị isi na-akpa àgwà ka ha na-azụ atụrụ Chineke.
ISIOKWU NDỊ ỌZỌ DỊ N’ỤLỌ NCHE A
8 Otú Anyị Nwere Ike Isi Nyere Ndị Ọzọ Aka
IHE E SERE N’IHU ỤLỌ NCHE A: Ebe ụmụnna anyị na-ekwusa ozi ọma n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè na Tokio. Ihe karịrị nde mmadụ abụọ na narị puku asatọ na-esi ebe dị iche iche aga ọrụ na Tokio n’ụbọchị ọ bụla. Ụmụnna na-agba mbọ ka ha zie ndị a na-enwetaghị n’ozi ụlọ n’ụlọ ozi ọma
JAPAN
MMADỤ OLE BI NA YA:
126,536,000
NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA YA:
216,692
NDỊ ỌSỤ ỤZỌ OGE NIILE OLE NỌ NA YA:
65,245