Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w14 4/1 p. 13
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịhụnanya Ụmụnna Dị Irè
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • ‘Ịrịọ Arịrịọ n’Ihi Ịhụnanya’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Faịlimọn Na Ọnisimọs—Ndị E Jikọtara n’Òtù Ụmụnna Ndị Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Mgbe Pọl Nọ na Rom
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
w14 4/1 p. 13

Ị̀ MAARA?

Olee otú e si emeso ndị ohu mgbe ndị Rom na-achị ụwa?

Ígwè ndị Rom na-anyawa ndị ohu ha n’olu. E dere ya ihe

Ígwè ndị Rom na-anyawa ndị ohu n’olu

E nwere ọtụtụ ndị ghọrọ ndị ohu mgbe ndị Rom na-achị ụwa. E jidere ụfọdụ n’ime ha mgbe e meriri obodo ha n’agha, a tọkwaara ụfọdụ atọrọ. Ọ na-abụ e jide ha ma ọ bụ tọrọ ha, e ree ha. Ha agaghịkwa ahụ obodo ha ma ọ bụ ezinụlọ ha anya ọzọ.

A na-akpọga ọtụtụ ndị ohu n’ebe a na-egwupụta akụ̀ ndị dị n’ime ala. Ụfọdụ n’ime ha na-arụgide ọrụ n’ebe ahụ nwụọ. Ma, e nwere ndị nke a na-akpọga n’ubi ma ọ bụ n’ụlọ ndị mmadụ ka ha rụwa ọrụ. Ihe na-akatụrụ hanwa mfe karịa ndị nke a na-akpọga n’ebe a na-egwupụta akụ̀ ndị dị n’ime ala. A na-anyawa ndị ohu ígwè n’olu, a na-edekwa ihe n’ígwè ahụ. Ihe a na-ede na ya bụ na ọ bụrụ na ohu ahụ agbafuo, a ga-enye onye ọ bụla kpọlatara ya onyinye. Ọ bụrụ na ohu agbalịa ọtụtụ ugboro ka ọ gbafuo, a na-eji ígwè ọkụ nwere mkpụrụ akwụkwọ bụ́ F daa ya n’egedege ihu. Mkpụrụ akwụkwọ a nọchiri anya okwu Latịn bụ́ fugitivus. Ihe ọ pụtara bụ onye gbara ọsọ.

Akwụkwọ Baịbụl bụ́ Faịlimọn kwuru na Pọl onyeozi zighachiiri Faịlimọn ohu ya a na-akpọ Onesịmọs. Ọ bụ eziokwu na Faịlimọn kwesịrị ịta Onesịmọs ezigbo ahụhụ maka na ọ gbapụrụ n’ụlọ ya, Pọl gwara Faịlimọn ka o “jiri obiọma nabata” Onesịmọs ebe ọ bụ na ha aghọọla Ndị Kraịst hụrụ ibe ha n’anya.—Faịlimọn 10, 11, 15-18.

Gịnị ka e ji mara mba Finishia n’oge ochie?

Owu ndị Taya sijiri ka ọ chawa pọpụl pọpụl na ihe e si na ya nweta ihe e ji sijie ya

Ihe e ji mara mba Finishia n’oge ochie bụ ihe e ji esiji ákwà ka ọ chawa pọpụl pọpụl. Ihe a na-akpọzi ebe ahụ Finishia dị bụ Lebanọn. Taya bụ obodo a ma ama na Finishia, e jikwa aha ya mara ihe ahụ e ji esiji ákwà. Eze Izrel bụ́ Sọlọmọn ji “ajị anụ e sijiri odo odo” ma ọ bụ pọpụl pọpụl chọọ ụlọ Chineke mma. Ọ bụ otu nwoke si Taya mepụtara ajị anụ ahụ.​—⁠2 Ihe E Mere 2:​13, 14.

Ihe ndị Taya ji esiji ákwà ka ọ chawa pọpụl pọpụl kacha oké ọnụ n’oge ahụ n’ihi na ọrụ a na-arụ tupu e nweta ya adịghị mfe. Ọrụ mbụ a na-arụ bụ ịga n’osimiri tụtụọ ihe a yiri eju e sere n’aka ekpe. A na-atụtụ ya ebe o buru ibu n’ihi na e nwere ike iji ihe ruru puku iri na abụọ sijie naanị otu ákwà. A tụtụchaa ha, a na-ewepụta ha ná mkpokoro ha ka e nweta ihe e ji esiji ákwà dị n’ime ha. E wepụtachaa ha, a na-etinye ha nnu ma dowe ha ebe ikuku ga na-eku ha nakwa ebe anwụ ga na-acha ha ruo abalị atọ. A na-etinyezi ha n’ite, kunye mmiri si n’osimiri n’ite ahụ ma sinye ya n’ọkụ na-anaghị enwusi ike ruo abalị ole na ole.

Ndị Finishia nọ na-emepụta ihe e ji esiji ákwà ka ọ chawa pọpụl pọpụl ma na-ere ya ruo ọtụtụ narị afọ. Ihe mere ha ji nwee ike ime ya bụ na mba Finishia chịrị ọtụtụ mba ndị ọzọ, azụmahịa dokwara ha anya. Ihe a hụrụ n’ebe ndị dị nso n’Oké Osimiri Mediterenian ruo n’ebe ọwụwa anyanwụ obodo Kadiz nke dị na Spen gosiri na ha mepụtara ihe e ji esiji ákwà n’oge ochie.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya