Isiokwu Ndị Dị n’Akwụkwọ A
Ọktoba 15, 2014
© 2014 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
NKE A NA-AMỤ AMỤ
DISEMBA 1-7, 2014
Nwee Okwukwe Siri Ike n’Alaeze Chineke
DISEMBA 8-14, 2014
Unu Ga-abụ “Alaeze nke Ndị Nchụàjà”
DISEMBA 15-21, 2014
Jiri Ọrụ Gị na Jehova Na-arụkọ Kpọrọ Ihe
DISEMBA 22-28, 2014
ISIOKWU NDỊ A GA-AMỤ AMỤ
▪ Nwee Okwukwe Siri Ike n’Alaeze Chineke
▪ Unu Ga-abụ “Alaeze nke Ndị Nchụàjà”
Jehova ga-eji ọchịchị Jizọs mezuo ihe o bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ. Ka anyị na-atụle otú ọgbụgba ndụ dị iche iche e kwuru okwu ha na Baịbụl si gbasa ọchịchị Mesaya, chọpụta ihe mere anyị ji kwesị ịtụkwasị Alaeze Chineke obi.
▪ Jiri Ọrụ Gị na Jehova Na-arụkọ Kpọrọ Ihe
N’isiokwu a, anyị ga-atụle gbasara ụfọdụ ndị fere Jehova ma n’oge ochie ma n’oge anyị a. Ọ ga-eme ka anyị jirikwuo ihe ùgwù anyị nwere kpọrọ ihe, ya bụ, ịbụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.
▪ “Na-atụkwasịnụ Uche n’Ihe Ndị Dị n’Elu”
N’oge ikpeazụ a, e nwere ọtụtụ ihe nwere ike ime ka okwukwe anyị ghara isi ike. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Ebreham na Mozis, bụ́ ndị ji obi ha niile jeere Chineke ozi n’oge ochie? Isiokwu a ga-agba anyị ume ka anyị mee ka uche anyị dịrị n’ebe Jehova nọ, dịrịkwa n’Alaeze ya. Ọ ga-esi otú ahụ nyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị.
ISIOKWU NDỊ ỌZỌ DỊ N’ỤLỌ NCHE A
IHE E SERE N’IHU ỤLỌ NCHE A: Ebe ụmụnna nwaanyị abụọ na-ezi ndị na-agafe agafe ozi ọma n’ebe dị nso n’ugwu Mbololo, n’agbata ebe ndịda na ebe ọwụwa anyanwụ Kenya. Ha nọ n’okporo ụzọ gafere n’obodo Taụsa, n’ebe a na-akpọ Taịta
KENYA
MMADỤ OLE BI NA YA
44,250,000
NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA YA
26,060
MMADỤ OLE A NA-AMỤRỤ BAỊBỤL
43,034
NDỊ BỊARA NCHETA ỌNWỤ JIZỌS N’AFỌ 2013
60,166