Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 8/1 p. 3-4
  • Gịnị Na-eme Mmadụ Ma Ọ Nwụọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Na-eme Mmadụ Ma Ọ Nwụọ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ?
  • Gịnị n’Ezie Bụ Hel?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ n’Ọnwụ
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ọ Bụrụ na Mmadụ Anwụọ, Ọ Pụtaghị na nke Ya Agaala
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ezigbo Olileanya nke Dịịrị Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 8/1 p. 3-4

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | NDỊ NWỤRỤ ANWỤ HÀ GA-ADỊLI NDỤ ỌZỌ?

Gịnị Na-eme Mmadụ Ma Ọ Nwụọ?

Ebe ndị dimkpa na ụmụaka nọ n’akụkụ igbe ozu na-eru uju n’ebe a na-eli ozu

Otu nwoke aha ya bụ Lionel kwuru, sị: “Echere m na ebe atọ mmadụ nwere ike ịga ma ọ nwụọ bụ eluigwe, ọkụ mmụọ na pọgatrị. Ama m na erughị m eru ịga eluigwe nakwa na ajọ omume m erughị nke ịga ọkụ mmụọ. Ma, aghọtachaghị m ihe a na-akọ gbasara pọgatrị. Ndị mmadụ na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ na-aga n’ebe atọ ndị a. Agụtatụbeghị m ụdị ihe ahụ na Baịbụl.”

Otu nwoke aha ya bụ Fernando kwuru, sị: “A kụziiri m na mmadụ nwụọ, ya agaa eluigwe, ma ekwetaghị m. Echere m na onye nwụọ nke ya agaala, onye ahụ emekataghị dịrị ndụ ọzọ.”

È nwetụla mgbe ị jụrụ onwe gị, sị: ‘Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ? È nwere ebe ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ nọ na-ata ahụhụ? Ànyị ga-ahụ ha ọzọ? Olee otú anyị ga-esi amata nke bụ́ eziokwu?’ Ka anyị legodị ihe Baịbụl kwuru. Anyị ga-ebu ụzọ leba anya n’ihe o kwuru na-eme mmadụ ma ọ nwụọ. E mechaa, anyị eleba anya n’ihe o kwuru gbasara ndị nwụrụ anwụ ịdị ndụ ọzọ.

Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ?

IHE BAỊBỤL ZARA: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị, ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ ha nwere ọzọ, n’ihi na e chefuwo ihe niile a pụrụ icheta banyere ha. Ihe niile ruru gị aka ime, jiri ike gị dum mee ha, n’ihi na ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị na Shiol, ebe ị na-aga.”a—Ekliziastis 9:5, 10.

Shiol bụ ebe onye ọ bụla nwụrụnụ na-aga. Ndị niile nọ na ya amaghị ihe ọ bụla, o nweghịkwa ihe ha ga-emeli. Olee ihe Job bụ́ onye ezi omume chere gbasara Shiol? N’otu ụbọchị, ụmụ Job na ihe niile o nwere lara n’iyi. Ka obere oge gachara, etuto ọjọọ etoo ya n’ahụ́ niile. Job rịọrọ Chineke sị: “A sị nnọọ na ị ga-ezobe m na Shiol, [“n’ime ala mmụọ,” Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik] na ị ga-ezobe m.” (Job 1:13-19; 2:7; 14:13) O doro anya na Job ewereghị Shiol ka ọkụ ala mmụọ, ebe ọ ga-aga takwuo ahụhụ. Kama, o weere ya ka ebe ọ ga-anọ zuru ike.

Ihe ọzọ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ bụ ịgụ ihe e dere na Baịbụl gbasara mmadụ asatọ si n’ọnwụ bilie.—Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “Mmadụ Asatọ Baịbụl Kwuru na A Kpọlitere n’Ọnwụ.”

O nweghị onye n’ime ha kwuru na ya gara n’ebe ọ nọ na-enwe obi ụtọ ma ọ bụ na-ata ahụhụ. Ọ bụrụ na ha gara ụdị ebe ndị ahụ mgbe ha nwụrụ, ọ̀ bụ na ha agaraghị akọrọ ya ndị mmadụ? A gaara edekwa ya na Baịbụl ka onye ọ bụla nwee ike ịgụ ya. Ma, e deghị ụdị ihe ahụ na Baịbụl. O doro anya na mmadụ asatọ ahụ sí n’ọnwụ bilie enweghị ihe ha ga-ekwuli mere mgbe ha nwụrụ, n’ihi na ha dị ka ndị nọ́ n’oké ụra, ha amaghịkwa ihe ọ bụla. E nwedịrị ebe ụfọdụ Baịbụl kwuru na onye nwụrụ anwụ nọ n’ụra. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na Devid na Stivin, bụ́cha ndị ezi omume, “dara n’ụra ọnwụ.”—Ọrụ Ndịozi 7:60; 13:36.

Ajụjụ bụzi: Ndị nwụrụ anwụ hà ga-adị ndụ ọzọ? Hà ga-emecha sí n’ụra ọnwụ bilie?

a Okwu Hibru bụ́ “Shiol” na okwu Grik bụ́ “Hedis” pụtachara “ili.” Otú e si sụgharịa ya n’ụfọdụ Baịbụl bụ “ala mmụọ,” ma Baịbụl ekwughị na e nwere ọkụ ala mmụọ a na-ata ndị mere ihe ọjọọ ahụhụ ma ha nwụọ.

MMADỤ ASATỌ BAỊBỤL KWURU NA A KPỌLITERE N’ỌNWỤb

Nwa nwoke nwaanyị di ya nwụrụ Ịlaịja onye amụma kpọlitere nwa nwoke nke otu nwaanyị di ya nwụrụ. Ha bi na Zarefat nke dị n’ebe ugwu Izrel.—1 Ndị Eze 17:17-24.

Nwa okoro onye Shunem Ịlaịsha, bụ́ onye nọchiri anya Ịlaịja, kpọlitere otu nwa okoro ya na ndị mụrụ ya bi n’obodo Shunem ma kpọnye ya ndị mụrụ ya.—2 Ndị Eze 4:32-37.

Otu nwoke a tụbara n’ebe e liri mmadụ Ndị gara ili ozu otu nwoke ji ụjọ tụba ya n’ebe e liri Ịlaịsha ma gbalaga. Mgbe ozu nwoke ahụ metụrụ ọkpụkpụ Ịlaịsha, nwoke ahụ si n’ọnwụ bilie.—2 Ndị Eze 13:20, 21.

Nwa nwoke nke nwaanyị Nen di ya nwụrụ Jizọs kwụsịrị ndị sí n’obodo Nen buru ozu otu nwata nwoke na-apụ ịga lie ya. Ọ kpọlitere nwata nwoke ahụ ma kpọnye ya nne ya.—Luk 7:11-15.

Nwa nwaanyị Jeirọs Otu nwoke aha ya bụ Jeirọs, bụ́ onyeisi oche nke ụlọ nzukọ, bịakwutere Jizọs ma rịọsie ya ike ka ọ bịa gwọọ nwa ya nwaanyị ahụ́ na-adịghị. Nwata nwaanyị ahụ nwụrụ tupu Jizọs abịaruo. Ma, Jizọs kpọlitere ya.—Luk 8:41, 42, 49-56.

Ezigbo enyi Jizọs bụ́ Lazarọs Lazarọs nwụrụ, ụbọchị anọ agaakwa, tupu Jizọs abịa kpọlite ya. Ọtụtụ ndị hụkwara mgbe ọ kpọlitere ya.—Jọn 11:38-44.

Otu nwaanyị aha ya bụ Dọkas E ji imere ndị mmadụ ihe ọma mara nwaanyị a. Mgbe ọ nwụrụ, Pita onyeozi kpọlitere ya.—Ọrụ Ndịozi 9:36-42.

Yutikọs Otu nwa okorobịa aha ya bụ Yutikọs si na windo dị n’okpukpu ụlọ nke atọ daa ma nwụọ, Pọl onyeozi akpọlite ya n’ọnwụ.—Ọrụ Ndịozi 20:7-12.

b Mbilite n’ọnwụ kacha mkpa e dere na Baịbụl bụ nke Jizọs Kraịst. Isiokwu na-eso nke a ga-agwa anyị ihe mere o ji pụọ iche.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya