Isiokwu Ndị Dị́ n’Ụlọ Nche A
3 Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Gana
IZU NA-AMALITE N’ỌGỌST 29, 2016 RUO SEPTEMBA 4, 2016
7 Na-achọ Alaeze Chineke, Ọ Bụghị Ihe Onwunwe
Jizọs gwara anyị ka anyị buru ụzọ ‘na-achọ alaeze Chineke,’ ọ bụghị ihe onwunwe. Olee otú anyị ga-esi ghara ịhụ ihe onwunwe n’anya ma selata aka n’ihe ndị na-eri anyị oge ka anyị nwee ike iji ike anyị niile na-ejere Jehova ozi? Anyị ga-atụle Matiu 6:25-34 ma leba anya n’ihe ndị na-agba ume Jizọs kụziri n’elu ugwu.
IZU NA-AMALITE NA SEPTEMBA 5 RUO 11, 2016
13 Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị ‘Ịna-eche Nche’?
Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị kwesịrị iji ndụmọdụ Jizọs nyere anyị ka anyị ‘na-eche nche’ kpọrọ ihe. (Mat. 24:42) Ihe ga-enyere anyị aka ime ya bụ ịkpachara anya ka ihe ndị na-abaghị uru ghara ime ka anyị kwụsị ịmụ anya na iche nche maka ọbịbịa Jizọs. Isiokwu a kọwara otú anyị ga-esi gbaa mbọ ka ihe ọ bụla ghara ime ka anyị kwụsị ịna-eche nche.
18 “Atụla Egwu. Mụ Onwe M Ga-enyere Gị Aka”
IZU NA-AMALITE NA SEPTEMBA 12 RUO 18, 2016
21 Obi Dị Anyị Ụtọ na Chineke Na-egosi Anyị Obiọma Ya Na-erughịrị Mmadụ
IZU NA-AMALITE NA SEPTEMBA 19 RUO 25, 2016
26 Na-ekwusa Ozi Ọma Gbasara Obiọma Chineke nke Na-erughịrị Mmadụ
Isiokwu abụọ a ga-akọwa ụzọ dị́ iche iche anyị si erite uru n’obiọma na-erughịrị mmadụ Jehova na-egosi anyị. Ha ga-agbakwa anyị ume igosi na obi dị anyị ụtọ maka ịhụnanya Jehova. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-agwa ndị ọzọ otú ha ga-esi erite uru n’obiọma Jehova na-erughịrị mmadụ.