Otú Ị Ga-esi Emeri n’Ọgụ A Na-alụso Uche Gị
E NWERE ọgụ a na-alụso gị. Ọ bụ Ekwensu na-alụso gị ọgụ a. Ị̀ ma ngwá agha o ji alụso gị ya? Ọ bụ ụgha. Ebe o lekwasịrị anya abụghị ahụ́ gị, kama ọ bụ uche gị.
Pọl onyeozi ma na ụgha Setan na-agha na-akpata ezigbo nsogbu. Ma, ụfọdụ Ndị Kraịst ibe ya aghọtaghị ya otú ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ dị ka ụfọdụ ndị nọ na Kọrịnt nọ na-eche na otú ụkwụ si sie ha ike n’ọgbakọ mere na o nweghị ihe ga-emeli ka ha daa. (1 Kọr. 10:12) Ọ bụ ya mere Pọl ji dọọ ha aka ná ntị, sị: “Egwu na-atụ m na e nwere ike merụọ obi unu, o wee ghara izi ezi, gharakwa ịdị ọcha dị ka o kwesịrị Kraịst, dị ka agwọ ahụ ji aghụghọ ya rafuo Iv.”—2 Kọr. 11:3.
Ihe a Pọl kwuru gosiri na anyị ekwesịghị ịna-eme ka ànyị bụ anwụ anwụ. Ọ bụrụ na ị ga-emeri n’ọgụ Ekwensu na-alụso uche gị, i kwesịrị ịghọta nsogbu ụgha ya nwere ike ịkpata, gbakwaara ya ọsọ.
GỊNỊ MERE ỤGHA JI DỊ NJỌ?
A na-eji ụgha aghọgbu ndị mmadụ ma ọ bụ jiri ya mee ka ha gbanwee ihe ha na-eche na ihe ha na-eme. Otu akwụkwọ kwuru na ụgha bụ ihe e kwesịrị ịgbara ọsọ, na ọ na-akpata nsogbu, nakwa na ọ dịtụdịghị mma.—Akwụkwọ bụ́ Propaganda and Persuasion.
Gịnị mere ụgha ji dị njọ? Ọ bụ n’ihi na ọ na-eji nwayọọ nwayọọ aba mmadụ n’obi. Onye ahụ agadịghị amata na a ghọgbuwela ya. E nwere ike iji ya tụnyere ikuku ọjọọ a na-anaghị ahụ anya, nke a na-anaghịkwa anụ ísì ya. Ọ bụ ihe mere Vance Packard, bụ́ ọkachamara n’ihe gbasara àgwà ndị mmadụ, ji kwuo na e nwere ike iji ụgha mee ka anyị mewe ihe ụfọdụ, ma anyị agaghị ama na a ghọgbuola anyị. Otu ọkà mmụta kwuru na e jirila ụgha mee ka ụfọdụ ndị mee ihe ndị jọgburu onwe ha, dị ka ‘igbukpọ ndị agbụrụ ọzọ, ịlụ agha, imesi ndị ọzọ ike n’ihi okpukpe ha, agbụrụ ha ma ọ bụ ebe ha si nakwa omume ndị ọzọ na-enweghị isi na ọdụ.’—Akwụkwọ bụ́ Easily Led—A History of Propaganda.
Ebe ọ bụ na ndị mmadụ efu nwere ike iji ụgha duhie anyị, chezienụ ihe Setan nwere ike ime. Ọ mụọla àgwà ndị mmadụ kemgbe Chineke kere ha. “Ụwa dum” dị n’aka ya ugbu a. O nwere ike iji ihe ọ bụla dị n’ụwa mee ka ụgha ya ruo ebe niile. (1 Jọn 5:19; Jọn 8:44) Otú Setan si eme ka ‘uche ndị mmadụ kpuo ìsì’ emeela ka ọ ‘na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.’ (2 Kọr. 4:4; Mkpu. 12:9) Gịnị ka ị ga-eme ka Setan ghara iji ụgha ya nweta gị?
MEE KA OKWUKWE GỊ SIE IKE
Jizọs kwuru ihe anyị ga-eme iji lụso ụgha Setan ọgụ. Ọ sịrị: ‘Unu ga-amara eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.’ (Jọn 8:31, 32) Agha daa, ihe mbụ na-ala ka naị bụ eziokwu. N’ihi ya, i kwesịrị ime ihe onye agha nọ n’ọgbọ agha na-eme, ya bụ, ịmata ebe ọ ga-esi na-enweta ozi bụ́ eziokwu, nke e nwere ike ịtụkwasị obi, ka ndị iro ghara ịghọgbu ya. Jehova ji Baịbụl emere anyị ụdị ihe ahụ. Ọ bụ ebe ahụ ka ị ga-ahụ ihe niile ga-enyere gị aka ịlụso ụgha Setan ọgụ.—2 Tim. 3:16, 17.
O doro anya na Setan, bụ́ Nna ụgha, ma ihe a. Ọ bụ ihe mere o ji eji ụwa ochie a eme ka ndị mmadụ ghara inwe ohere ịgụ Baịbụl na ịmụ ya. Ekwela ka ọ ghọgbuo gị. (Efe. 6:11) ‘Nwee ike iji uche gị ghọta’ ihe niile gbasara eziokwu. (Efe. 3:18) Ọ pụtara na ị ga-agbalịsi ike. Ma, cheta eziokwu gbara ọkpụrụkpụ Noam Chomsky, bụ́ otu nwoke dere akwụkwọ, kwuru. Ọ sịrị: “O nweghị onye ga-egbuwa gị isi, kponye eziokwu n’ụbụrụ gị. Ọ bụ gị ga-eji aka gị chọpụta nke bụ́ eziokwu.” N’ihi ya, ‘jiri aka gị chọpụta’ nke bụ́ eziokwu. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịgbalịsi ike “na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma kwa ụbọchị.”—Ọrụ 17:11.
Ọ bụrụ na ị chọrọ imeri n’ọgụ Setan na-alụso uche gị, i kwesịrị ịmata nsogbu ụgha ya ga-akpata ma gbaara ya ọsọ
Echefula na Setan achọghị ka ị na-echebara ihe echiche nke ọma ma ghọta nke bụ́ eziokwu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi ihe otu akwụkwọ kwuru. Ọ sịrị na ihe nwere ike ime ka ndị mmadụ kweta ụgha a ghaara ha bụ ma e mee ka ha ghara ichebara ihe a gwara ha echiche nke ọma. (Akwụkwọ bụ́ Media and Society in the Twentieth Century) N’ihi ya, ekwetala ihe ọ bụla ị nụrụ n’ebughị ụzọ chebara ya echiche nke ọma. (Ilu 14:15) Jiri “ikike iche echiche” Chineke nyere gị chebara eziokwu Baịbụl echiche ka okwukwe gị sie ike.—Ilu 2:10-15; Rom 12:1, 2.
EKWELA KA IHE Ọ BỤLA MEE KA GỊ NA ỤMỤNNA GHARA ỊDỊ N’OTU
E jiri ụgha kọjuo ndị agha isi, ha nwere ike ịtụwa ụjọ, ike ịlụ ọgụ agaghịzi adị ha. O nwedịrị ike ime ka ha lụsowa ndị òtù ha ọgụ ma ọ bụ hapụ ndị ibe ha gaa nọrọ iche. Otu ọchịagha ndị Jamanị kwuru na ihe so mee ka e merie ha n’Agha Ụwa Mbụ bụ na ndị iro ha ji ụgha megharịa ha anya otú ahụ agwọ si enweta òké. Setan na-eji ụdị aghụghọ ahụ eme ka ọgbakọ ghara ịdị n’otu. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ime ka nwanna na nwanna sewe okwu ma ọ bụ mee ka ha hapụ nzukọ Jehova n’ihi na ha chere na ihe e mere n’ọgbakọ adịghị mma.
Ekwela ka Setan duhie gị. Kwe ka Okwu Chineke na-eduzi gị. Dị ka ihe atụ, n’ihe gbasara anyị na ụmụnna anyị ịdị n’otu, Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘na-agbaghara ibe anyị kpamkpam,’ na-edozikwa esemokwu n’egbughị oge. (Kọl. 3:13, 14; Mat. 5:23, 24) Ọ dọsiri anyị aka ná ntị ike ka anyị ghara ịhapụ ọgbakọ. (Ilu 18:1) Chọpụta ma ị̀ na-agbalịsi ike ịlụso ụgha Setan ọgụ. Jụọ onwe gị, sị: ‘Mgbe nwanna kpasuru m iwe n’oge gara aga, ònye ka m mere ihe dị ya mma? Ọ̀ bụ Jehova, ka ọ̀ bụ Setan?’—Gal. 5:16-26; Efe. 2:2, 3.
EKWELA KA IHE Ọ BỤLA MEE KA Ị GHARA ỊTỤKWASỊ NZUKỌ JEHOVA OBI
Onye agha na-atụkwasịghị onyeisi ha obi agaghị eji obi ya niile na-alụ agha. N’ihi ya, ndị iro na-eji ụgha eme ka ndị agha ghara ịtụkwasị onyeisi ha obi. Ha nwere ike ịna-asị ha: “Unu agaghị atụkwasịli ndị isi unu obi,” nakwa “Unu ekwela ka ha mee ka unu baa ná nsogbu.” Iji mee ka ha kweta ihe ha na-ekwu, ha nwere ike iji aghụghọ kwuwe banyere ihe ndị isi mejọrọ. Setan na-eme ụdị ihe a. Ike anaghị agwụ ya ná mbọ ọ na-agba ka ị ghara ịtụkwasị ndị Jehova ji eduzi nzukọ ya obi.
Gịnị ka ị ga-eme ka ọ ghara iduhie gị? Kpebisie ike ịnọsi ike ná nzukọ Jehova, jirikwa obi gị niile na-akwado ndị o ji eduzi nzukọ ya n’agbanyeghị na ha ezughị okè. (1 Tesa. 5:12, 13) Ndị si n’ezi ofufe dapụ ma ọ bụ ndị nduhie ndị ọzọ kwuwe okwu ọjọọ gbasara ọgbakọ iji megharịa gị anya, ekwela ka ha ‘mee ka ị maa jijiji ọsọ ọsọ wee bụrụ onye na-enweghị uche,’ a sịgodị na ihe ha na-ekwu yiri eziokwu. (2 Tesa. 2:2; Taị. 1:10) Mee ihe Pọl gwara Timoti ka o mee. Jidesie eziokwu ị mụtara ike. Echefukwala ebe ị mụtara ya. (2 Tim. 3:14, 15) N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe gosiri na i kwesịrị ịtụkwasị ndị Jehova si n’aka ha na-akụziri anyị eziokwu obi. O ji ha na-arụ ọrụ kemgbe ihe fọrọ obere ka o ruo otu narị afọ.—Mat. 24:45-47; Hib. 13:7, 17.
EKWELA KA E JIRI ỤJỌ MEE KA Ị DAA MBÀ
Chetakwa na ọ bụghị mgbe niile ka Setan na-eji nwayọọ nwayọọ achọ inweta anyị. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eji iyi egwu. Akwụkwọ ahụ kwuru gbasara otú ụgha si malite kwuru na iyi egwu so n’otú e si eduhie ndị mmadụ kemgbe ụwa. Dị ka ihe atụ, otu ọkachamara ndị Briten aha ya bụ Philip M. Taylor kwuru na ndị Asiria na-eji iyi egwu na ụgha eme ka ndị iro ha chịliere ha aka elu. Setan ga na-agbalị iji egwu mmadụ, ụjọ ọnwụ, ma ọ bụ ịtụ ụjọ ka a ghara ịkpagbu gị mee ka ị kwụsị ife Jehova.—Aịza. 8:12; Jere. 42:11; Hib. 2:15.
Ekwela ka egwu Setan na-eyi gị mee ka ị daa mbà ma ọ bụ mee ka ị ghara ịna-erubere Jehova isi. Jizọs sịrị: “Unu atụla egwu ndị na-egbu ahụ́, mgbe ha mesịrị nke a, ha enweghị ike ime ihe ọ bụla ọzọ.” (Luk 12:4) Ka obi sie gị ezigbo ike na Jehova ga-emezu nkwa o kwere na ọ ga-elekọta gị ma nye gị “ike karịrị ike nkịtị,” nakwa na ọ ga-enyere gị aka ka ị ghara ịchịliri Setan aka elu n’ihi egwu ọ na-eyi gị.—2 Kọr. 4:7-9; 1 Pita 3:14.
O doro anya na e nwere mgbe ụjọ ga-ejide gị ma ọ bụ ike agwụwa gị. Ma, cheta ihe Jehova gwara Jọshụa. Ọ sịrị ya: “Nwee obi ike, dịkwa ike. Amala jijiji, atụkwala ụjọ, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị ebe ọ bụla ị na-aga.” (Jọsh. 1:9) E nwee ihe na-echegbu gị, kọọrọ ya Jehova ozugbo n’ekpere. Ka obi sie gị ike na ‘udo nke Chineke ga-eche obi gị na ike iche echiche gị nche’ ka i nwee ike ịgbara ụgha Setan niile ọsọ.—Fil. 4:6, 7, 13.
Ì chetara ụgha Rabshake, bụ́ onye ozi eze Asiria, ji na-eyi ndị Chineke egwu? Ihe okwu ya pụtara bụ, ‘O nweghị ihe ga-eme ka ndị Asiria ghara ịgba unu ose n’anya. Chineke unu, bụ́ Jehova, agaghị anapụtali unu.’ Ọ katara obi kwuo, sị: ‘Ọ bụ Jehova gwara anyị bịa bibie obodo a.’ Gịnị ka Jehova zara ndị ya? Ọ sịrị ha: “Atụla egwu n’ihi okwu ị nụrụ, nke ndị na-ejere eze Asiria ozi kwuru iji kwutọọ m.” (2 Eze 18:22-25; 19:6) O dunyere otu mmụọ ozi, ya agaa gbuo otu narị puku ndị agha Asiria, na puku iri asatọ na ise n’otu abalị.—2 Eze 19:35.
MARA IHE, NA-EGE JEHOVA NTỊ
Ò nwetụla mgbe ị na-ele fim, hụ ebe a na-aghọgbu mmadụ, ma onye ahụ amataghị? Gị anọrọ ebe ị nọ na-asị ya, ‘Ekwetala. Ha na-aghara gị ụgha.’ Chezienụ otú ndị mmụọ ozi si na-asị gị, “Ekwela ka Setan jiri ụgha ya ghọgbuo gị.”
N’ihi ya, egela ntị n’ụgha Setan. (Ilu 26:24, 25) Na-ege Jehova ntị, tụkwasịkwa ya obi n’ihe niile ị na-eme. (Ilu 3:5-7) Mee ihe ọ na-agwa gị, ya bụ: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa.” (Ilu 27:11) I mee otú ahụ, ị ga-emeri n’ọgụ Setan na-alụso uche gị.