Ndị Na-eto Eto, ‘Na-emenụ Ihe Ga-ewetara Unu Nzọpụta’
“Otú ahụ unu si na-erube isi mgbe niile, . . . jirinụ egwu na ịma jijiji na-eme ihe ga-ewetara unu nzọpụta.”—FIL. 2:12.
1. Gịnị mere baptizim ji dị ezigbo mkpa? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)
KWA afọ, a na-eme ọtụtụ puku ndị anyị na-amụrụ ihe baptizim. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị na-eto eto, ụfọdụ n’ime ha erubeghịdị afọ iri na atọ. O nwere ike ịbụ na a mụrụ ha n’ọgbakọ. Ì so na ha? Ọ bụrụ otú ahụ, i mere nke ọma. E kwesiri ime Onye Kraịst ọ bụla baptizim, ka e nwee ike ịzọpụta ya, nakwa ka ọ dịrị ndụ mgbe ebighị ebi.—Mat. 28:19, 20; 1 Pita 3:21.
2. Gịnị mere na ụjọ ekwesịghị ịtụ gị inyefe Jehova onwe gị?
2 Ọ bụ eziokwu na baptizim na-eme ka Jehova na-agọzi anyị, ma e nwere ọtụtụ ọrụ ị ga-arụ. Olee ụdị ọrụ ọ bụ? N’ụbọchị ahụ e mere gị baptizim, nwanna kwuru okwu baptizim jụrụ gị, sị: “N’ihi àjà Jizọs Kraịst chụrụ, ì chegharịala, hapụ mmehie gị, nyefeekwa Jehova onwe gị ime uche ya?” Ị zara ee. Ihe a ị zara bụ nkwa i kwere Jehova na ị ga na-ahụ ya n’anya, nakwa na ị ga na-eji ofufe ya kpọrọ ihe karịa ihe ọ bụla ọzọ. Nkwa a abụghị obere ihe. Ì kwesịrị ịkwa mmakwaara maka ya? Mbanụ. Ị gaghị akwa mmakwaara ma i kwe ka Jehova na-eduzi gị. Ndị na-amaghị Jehova so n’ụwa Setan. Ekwensu achọghị ka a zọpụta gị. Nke bụ́ eziokwu bụ na obi ga-atọ ya ụtọ ma ndụ ebighị ebi kwaa gị, n’ihi na ị na-efe ya ma jụ ka Jehova na-achị gị.
3. Olee otú Jehova sirila gọzie gị n’ihi na i nyefere ya onwe gị?
3 Chegodị otú Jehova sirila gọzie gị n’ihi na i nyefere ya onwe gị, e meekwa gị baptizim. Ugbu a i nyeferela ya onwe gị, i nwere ike iji obi ike kwuo, sị: “Jehova nọnyeere m; agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?” (Ọma 118:6) O nweghị ihe ọma karịrị mmadụ ikwe ka Chineke na-eduzi ya, nakwa ịmata na o ji gị na-eme ọnụ.
IHE Ị GA-EJI AKA GỊ EKPEBI
4, 5. (a) Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na mmadụ inyefe Jehova onwe ya bụ ihe mmadụ ga-eji aka ya ekpebi? (b) Olee nsogbu ndị nwere ike ịbịara Onye Kraịst ọ bụla n’agbanyeghị afọ ndụ ya?
4 Ebe ị bụ Onye Kraịst emerela baptizim, adịm ná mma gị na Chineke adịghị ka ụlọ ma ọ bụ ala i nwere ike iketa n’aka ndị mụrụ gị. Ọ bụ gị ga-eme ihe a ga-eji azọpụta gị, ọ bụrụgodị na gị na ndị mụrụ gị ka bi. Gịnị mere o ji dị mkpa ka i buru ya n’obi? Ọ bụ n’ihi na anyị amaghị ụdị ọnwụnwa nwere ike ịbịara anyị echi. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na e mere gị baptizim mgbe ị na-erubeghị afọ iri na atọ, e nwere ike inwe ihe ọhụrụ ndị ị ga na-eche nakwa nsogbu ọhụrụ ndị gị na ha na-alụ ugbu a ị na-erubeghị afọ iri abụọ. Otu nwa agbọghọbịa kwuru, sị: “Iwe agaghị ewe nwatakịrị bụ́ Onyeàmà Jehova n’ihi na ọ taghị keeki e ji cheta ụbọchị ọmụmụ n’ụlọ akwụkwọ ha. Ma, n’ime afọ ole na ole mgbe agụụ inwe mmekọahụ ga-agụsi ya ike, e kwesịrị ime ka o kwetasie ike na irubere iwu Jehova isi ga-akacha abara ya uru mgbe niile.”
5 Ma, ọ bụghị naanị ndị na-eto eto na-enwe nsogbu ndị ọhụrụ ha na ha na-alụ. Ma ndị e mere baptizim mgbe ha torola eto na-enwe ọtụtụ nsogbu ha na-atụghị anya na ọ ga-abịara ha. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịbụ nsogbu ndị a na-enwe na alụmdi na nwunye, ọrịa, ma ọ bụ inweta ọrụ. N’agbanyeghị afọ ndụ anyị, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịnọgide na-eme ihe dị Jehova mma ma nsogbu bịara anyị.—Jems 1:12-14.
6. (a) Gịnị ka ọ pụtara na i kwere Jehova nkwa na ị ga na-efe ya n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ? (b) Olee ihe ị ga-amụta ná Ndị Filipaị 4:11-13?
6 Ka i nwee ike na-eme ihe dị Jehova mma, echefula na i kwere Jehova nkwa na ị ga na-efe ya n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ. Nke a pụtara na ị gwara Ọkaakaa eluigwe na ụwa na ị ga na-efe ya ọ bụrụgodị na ndị enyi gị ma ọ bụ ndị mụrụ gị akwụsị ife ya. (Ọma 27:10) N’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ, na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka imezu nkwa i kwere ya.—Gụọ Ndị Filipaị 4:11-13.
7. Gịnị ka ‘iji egwu na ịma jijiji’ na-eme ihe a ga-eji zọpụta gị pụtara?
7 Jehova chọrọ ka ị bụrụ enyi ya. Ma, ị ga-agbalịsi ike na-eme ka gị na ya bụrụ enyi ma na-eme ihe a ga-eji azọpụta gị. Ndị Filipaị 2:12 kwuru, sị: “Jirinụ egwu na ịma jijiji na-eme ihe ga-ewetara unu nzọpụta.” Ihe a gosiri na i kwesịrị ichebara otú gị na Jehova ga-esi nọgide na-adị ná mma echiche, ma na-eme ihe ọ chọrọ n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara gị. I kwesịghị ịna-eche na i mekataghị kwụsị ife Jehova. Ụfọdụ ndị ferela Jehova ọtụtụ afọ akwụsịla ife ya. N’ihi ya, olee ihe ndị nwere ike inyere gị aka ka ị na-eme ihe a ga-eji azọpụta gị?
ỊMỤ BAỊBỤL DỊ MKPA
8. Gịnị ka ịmụ Baịbụl n’onwe gị pụtara? Gịnịkwa mere o ji dị mkpa?
8 Ka anyị nwee ike ịbụ enyi Jehova, anyị kwesịrị ịna-ege ya ntị ma na-agwa ya okwu. Otú kacha mma anyị nwere ike isi na-ege ya ntị bụ ịna-amụ Baịbụl n’onwe anyị. Nke a pụtara na ị ga na-agụ Okwu Chineke nakwa akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. Ma ịmụ Baịbụl abụghị naanị iburu ihe ụfọdụ n’isi otú ahụ i nwere ike ime mgbe unu chọrọ ile ule n’ụlọ akwụkwọ. Kama, ọ dị ka ebe ị na-eme njem ka ị chọpụta ihe ọhụrụ banyere Jehova. Nke a ga-enyere gị aka ịbịaru Chineke nso, ya abịaruokwa gị nso.—Jems 4:8.
Ị̀ na-agwa Jehova okwu ma na-amụ Baịbụl? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 ruo na nke 11)
9. Olee ihe ndị nyerela gị aka ịmụ Baịbụl n’onwe gị?
9 Nzukọ Jehova ewepụtala ọtụtụ ihe nwere ike inyere gị aka ịmụ ihe nke ọma. Dị ka ihe atụ, na jw.org, e nwere isiokwu bụ́ “Ihe Ndị E Ji Amụ Baịbụl” dị n’ebe e dere “Ndị Na-eto Eto.” Ihe a nwere ike inyere gị aka ime ihe ndị ị mụtara ná ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. E nwekwara ihe ọzọ na jw.org ga-enyere gị aka ịghọta ihe Baịbụl na-akụzi. Ọ dị n’ebe e dere “Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka.” Ha ga-enyere gị aka ime ka okwukwe gị sikwuo ike, nyekwara gị aka ịma otú ị ga-esi akọwara ndị ọzọ ihe ndị i kweere. I nwekwara ike ịhụ ihe ga-enyere gị aka ịna-amụ Baịbụl n’onwe gị n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . . Olee Ihe M Nwere Ike Ime Ka Ịgụ Baịbụl Na-atọ M Ụtọ?” Ọ dị na Teta! April 2009. Mmadụ ịmụ Baịbụl na ichebara ihe ndị ọ na-amụ echiche ga-eme ka onye ahụ na-eme ihe a ga-eji azọpụta ya.—Gụọ Abụ Ọma 119:105.
EKPERE DỊ MKPA
10. Gịnị mere ekpere ji dị Onye Kraịst merela baptizim mkpa?
10 Mgbe anyị na-amụ Baịbụl, anyị na-ege Jehova ntị. Mgbe anyị na-ekpekwa ekpere, anyị na-agwa ya okwu. Onye Kraịst ekwesịghị iwere ekpere ka ihe ọ na-eme iji mezuo iwu ma ọ bụ ihe ọ ga na-eme ka ihe na-agaziri ya. Kama, ọ bụ otú anyị si agwa Onye kere anyị okwu. Jehova chọrọ ịnụ olu anyị. (Gụọ Ndị Filipaị 4:6.) Mgbe ị na-echegbu onwe gị n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, Baịbụl kwuru ka ị “tụkwasị Jehova ibu arọ gị.” (Ọma 55:22) Ì kwetara n’ihe a Baịbụl kwuru? Ọtụtụ nde ụmụnna ga-agwa gị na ihe a Baịbụl kwuru enyerela ha aka. O nwekwara ike inyere gị aka.
11. Gịnị mere i kwesịrị iji na-ekele Jehova mgbe niile?
11 Ma, anyị ekwesịghị ikpe ekpere naanị mgbe anyị chọrọ ka Jehova nyere anyị aka. Baịbụl kwuru, sị: ‘Gosinụ na unu bụ ndị nwere ekele.’ (Kọl. 3:15) Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike na-echegbu onwe anyị banyere nsogbu anyị nke na anyị agaghị echeta ihe ọma niile Jehova meerela anyị. N’ihi ya, gbalịa mee ihe a. N’ụbọchị ọ bụla, chee ma ọ̀ dịkarịa ala ihe atọ Jehova meerela gị, ma kelee ya maka ihe ndị ahụ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Abigail, bụ́ onye e mere baptizim mgbe ọ dị afọ iri na abụọ, kwuru, sị: “Echere m na anyị kwesịrị ikele Jehova karịa onye ọ bụla ọzọ ma n’eluigwe ma n’ụwa a. Anyị kwesịkwara ikele ya mgbe ọ bụla maka ihe ndị o meere anyị. Mgbe ụfọdụ, Abigail na-ajụ onwe ya ajụjụ a, sị: “Ọ bụrụ na anyị ekeleghị Jehova maka ihe ndị o meere anyị taa, ya eruo echi, ihe ndị ahụ efunahụ anyị, oleezi ihe anyị ji n’aka?”
URU Ọ BARA MMADỤ IJI AKA YA HỤ IHE NA-EGOSI NA JEHOVA DỊ MMA
12, 13. Gịnị mere o ji dị mkpa ka i chee banyere ihe ndị merela ná ndụ gị nke gosiri gị na Jehova dị mma?
12 Jehova nyeere Eze Devid aka idi ọtụtụ nsogbu ndị bịaara ya. N’ihi ya, o kwuru ihe na-egosi na Jehova dị mma. Ọ sịrị: “Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma; Obi ụtọ na-adịrị dimkpa nke gbabara n’ime ya.” (Ọma 34:8) Amaokwu a na-egosi na ọ na-aba uru ka mmadụ jiri aka ya hụ ihe na-egosi na Jehova dị mma. Ị na-agụ Baịbụl na akwụkwọ anyị, na-aga ọmụmụ ihe, ị ga-amụta otú Chineke sirila nyere ndị ọzọ aka ịna-efe ya. Ma, ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma, ị ga-ahụ otú Jehova si na-enyere gị aka. Olee ihe ndị merela ná ndụ gị nke gosiri gị na Jehova dị mma?
13 E nweela ụzọ dị iche iche Ndị Kraịst niile sirila chọpụta na Jehova dị mma. Jehova gwara onye ọ bụla n’ime anyị ka anyị bịaruo ya na Ọkpara ya nso. Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m, bụ́ onye zitere m, adọtaghị ya.” (Jọn 6:44) Ì chere na ihe a Jizọs kwuru gbasara gị? Nwa okoro ma ọ bụ agbọghọ nwere ike ịna-eche, sị ‘Jehova dọtara ndị mụrụ m, mụ esorozie ha.’ Ma, mgbe i nyefere Jehova onwe gị, e meekwa gị baptizim, i gosiri na gị na Jehova adịla n’ezigbo mma. Ma ugbu a, ị marala onye ọ bụ n’eziokwu. Baịbụl gwara anyị, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ Chineke n’anya, onye a bụ onye Ọ maara.” (1 Kọr. 8:3) Ejila ebere Jehova meere gị kwe ka ị nọrọ ná nzukọ ya eti epele.
14, 15. Olee otú ozi ọma nwere ike isi mee ka okwukwe gị sikwuo ike?
14 Otú ọzọ ị ga-esi chọpụta na Jehova dị mma bụ ma Jehova nye gị obi ike ị ga-eji gwa ndị ọzọ banyere ihe ndị i kweere. I nwere ike ime otú ahụ n’ozi ọma nakwa n’ụlọ akwụkwọ. Ọ na-esiri ụfọdụ ike izi ndị enyi ha ozi ọma n’ụlọ akwụkwọ. Ọ ga-abụ na ị ma ihe kpatara ya. O nwere ike ịbụ na ị na-eche banyere ihe ha ga-eme ma i zie ha ozi ọma. Izi ìgwè mmadụ ozi ọma nwere ike ịkacha tụọ gị ụjọ karịa izi ndị mmadụ ozi ọma otu otu. Gịnị nwere ike inyere gị aka?
15 Nke mbụ, chee ihe mere i ji kwetasie ike n’ihe ndị i kweere. Ùnu nwere ihe ndị ga-enyere gị aka ịghọta ihe Baịbụl na-akụzi n’asụsụ unu na jw.org? Ọ bụrụ na o doghị gị anya ma ùnu nwere ya, gbalịa chọọ ha. E wepụtara ha iji nyere gị aka ichebara ihe ndị i kweere echiche, ihe mere i ji kwere ha, na otú ị ga-esi agwa ha ndị ọzọ. Obi sichaa gị ike n’ihe i kweere, gị akwadebekwa nke ọma, ị ga-achọ ịkọrọ ndị ọzọ banyere Jehova.—Jere. 20:8, 9.
16. Olee ihe nwere ike ime ka i jiri obi ike na-agwa ndị ọzọ ihe ndị i kweere?
16 Ọ bụrụgodị na ị kwadebe nke ọma, ụjọ nwekwara ike na-atụ gị ịgwa ndị ọzọ ihe ndị i kweere. Otu nwanna nwaanyị dị afọ iri na asatọ, bụ́ onye e mere baptizim mgbe ọ dị afọ iri na atọ kwuru, sị: “Ama m ihe m kweere, ma mgbe ụfọdụ, ọ na-esiri m ike ịgwa ya ndị mmadụ.” Olee otú o si merie nsogbu a? O kwuru, sị: “M na-ejisi ike meda obi zie ha ozi ọma. Ụjọ anaghị atụ ụmụ klas m ikwu ihe ndị ha na-eme. Ụjọ ekwesịghịkwa ịtụ m ịgwa ha ihe ndị m kweere. N’ihi ya, m chọọ ịgwa mmadụ okwu, m na-ebido ịkọtụrụ ya akụkọ, dị ka, ‘mgbe m nọ na-amụrụ mmadụ Baịbụl ụnyaahụ, m . . . ’ M kwuchaa, mụ akọwakwa akụkọ ahụ m na-akọ. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị Baịbụl ka m malitere ikwu banyere ya, ma ọtụtụ mgbe, ndị mmadụ na-enwekarị mmasị ịma ihe m na-eme mgbe m na-amụrụ mmadụ Baịbụl. Mgbe ụfọdụ, ha na-ajụ m banyere ya. Otú a m si amalite ịgwa ha okwu na-eme ka ọ dịkwuoro m mfe izi ha ozi ọma. N’ikpeazụ, obi na-atọ m ụtọ.”
17. Olee ihe ọzọ ga-enyere gị aka izi ndị ọzọ ozi ọma?
17 Ọ bụrụ na ị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma na-eme ihe gosiri na ihe gbasara ha na-emetụ gị n’obi, o nwere ike ime ka ha kweta n’ihe ị na-ezi ha. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Olivia. E mere ya baptizim n’oge ọ bụ nwata. O kwuru, sị: “Mụ na ndị mmadụ kwurịtawa okwu, m na-atụkarị ụjọ ikwu banyere Baịbụl ka ha ghara iwere m ka onye bu chọọchị n’isi.” Ma, o mechara gbanwee obi ya. Kama ikwe ka ụjọ a ọ na-atụ na-echu ya ụra, Olivia kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị na-eto eto amaghị ihe ọ bụla banyere Ndịàmà Jehova. Ọ bụ naanị anyị bụ Ndịàmà Jehova ha ma. N’ihi ya, otú anyị si akpa àgwà na otú anyị si emeso ha ihe ga-ekpebi ma hà ga-ege anyị ntị ma ọ bụ na ha agaghị ege. Olee ihe nwere ike ime ma ọ na-esiri anyị ike ịgwa ha ihe anyị kweere, na-eme ihere, ma ọ bụ ọnụ ana-ama anyị jijiji ma anyị na-ezi ha ozi ọma? Ha nwere ike lewe anyị anya ka ndị na-amaghị ihe ha na-eme. Ha nwedịrị ike na-akparị anyị n’ihi na anyị anaghị akata obi agwa ha okwu. Ma, ọ bụrụ na anyị akata obi na-agwa ha ihe anyị kweere mgbe niile, ha nwere ike ịna-akwanyere anyị ùgwù.”
NA-EME IHE GA-EWETARA GỊ NZỌPỤTA
18. Olee ihe ndị ị ga-eme a ga-eji azọpụta gị?
18 Anyị amụtala na mmadụ ịna-eme ihe a ga-eji azọpụta ya abụghị obere ọrụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ịna-agụ Baịbụl na ichebara ihe ndị ị na-agụ echiche, ikpe ekpere, na ịna-eche ụzọ dị iche iche Jehova sirila gọzie gị ná ndụ. Ime ihe ndị a ga-eme ka obi sie gị ike na Jehova bụ enyi gị. Nke a ga-eme ka ị na-agwa ndị ọzọ ihe i kweere.—Gụọ Abụ Ọma 73:28.
19. Gịnị mere na mbọ ọ bụla ị na-agba ime ihe a ga-eji azọpụta gị agaghị efu ọhịa?
19 Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, na-eso m mgbe niile.” (Mat. 16:24) N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị chọrọ iso Jizọs, anyị ga-enyefe Jehova onwe anyị, e meekwa anyị baptizim. Ọ ga-eme ka Jehova gọzie anyị mmaji kwuru mmaji ugbu a, anyị enwetakwa ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ya. N’ihi ya, mee ihe ọ bụla i nwere ike ime ka ị na-eme ihe a ga-eji azọpụta gị.