AKỤKỌ NDỤ
Ihe Niile Kwere Omume n’Ebe Jehova Nọ
“ỌNWỤ agaghị adịkwa ọzọ, a ga-akpọlitedị ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.” Nwunye m aha ya bụ Mairambubu nụrụ ihe a mgbe ọ nọ na bọs na-eme njem. Ihe a ọ nụrụ masịrị ya, ya achọọ ịmatakwu banyere ya. Ozugbo bọs ahụ kwụsịrị ndị mmadụ, ọ chụụrụ nwaanyị kwuru okwu ahụ gawa. Aha ya bụ Apun Mambetsadykova. Ọ bụ Onyeàmà Jehova. N’oge ahụ, mmadụ nwere ike ịba ná nsogbu ma ya na Onyeàmà Jehova na-ekwurịta okwu. Ma ihe Apun mechara kụziere anyị gbanwere ndụ anyị.
HA NA-ESI N’ỤTỤTỤ RỤRỤ ỌRỤ RUO ABALỊ
A mụrụ m n’afọ 1937, n’otu ugbo dị nso n’obodo Tọkmọk, nke dị na Kegịstan. Ihe anyị na-akpọ ugbo a bụ kọlkọz. Ezinụlọ anyị bụ ndị Kegiz. Anyị na-asụkwa asụsụ Kegiz. Papa m na mama m na-arụrụ ndị mmadụ ọrụ n’ugbo a a na-akpọ kọlkọz. Ha na-esi n’ụtụtụ rụrụ ọrụ ruo abalị. A na-enye ndị na-arụ ọrụ n’ugbo ahụ nri mgbe niile, ma na-akwụ ha ụgwọ naanị otu ugboro n’afọ. Mama m na-agbasi mbọ ike elekọta mụ na nwanne m nwaanyị m tọrọ. Ọ bụ naanị afọ ise ka m gụrụ akwụkwọ, malitekwa ịrụ ọrụ n’ugbo ahụ.
Ugwu ndị dịkọrọ ọnụ na Teski Ala-Too
Ọtụtụ ndị bi n’ebe ahụ m bi bụ ndị ogbenye. Ha na-arụgbukwa onwe ha n’ọrụ tupu ha enweta ihe ha ga-eji akpa afọ ha. Ebe m bụ nwa okorobịa, anaghị m eche gbasara ọdịnihu ma ọ bụ uru ndụ m dị bara. Echetụbeghị m ya n’echiche na eziokwu magburu onwe ya banyere Jehova Chineke na ihe ndị o bu n’obi ime ga-agbanwe ndụ m. Otú ozi ọma si ruo Kegịstan ma gazuo ebe niile bụ akụkọ na-atọ ụtọ. Ọ malitere n’obodo anyị bụ́ ebe ugwu Kegịstan.
OTÚ NDỊ A CHỤGARA N’OBODO ỌZỌ SI MEE KA OZI ỌMA RUO NA KEGỊSTAN
Ozi ọma ruru na Kegịstan n’afọ 1956. Ihe ụmụnna mere ka ndị obodo a nwee ike ịnụ banyere Jehova bụ ịkụziri ha eziokwu n’ihi na e jirila ihe gbasara ọchịchị Kọmunist kọjuo ha isi. Gịnị mere o ji dị otú ahụ? Ọ bụ ndị Sọviet Yuniọn na-achị obodo a bụ́ Kegịstan mgbe ahụ. Ndịàmà Jehova nọ n’ebe niile ndị Sọviet Yuniọn na-achị, anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Jọn 18:36) N’ihi ya, ndị ọchịchị na-emekpọ ha ọnụ n’ihi na e weere ha ka ndị na-agba ọchịchị Kọmunist ụkwụ. Ma, o nweghị ihe ga-eme ka Okwu Chineke ghara iru ndị chọrọ ịnụ ya n’obi. N’eziokwu, otu ihe bara uru m mụtarala kemgbe a mụrụ m bụ na “ihe niile kwere omume” n’ebe Jehova nọ.—Mak 10:27.
Emil Yantzen
Nsogbu ndị ọchịchị nyere Ndịàmà Jehova mere ka ozi ọma ruo ebe niile na Kegịstan. Gịnị mere o ji dị otú ahụ? Ọ bụ ndị Sọviet Yuniọn na-achị Saịberịa, bụ́ ebe ha na-achụga ndị ha weere ka ndị na-agba ọchịchị ha mgba okpuru. Mgbe a tọhapụrụ ha, ọtụtụ n’ime ha bịara biri na Kegịstan. Ụfọdụ n’ime ha mekwara ka ozi ọma ruo na Kegịstan. Otu n’ime ndị a bụ Emil Yantzen, bụ́ onye a mụrụ na Kegịstan, n’afọ 1919. A kpọgara ya n’ụlọ mkpọrọ ọ ga-anọ na-arụgbu onwe ya n’ọrụ. Ọ bụ ebe a ka Ndịàmà Jehova nọ zie ya ozi ọma, ya aghọọ Onyeàmà Jehova. Ọ lọtara n’afọ 1956. Emil gara biri n’ebe dị nso n’obodo Sokuluk, bụ́ obodo m. Ọ bụ na Sokuluk ka e hiwere ọgbakọ mbụ na Kegịstan, n’afọ 1958.
Victor Vinter
Mgbe ihe dị ka otu afọ gachara, Nwanna Victor Vinter kwatara na Sokuluk. A tụrụ nwanna a ji ofufe Chineke kpọrọ ihe mkpọrọ ọtụtụ ugboro. A tụrụ ya mkpọrọ afọ atọ ugboro abụọ n’ihi na o kweghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mgbe e mechara, a tụkwara ya mkpọrọ afọ iri, chụgakwa ya mba ọzọ, bụ́ ebe ọ nọrọ afọ ise. Ma, nsogbu ndị a emeghị ka ọtụtụ ndị ghara ịbata n’ọgbakọ.
OTÚ OZI ỌMA SI RUTEWE N’OBODO ANYỊ
Eduard Varter
N’afọ 1963, Ndịàmà Jehova e nwere na Kegịstan dị ihe dị ka otu narị na iri isii. Ọtụtụ n’ime ha si Jamanị, Yukren, na Rọshịa. Otu n’ime ha bụ Nwanna Eduard Varter, bụ́ onye a chụgara mba ọzọ. O mere baptizim na Jamanị n’afọ 1924. Ihe dị ka n’afọ 1942, ndị Nazi kpọgara ya n’ogige ọ ga-arụgbu onwe ya n’ọrụ. Mgbe afọ ole na ole gachara, ndị ọchịchị Kọmunist nke Sọviet Yuniọn chụgara ya mba ọzọ. N’afọ 1961, nwanna a kwagara n’obodo Kant, nke dị nso n’obodo m.
Elizabeth Fot; Aksamai Sultanalieva
Otu nwanna nwaanyị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe aha ya bụ Elizabeth Fot, bikwa n’obodo Kant. Ihe o ji akpa afọ ya bụ ịkwa ákwà. Ọ na-akwara ndị dọkịta na ndị nkụzi ákwà n’ihi na ọ ma ọrụ ya nke ọma. Otu n’ime ndị ọ na-akwara ákwà bụ otu nwaanyị aha ya bụ Aksamai Sultanalieva. Di nwaanyị a na-arụ ọrụ n’ọfis ọkàiwu gọọmenti na-agba ndị mmadụ akwụkwọ. Mgbe Aksamai wetaara Elizabeth ákwà, ọ jụrụ ya ọtụtụ ajụjụ banyere uru ndụ anyị dị bara, nakwa ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ. Elizabeth ji Baịbụl zaa ya ajụjụ niile ọ jụrụ ya ozugbo. Aksamai ghọrọ onye nkwusa ji ozi ya kpọrọ ihe.
Nikolai Chimpoesh
N’oge ahụ, Nwanna Nikolai Chimpoesh, si Mọldova, ghọrọ onye nlekọta sekit. Ọ bụ onye nlekọta sekit ruo ihe fọrọ obere ka o ruo afọ iri atọ. Ọ na-aga eleta ọgbakọ, na-ahazikwa otú e si ebipụtaghachi akwụkwọ anyị, nakwa otú e si ekesa ha. Ndị ọchịchị chọpụtakwara ihe ndị a ọ na-eme. Nwanna Eduard Varter gwara Nwanna Nikolai okwu gbara ya ume. Ọ sịrị ya: “Ndị ọchịchị jụọ gị otú anyị si na-enweta akwụkwọ anyị, gwa ha hoo haa na anyị na-esi n’isi ụlọ ọrụ anyị dị ná Bruklin enweta ha. Legide Ndị Uwe Ojii Nzuzo nke Mba Sọviet Yuniọn anya ná mkpụrụ anya. Atụla ụjọ.”—Mat. 10:19.
Obere oge Nwanna Nikolai na Nwanna Eduard kwurịtachara okwu, Ndị Uwe Ojii Nzuzo nke Mba Sọviet Yuniọn gwara ya ka ọ bịa n’isi ụlọ ọrụ ha dị n’obodo Kant. Nwanna Nikolai kwuru ihe mere mgbe o rutere. Ọ sịrị: “Otu n’ime ndị uwe ojii ahụ jụrụ m ebe anyị si enweta akwụkwọ anyị. M gwara ya na ọ bụ na Bruklin. Ọ maghị ihe ọ ga-agwa m agwa. Ọ hapụrụ m ka m lawa, o nwekwaghị mgbe ọzọ ọ kpọrọ m ka m bịa n’isi ụlọ ọrụ ha.” Nwanna a na ụmụnna ndị ọzọ, bụ́ ndị katara obi, ji akọ nọgide na-ekwusa ozi ọma n’obodo anyị dị n’ebe ugwu Kegịstan. Mgbe eziokwu banyere Jehova batara n’ezinụlọ anyị n’afọ 1981, nwunye m aha ya bụ Mairambubu, bụ onye mbụ nụrụ banyere ya.
NWUNYE M GHỌTARA OZUGBO NA IHE Ọ NỤRỤ BỤ EZIOKWU
Nwunye m bụ onye Narin, nke dị na Kegịstan. Otu ụbọchị n’ọnwa Ọgọst afọ 1974, ọ bịara n’ụlọ nwanne m nwaanyị nke m tọrọ. Ọ bụ ebe a ka mụ na ya hụrụ na nke mbụ. Ozugbo m hụrụ ya, ihe ya masịrị m. Mụ na ya lụrụ n’ụbọchị ahụ.
Apun Mambetsadykova
N’ọnwa Jenụwarị afọ 1981 mgbe nwunye m nọ na bọs na-aga ahịa, ọ nụrụ ka otu nwaanyị kwuru ihe ahụ anyị kwuru ná mmalite. Nwunye m chọrọ ịmatakwu banyere ya, n’ihi ya, ọ jụrụ nwaanyị ahụ aha ya na adres ya. Ọ gwara ya na aha ya bụ Apun. Ma, nwaanyị ahụ kpachapụrụ anya n’ihi na n’agbata afọ 1981 na afọ 1989, a machibidodịrị Ndịàmà Jehova iwu. Kama Apun inye nwunye m adres ya, ọ gwara nwunye m ka o nye ya nke ya. Nwunye m lọtara na-enwe aṅụrị.
Nwunye m gwara m, si: “Otu nwaanyị gwara m ihe mere m obi ụtọ. Ọ gwara m na n’oge na-adịghị anya, ndị mmadụ agaghịzi na-anwụ. Anụ ọhịa agaghịdị na-emerụ mmadụ ahụ́.” Ihe a ọ gwara m dị m ka akụkọ ifo. M gwara ya, sị: “Ka anyị chere ka ọ bịa kọwaara anyị ya nke ọma.”
Apun bịara na nke anyị mgbe ọnwa atọ gachara. Ụmụnna nwaanyị ndị ọzọ bịakwara na nke anyị. Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị matara ndị Kegiz mbụ bụ́ Ndịàmà Jehova. Ụmụnna nwaanyị ndị a kọwaara anyị eziokwu magburu onwe ya banyere Jehova na ihe o bu n’obi imere ụmụ mmadụ. Ha ji akwụkwọ anyị a na-akpọ Site Na Paradais Etufuru Rue Paradais Enweghachiri kụziere anyị Baịbụl.a Ebe ọ bụ naanị otu akwụkwọ a ka e nwere na Tọkmọk niile, anyị ji aka depụtaghachi ya.
Amụma e buru na Jenesis 3:15 so n’ihe mbụ anyị mụtara. Ọ bụ Jizọs, eze bụ́ Mesaya, ga-emezu amụma a. Ihe a bụ ozi dị mkpa onye ọ bụla kwesịrị ịnụ. Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị iso na-ekwusa ya. (Mat. 24:14) Ọ dịghị anya, eziokwu Baịbụl amalite ịgbanwe ndụ anyị.
ỌMỤMỤ IHE NA IME BAPTIZIM MGBE A MACHIBIDORO ANYỊ IWU
Otu nwanna na Tọkmọk kpọrọ anyị ka anyị bịa agbamakwụkwọ. Obere oge anyị rutere, mụ na nwunye m chọpụtara na Ndịàmà Jehova dị iche. O nweghị onye ṅụrụ mmanya na-aba n’anya, a haziri ihe niile ahazi. Agbamakwụkwọ a dị iche ná ndị nke anyị garala, bụ́ ebe ndị mmadụ na-aṅụbiga mmanya ókè, na-akpa àgwà ọjọọ, ma na-ekwu okwu rụrụ arụ.
Anyị sokwa ọgbakọ e nwere na Tọkmọk gaa ọmụmụ ihe ụfọdụ. Anyị na-enwe ya n’ọhịa ma ọ bụrụ na oyi adịghị. Ụmụnna ma na ndị uwe ojii na-achọ ịmata ihe anyị na-eme, n’ihi ya, a na-ahọpụta ndị ga na-ele mgbe ha ji abịa. N’oge oyi, anyị na-enwe ọmụmụ ihe n’ụlọ ụmụnna. Ọtụtụ mgbe, ndị uwe ojii bịara n’ụlọ ndị ahụ ka ha mata ihe anyị na-eme. Mgbe mụ na nwunye m mere baptizim n’ọnwa Julaị afọ 1982 n’Osimiri Chuy, anyị kpachapụrụ anya. (Mat. 10:16) Ụmụnna bịara obere obere ma zukọta n’ọhịa ahụ. Anyị bụrụ abụ Alaeze ma gere okwu baptizim.
ANYỊ JI OHERE ANYỊ NWERE JEKWUORO JEHOVA OZI
N’afọ 1987, otu nwanna gwara m ka m gaa hụ otu onye nwere mmasị bi n’obodo Baliki. Iji ụgbọ okporo ígwè si n’ụlọ anyị gaa ebe ahụ na-ewe awa anọ. Mgbe anyị gachara zie ozi ọma ebe ahụ ọtụtụ ugboro, anyị chọpụtara na ọtụtụ ndị nwere mmasị. O doro anya na ihe a bụ ohere anyị ga-eji jekwuoro Jehova ozi.
Mụ na nwunye m na-agakarị n’obodo Baliki. N’ọtụtụ ngwụsị izu, anyị na-anọ ebe ahụ gaa ozi ọma, nweekwa ọmụmụ ihe. Ọtụtụ ndị bịara nwee mmasị ịgụ akwụkwọ anyị. Anyị na-etinye akwụkwọ anyị na mishok buru ya gaa Tọkmọk. Mishok bụ akpa a na-eji eburu poteto aga ebe ọzọ. Akpa abụọ akwụkwọ anyị juru na ya anaghị ezuru anyị n’ọnwa. Anyị na-ezidi ndị anyị na ha nọ n’ụgbọ okporo ígwè ozi ọma ma anyị gawa Baliki ma ọ bụ lọtawa.
N’afọ 1995, e hiwere ọgbakọ na Baliki mgbe afọ asatọ gachara anyị gara zie ozi ọma ebe ahụ na nke mbụ ya. N’afọ ndị ahụ anyị na-esi na Tọkmọk aga Baliki ezi ozi ọma, anyị na-emefu nnukwu ego. Anyị enwechaghị ego. Ma ị̀ ma otú anyị si na-enweta ego anyị ji na-aga ebe ahụ? Otu nwanna na-enyekarị anyị ego. Jehova ma na anyị chọrọ ijekwuru ya ozi, ya ‘emegheere anyị ọnụ ụzọ mmiri nke eluigwe.’ (Mal. 3:10) N’eziokwu, ihe niile kwere omume n’ebe Jehova nọ.
ỊZỤ ỤMỤ NA IJI OZI ỌMA KPỌRỌ IHE
N’afọ 1992, a họpụtara m ịbụ okenye. Abụ m onye Kegiz mbụ ghọrọ okenye na Kegịstan. N’ọgbakọ anyị na Tọkmọk, e nwere ụzọ ọhụrụ ndị anyị si nyere ndị mmadụ aka. Anyị nwere ọtụtụ ụmụ akwụkwọ, bụ́ ndị Kegiz, anyị malitere ịmụrụ Baịbụl. Otu n’ime ha so na Kọmitii Alaka ugbu a, mmadụ abụọ bụkwa ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Anyị nyekwaara ndị ọzọ na-abịa ọmụmụ ihe anyị aka. N’ihe dị ka n’afọ 1992, anyị na-eji asụsụ Rọshịa amụ ihe n’ọgbakọ, akwụkwọ anyị dịkwa n’asụsụ Rọshịa. Ma, ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ anyị na-asụ Kegiz, n’ihi ya, m na-atapịara ha ihe a na-ekwu. O nyeere ha aka ịghọta eziokwu Baịbụl nke ọma.
Mụ na nwunye m jikwa oge ahụ na-azụ ụmụ anyị. Anyị na-akpọ ha aga ozi ọma na ọmụmụ ihe. Ọ na-atọ nwa anyị nwaanyị aha ya bụ Gulsayra ụtọ izi ndị na-agafe agafe ozi ọma. Ọ dị naanị afọ iri na abụọ mgbe ahụ. Ọ na-atọkwa ụmụ anyị ụtọ ibu amaokwu Baịbụl n’isi. Ha si otú a jiri ọgbakọ kpọrọ ihe, ụmụ ụmụ anyị jikwa ọgbakọ kpọrọ ihe. N’ime ụmụ itoolu anyị mụrụ na ụmụ ụmụ iri na otu dị ndụ ugbu a, iri na isii n’ime ha nọ n’ọgbakọ ma ọ bụ na-eso ndị mụrụ ha aga ọmụmụ ihe.
Mụ na nwunye m na asatọ n’ime ụmụ anyị n’afọ 1989
MGBANWE PỤRỤ ICHE
Ọ ga-eju ụmụnna ndị malitere ozi a n’obodo anyị n’afọ 1956 anya ịhụ mgbanwe ndị anyị nwerela kemgbe ahụ. Otu ihe bụ na malite n’ihe dị ka afọ 1991, anyị enwerekwuola onwe anyị izi ozi ọma na izukọta ọnụ na-enwe ọmụmụ ihe.
Ebe mụ na nwunye m na-ezi ozi ọma
N’afọ 1991, mụ na nwunye m gara mgbakọ mbụ anyị na Alma-Ata, dị na Kazakstan. Ihe a na-akpọ Alma-Ata ugbu a bụ Almati. N’afọ 1993, ụmụnna anyị ndị Kazakstan nwere mgbakọ ukwu n’ámá egwuregwu Spatak dị na Bishkek. Ọ bụ nke mbụ a na-enwe mgbakọ n’ebe ahụ. Ụmụnna ji otu izu hichaa ámá egwuregwu ahụ. Obi tọrọ onyeisi na-elekọta ámá egwuregwu ahụ ụtọ nke na o kwere ka ụmụnna nọrọ ebe ahụ mee mgbakọ n’akwụghị ụgwọ ọ bụla.
Nnukwu ihe ọzọ mere n’afọ 1994. E wepụtara otu akwụkwọ anyị n’asụsụ Kegiz. A na-asụgharị akwụkwọ anyị ugbu a n’asụsụ Kegiz. Ọ bụ ndị nsụgharị nọ n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Bishkek na-asụgharị ya. N’afọ 1998, a kagburu iwu ahụ a machibidoro Ndịàmà Jehova na Kegịstan. Ndịàmà Jehova nọ na Kegịstan ugbu a ebuola ibu. Anyị dị ihe karịrị puku ndị nkwusa ise. Taa, anyị nwere ọgbakọ iri asatọ na atọ, nakwa ìgwè iri abụọ na ise na-eji asụsụ Chaịniiz, Bekee, Kegiz, Rọshịa, Asụsụ Ndị Ogbi nke Rọshịa, Tọkish, Wigụa, na Uzbek amụ ihe. Ụmụnna ndị a si ebe dị iche iche ji otu obi na-efe Jehova. Ọ bụ Jehova mere ka e nwee mgbanwe ndị a niile.
Jehova mekwara ka ndụ m gbanwee. Etoro m n’ezinụlọ na-enweghị ka ọ hà ha. Ọ bụkwa naanị afọ ise ka m gụrụ akwụkwọ. Ma, Jehova mere ka m ghọọ okenye ma jiri m na-akụziri ndị gụrụ akwụkwọ karịa m eziokwu Baịbụl. N’eziokwu, Jehova na-eme ka ihe na-anaghị eme eme mee. Ihe ndị mere ná ndụ m emeela ka m jiri obi m niile na-akọrọ ndị mmadụ gbasara Jehova, bụ́ onye “ihe niile kwere omume” n’ebe ọ nọ.—Mat. 19:26.
a Ọ bụ Ndịàmà Jehova biri ya. Ma a naghịzi ebipụta ya.