Isiokwu Ndị Dị n’Ụlọ Nche A
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 4 RUO 10, 2019
Ezigbo Ndị Kraịst na-atụsi anya ike ibi na Paradaịs. Isiokwu a ga-atụle ihe mere anyị ji kwetasie ike n’ihe Baịbụl kwuru na a ga-enwe Paradaịs. Ọ ga-atụlekwa otú anyị nwere ike isi ghọta nkwa ahụ Jizọs kwere gbasara Paradaịs.
8 Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 11 RUO 17, 2019
10 Na-akwanyere “Ihe Chineke Kekọtara” Ùgwù
Isiokwu a ga-akọwa ihe Baịbụl kwuru gbasara ịkwanyere alụmdi na nwunye ùgwù. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị na-akwanyere alụmdi na nwunye ùgwù? Olee otú anyị nwere ike isi na-akwado ihe Baịbụl kwuru banyere ịgba alụkwaghịm nakwa nwoke ịhapụ nwunye ya ma ọ bụ nwunye ịhapụ di ya?
15 Akụkọ Ndụ—‘Jehova Emesowo Anyị Ihe n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị’
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 18 RUO 24, 2019
19 Ndị Na-eto Eto, Onye Kere Unu Chọrọ Ka Unu Na-enwe Obi Ụtọ
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 25, 2019 RUO MACH 3, 2019
24 Ndị Na-eto Eto, Unu Nwere Ike Ibi Ndụ Na-enye Obi Ụtọ
Ndị na-eto eto na-enwekarị ọtụtụ ihe ha ga-ekpebi ná ndụ ha, dị ka ihe ndị ha ga-eji ndụ ha eme. Ndị mmadụ na-agba ha ume ka ha gaa mahadum ma ọ bụ mee ihe ọzọ ga-enye ha ezigbo ego. Ma, Jehova na-agba ha ume ka ime uche ya bụrụ ihe mbụ ná ndụ ha. Isiokwu abụọ a ga-eme ka anyị mata na ige Chineke ntị bụ ihe kacha mma anyị kwesịrị ime.