Isiokwu Ndị Gbara Na JW.ORG
È KERE YA EKE?
Ụda Dọlfin Na-emepụta O Ji Na-achọta Ihe
Ndị sayensị na-agbalị iṅomi ụda otu ụdị azụ̀ dọlfịn na-eme iji nwee ike ịrụpụta ngwá ọrụ ndị bụ́ ọkpọka ha ga-eji na-achọta ihe n’ime mmiri.
Gaa na jw.org, pịa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa SAYENSỊ NA BAỊBỤL, pịzie È KERE YA EKE?
IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA
Otú Ị Ga-esi Enyere Nwa Gị Aka Ka Ọ Na-emekwu nke Ọma n’Ule
Ịtụ anya ka nwatakịrị mee ihe karịrị ya nwere ike ime ka ọ na-echegbu onwe ya ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’ụlọ. Ndị nne na nna nwere ike ịchọpụta ihe mere nwa ha anaghị eme nke ọma n’ule ma nyere ya aka ịmụ ihe nke ọma.
Na jw.org, gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa ALỤMDI NA NWUNYE NA EZINỤLỌ, pịzie ỊZỤ ỤMỤ.