Ọ̀ Bụ Aha Mmadụ Gịnị Ka Unu Na-aghaghị Ịbụ?
1 Oge ime mpịazi na-eru nso maka ihe nile a kpọrọ mmadụ. Bible na-akpọ ya “ụbọchị ahụ nke Chineke.” Ọ bụ oge mgbe a ga-emezu ihe Chineke kpere n’ikpe megide ndị ajọ omume; ọ bụkwa oge mgbapụta nye ndị ezi omume. Mmadụ nile dị ndụ mgbe ahụ ga-aza ajụjụ maka ụzọ ha siworo jiri ndụ ha mee ihe. N’iburu nke ahụ n’uche, Pita welitere otu ajụjụ e ji eme nnyocha: “Ọ̀ bụ aha mmadụ gịnị ka unu na-aghaghị ịbụ”? O mesiri ike ịdị mkpa nke ‘ibi obi nsọ nile, nsọpụrụ Chineke nile, na ile anya ụbọchị ahụ nke Chineke,’ tinyekwara mkpa nke ịbụ ndị nọ “n’udo, ndị na-enweghị ntụpọ, ndị a na-apụghịkwa ịta ụta.”—2 Pita 3:11-14.
2 Ibi Obi Nso Nile na Nsọpụrụ Chineke Nile: Obi nsọ na-agụnye ọrụ ndị kwesịrị nlereanya, bụ́ ndị na-asọpụrụ ụkpụrụ dị iche iche nke Bible. (Taịtọs 2:7, 8) Onye Kraịst aghaghị izere omume ụwa ndị ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị, nke anụ ahụ na-akpali.—Rom 13:11, 14.
3 A na-akọwa “nsọpụrụ Chineke” dị ka “nrapagide onwe onye n’ebe Chineke nọ, nke na-esite n’obi nke ihe kpaliri ya bụ obi ekele dị omimi maka àgwà ya ndị na-adọrọ adọrọ.” Ịnụ ọkụ n’obi anyị n’ozi ahụ bụ otu ụzọ pụtara ìhè anyị sị egosipụta àgwà nke a. Ebumnobi anyị n’ime nkwusa karịrị nanị echiche nke ibu ọrụ; ọ na-esite n’ịhụnanya miri emi maka Jehova. (Mak 12:29, 30) N’ịbụ ndị ịhụnanya dị otú ahụ kpaliri, anyị na-ele ozi anyị anya dị ka ngosipụta bara uru nke nsọpụrụ Chineke anyị. Ebe ọ bụ na nsọpụrụ Chineke anyị aghaghị ịdịgide adịgide, òkè anyị na-ekere n’ọrụ ime nkwusa ahụ aghaghị ichi anya. O kwesịrị ịbụ akụkụ dị mkpa nke usoro ihe omume anyị kwa izu.—Hib. 13:15.
4 “Ile anya” ụbọchi ahụ nke Jehova pụtara idote ya n’ọnọdụ mbụ n’echiche anyị kwa ụbọchị, n’ewezụgaghị ya n’ụsọ mgbe ọ bụla dị ka ihe na-adịghị mkpa. Ọ pụtara idote ọdịmma Alaeze n’ọkwá mbụ ná ndụ anyị.—Mat. 6:33.
5 Ndị Na-enweghị Ntụpọ, Ndị A Na-apụghịkwa Ịta Ụta, Ndị Nọ n’Udo: Dị ka akụkụ nke oké ìgwè mmadụ ahụ, anyị ‘asawo uwe mwụda anyị, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa atụrụ ahụ.’ (Mkpu. 7:14) Mgbe ahụ, ịbụ “ndị na-enweghị ntụpọ” pụtara na anyị aghaghị iji ịnọgidesi ike n’ihe chee nche megide ikwe ka unyi ndị sitere n’ụwa fesasịa ndụ anyị dị ọcha, nke a rarawooro nye. Anyị na-edo onwe anyị ịbụ “ndị a na-apụghịkwa ịta ụta” site n’ịjụ ikwere ka nchụso ihe onwunwe dị iche iche nke asọpụrụghị Chineke mebie ọdịdị ndị Kraịst anyị. (Jes. 1:27; 1 Jọn 2:15-17) Anyị na-egosi na anyị na-ebi “n’udo” site n’igosipụta “udo nke Chineke” ná mmeso nile anyị na-emeso ndị ọzọ.—Fil. 4:7; Rom 12:18; 14:19.
6 Ọ bụrụ na anyị anọrọ na nche megide mmetọ ụwa n’ụzọ gara nke ọma, ọ dịghị mgbe anyị ‘ga-eyi ajọ oge a,’ nke Jehova maworo ikpe. Kama nke ahụ, ọrụ ọma anyị ga-enyere ndị ọzọ aka ịhụ ọdịiche dị “n’etiti onye na-efe Chineke na onye na-adịghị efe Ya.”—Rom 12:2; Mal. 3:18.
7 Anyị na-atụ anya ịga Mgbakọ Distrikti “Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto” n’ọnwa ole na ole ugbu a, obi abụọ adịghịkwa ya na nri ime mmụọ na-enye ume ọhụrụ ga-emesiwanye ọchịchọ anyị ike igosipụta nsọpụrụ Chineke anyị. Ọtụtụ ndị ọhụrụ nwere ọchịchọ a. Anyị pụrụ ịbụ ihe ngọzi site n’inyere ha aka ikere òkè n’ozi ubi n’August.
8 A na-ebuli aha Jehova elu, a na-ewusi ọgbakọ ike, ndị ọzọkwa na-erite uru mgbe anyị ji obi anyị nile na-arụ “ọrụ ọma.” (1 Pita 2:12) Ka anyị bụrụ ndị dị otú ahụ mgbe nile.