Ntụleghachi Odide Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke July 24 ruo November 13, 1995. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ọnụ ọgụgụ ajụjụ ole i nwere ike n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide ahụ, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha onwe onye gị. Nọmba peji na paragraf nwere ike ha agaghị apụta n’izo aka nile gaa n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. Ọ dịghị mkpa ịmụsi ihe ike n’ụlọ akwụkwọ, n’ihi na ọ dịghị mgbe a ga-eji ihe ka ukwuu n’ime ihe ndị ha na-akụzi mee ihe. [yy p. 81]
2. A pụrụ ile iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na ọgwụ ọjọọ na-eme ihe anya dị ka mkpori ndụ na-adịghị emerụ ahụ. [yy p. 97]
3. Ise siga adịghị emerụ ahụ ma ọlị, ọ pụkwara inye obi ụtọ dị ukwuu. [yy p. 112]
4. Mgbe ị nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, i kwesịrị ịṅa ntị nke ọma ná ntụziaka nile a na-enye site n’ikpó okwu. [sg p. 28]
5. Ọ bụrụ na o kwere mee, ezinụlọ ọ bụla kwesịrị ịdị na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ chiri anya. [sg p. 43]
6. Site n’ịmụsi ihe ike n’ụlọ akwụkwọ, ị ga-esetịpụ ezi ihe nlereanya dị ka onye Kraịst. [yy p. 82]
7. Ịgụ ihe n’ihu ọha dị oké mkpa, ọ dịkwa onye ozi ọ bụla mkpa inwe ike ịgụ ihe nke ọma. [sg p. 34]
8. Mbipụta ọ bụla nke Ụlọ Nche dị oké mkpa, e kwesịkwara ịmụ ya nke ọma ngwa ngwa o kwere mee mgbe a natasịrị ya. [sg p. 42]
9. Okwu Solomọn n’Eklisiastis 3:1, 2 na-ezo aka nanị n’usoro na-aga n’ihu nke ndụ na ọnwụ, ọ bụghị n’akara aka mmadụ n’otu n’otu. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 10/15/91 p. 5.]
10. Nne na nna na-enye ụmụ ha ohere ikiri ihe ọ bụla pụrụ ịpụta na telivishọn si otú ahụ na-ahapụ ha n’onwe ha. (Ilu 29:15) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 8/1/88, p. 11, para. 8.]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. Gịnị mere na e kwesịghị ịma Ndịàmà Jehova ikpe maka ịkatọ okpukpe ndị ọzọ? [td 48C]
12. N’ihi gịnị ka nkweta ahụ bụ́ na a na-ahụ “ezi omume n’okpukpe nile” ji bụrụ nduhie? [td 48G]
13. Olileanya dị aṅaa ka ndị Kraịst nwere maka ndị a hụrụ n’anya nwụrụ anwụ? [td-IB 30A]
14. Olee otú anyị si mara na nlata nke Jisọs ga-abụ n’ụzọ anya na-agaghị ahụ? [td-IB 38A]
15. Ụkpụrụ ezi omume ndị dị aṅaa ka e mesiri ike n’Abụ nke Abụ? [Ọgụgụ Bible kwa izu]
16. Dị ka a kọwara n’Aịsaịa 14:4, 12-14, àgwà ònye ka eze Babilọn gosipụtara? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 9/15/85 p. 16 para. 2.]
17. Ònye bụ onye nche nke oge a, gịnịkwa ka ọ na-ama ọkwa ya? (Aịsa. 21:8, 12) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 12/1/87 p. 29, para. 10.]
18. Gịnị mere Eklisiastis 12:12 ji lee akwụkwọ anya n’ụzọ dị njọ otú a? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 9/1/87 p. 31.]
19. Olee otú ịhụnanya siri “dị ike dị ka ọnwụ”? (Abụ nke Abụ 8:6, 7) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 12/15/87 p. 23.]
20. Gịnị ka okwu ndị ahụ bụ́ “ihe efu” nke e ji mee ihe ọtụtụ ugboro n’akwụkwọ Eklisiastis pụtara? [w 9/1/87 p. 30.]
21. N’Aịsaịa 6:8 Jehova jụrụ Aịsaịa, sị: “Ònye ka M ga-eziga?” Azịza dị aṅaa nke Aịsaịa nyere bụ ihe oké agbamume nye anyị taa? [Ọgụgụ Bible kwa izu]
22. Ònye ga-abụ onye ọchịchị ahụ a kọwara n’Aịsaịa isi 11, abamuru dịkwa aṅaa ka ịchịisi ya ga-eweta? [Ọgụgụ Bible kwa izu]
23. Olee mgbe anyị pụrụ ịtụ anya na ọnọdụ ndị dị ebube a kọwara n’Aịsaịa isi 2 ga-ewere ọnọdụ gburugburu ụwa? [Ọgụgụ Bible kwa izu]
24. N’ihi gịnị ka o ji dị njọ onye Kraịst ise siga? [yy p. 113-114]
25. N’oge ndị dị aṅaa kpọmkwem ka ikike ịgụ ihe nke ọma kasị mkpa? [sg p. 34]
26. Usoro ọmụmụ ihe kwa ụbọchị dị aṅaa ka onye ọ bụla kwesịrị ịgbaso ma ọ bụrụ na o kwere omume? [sg-IB p. 43]
27. N’ihi gịnị ka Jehova ji ajụ ịṅa ntị n’ọtụtụ ekpere a na-ekpegara ya? (Aịsa. 1:15) [Ọgụgụ Bible kwa izu]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
28. Dị ka Ilu 26:20, 21 si kwuo, ọ bụrụ na anyị (na-azaghachi ngwa ngwa; nwere nkwuwa okwu; dị nwayọọ), kama ‘itinye nkụ n’ọkụ ahụ’ ma na-akpasu ndị ọzọ iwe, anyị na ha ga-enwe (nsogbu onwe onye; nkwurịta okwu na-adịghị mma; mmekọrịta dị mma). [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 10/15/91 p. 13, para. 16.]
29. Dị ka Ilu 27:6 si kwuo, onye hụrụ gị n’anya (agaghị ekwu ihe ọ bụla ga-ewute gị ma ọlị; ga na-atụ egwu ịgwa gị eziokwu banyere gị onwe gị; ga-enye gị ndụmọdụ mgbe ọ dị gị mkpa). [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 9/15/90 p. 28.]
30. Ndị na-eche na echiche enweghị ikpe ọmụma, nke ihe masịrị onye bụ ịhụ ụzọ bụ n’ezie ndị (na-adịghị eme mmadụ ihe ọjọọ; na-ekwe nnọọ ka ibe ha nọrọ; nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ). (Aịsa. 5:20) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 3/1/93 p. 11.]
31. Abụ nke Abụ na-eme ka (ọkwá Solomọn dị ka eze; akụ̀ na ụba dị ukwuu nke Solomọn; ikwesị ntụkwasị obi nke otu nwa agbọghọ ime obodo n’ebe nwa okoro na-azụ atụrụ nọ) pụta ìhè. [Ọgụgụ Bible kwa izu]
Jikọta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a na okwu ndị e depụtara n’okpuru:
Ilu 22:3; Ilu 31:29; Aịsa. 13:19, 20; Aịsa. 48:17.
32. N’ịdọ anyị aka ná ntị megide omume ndị na-emerụ ahụ, Chineke na-enyere anyị aka n’ezie inweta ihe kasị mma ná ndụ. [yy p. 114]
33. Ọ bụ ezie na Jehova adịghị echebe ndị ya n’otu ntabi anya pụọ n’ihe ọghọm, agha ime obodo, ma ọ bụ mpụ, iji amamihe dị irè nke Bible eme ihe pụrụ ịba uru. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 1/1/92 p. 17, para. 23.]
34. Mgbe nwunye na-arụsi ọrụ ike ma na-ekwesị ntụkwasị obi, di ya pụrụ ikwu okwu ịja mma ndị a. [Ọgụgụ Bible kwa izu]
35. E nwere ezi ihe mere na a gaghị enwe obi abụọ mgbe ọ bụla banyere mmezu nke amụma ndị e buru site n’ike mmụọ nsọ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 5/15/93 p. 6.]