Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/95 p. 3-4
  • Inye Onwe Anyị n’Afọ Ofufo Maka Ezi Ọrụ Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Inye Onwe Anyị n’Afọ Ofufo Maka Ezi Ọrụ Nile
  • Ozi Alaeze Anyi—1995
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Inye Onwe Anyị n’Afọ Ofufo
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Ụzọ Dị Iche Iche Anyị Nwere Ike Isi Jekwuoro Jehova Ozi
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Soro Jehova Na-arụ Ọrụ Kwa Ụbọchị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Ozi Alaeze Anyi—1995
km 11/95 p. 3-4

Inye Onwe Anyị n’Afọ Ofufo Maka Ezi Ọrụ Nile

1 Otu akwụkwọ ndị ụwa zoro aka n’ebe Ndịàmà Jehova nọ, na-asị: “Ọ ga-esi ike ịhụ ndị òtù ọzọ na-arụsi ọrụ ike n’okpukpe ha dị ka Ndịàmà na-arụ.” N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji arụsi ọrụ ike otú a, na-enwekwa mmụọ nke ịdị njikere?

2 Otu ihe kpatara ya bụ na a na-akụnye echiche nke ịdị ngwa n’ime ha. Jisọs matara na ya nwere oge a kpaara ókè iji rụchaa ọrụ ya n’elu ala. (Jọn 9:4) Ka Ọkpara Chineke e mere ka ọ dị ebube na-enwe ike n’etiti ndị iro ya taa, ndị Jehova maara na ha nwere oge a kpaara ókè iji rụọ ọrụ ha. Ya mere, ha nọgidere na-enye onwe ha n’afọ ofufo maka ije ozi dị nsọ. (Abụ Ọma 110:1-3) Ebe ọ bụ na mkpa maka ndị ọrụ ka ukwuu dị iji webata ihe ubi, a pụghị inwe nsepụaka ná mgbalị ha. (Mat. 9:37, 38) N’ihi ya, ha na-agbalị iṅomi Jisọs, bụ́ onye setịpụrụ ihe nlereanya zuru okè nke ịdị njikere na ịdị uchu n’ọrụ ya.—Jọn 5:17.

3 Ihe ọzọ mere Ndịàmà Jehova ji ejiri obi ha nile arụ ọrụ dị ka ha na-arụrụ Jehova bụ na nzukọ ha zuru ụwa ọnụ dị iche n’ìgwè ndị ọzọ nile. Nzukọ okpukpe dị iche iche nke ụwa na-achọkarị nanị oge na mgbalị dịkarịsịrị nta n’aka ndị na-agbaso ha. Ihe ha kwere na ya enweghị mmetụta ọ bụla ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị, mmeso ha na-emeso ndị ọzọ, ma ọ bụ ná nchụso ha ná ndụ. Ebe ọ bụ na ha enweghị ike mkpali nke ezi okpukpe, ha esiwo ọnwụ ka ndị ọzụzụ atụrụ ha ‘na-agwa ha okwu ire ụtọ nile,’ na-emesi ha obi ike na mgbalị dị nnọọ nta ha na-etinye zuru ezu. (Aịsa. 30:10) Ndị ụkọchukwu ha emenyeworo ha site ‘n’ime ka ntị na-akọ ha ọkọ,’ na-akụnye mmụọ nke enweghị mmasị na umengwụ ime mmụọ.—2 Tim. 4:3.

4 Lee ka nke a si dị iche n’etiti ndị Jehova! Ihe ọ bụla banyere ofufe anyị na-agụnye mgbalị, njisi ike, na ọrụ. Kwa ụbọchị nakwa n’ihe ọ bụla anyị na-eme, anyị na-eme ihe anyị kwere na ya. Ọ bụ ezie na eziokwu na-ewetara anyị ọṅụ dị ukwuu, ọ na-agụnye “oké mgba” ka anyị wee rụzuo ihe ọ na-achọ. (Tụlee 1 Ndị Tesalọnaịka 2:2.) Nanị ịhụ maka ibu ọrụ nke ịdị ndụ kwa ụbọchị ezuwo ime ka ọtụtụ ndị jiri ọrụ n’aka. Otú ọ dị, anyị adịghị ekwe ka nchegbu ndị a gbochie anyị itinye ọdịmma Alaeze n’ọkwá mbụ.—Mat. 6:33.

5 Ihe e nyere anyị ime n’ozi Jehova bara uru nke ukwuu ma dị ngwa nke na a na-akpali anyị ‘ịzụchapụta’ oge site ná nchụso ndị ọzọ ma jiri ya mee ihe n’ụzọ ka eweta uru n’ihe ime mmụọ. (Efe. 5:16) Ịmata na nsọpụrụ Chineke anyị na mmụọ afọ ofufo anyị na-atọ Jehova ụtọ, anyị nwere ihe mkpali kasị ukwuu ịga n’ihu n’ọrụ anyị nke siri ike. N’ihi ngọzi bara ụba anyị na-enweta ugbu a na olileanya nke ndụ n’ọdịnihu, mkpebi anyị siri ike bụ ịnọgide “na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ, na-agbasikwa mgba ike” n’ihi ọdịmma Alaeze.—1 Tim. 4:10.

6 Ofufe na Mmụọ nke Ịchụ Onwe Onye n’Àjà: Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ taa na-enye mkpa ihe onwunwe na mmasị ọkwá mbụ n’ebe ihe ọ bụla ọzọ dị. Ha na-eche na ha ziri nnọọ ezi n’ịtụkwasị uche n’ihe ha ga-eri, ṅụọ, ma ọ bụ gbokwasị n’ahụ. (Mat. 6:31) N’ịbụ ndị na-enweghị afọ ojuju n’ihe ndị dị mkpa, ihe mgbaru ọsọ nke ịnụ ụtọ ibi ndụ dị mma ugbu a n’ụzọ zuru ezu na ‘inwe ọtụtụ ezi ihe e debere ruo ọtụtụ afọ, ka ha wee na-ezu ike, na-eri ihe, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, ka obi na-atọkwa ha ụtọ’ na-akpali ha. (Luk 12:19) Onye na-aga chọọchị iji mezuo iwu na-eche na mgbalị onwe onye ọ bụla nke okpukpe ya chọrọ bụ itinye aka n’ihe ndị ruuru ya. Echiche nke ịhapụ ma ọ bụ ọbụna ịkwụsịlatatụ nchụso ihe onwunwe ụfọdụ ma ọ bụ ịgbahapụ mmasị na-enye obi ụtọ adabaghị adaba. N’ihi ịtụkwasị echiche ya n’onwe ya, ịzụlite mmụọ nke ịchụ onwe onye n’àjà bụ akụkọ ifo, ihe na-ekweghị omume.

7 Anyị na-ele okwu a anya n’ụzọ dị iche. Okwu Chineke emewo ka echiche anyị dị elu nke mere na anyị na-eche echiche Chineke kama nke mmadụ. (Aịsa. 55:8, 9) Anyị nwere ihe mgbaru ọsọ ná ndụ ndị karịrị nchụso anụ ahụ. Iwepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta na ido aha ya nsọ bụ ihe iseokwu ndị kasị mkpa n’ụwa nile. Ibu ibu nke ihe iseokwu ndị a dị ukwuu nke na, n’iji ihe tụnyere ihe, mba nile “dị ka ihe efu n’ihu Ya.” (Aịsa. 40:17) A ghaghị ile mgbalị ọ bụla ịdị ndụ anyị n’ụzọ na-eleghara iwu Chineke anya dị ka ihe nzuzu.—1 Kọr. 3:19.

8 Ya mere, ọ bụ ezie na ihe onwunwe ụfọdụ dị mkpa, ndị ọzọkwa bara uru iji were ọrụ Alaeze anyị gaa n’ihu, anyị na-aghọta na ihe ndị a abụghị n’ezie “ihe ndị ka mkpa.” (Fil. 1:10, NW) Anyị na-agbaso mmụọ nke 1 Timoti 6:8 n’ibelata nchụso anyị nke ọdịmma ihe onwunwe na iji amamihe na-agbalịsi ike ịtụkwasị obi anyị ‘n’ihe a na-adịghị ahụ anya nke na-adịru ebighị ebi.’—2 Kọr. 4:18.

9 Ka anyị na-eche echiche Chineke karị, ka anyị ga na-enwe nchegbu dị nta banyere ihe onwunwe. Mgbe anyị tụgharịrị uche n’ihe ndị Jehova mewooro anyị na ngọzi ndị dị ebube o kweworo ná nkwa maka ọdịnihu, anyị na-adị njikere ịchụ àjà ọ bụla ọ na-achọ n’aka anyị. (Mak 10:29, 30) Ọ bụ ya bụ nnọọ isi ndụ anyị. E wezụga ebere na ịhụnanya ya, anyị agaghị anụ ụtọ ndụ ugbu a, ọ dịghịkwa ọdịnihu ọ bụla ga-adị. Anyị na-enwe echiche nke iji ụgwọ inyefe onwe anyị, ebe ọ bụ na ihe nile anyị na-eme n’ije ozi ya ‘bụ ihe anyị ji ụgwọ ime.’ (Luk 17:10) Ihe ọ bụla a sịrị anyị nyeghachi Jehova, anyị na-eji obi ụtọ enye, na-amara na anyị “ga-ewerekwa ngọzi na-ewe ihe ubi.”—2 Kọr. 9:6, 7.

10 E Nwere Mkpa Maka Ndị Ọrụ Afọ Ofufo Ugbu A: Site nnọọ ná mmalite ya, ọgbakọ ndị Kraịst banyere n’oge nke oké ihe omume. A ghaghị ịgba àmà zuru ezu tupu mbibi Jerusalem na 70 O.A. N’oge ahụ ndị ozi Jisọs “ji ọrụ n’aka nke ukwuu n’okwu ahụ.” (Ọrụ 18:5, NW) Mgbasapụ dị ngwa mere ka ọ dị mkpa ịzụ ndị na-ezisa ozi ọma ndị ọzọ na ndị ọzụzụ atụrụ nwere nkà na ịchọ enyemaka ha. E nwekwara mkpa maka ndị ikom nwere ahụmahụ n’imeso ndị ọchịchị ụwa ihe tinyekwara ndị tozuru okè nwere ike ilekọta nnakọta na nkesa nke ihe anụ ahụ. (Ọrụ 6:1-6; Efe. 4:11) Ọ bụ ezie na mmadụ ole na ole jere ozi n’ụzọ pụtara ìhè, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ jere ozi n’ụzọ na-apụtaghị ìhè. Ma ha nile ‘jisichara ike,’ na-eji obi ha nile arụkọ ọrụ ọnụ iji rụzuo ọrụ ahụ.—Luk 13:24.

11 Ọ bụ ezie na e nwere mkpa dị nnọọ nta maka ịrụsi ọrụ ike n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ n’ọtụtụ narị afọ ndị sochirinụ, ntụteghachi dị ukwuu nke ọrụ Alaeze malitere mgbe Jisọs weere ike Alaeze ya na 1914. Na mbụ, ọtụtụ ndị amataghị na mkpa maka ndị ọrụ n’ihi ọdịmma Alaeze ga-adị ukwuu otú a, na-achọ enyemaka nke ọtụtụ nde ndị dị njikere n’ala dị iche iche gburugburu ụwa.

12 Taa nzukọ ahụ etinyewo aka n’ụzọ dị omimi n’ọrụ dịgasị nnọọ iche iche nke chọworo ihe onwunwe anyị ruo n’ókè kasị ukwuu. Ọrụ Alaeze na-aga n’ihu n’ihu n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu. Ịdị ngwa nke oge anyị na-akpali anyị itinye mgbalị na iji ihe onwunwe ọ bụla anyị nwere mee ihe iji rụzuo ọrụ e ji n’aka. Ka ọgwụgwụ nke usoro ihe ọjọọ nile na-eru oké nso, anyị na-atụ anya ọbụna ọrụ ka ukwuu n’oge ndị dị n’ihu. A na-akpọ ohu Jehova ọ bụla nke raara onwe ya nye òkù ka o nye onwe ya n’afọ ofufo n’ọrụ nchịkọbata ahụ dị ngwa.

13 Gịnị Dị Mkpa Ka E Mee? Anyị pụrụ ikwu n’eziokwu na e nwere “ọtụtụ ihe ime n’ọrụ Onyenwe anyị.” (1 Kọr. 15:58, NW) N’ọtụtụ ókèala, ihe ubi achawo, ma ndị ọrụ dị ole na ole. A na-akpọ anyị òkù ime òkè anyị ọ bụghị nanị n’ịgba àmà n’ụzọ ka zuo ezu n’ókèala nke anyị kamakwa n’imeri ihe ịma aka nke ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu.

14 Ọ bụ ihe a pụrụ ịja mma ịhụ otú Ndịàmà n’akụkụ nile nke ụwa si enye onwe ha n’afọ ofufo maka ọrụ ndị ọzọ. Ndị a pụrụ ịgụnye malite n’inye onwe ha n’afọ ofufo n’iwu ebe dị iche iche nke ofufe, ije ozi ná mgbakọ dị iche iche, na inye aka n’ọrụ ihe enyemaka dị iche iche mgbe e nwere ọdachi ruo n’ịdị na-ehichasị Ụlọ Nzukọ Alaeze ha n’ụzọ chiri anya. Banyere ihe omume nke ikpeazụ, e nwere okwu nke ijide n’aka mgbe nile na a hapụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ọnọdụ dị ọcha ma dị mma n’anya mgbe nzukọ nke ọ bụla gasịrị. Ịrụzu ọrụ ndị a pụrụ iche na ha dị ala na-egosipụta ezi nghọta nke okwu Jisọs na Luk 16:10: “Onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi n’ihe dịkarịsịrị nta kwesịkwara ka a tụkwasị ya obi n’oké ihe: onye bụkwa onye ajọ omume n’ihe dịkarịsịrị nta bụkwa onye ajọ omume n’oké ihe.”

■ Inye Ihe Omume Dị Iche Iche nke Ọgbakọ Nkwado: Ọ bụ ezie na ọgbakọ nke ọ bụla na-arụ ọrụ dị ka akụkụ nke nzukọ ahụ dum, na-anatakwa nduzi site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” ihe mejupụtara ya bụ ndị nkwusa Alaeze n’otu n’otu. (Mat. 24:45) Ihe ndị ọ na-arụzu na-adabere n’ụzọ dị ukwuu n’ókè Onyeàmà ọ bụla dị njikere ma nwee ike ime. Ọgbakọ na-elekwasị anya n’ịhụ na e kwusara ozi ọma ahụ n’ókèala ya, na-eme ndị na-eso ụzọ ọhụrụ, ma mgbe ahụ na-ewusi ha ike n’ụzọ ime mmụọ. Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ikere òkè n’ọrụ a. Anyị pụkwara isetịpụrụ onwe anyị ihe mgbaru ọsọ n’ọmụmụ ihe onwe onye, ikere òkè n’ụzọ bara uru ná nzukọ, na inyere ndị ọzọ nọ ná mkpa n’ime ọgbakọ aka. Ihe omume ndị a na-enye anyị ọtụtụ ohere dị mma iji gosipụta ịdị njikere anyị.

■ Idu Ndú n’Ọkwá nke Nlekọta: Jehova etinyewo nlekọta nke ọgbakọ nke ọ bụla n’aka ndị okenye ya a họpụtara ahọpụta. (Ọrụ 20:28) Ndị a bụ ndị ikom gbalịworonụ iji ruo eru maka ihe ùgwù nke a. (1 Tim. 3:1) Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nwanna nwoke ọ bụla nọ n’ọgbakọ nwere ohere ụfọdụ nke iru eru maka ibu ọrụ ndị ka ukwuu. Ọtụtụ ụmụnna nwoke na-etolite n’ụzọ ime mmụọ, ọ dịkwa ha mkpa ịnọgide na-eto eto n’okpuru nduzi na enyemaka ịhụnanya nke ndị okenye ọgbakọ. Ndị ikom a kwesịrị ịbụ ndị na-amụsi Bible na akwụkwọ anyị dị iche iche ike. Ha pụrụ igosipụta ịdị njikere ha site n’ido onwe ha n’okpuru ndị okenye e ji mmụọ nsọ họpụta, na-eṅomi okwukwe ha, na-azụlitekwa àgwà ndị a na-achọ n’aka ndị nlekọta.—Hib. 13:7, 17.

■ Iwere Ozi Oge Nile: Ọgbakọ na-arụ ọrụ n’ụzọ bụ isi ikwusa ozi ọma ahụ. (Mat. 24:14) Lee aha ngọzi ọ bụ mgbe ndị na-anụ ọkụ n’obi tinyekwuru mgbalị site n’idebanye aha dị ka ndị ọsụ ụzọ! Nke a na-agụnyekarị ime mgbanwe dị iche iche ná ndụ onwe ha. A pụrụ ichọ mgbanwe ndị ọzọ ka ha wee nọgide n’akụkụ nke a pụrụ iche nke ije ozi. Ma ndị nọgidere n’ihe ùgwù nke a kama ịkwụsị mgbe otu afọ ma ọ bụ karịa gasịrị n’ihi nkụda aka nwa oge aghaghị inweta ngọzi bara ụba nke Jehova. Ndị okenye na-ahụ n’anya na ndị ọzọ tozuru okè pụrụ ịtụnye ụtụ n’ihe ịga nke ọma nke ndị ọsụ ụzọ, na-agba ha ume site n’okwu na omume. Lee aha mmụọ ọma ndị na-eto eto bụ́ ndị na-abanye ozugbo n’ọrụ ọsụ ụzọ ngwa ngwa ha gụsịrị akwụkwọ na-egosipụta! Ọ bụkwa otu ihe ahụ n’ebe ndị meworo okenye nọ bụ ndị na-edebanye aha dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile ngwa ngwa ibu ọrụ nkịtị ha ndị ọzọ belatara. Lee aha afọ ojuju ọ na-ewetara onye Kraịst raara onwe ya nye mgbe o si otú a na-akwado omume Jehova na-eme ka ọrụ nchịkọbata ahụ na-aga ọsọ ọsọ!—Aịsa. 60:22.

■ Ikere Òkè n’Owuwu na Ndozi nke Ebe Ndị A Na-anọ Enwe Nzukọ: E wuwo nnọọ ọtụtụ narị Ụlọ Nzukọ Alaeze ọgbara ọhụrụ, meziekwa ọtụtụ Ala Mgbakọ. N’ụzọ dị ịtụnanya, ọ bụ ụmụnna anyị ndị ikom na ndị inyom ndị wepụtaworo oge na nkà ha n’afọ ofufo rụrụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọrụ ahụ nile. (1 Ihe Eme. 28:21) Ọtụtụ puku ndị ọrụ dị njikere na-edozi ihe owuwu ndị a site n’ịrụ ọrụ ọ bụla a pụrụ ịchọ ka a rụọ. (2 Ihe Eme. 34:8) Ebe ọ bụ na ọrụ a bụ otu akụkụ nke ozi dị nsọ, ndị na-enye aka na-enye onwe ha n’afọ ofufo, n’adịghị ekwu ka a kwụọ ha ụgwọ maka ọrụ ndị ha rụrụ n’akụkụ nke a, dịkwa ka ha na-agaghị ekwu ka a kwụọ ha ụgwọ iji mee nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, kwuo okwu ihu ọha n’ọgbakọ, ma ọ bụ nye aka n’ọrụ mgbakọ dị iche iche. Ndị ọrụ afọ ofufo ndị a na-arụ ọrụ n’efu n’ime atụmatụ na iwu ebe ndị a na-efe ofufe nye otuto Jehova. Ha na-eji ịnụ ọkụ n’obi enye aka n’ihe ndị dị ka idejupụta akwụkwọ iwu dị iche iche, ime ihe ndekọ ego, ime mmekọrịta azụmahịa, na ịgụkọ ọnụ ọgụgụ ngwá ọrụ dị mkpa. Ndị ohu Jehova ndị a na-eguzosi ike n’ihe adịghị agbakwụnye ihe n’ihe ha zụrụ ihe ma ọ bụ na-achọ uru ihe onwunwe n’ụzọ ọ bụla, ebe ọ bụ na a raara nkà na ihe nile ha nwere nye Jehova. Ọrụ a chọrọ ndị ọrụ dị uchu ndị na-eji ‘mkpụrụ obi ha nile arụ ọrụ, dị ka hà na-arụrụ Onyenwe anyị.’—Kọl. 3:23.

15 Mgbe ahụ, gịnị na-eme ka ịdị njikere nke ndị Jehova bụrụ ihe pụrụ iche? Ọ bụ mmụọ nke inye ihe. Inye ihe ha ná mmesapụ aka na-agụnye ihe karịrị ego ma ọ bụ ihe onwunwe—ha ‘na-enye onwe ha n’afọ ofufo.’ (Abụ Ọma 110:3) Nke a bụ isi nraranye anyị nye Jehova. A na-akwụghachi anyị ụgwọ n’ụzọ pụrụ iche. Anyị na-enweta ‘obi ụtọ ka ukwuu,’ anyị ‘na-ewerekwa ngọzi na-ewe ihe ubi’ n’ihi na ihe anyị na-eme na-amasị ndị ọzọ, bụ́ ndị na-enyekwa anyị ihe. (Ọrụ 20:35, NW; 2 Kọr. 9:6; Luk 6:38) Onye Na-eme Ihe Ọma kasị ukwuu nke anyị nwere bụ Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, onye “hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.” (2 Kọr. 9:7) Ọ ga-eji ngọzi ndị ga-adịru ebighị ebi kwụghachi anyị narị okpukpu. (Mal. 3:10; Rom 6:23) Ya mere mgbe e nyere gị ibu ọrụ dị iche iche n’ozi Jehova, ị̀ ga-ewepụta onwe gị n’afọ ofufo ma zaa dị ka Aịsaịa zaghachiri, sị: “Lee m; ziga m”?—Aịsa. 6:8.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya