Ọrụ Ndịozi
18 Mgbe ihe a mechara, o si n’Atens pụọ gaa Kọrịnt. 2 N’ebe ahụ, ọ hụrụ otu onye Juu aha ya bụ Akwịla+ nakwa Prisila nwunye ya. Nwoke a bụ onye Pọntọs, o tebeghịkwa ha si Ịtali bịa ebe a. Ha bịara ebe a maka na Klọdiọs gwara ndị Juu niile ka ha pụọ na Rom. Pọl wee gakwuru ha. 3 Ebe ya na ha nwere otu ụdị aka ọrụ, ọ gara biri n’ụlọ ha. Ya na ha na-arụkọkwa ọrụ,+ n’ihi na aka ọrụ ha bụ ịkpa ákwà ụlọikwuu. 4 Ọ na-akụzi ihe n’ụlọ nzukọ+ n’ụbọchị izu ike ọ bụla.+ Ọ na-akụzikwa ya otú na-eme ka ndị Juu na ndị Grik kweta ihe ọ na-akụzi.
5 Ma mgbe Saịlas+ na Timoti+ si Masedonia gbadata, Pọl malitere iji oge ya niile na-ekwusa okwu Chineke, na-agwa ndị Juu ihe gosiri na Jizọs bụ Kraịst.+ 6 Ma ha nọ na-emegide Pọl ma na-agwa ya okwu ọjọọ. N’ihi ya, o fechara uwe ya+ wee sị ha: “Ka ọbara unu dị unu n’isi.+ Aka m dị ọcha.+ Si ugbu a gawa, m ga-ejekwuru ndị mba ọzọ.”+ 7 O wee si ebe ahụ* pụọ banye n’ụlọ otu nwoke aha ya bụ Tishiọs Jọstọs, onye na-atụ egwu Chineke, onye ụlọ ya dị n’akụkụ ụlọ nzukọ. 8 Ma Krispọs,+ onyeisi oche nke ụlọ nzukọ, na ezinụlọ ya niile, kweere n’Onyenwe anyị. Ọtụtụ n’ime ndị Kọrịnt, ndị nụrụ okwu Chineke, kwekwaara, e mee ha baptizim. 9 N’abalị, Onyenwe anyị gwara Pọl n’ọhụụ, sị: “Ụjọ atụla gị, kama na-ekwusa ozi ọma, adala mbà, 10 n’ihi na e nwere ọtụtụ ndị n’obodo a ga-ekwere na m. N’ihi ya, anọnyeere m gị,+ o nweghịkwa onye ga-emerụ gị ahụ́.” 11 Ọ bụ ya mere o ji nọrọ ebe ahụ otu afọ na ọnwa isii, na-akụziri ndị mmadụ okwu Chineke.
12 N’oge Galio bụ gọvanọ na-achị Akeya, ndị Juu ji otu obi bịa imesi Pọl ike. Ha kpụụrụ ya gaa ebe a na-anọ ekpe ikpe, 13 sị: “Nwoke a na-akụziri ndị mmadụ ka ha na-efe Chineke otú iwu na-ekwughị ka e si na-efe ya.” 14 Ma mgbe Pọl chọrọ ikwu okwu, Galio gwara ndị Juu, sị: “Ndị Juu, n’eziokwu, a sị na o nwere ihe ọjọọ nwoke a mere ma ọ bụ na o nwere arụ ọ kpara, m gaara enwe ndidi na-ege ihe unu na-ekwu. 15 Ma ebe ọ bụ okwu gbasara aha na iwu unu na ihe mmadụ kwuru,+ jirinụ aka unu kpee ya. Achọghị m ikpe ikpe gbasara ihe ndị a.” 16 O wee chụpụ ha ebe ahụ a na-anọ ekpe ikpe. 17 N’ihi ya, ha niile jidere Sọstenis+ onyeisi oche ụlọ nzukọ ma malite iti ya ihe n’ihu ebe ahụ a na-anọ ekpe ikpe. Ma, Galio atụpụghị ọnụ n’ihe a niile.
18 Ma, mgbe Pọl nọkwuru ọtụtụ ụbọchị ebe ahụ, ọ sịrị ụmụnna ka e mesịa ma banye ụgbọ mmiri ga-ebuga ya Siria. Prisila na Akwịla sokwa ya. Ọ kpụdara ntutu isi ya na Senkrea+ n’ihi na o nwere nkwa o kwere Chineke. 19 Mgbe ha ruru Efesọs, ndị nke ọzọ nọdụrụ otu ebe, Pọl abanye n’ụlọ nzukọ na-akụziri ndị Juu ihe, na-enyere ha aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ.+ 20 Ha nọ na-arịọ ya ka ọ nọtụkwuo, ma o kweghị. 21 Kama ọ sịrị ha ka e mesịa, sịkwa ha: “M ga-abịa ịhụ unu ọzọ ma ọ bụrụ uche Jehova.”* O wee banye ụgbọ mmiri n’Efesọs 22 gbadaa Sizaria. Ọ gakwara Jeruselem kelee ọgbakọ dị ebe ahụ ma gawa Antiọk.+
23 Mgbe ọ nọtụrụ ebe ahụ, ọ pụrụ na-aga ebe dị iche iche na Galeshia na Frijia,+ na-eme ka okwukwe ndị niile na-eso ụzọ Jizọs sie ike.+
24 Ma otu onye Juu aha ya bụ Apọlọs,+ onye Alegzandria, bịara n’Efesọs. Ọ bụ ọkà okwu, marakwa Akwụkwọ Nsọ nke ọma. 25 A kụziiri nwoke a ụzọ Jehova.* Mmụọ nsọ mekwara ka o jiri ịnụ ọkụ n’obi na-akụzi ihe ma na-agwa ndị mmadụ eziokwu gbasara Jizọs. Ma ihe ọ ma bụ naanị gbasara baptizim Jọn nọ na-agwa ndị mmadụ ka ha mee. 26 Ọ malitekwara ikwu okwu n’ụlọ nzukọ n’atụghị egwu. Mgbe Prisila na Akwịla+ nụrụ ihe ọ na-ekwu, ha kpọpụrụ ya iche kọwakwuoro ya eziokwu gbasara ụzọ Chineke. 27 Mgbe Apọlọs nọ na-achọ ịga Akeya, ụmụnna degaara ndị ebe ahụ na-eso ụzọ Jizọs akwụkwọ, gwa ha ka ha nabata ya nke ọma. Mgbe o ruru ebe ahụ, o nyeere ndị Chineke meere amara ha ekwere na ya ezigbo aka. 28 Ọ na-apụta n’ihu ọha ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-egosi na ihe ndị Juu na-ekwu abụghị eziokwu. Ọ na-ejikwa Akwụkwọ Nsọ egosi na Jizọs bụ Kraịst.+