Ozi Ọma Luk Dere
17 Jizọs wee gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “A ga na-enwe ihe nwere ike ime ka mmadụ mehie. Ma, onye na-eme ka onye ọzọ mehie ga-ata ahụhụ. 2 Ọ ga-akara ya mma ma ọ bụrụ na e weere nkume e ji egwe nri konye ya n’olu ma tụba ya n’oké osimiri karịa na ọ ga-eme ka otu n’ime ndị a dị nta mehie.+ 3 Kpacharanụ anya. Ọ bụrụ na nwanna gị emehie gị, dụọ ya ọdụ.+ Ọ bụrụkwa na o chegharịa, gbaghara ya.+ 4 Ọ bụrụgodị na o mehie gị ugboro asaa n’ụbọchị, bịakwutekwa gị ugboro asaa n’ụbọchị, sị, ‘Echegharịala m,’ gbaghara ya.”+
5 Ndịozi ahụ wee sị Onyenwe anyị: “Mee ka anyị nwekwuo okwukwe.”+ 6 Onyenwe anyị asị: “Ọ bụrụ na unu enwee okwukwe há ka mkpụrụ osisi mọstad, unu ga-agwa osisi mọlberi ojii a, sị, ‘Fopụ onwe gị ma kụọ onwe gị n’oké osimiri.’ Ọ ga-erubekwara unu isi.+
7 “Ọ bụrụ na otu n’ime unu nwere ohu na-akọrọ ya ubi ma ọ bụ nke na-azụrụ ya atụrụ, olee ihe ọ ga-asị ya ma o si n’ubi lọta? Ọ̀ ga-asị ya, ‘Bịa ebe a ozugbo, nọdụ ala rie ihe na tebụl’? 8 Mba. Kama ọ ga-asị ya: ‘Siere m ihe ka m rie nri anyasị, yirikwa eprọn jeere m ozi. M richaa ihe, ṅụchaakwa ihe, i nweziri ike iri ihe, ṅụọkwa ihe.’ 9 Ọ̀ ga-etowe ohu ahụ maka na ọ rụrụ ọrụ o kwesịrị ịrụ? Mba. 10 Ununwa kwa, mgbe unu mere ihe niile unu kwesịrị ime, sịnụ: ‘Anyị bụ ndị ohu na-abaghị uru ọ bụla. Ihe anyị mere bụ ihe anyị kwesịrị ime.’”+
11 Ka ọ na-aga Jeruselem, o si n’agbata Sameria na Galili na-agafe. 12 Ka ọ na-abanyekwa n’otu obodo, ndị ekpenta iri hụrụ ya. Ma ha guzo n’ebe dị anya.+ 13 Ha wee tie mkpu, sị: “Jizọs, Onye Ozizi, meere anyị ebere!” 14 Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha: “Gaanụ gosi ndị nchụàjà onwe unu.”+ Ma ka ha na-aga, a gwọrọ ha.+ 15 Mgbe otu n’ime ha hụrụ na a gwọọla ya, ọ laghachiri, jiri oké olu na-eto Chineke. 16 O wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala n’ụkwụ Jizọs, na-ekele ya. Ọ bụkwa onye Sameria.+ 17 Jizọs sịrị ya: “Ọ́ bụghị mmadụ iri ka a gwọrọ? Oleekwanụ mmadụ itoolu ndị ọzọ? 18 E wezụga nwoke a bụ́ onye mba ọzọ, è nwere onye ọzọ lọghachiri ka o too Chineke?” 19 O wee sị ya: “Bilie lawa. Okwukwe gị emeela ka ahụ́ dị gị mma.”+
20 Mgbe ndị Farisii jụrụ ya oge Alaeze Chineke ga-abịa,+ ọ sịrị ha: “Alaeze Chineke agaghị abịa otú mmadụ niile ga-ama. 21 Ndị mmadụ agaghịkwa asị, ‘Ọ dị ebe a!’ ma ọ bụ, ‘Ọ dị ebe ahụ!’ N’ihi na Alaeze Chineke dị n’etiti unu.”+
22 Ọ gwaziri ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Oge na-abịa mgbe unu ga-achọ ịhụ otu n’ime ụbọchị Nwa nke mmadụ ma unu agaghị ahụ ya. 23 Ndị mmadụ ga-asịkwa unu, ‘Leenụ ya ebe ahụ!’ ma ọ bụ, ‘Leenụ ya ebe a!’ Unu apụla, unu esokwala ha.+ 24 N’ihi na otú ahụ ọ na-abụ àmụ̀mà gbuo, ìhè ya esi n’otu akụkụ eluigwe ruo n’akụkụ ọzọ n’eluigwe, otú ahụkwa ka ọ ga-adị n’ụbọchị+ Nwa nke mmadụ.+ 25 Ma, Nwa nke mmadụ ga-eburịrị ụzọ taa ọtụtụ ahụhụ, ọgbọ a ajụkwa ya.+ 26 Dịkwa ka ọ dị n’oge Noa,+ otú ahụ ka ọ ga-adị n’oge Nwa nke mmadụ:+ 27 ndị mmadụ nọ na-eri, na-aṅụ, ụmụ nwoke ana-alụ nwaanyị, a na-ekekwa ụmụ nwaanyị di ruo ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ,+ Iju Mmiri abịa bibie ha niile.+ 28 Otú ahụ ọ dị n’oge Lọt ka ọ ga-adịkwa:+ ndị mmadụ nọ na-eri, na-aṅụ, na-azụ, na-ere, na-akụ ihe, na-arụkwa ụlọ. 29 Ma n’ụbọchị Lọt si na Sọdọm pụta, ọkụ na sọlfọ* si n’eluigwe zoo ma bibie ha niile.+ 30 Otú ahụ ka ọ ga-adị n’ụbọchị ahụ mgbe Nwa nke mmadụ ga-egosi ndị mmadụ onwe ya.+
31 “N’ụbọchị ahụ, onye nọ n’elu ụlọ, ya arịdakwala ka ọ gaa buru ihe dị n’ụlọ ya. Onye nọkwa n’ubi, ya alaghachila ka o were ihe ndị ọ hapụrụ n’ụlọ. 32 Chetanụ nwunye Lọt.+ 33 Onye ọ bụla nke na-achọ ịzọpụta ndụ* ya ga-atụfu ya. Ma onye ọ bụla nke tụfuru ndụ ya ga-azọpụta ya.+ 34 Ana m asị unu, n’abalị ahụ, mmadụ abụọ ga-edina n’otu àkwà.* A ga-akpọrọ otu onye, ma a ga-ahapụ onye nke ọzọ.+ 35 Ụmụ nwaanyị abụọ ga na-egwe nri n’otu nkume e ji egwe nri. A ga-akpọrọ otu onye, ma a ga-ahapụ onye nke ọzọ.” 36* —— 37 Ha wee sị ya: “Onyenwe anyị, ebee ka ihe a ga-eme?” Ya asị ha: “Ebe ozu dị, ebe ahụkwa ka ugo ga-ezukọta.”+