Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 8/1 p. 19-24
  • “Anyị Emewo Ihe Anyị Ji Ụgwọ Ime”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Anyị Emewo Ihe Anyị Ji Ụgwọ Ime”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịmata Eziokwu Bible
  • Ọganihu n’Eziokwu
  • Mgbanwe Ọrụ
  • Ndụ na Betel Nwere Nzube
  • Ihe Ùgwù nke Ikere Òkè ná Mgbasawanye
  • Ihe Ndị M Mụtaworo
  • Nke A Ọ̀ Pụrụ Ịbụ Ụzọ Ndụ Kasị Mma Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ị̀ Pụrụ Iwepụta Onwe Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Ebe Ozi Oge Niile Mere Ka M Ruo
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Iji Obi Ekele Na-elekwasị “Ụlọ Chineke” Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 8/1 p. 19-24

“Anyị Emewo Ihe Anyị Ji Ụgwọ Ime”

DỊ KA GEORGE COUCH SI KỌỌ

Mgbe anyị jisịrị ụtụtụ jee ozi ụlọ n’ụlọ, onye mụ na ya so wepụtara bred abụọ. Mgbe anyị tasịrị ya, ewepụtara m siga ka m see. “Ogologo oge hà aṅaa ka ị nọworo n’eziokwu?” ka ọ jụrụ. “Abalị gara aga bụ nzukọ mbụ m gatụworo,” ka m gwara ya.

A MỤRỤ m na March 3, 1917, n’ugbo dị ihe dị ka kilomita 50 n’ebe ọwụwa anyanwụ Pittsburgh, Pennsylvania, U.S.A., na nso obodo nta bụ́ Avonmore. N’ebe ahụ ka nne na nna m zụlitere ụmụnne m ndị nwoke anọ, otu nwanne m nwanyị, na mụ onwe m.

E nyeghị anyị ọzụzụ dị ukwuu nke okpukpe. N’otu oge nne na nna m na-eje chọọchị, ma ha kwụsịrị ije mgbe anyị bụ́ ụmụaka ka dị obere. Otú ọ dị, anyị kwere n’Onye Okike, ndụ ezinụlọ anyị gbasokwara ụkpụrụ ndị bụ́ isi a na-achọta na Bible.

Ọzụzụ kasị mma m natara n’aka nne na nna m bụ n’ihe metụtara ibu ọrụ—otú a ga-esi nara ma rụzuo ya. Ọ bụ otú ahụ ka ndụ n’ugbo dị. Ma ọ bụghị nanị ọrụ mejupụtara ndụ anyị. Anyị na-enwe ntụrụndụ dị mma, dị ka ịtụ basketball na baseball, ịgba ịnyịnya, na igwu mmiri. Ego kọrọ ụkọ n’oge ahụ, ma ndụ n’ugbo dị ụtọ. Anyị gụrụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ nwere otu ọnụ ụlọ mgbe anyị nọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị ma jee n’obodo ukwu ịgụ akwụkwọ n’afọ ndị anyị na-aga ụlọ akwụkwọ dị elu.

N’otu abalị mụ na enyi m so na-aga n’ime obodo. Otu nwa agbọghọ mara mma si n’ụlọ ya pụta ikele enyi m. Enyi m kọwaara Fern Prugh onye m bụ. Ọ dị mma na o bi n’otu okporo ámá ebe ụlọ akwụkwọ dị elu ahụ dị. Ọtụtụ mgbe m na-agafe n’akụkụ ụlọ ya, Fern nọ n’èzí na-arụ ọrụ. O doro anya na ọ bụ onye na-arụsi ọrụ ike, nke ahụ masịrị m. Anyị zụlitere ọbụbụenyi chiri anya na ịhụnanya n’ebe onwe anyị nọ wee lụọ n’April nke 1936.

Ịmata Eziokwu Bible

Tupu a mụọ m, e nwere otu agadi nwanyị nke ndị mmadụ mesoro omume ọjọọ n’ihi okpukpe ya. Nne m na-eleta ya n’ụbọchị Saturday mgbe ọ na-aga n’obodo ukwu ịzụ ihe. Nne m na-ehicha ụlọ ya ma na-ejere ya ozi, na-eme otú ahụ ruo mgbe nwanyị ahụ nwụrụ. Ekwere m na Jehova gọziri nne m n’ihi na o gosiri nwanyị a obiọma nke ukwuu, onye bụ́ Onye Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ.

Oge ụfọdụ mgbe nke ahụ gasịrị, obere nwa nwanyị nwanne nna m nke nwanyị nwụrụ na mberede. Ọ dịghị ezi nkasi obi ndị chọọchị nyere nwanne nna m, ma otu onye agbata obi anyị bụ́ Onye Mmụta Bible mere otú ahụ. Onye Mmụta Bible ahụ kọwaara ya ihe na-eme mgbe mmadụ nwụrụ. (Job 14:13-15; Eklisiastis 9:5, 10) Nke a wetara nkasi obi dị ukwuu. N’aka nke ya, nwanne nna m gwara nne m okwu banyere olileanya mbilite n’ọnwụ. Nke a kpaliri mmasị nne m, ebe ọ bụ na nne na nna ya nwụrụ mgbe ọ dị obere, ọ chọsikwara ike ịmata ihe na-eme mmadụ n’ọnwụ. Ahụmahụ ahụ kụnyere n’ime m mkpa ọ dị iji ohere ọ bụla gbaa àmà n’ụzọ mberede.

N’afọ ndị 1930, nne m malitere ige ntị n’okwu ndị Joseph F. Rutherford, bụ́ onyeisi oche Watch Tower Bible and Tract Society n’oge ahụ, na-ekwu na redio n’ụtụtụ Sunday. N’afọ ndị ahụ, Ndịàmà malitekwara ọrụ ụlọ n’ụlọ n’ebe anyị bi. Ha ga-akwụkọta obere phonograph n’ogige anyị n’okpuru ndo osisi ma kpọọ okwu izi ihe ndị Nwanna Rutherford gụbanyere na rekọd. Rekọd ndị ahụ na magazin Ụlọ Nche na Golden Age (bụ́ Teta! ugbu a) mere ka mmasị nne m dịrị na-aga.

Afọ ole na ole ka e mesịrị, na 1938, e zigaara ndị na-anata ụtụ Ụlọ Nche kaadị nke na-akpọ ha òkù ka ha bịa nzukọ pụrụ iche n’ụlọ mmadụ nke dịpụrụ ihe dị ka kilomita 25. Nne m chọrọ ịga, ya mere mụ na Fern na abụọ n’ime ụmụnne m ndị nwoke sonyeere ya. John Booth na Charles Hessler, bụ́ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova, gwara ihe dị ka anyị mmadụ iri na abụọ okwu. Mgbe nke ahụ gasịrị, ha malitere ịhazi otu ìgwè iji kere òkè n’ozi n’ụtụtụ echi ya. Ọ dịghị onye wepụtara onwe ya isoro ha jee, ya mere Nwanna Hessler họọrọ m ma jụọ sị, “Gịnị ma i sonyere anyị?” Amaghị m kpọmkwem ihe ha na-aga ime, ma apụghị m icheli n’echiche ihe mere na ekwesịghị m inyere ha aka.

Anyị jere site n’ụlọ ruo n’ụlọ ruo ihe dị ka ehihie, mgbe ahụkwa Nwanna Hessler wepụtara bred abụọ. Anyị nọdụrụ ala na stepụ chọọchị ma malite iri ihe. Ọ bụ mgbe m wepụtasịrị siga ahụ ka Nwanna Hessler matara na ọ bụ nanị otu nzukọ ka m garala. O jiri aka ya kwuo na ya ga-abịa n’ụlọ anyị maka nri abalị n’anyasị ahụ ma gwa anyị ka anyị kpọọ ndị agbata obi anyị òkù ịbịa maka nkwurịta okwu Bible. Mgbe nri abalị gasịrị, o duziiri anyị Bible ma kwuo okwu nye ìgwè ihe dị ka mmadụ iri ndị bịaranụ. Ọ gwara anyị na anyị kwesịrị inwe ọmụmụ Bible kwa izu. Ọ bụ ezie na ndị agbata obi anyị ekwenyeghị na nke a, mụ na Fern dokwara inwe ọmụmụ Bible ebe obibi kwa izu.

Ọganihu n’Eziokwu

Ngwa ngwa mgbe nke ahụ gasịrị, mụ na Fern pụrụ n’ozi ubi. Anyị nọ n’azụ oche obere ụgbọala, anyị ka mụnyesịkwara siga mgbe nwanne m nwoke lere anyị anya ma sị: “M ka chọpụtara na Ndịàmà adịghị ese siga.” Ozugbo ahụ, Fern si na window tụfuo siga ya—esechara m nke m. Ọ bụ ezie na ise siga atọwo anyị ụtọ, anyị emetụghị siga aka ọzọ ma ọlị.

Mgbe e mesịrị anyị baptism na 1940, mụ na Fern nọ n’otu nzukọ ebe anyị mụrụ otu isiokwu nke gbara ume ịsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ọrụ nkwusa oge nile. Mgbe anyị na-ala, otu nwanna nwoke jụrụ, sị: “Gịnị mere gị na Fern agaghị asụ ụzọ? Ọ dịghị ihe na-egbochi unu.” Anyị kwenyere ihe o kwuru, ya mere anyị wepụtara onwe anyị. Etinyere m akwụkwọ ime ka ụlọ ọrụ m mara banyere ya ụbọchị 30 tupu oge eruo, anyị wee mee ndokwa ịsụ ụzọ.

Anyị kpọtụụrụ Watch Tower Society banyere ebe anyị kwesịrị ije ozi, e mesịzie anyị kwagara na Baltimore, Maryland. N’ebe ahụ ka e nwere ebe obibi maka ndị ọsụ ụzọ, ụgwọ a na-akwụkwa maka ọnụ ụlọ na nri bụ $10 kwa ọnwa. Anyị nwere ego anyị chekwara bụ́ nke anyị chere ga-eduru anyị n’Amagedọn. (Mkpughe 16:14, 16) E kwuwerị, anyị chere mgbe nile na Amagedọn dị nnọọ nso. Ya mere mgbe anyị malitere ịsụ ụzọ, anyị hapụrụ ụlọ anyị, hapụkwa ihe ndị ọzọ nile.

Anyị sụrụ ụzọ na Baltimore site 1942 ruo 1947. Mmegide nye ọrụ Ndịàmà Jehova kpụ ọkụ n’ọnụ n’afọ ndị ahụ. Kama ịkwọrọ obere ụgbọala anyị gaa n’ebe obibi ndị anyị na-amụrụ Bible, mgbe ụfọdụ anyị na-agwa mmadụ ka ọ kwọga anyị. N’ụzọ dị otú ahụ a gaghị achawa taya ụgbọala anyị. Ọ dịghị onye mmegide dị otú ahụ na-amasị, ma apụrụ m ịsị na anyị nọ na-anụ ụtọ ozi ubi mgbe nile. N’ezie, anyị lere anya inwetatụ ọṅụ n’ịrụ ọrụ Onyenwe anyị.

Ọ dịghị anya anyị mefusịrị ego nile anyị chekwaworo. Taya ụgbọala anyị kwọchasịrị, uwe na akpụkpọ ụkwụ anyị kakwara. Anyị rịara ogologo ọrịa ugbo abụọ ma ọ bụ atọ. Ọ dịghị mfe ịrụrụ na-aga, ma anyị echetụghịdị echiche ịkwụsị. Anyị ekwutụghịdị okwu banyere ya. Anyị mere ka ndụ anyị dị mfe ka anyị wee nwee ike ịnọgide n’ọrụ ọsụ ụzọ.

Mgbanwe Ọrụ

Na 1947, anyị gara mgbakọ na Los Angeles, California. Ka anyị nọ n’ebe ahụ, e nyere mụ na nwanne m bụ́ William akwụkwọ ozi n’otu n’otu nke kenyere anyị ọrụ njegharị ileta ma nyere ọgbakọ dị iche iche aka. E nyeghị anyị ọzụzụ ọ bụla pụrụ iche maka ọrụ ahụ n’oge ahụ. Nanị ihe anyị mere bụ ịgawa. N’afọ asaa ndị sochirinụ, mụ na Fern jere ozi n’Ohio, Michigan, Indiana, Illinois, na New York. Na 1954 a kpọrọ anyị òkù ịbịa klas nke 24 nke Gilead, ụlọ akwụkwọ maka ịzụ ndị ozi ala ọzọ. Ka anyị nọ n’ebe ahụ, Fern butere ọrịa polio. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọ gbakere nke ọma, e kenyekwara anyị ọrụ njegharị na New York nakwa Connecticut.

Ka anyị na-eje ozi na Stamford, Connecticut, Nathan H. Knorr, bụ́ onyeisi oche Watch Tower Society n’oge ahụ, gwara anyị ka anyị soro ya na nwunye ya, bụ́ Audrey, nọrịa ná ngwụsị izu ahụ. Ha nyere anyị nri anyasị bụ́ anụ ehi dị ụtọ na ihe ndị ọzọ e ji sie ya. Anyị na ha mabu, amakwaara m Nwanna Knorr nke ọma nke na m ghọtara na o nwere ihe o bu n’obi ma e wezụga mkpakọrịta anyị na nri anyasị ahụ. Ka e mesịrị n’anyasị ahụ ọ jụrụ m sị, “Ọ̀ ga-amasị gị ịbịa Betel?”

“Ejichaghị m n’aka; amaghị m ihe dị ukwuu banyere ndụ Betel,” ka m zaghachiri.

Mgbe anyị chesịrị banyere nke a ruo ọtụtụ izu, anyị gwara Nwanna Knorr na anyị ga-abịa ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ka anyị mee otú ahụ. N’izu na-eso ya, anyị natara akwụkwọ ozi ịbịa na Betel n’April 27, 1957, bụ́ mgbaafọ nke 21 nke agbamakwụkwọ anyị.

N’ụbọchị mbụ na Betel, Nwanna Knorr nyere m ntụziaka doro anya n’ihe a tụrụ anya ya. Ọ gwara m, sị: “Ị bụkwaghị ohu sekit ọzọ; ị bịara ebe a ịrụ ọrụ na Betel. Nke a bụ ọrụ kasị mkpa ị na-aghaghị ịrụ, anyị chọkwara ka i tinye oge na ume gị n’itinye ọzụzụ ị na-anata na Betel ebe a n’ọrụ. Anyị chọrọ ka ị nọrọ.”

Ndụ na Betel Nwere Nzube

Ọrụ mbụ m rụrụ bụ ná Ngalaba Na-ahụ Maka Magazin na nke Nzipụ Akwụkwọ. E mesịa, mgbe ihe dị ka afọ atọ gasịrị, Nwanna Knorr ziri ozi ka m bịa n’ọfịs ya. Ọ gwara m na nke bụ ihe mere e ji kpọta m na Betel bụ iji rụọ ọrụ n’ebe obibi. Ntụziaka ya guzo kwem, “Ị bịara ebe a ilekọta Ebe Obibi Betel.”

Ilekọta Ebe Obibi Betel chetaara m banyere ihe mmụta ndị nne na nna m kụziwooro m mgbe m na-etolite n’ugbo. Ebe Obibi Betel dị nnọọ ka ezinụlọ mmadụ. E nwere ákwà ndị a ga-asa, nri ndị a ga-akwadebe, efere ndị a ga-asa, àkwà ndị a ga-edozi, na ihe ndị ọzọ. Ndị na-ahụ maka ebe obibi ahụ na-agbalị ime ka Betel bụrụ ebe dị ụtọ obibi, ebe mmadụ pụrụ ịkpọ ebe obibi ya.

Ekwere m na e nwere ọtụtụ ihe mmụta ezinụlọ dị iche iche pụrụ ịmụta site n’otú Betel si arụ ọrụ. Anyị na-eteta n’isi ụtụtụ ma were ihe ime mmụọ malite ụbọchị anyị site n’ịtụle ihe mmụta Bible dịịrị ụbọchị. A na-atụ anya n’aka anyị ịrụsi ọrụ ike na ibi ndụ a haziri nke ọma ma bụrụ nke iji ọrụ n’aka. Betel adịghị ka ebe obibi ndị mọnk, dị ka ụfọdụ pụrụ iche. Anyị na-arụzu ihe dị ukwuu n’ihi ụzọ ndụ anyị a haziri ahazi. Ọtụtụ ekwuwo na ọzụzụ ha natara n’ebe a mesịrị nyere ha aka ịnakwere ibu ọrụ n’ezinụlọ ha nakwa n’ọgbakọ ndị Kraịst.

A pụrụ ikenye ndị ikom na ndị inyom na-eto eto bịara Betel ọrụ ihicha ụlọ, ịsa ákwà, ma ọ bụ ịrụ ọrụ n’ebe a na-ebipụta akwụkwọ. Ụwa pụrụ ịchọ ka anyị kwere na ọrụ ọkpụkpụ aka dị otú ahụ bụ nke dị ala ma na-eweda anyị ala. Ma, ndị na-eto eto na Betel na-aghọta na ọrụ ndị dị otú ahụ dị mkpa ka ezinụlọ anyị rụọ ọrụ nke ọma na n’ụzọ obi ụtọ.

Ụwa pụkwara ịkwalite echiche bụ́ na ọkwá na ùgwù dị gị mkpa iji nwee obi ụtọ n’ezie. Nke ahụ bụ ụgha. Mgbe anyị na-eme ihe e kenyere anyị ime, anyị ‘na-eme ihe anyị ji ụgwọ ime,’ anyị na-anatakwa ngọzi Jehova. (Luk 17:10) Anyị pụrụ inwe ezi afọ ojuju na obi ụtọ nanị ma ọ bụrụ na anyị echeta nzube anyị ji arụ ọrụ anyị na-arụ—ime uche Jehova na ime ka ọdịmma Alaeze gaa n’ihu. Ọ bụrụ na anyị eburu nke ahụ n’uche, ọrụ ọ bụla pụrụ ịdị ụtọ ma na-eju afọ.

Ihe Ùgwù nke Ikere Òkè ná Mgbasawanye

Ná mgbakọ Cleveland, Ohio, na 1942, ihe karịrị afọ iri tupu anyị abịa na Betel, Nwanna Knorr kwuru okwu bụ́ “Udo—Ọ̀ Pụrụ Ịdịgide?” O mere ka o doo anya na Agha Ụwa nke Abụọ, bụ́ nke na-aga n’ihu mgbe ahụ, ga-akwụsị nakwa na a ga-enwe oge udo nke ga-enye ohere maka ime nkwusa sara mbara. Na 1943, e guzobere Ụlọ Akwụkwọ Gilead iji zụọ ndị ozi ala ọzọ na Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke iji mee ka ikike ikwu okwu nke ụmụnna n’ihu ọha ka mma. A hazikwara mgbakọ ndị buru ibu. Ndị pụtara ìhè karịsịa n’afọ ndị 1950 bụ ndị ahụ e mere n’Ámá Egwuregwu Yankee, New York. N’ihe metụtara mgbakọ ndị e mere n’ebe ahụ na 1950 na 1953, enwere m ohere inye aka dokwaa maka akatamkpo Trailer City ebe e nyere ọtụtụ iri puku mmadụ ụlọ maka ụbọchị asatọ ná mgbakọ nke ọ bụla.

Mgbe mgbakọ ndị ahụ gasịrị, gụnyere nke kasị ha nile ukwuu na 1958, e nwere mmụba ndị dị ukwuu ná ndị nkwusa Alaeze. Nke a metụtara ọrụ anyị na Betel kpọmkwem. Ná ngwụsị afọ ndị 1960 nakwa ná mmalite afọ ndị 1970, anyị nọ nnọọ n’ihe isi ike ịchọta ohere na ọnụ ụlọ ebe ndị ọrụ ga-ebi. Iji nye ezinụlọ anyị na-amụbawanyenụ ụlọ, anyị aghaghị inwetakwu ụlọ ihi ụra, kichin, na ụlọ iri ihe.

Nwanna Knorr gwara mụ na Nwanna Max Larson, bụ́ onye nlekọta ụlọ obibi akwụkwọ, ka anyị chọta ụlọ kwesịrị ekwesị maka mgbasawanye. Na 1957, mgbe m bịara Betel, e nyere ezinụlọ anyị dị ihe dị ka 500 ụlọ n’otu nnukwu ụlọ obibi. Ma n’afọ ndị gafeworonụ, Society zụtara ma rụzigharịa họtel ukwu atọ ndị dị nso—Towers, Standish, na Bossert—nakwa ọtụtụ ụlọ ndị katụ nta. Na 1986 Society zụtara ụlọ ebe Hotel Margaret dịbu werezie ọmarịcha ụlọ ọhụrụ ahụ e wuru n’ebe ahụ mere ebe obibi maka ihe dị ka mmadụ 250. E mesịa ná mmalite afọ ndị 1990, e wuru ụlọ obibi dị okpukpu 30 iji nye ndị ọrụ 1,000 ndị ọzọ ụlọ. Betel Brooklyn pụrụ inye ndị òtù ezinụlọ anyị karịrị 3,300 ụlọ na nri ugbu a.

A zụtakwara ụlọ na Wallkill, New York, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kilomita 160 site na Betel dị na Brooklyn. N’ime afọ ndị gafeworonụ, malite ná ngwụsị afọ ndị 1960, e wuru ọtụtụ ụlọ ebe obibi na otu ebe obibi akwụkwọ buru ibu n’ebe ahụ. Ugbu a, ihe dị ka ndị òtù 1,200 nke ezinụlọ Betel anyị bi ma na-arụ ọrụ n’ebe ahụ. Na 1980 a malitere ịchọ ala ihe dị ka hekta 250 dị New York City nso karị, nweekwa ụzọ awara awara dị mma. Onye ọrụ na-ahụ maka ala na ụlọ chịrị ọchị wee sị: “Olee ebe unu ga-ahụ ụdị ala ahụ? Ọ gaghị ekwe omume.” Ma ọ kpọghachiri n’ụtụtụ echi ya ma sị: “Achọtawo m ala unu.” Taa, a maara ya dị ka Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower dị na Patterson, New York. N’ebe ahụ, a na-enwe ụlọ akwụkwọ dị iche iche, e nwekwara ezinụlọ nke ihe karịrị ndị ozi 1,300.

Ihe Ndị M Mụtaworo

Amụtawo m na ezi onye nlekọta bụ onye pụrụ inweta ihe ọmụma bara uru n’aka ndị ọzọ. Ihe ka ọtụtụ ná nchepụta ndị m nweworo ihe ùgwù itinye n’ọrụ dị ka onye nlekọta Betel sitere n’aka ndị ọzọ.

Mgbe m bịara Betel, ọtụtụ mere agadi dị ka m merela taa. Ihe ka ọtụtụ anwụọla ugbu a. Ole ndị na-anọchi anya ndị ahụ kara nka ma nwụọ? Ọ dịghị abụkarị ndị kasị nwee ikike. Ọ bụ ndị nọ ebe a, na-arụ ọrụ n’ikwesị ntụkwasị obi, na-ewepụta onwe ha.

Ihe ọzọ dị mkpa icheta bụ uru ezi nwunye bara. Nkwado nke ezigbo nwunye m, bụ́ Fern, abụrụwo oké ihe enyemaka nye m n’ịrụzu ọrụ ọchịchị Chineke m. Ndị bụ́ di nwere ibu ọrụ nke ịhụ na nwunye ha na-enwe ọṅụ n’ọrụ ha. Ana m agbalị ime atụmatụ maka ihe mụ na Fern na-enwe mmasị ime. Ọ naghị abụkebe ihe dị oké ọnụ, nanị ihe dị iche n’ihe anyị na-emebu. Ọ dị n’ubu di ime ihe iji mee nwunye ya obi ụtọ. Oge o so ya nọkọọ dị oké ọnụ ahịa ma na-agafe ngwa ngwa, ya mere ọ dị ya mkpa iji ya mee ihe kasị mma.

Enwere m ọṅụ ịdị ndụ ná mgbe ikpeazụ nke Jisọs kwuru okwu banyere ya. Nke a bụ oge kasị dị ịtụnanya n’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ. Anyị nwere ike iji anya nke okwukwe anyị lee ma hụ otú Onyenwe anyị si ewulite nzukọ ya ná nkwadebe maka mbịarute nke ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa. Ka m na-eleghachi anya azụ n’oge ndụ m n’ozi Jehova, apụrụ m ịhụ na ọ bụ Jehova na-ahazi nzukọ a—ọ bụghị ụmụ mmadụ. Anyị bụ nanị ndị na-ejere ya ozi. N’ihi ya, anyị aghaghị ịdị na-elegara ya anya maka nduzi. Ozugbo o setịpụrụ ihe anyị ga-eme, anyị kwesịrị ịbanye na ya ozugbo ma mekọọ ya ọnụ.

Were onwe gị nye nzukọ a, ị ga-ejikwa n’aka inwe ndụ rijuru afọ na nke obi ụtọ. Ihe ọ bụla ị na-eme—ma ọ bụ ịsụ ụzọ, ọrụ sekit, ije ozi n’ọgbakọ dị ka onye nkwusa, ozi Betel, ma ọ bụ ọrụ ozi ala ọzọ—gbasoo ntụziaka ndị e setịpụrụ, werekwa ọrụ gị kpọrọ mkpa. Gbalịa ike gị ịnụ ụtọ ọrụ ọ bụla na ụbọchị ọrụ nke ọ bụla n’ozi Jehova. Ike ga-agwụ gị, ị pụkwara ịrụgbu onwe gị n’ọrụ ma ọ bụ nwee nkụda mmụọ mgbe ụfọdụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka ị na-aghaghị icheta nzube i ji rara ndụ gị nye Jehova. Ọ bụ iji mee uche ya, ọ bụghị nke gị.

Ọ dịbeghị ụbọchị m bịara ọrụ ma ghara ịnụ ụtọ ihe m rụrụ. N’ihi gịnị? N’ihi na mgbe anyị ji mkpụrụ obi anyị dum were onwe anyị nye Jehova, anyị na-enwe afọ ojuju ịmara na “anyị emewo ihe anyị ji ụgwọ ime.”

[Foto dị na peeji nke 19]

Ịsụ ụzọ na Baltimore, 1946

[Foto dị na peeji nke 19]

Mụ na Fern n’ime Trailer City na 1950

[Foto dị na peeji nke 19]

Ngalaba Na-ahụ Maka Magazin

[Foto dị na peeji nke 19]

Trailer City, 1950

[Foto dị na peeji nke 22]

Mụ na Audrey na Nathan Knorr

[Foto dị na peeji nke 23]

Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower dị na Patterson, New York

[Foto dị na peeji nke 24]

Mụ na Fern taa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya