Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 8/15 p. 16-21
  • Ịgbara “Mba Nile” Àmà

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịgbara “Mba Nile” Àmà
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmụọ Jehova na Ozi Ọma Ahụ
  • Ịmara Mkpa Ime Mmụọ
  • Ụzọ Ndị Na-aga nke Ọma Maka Iji Gbasaa Ozi Ọma Ahụ
  • Àgwà Ndị Kraịst Bụkwa Àmà
  • Òtù Ohu ahụ Na-enye Ngwá Ọrụ Ndị Kwesịrị Ekwesị
  • Anyị Nile Nwere Ibu Ọrụ
  • Nzukọ Jehova Na-akwado Ozi Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Obi Ò Siri Gị Ike na Ị Chọtala Eziokwu? N’ihi Gịnị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • A Ghaghịkwa Ibu Ụzọ Kwusaa Ozi Ọma nke A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • “Gaanụ Mee Ndị Mba Niile Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ M”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 8/15 p. 16-21

Ịgbara “Mba Nile” Àmà

“A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”​—⁠MATIU 24:14.

1. N’ihi gịnị ka okwu Jisọs ndị e dekọrọ na Matiu 24:14 na-aghaghị iji bụrụ ihe ịtụnanya nye ndị na-eso ụzọ ya?

LEE ihe ịtụnanya okwu Jisọs ndị ahụ e dere n’elu na-aghaghị ịbụwororị ndị na-eso ụzọ ya bụ́ ndị Juu! Nanị echiche ahụ nke ndị Juu e doro nsọ ije na-agwa ndị Jentaịl “na-adịghị ọcha,” “ndị mba ọzọ,” okwu bụ ihe ọhụrụ nye onye Juu, ọbụna ihe a na-asọ oyi.a Leenụ, ezigbo onye Juu na-agbaso iwu agaghị eche echiche ịbanye n’ebe obibi nke onye Jentaịl! Ndị ahụ na-eso ụzọ bụ́ ndị Juu nwere ihe dị ukwuu ha ka ga-amụta banyere Jisọs, ịhụnanya ya, na ọrụ ya. Ha nwekwara ihe dị ukwuu ha ka ga-amụta banyere eleghị mmadụ anya n’ihu nke Jehova.​—⁠Ọrụ 10:​28, 34, 35, 45.

2. (a) Ruo n’ókè hà aṅaa ka ozi Ndịàmà gbasaworo? (b) Isi ihe atọ dị aṅaa tụnyeworo ụtụ n’ọganihu nke Ndịàmà?

2 Ndịàmà Jehova ekwusawo ozi ọma ahụ n’etiti mba nile, gụnyere Israel nke oge a, na-ekwusakwa ya ugbu a n’ọtụtụ mba karịa ka e metụworo ya. Na 1994, ihe karịrị nde Ndịàmà anọ na ọkara na-eme nkwusa n’ihe dị ka 230 ala. Ha na-eduziri ndị nwere mmasị ihe dị ka nde ọmụmụ Bible ebe obibi anọ na ọkara. A na-emezu nke a n’agbanyeghị ịkpọasị zuru ụwa nile, nke na-adaberekarị n’amaghị nke a na-akọ ná nkụzi na ebumnuche nke Ndịàmà ahụ. Dị ka e kwuru banyere ndị Kraịst oge gboo, otú ahụ ka a pụrụ ikwu banyere ha: “Ihe banyere ịrọ òtù a, anyị mazuuru na a na-ekwugide ya ebe nile.” (Ọrụ 28:22) Gịnịzị ka a pụrụ ikwu kpatara ihe ịga nke ọma nke ozi ha? E nwere ma ọ dịkarịa ala ihe atọ nke na-atụnye ụtụ n’ọganihu ha​—⁠ịgbaso idu ndú nile nke mmụọ Jehova, iṅomi ụzọ Kraịst ndị a pụrụ iji mee ihe, na iji ngwá ọrụ ndị kwesịrị ekwesị maka nkwurịta okwu dị irè na-eme ihe.

Mmụọ Jehova na Ozi Ọma Ahụ

3. N’ihi gịnị ka anyị na-apụghị iji tuo ọnụ maka ihe a rụzuworo?

3 Ndịàmà Jehova hà na-etu ọnụ banyere ihe ịga nke ọma ha dị ka a ga-asị na ọ bụ n’ihi ikike ọ bụla pụrụ iche ha nwere? Ee e, n’ihi na okwu Jisọs na-emezu n’ọnọdụ ha: “Mgbe ọ bụla unu ga-emesị ihe nile a kaworo aka nye unu, sịnụ, Anyị bụ ohu ndị na-abaghị n’ihe; anyị emewo ihe anyị ji ụgwọ ime.” Dị ka ndị Kraịst raara onwe ha nye, e meworo baptism, Ndịàmà Jehova anakwerewo ibu ọrụ nke ijere Chineke ozi afọ ofufo, n’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ onwe onye ha. Nye ụfọdụ, nke ahụ pụtara ije ozi oge nile dị ka ndị ozi ala ọzọ ma ọ bụ dị ka ndị ọrụ afọ ofufo n’alaka ụlọ ọrụ na ihe owuwu dị iche iche maka ibipụta akwụkwọ ndị Kraịst. Nye ndị ọzọ mwepụta onwe onye dị otú ahụ nke ndị Kraịst na-eduga ha n’ọrụ iwu ihe n’ihe owuwu dị iche iche nke okpukpe, gaa n’ime nkwusa oge nile dị ka ndị ozi ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ime nkwusa nwa oge dị ka ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ n’ọgbakọ ndị dị n’ógbè dị iche iche. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị nke pụrụ iji anyị ịrụ ọrụ dịịrị anyị nyaa isi n’ụzọ ziri ezi, “ihe anyị ji ụgwọ ime.”​—⁠Luk 17:10; 1 Ndị Kọrint 9:16.

4. Olee otú e siworo merie mmegide zuru ụwa ọnụ nke ozi ndị Kraịst?

4 A pụrụ ikwu na ọ bụ mmụọ, ma ọ bụ ike ọrụ Jehova kpatara ihe ịga nke ọma ọ bụla anyị nwere. O ziri ezi ikwu taa dị ka o ziri ezi ikwu n’ụbọchị onye amụma bụ Zekaraịa, sị: “Nke a bụ okwu Jehova nke Ọ gwara Zerubabel, sị, Ọ bụghị site n’usuu ndị agha, ọ bụghịkwa site n’ike, kama ọ bụ site na Mmụọ m, ka Jehova nke usuu ndị agha sịrị.” N’ihi ya, e meriwo mmegide zuru ụwa ọnụ nke a na-emegide ọrụ nkwusa nke Ndịàmà, ọ bụghị site ná mgbalị ụmụ mmadụ kama site ná nduzi na nchebe nke Jehova.​—⁠Zekaraịa 4:6.

5. Òkè dị aṅaa ka Jehova na-ekere n’ịhụ na a gbasara ozi Alaeze ahụ?

5 Banyere ndị ahụ na-azaghachi n’ebe ozi Alaeze ahụ dị, Jisọs sịrị: “E dewo ya n’akwụkwọ ndị amụma, sị, Ha nile ga-abụkwa ndị Chineke ziworo ihe. Onye ọ bụla nke nụworo site n’ọnụ Nna m, nke mụtawokwara ihe, ọ na-abịakwute m. . . . Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m, ọ bụrụ na e nyeghị ya site n’aka Nna m.” (Jọn 6:​45, 65) Jehova pụrụ inyocha obi na uche, ọ makwaara ndị o yiri ka ha ga-azaghachi n’ịhụnanya ya ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ha amatabeghị ya. Ọ na-ejikwa ndị mmụọ ozi na-eme ihe iduzi ozi a pụrụ iche. Ọ bụ ya mere Jọn ji hụ nkere òkè nke ndị mmụọ ozi n’ọhụụ wee dee, sị: “M wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efe n’etiti eluigwe, na-enwe ozi ọma ebighị ebi izisara ndị na-anọdụ n’elu ụwa, bụ́ mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla.”​—⁠Mkpughe 14:6.

Ịmara Mkpa Ime Mmụọ

6. Omume dị aṅaa bụ isi dị mkpa ka mmadụ wee zaghachi n’ozi ọma ahụ?

6 Isi ihe ọzọ dị na Jehova inye mmadụ ohere ịnakwere ozi ọma ahụ bụ́ nke ahụ Jisọs kwupụtara: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3, NW) Onye onwe ya juru afọ ma ọ bụ onye na-adịghị achọ eziokwu agaghị amata mkpa ime mmụọ. Ọ na-eche echiche nanị n’ụzọ ihe a na-ahụ anya, nke anụ ahụ. Ịbụ onye onwe onye juru afọ na-aghọ ihe mgbochi. Ya mere, mgbe ọtụtụ ndị anyị na-ezute ka anyị na-eje site n’ụlọ ruo n’ụlọ jụrụ ozi ahụ, anyị aghaghị iburu n’uche ihe nile dị iche iche ndị mmadụ pụrụ ikwu kpatara mmeghachi omume ha.

7. N’ihi gịnị ka ọtụtụ na-ejighị azaghachi n’eziokwu ahụ?

7 Ọtụtụ ndị adịghị ege ntị n’ihi na ha ji ikwesi olu ike rapagidesie ike n’okpukpe nke ndị mụrụ ha, ha adịghịkwa njikere inwe mkparịta ụka. Ndị ọzọ aghọọla ndị okpukpe ndị kwekọrọ n’ụdị onye ha bụ dọọrọ mmasị ha​—⁠ụfọdụ chọrọ okpukpe ihe omimi, ndị ọzọ na-azaghachi n’ebe mkpali mmetụta uche dị, ma ndị ọzọ na-achọ ihe omume nnọkọ efu na chọọchị ha. Ọtụtụ ndị taa ahọrọwo ụzọ ndụ nke na-emegide ụkpụrụ Chineke. Ma eleghị anya ha na-ebi ndụ rụrụ arụ, nke bụ́ ihe mere ha ji na-asị, “Enweghị m mmasị.” Ma ndị ọzọ, ndị pụrụ ịzọrọ na ha gụrụ akwụkwọ marakwa banyere nkà sayensị, na-ajụ Bible dị ka ihe ụmụaka.​—⁠1 Ndị Kọrint 6:9-⁠11; 2 Ndị Kọrint 4:​3, 4.

8. N’ihi gịnị ka ọjụjụ na-ekwesịghị iji belata ịnụ ọkụ n’obi anyị? (Jọn 15:​18-⁠20)

8 Ọjụjụ nke ihe ka ọtụtụ na-ajụ ò kwesịrị ibelata okwukwe na ịnụ ọkụ n’obi anyị n’ozi ahụ na-azọpụta ndụ? Anyị pụrụ inweta nkasi obi site n’okwu Pọl gwara ndị Rom: “N’ihi na a sị na ụfọdụ ekweghị, gịnịkwa? ekweghị ekwe hà ga-eme ka ikwesị ntụkwasị obi nke Chineke ghara ịdị irè? Chineke ekwela: kama ka ọ pụta ìhè na Chineke bụ Onye eziokwu, ma mmadụ nile n’otu n’otu bụ ndị ụgha; dị ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Ka e wee gụọ Gị n’onye ezi omume n’okwu Gị nile, ka I wee kpegbuokwa mgbe a na-ekpe Gị ikpe.”​—⁠Ndị Rom 3:​3, 4.

9, 10. Olee ihe àmà e nwere na e meriwo mmegide n’ọtụtụ ala?

9 Anyị pụrụ inweta agbamume site n’ọtụtụ ihe atụ dị gburugburu ụwa nke mba dị iche iche ebe yiwororị ka ebe na-adịghị aṅa ntị ma ọlị, ma mgbe oge na-aga, ghọrọ nnọọ ebe dị iche kpam kpam. Jehova na ndị mmụọ ozi amataworị na e nwere ndị obi ha ziri ezi a ga-achọta​—⁠ma Ndịàmà Jehova aghaghị ịnọgide ma tachie obi n’ozi ha. Were dị ka ihe atụ, mba ụfọdụ ebe ikpe okpukpe Katọlik yiri ka ọ bụ oké ihe mgbochi a na-apụghị imeri emeri na 50 afọ gara aga​—⁠Argentina, Brazil, Colombia, Ireland, Itali, Mexico, Portugal, na Spain. Ndịàmà dị ole na ole laa azụ na 1943, nanị 126,000 n’ụwa nile, na-enwe 72,000 n’ime ndị a na United States. Amaghị nke a na-akọ na ịkpọasị na-eche Ndịàmà ahụ ihu yiri mgbidi brik nke a na-apụghị ịkwatu akwatu. Ma, taa ụfọdụ n’ime ihe kasị mma a rụpụtara site n’ime nkwusa abụwo ná mba ndị a. Ọ bụkwa otu ihe ahụ n’ọtụtụ mba ndị bụbu mba ọchịchị Kọmunist. Na 1993, baptism nke 7,402 mmadụ n’otu mgbakọ na Kiev, Ukraine, na-enye ihe àmà maka nke a.

10 Olee ụzọ Ndịàmà ahụ jiworo mee ihe iji mee ka ndị agbata obi ha nụrụ ozi ọma ahụ? Hà ejiwo ihe ụ̀rà nke ihe onwunwe dị iche iche mee ihe iji tọghata ndị mmadụ, nke bụ ihe ụfọdụ kwuworo? Hà eletawo nanị ndị ogbenye na ndị na-agụghị akwụkwọ dị ka ndị ọzọ zọrọwooro?

Ụzọ Ndị Na-aga nke Ọma Maka Iji Gbasaa Ozi Ọma Ahụ

11. Ihe nlereanya ọma dị aṅaa ka Jisọs setịpụrụ n’ozi ya? (Lee Jọn 4:​6-⁠26.)

11 Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya guzobere ụkpụrụ nke Ndịàmà na-agbaso ruo taa n’ọrụ ha nke ime ndị na-eso ụzọ. Jisọs jere n’ebe ọ bụla ndị mmadụ nọ, ndị ọgaranya ma ọ bụ ndị ogbenye​—⁠n’ebe obibi, ebe ọha na-anọ, n’akụkụ ọdọ mmiri, n’akụkụ ugwu, ọbụna n’ụlọ nzukọ dị iche iche.​—⁠Matiu 5:1, 2; 8:14; Mak 1:16; Luk 4:15.

12, 13. (a) Olee otú Pọl si setịpụrụ ndị Kraịst ihe nlereanya? (b) Olee otú Ndịàmà Jehova siworo gbasoo ihe nlereanya Pọl?

12 Banyere ozi nke ya, Pọl onyeozi pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi, sị: “Unu onwe unu maara, site n’ụbọchị mbụ m zọrọ ụkwụ n’Esia, otú m nọ n’etiti unu oge ahụ nile, otú m bụrụ ohu Onyenwe anyị . . . , otú egwu na-emeghị m ka m ghara ịkọrọ unu otu ihe n’ihe nile baara unu uru, na izi unu ihe n’ihu ọha mmadụ, n’ụlọ nke aka unu kwa n’otu n’otu.”​—⁠Ọrụ 20:​18-⁠20.

13 A maara Ndịàmà Jehova n’ụwa nile n’ihi ịgbaso ụkpụrụ nke ndị ozi, ozi ụlọ n’ụlọ. Kama ilekwasị anya ná mgbasa ozi TV, nke na-efu oké ego, na-abamighị ime, nke na-adịghị erute ndị mmadụ n’otu n’otu, Ndịàmà na-ejekwuru ndị mmadụ, ndị ọgaranya na ndị ogbenye, na-ezutekwa ha ihu na ihu. Ha na-achọ ikwurịta banyere Chineke na Okwu ya.b Ha adịghị agbalị ime ndị Kraịst osikapa na-eji ihe onyinye dị iche iche. Nye ndị ahụ dị njikere iche echiche, ha na-egosipụta na nanị ezi ngwọta dịịrị nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ bụ ọchịchị site n’aka Alaeze Chineke, nke ga-agbanwe ọnọdụ ndị dị n’elu ala anyị ịka mma.​—⁠Aịsaịa 65:17, 21-⁠25; 2 Pita 3:13; Mkpughe 21:​1-⁠4.

14. (a) Olee otú ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ na ndị ọsụ ụzọ siworo tọọ ntọala siri ike? (b) Gịnị ka anyị na-amụta site n’ahụmahụ Ndịàmà Jehova na Japan?

14 Iji rụzuo ọrụ ahụ n’ọtụtụ ala ruo n’ókè o kwere mee, ndị ozi ala ọzọ na ndị ọsụ ụzọ eguzobewo n’ọtụtụ mba ókèala ebe a pụrụ isi chịkọta ọrụ ahụ. Ha atọwo ntọala, e mesịa Ndịàmà bụ ndị obodo ebutewo ụzọ. N’ụzọ dị otú a, ọ chọbeghị ọnụ ọgụgụ buru ibu nke Ndịàmà si mba ọzọ iji hụ na nkwusa ahụ na-aga n’ihu na iji hazie ya nke ọma. Otu ihe atụ pụtara ìhè bụ Japan. Laa azụ ná ngwụsị nke afọ ndị 1940, n’ụzọ ka ukwuu ọ bụ ndị ozi ala ọzọ si Australasia na Britain jere n’ebe ahụ, mụọ asụsụ ha, kwekọọ n’ọnọdụ n’emepechaghị anya nke ọgbọ ahụ dị mgbe agha gasịrị, wee malite ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ. N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, a machibidoro ma kpagbuo Ndịàmà na Japan. Ya mere ndị ozi ala ọzọ ahụ bịara wee hụ nanị Ndịàmà Japan ole na ole na-arụsi ọrụ ike. Ma taa, ha etowo ruo ihe karịrị 187,000 n’ihe gafere 3,000 ọgbakọ! Gịnị bụ isi ihe dị n’ihe ịga nke ọma ha bịara ngwa ngwa? Otu onye ozi ala ọzọ jeworo ozi ruo ihe gafere 25 afọ n’ebe ahụ sịrị: “Ọ kasị mkpa ịmụta iso ndị mmadụ na-enwe mkparịta ụka. Site n’ịmụta asụsụ ha, anyị nwere ike itinye onwe anyị n’ọnọdụ ha, ịghọta na inwe mmasị n’ụzọ ha si adị ndụ. Anyị aghaghị igosi na anyị hụrụ ndị Japan n’anya. Anyị ji obi umeala gbalịa ịghọ akụkụ nke ógbè ahụ, otú ọ dị, n’emebighị ụkpụrụ ndị Kraịst anyị.”

Àgwà Ndị Kraịst Bụkwa Àmà

15. Olee otú Ndịàmà siworo gosipụta àgwà ndị Kraịst?

15 Otú ọ dị, ndị mmadụ azaghachibeghị nanị n’ozi Bible. Ha ahụwokwa Iso Ụzọ Kraịst n’ọrụ. Ha ahụwo ịhụnanya, nkwekọrịta na ịdị n’otu nke Ndịàmà ọbụna n’ọnọdụ ndị kasị sie ike, dị ka agha obodo, agha ebo, na ibu iro nke agbụrụ. Ndịàmà anọgidewo na-enwe nnọpụiche doro anya nke ndị Kraịst n’agha nile mezuokwa okwu Jisọs: “Iwu ọhụrụ ka m na-enye unu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya; dị ka m hụrụ unu n’anya, ka unu onwe unu hụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.”​—⁠Jọn 13:​34, 35.

16. Ahụmahụ dị aṅaa na-enye ihe atụ nke ịhụnanya ndị Kraịst e tinyere n’ọrụ?

16 E gosipụtara ịhụnanya onye agbata obi n’ihe banyere otu agadi nwoke onye degaara akwụkwọ akụkọ a na-ebi n’ógbè ya akwụkwọ banyere “Mazị na Oriakụ Ndị Ọma.” Ọ kọwara na ndị agbata obi ya egosiworị ya obi ọma mgbe nwunye ya na-anwụ. “Kemgbe ọ nwụrụ . . . ha dị egwu,” ka o dere. “Kemgbe ahụ ha ‘ekuchiwo’ m . . . , na-arụ ụdị ọrụ nile dị n’ụlọ, na-enyekwa aka igbo mkpa dị iche iche nke onye dị 74 afọ nke laworo ezumike nká. Ihe mere ka ihe a nile ọbụna pụọ iche karị bụ na ha bụ ndị isi ojii, abụ m onye ọcha. Ha bụ Ndịàmà Jehova, abụ m onye Katọlik na-adịkwaghị eje ụka.”

17. Ụzọ dị aṅaa ka anyị ga-ezere?

17 Ahụmahụ nke a na-egosi na anyị pụrụ ịgba àmà n’ọtụtụ ụzọ, gụnyere àgwà anyị kwa ụbọchị. N’ezie, ọ gwụla ma àgwà anyị o yiri nke Kraịst, ozi anyị ga-abụ nke yiri nke ndị Farisii, n’enweghị mmetụta ọ bụla. Anyị achọghị ịdị ka ndị ahụ Jisọs kọwara: “Ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke ha ga-asị unu mee, meenụ ihe ndị a, debekwa ha: ma unu emela dị ka ọrụ nile ha si dị; n’ihi na ha na-ekwu, ma ha adịghị eme.”​—⁠Matiu 22:37-⁠39; 23:3.

Òtù Ohu ahụ Na-enye Ngwá Ọrụ Ndị Kwesịrị Ekwesị

18. Olee otú akwụkwọ ndị e ji amụ Bible si akwadebe anyị inyere ndị nwere obi eziokwu aka?

18 Ihe ọzọ dị mkpa n’ikwusara mba nile ozi ọma ahụ abụwo inwe ike inweta akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ndị Watch Tower Bible and Tract Society na-emepụta. Anyị nwere akwụkwọ, broshụọ, traktị, na magazin dị iche iche ndị pụrụ ime ka afọ ju ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla ji obi eziokwu na-ajụ ajụjụ. Ọ bụrụ na anyị ezute onye Alakụba, Hindu, Buddha, Tao, ma ọ bụ Juu, anyị pụrụ iji akwụkwọ Mankind’s Search for God ma ọ bụ ụdị traktị na akwụkwọ nta dị iche iche mee ihe iji malite nkwurịta okwu nakwa ọmụmụ Bible ma eleghị anya. Ọ bụrụ na onye kwere n’evolushọn ajụọ banyere okike, anyị pụrụ iji akwụkwọ Life​—⁠How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? mee ihe. Ọ bụrụ na onye na-eto eto ajụọ, sị, ‘Gịnị bụ nzube nke ndụ?’ anyị pụrụ izoro ya aka n’akwụkwọ Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya. Ọ bụrụ na nsogbu onwe onye dị iche iche na-enyesi mmadụ nsogbu ike​—⁠ịda mbà n’obi, oké ike ọgwụgwụ, ndina n’ike, ịgba alụkwaghịm⁠—​anyị nwere magazin ndị kwuworo okwu n’isiokwu ndị ahụ n’ụzọ bara uru. N’eziokwu, òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nke Jisọs buru n’amụma na ọ ga na-enye “[ihe oriri] n’oge ya” na-emezu òkè ya.​—⁠Matiu 24:​45-⁠47.

19, 20. Olee ụzọ ọrụ Alaeze ahụ siworo gaa ọsọ ọsọ n’Albania?

19 Ma iji rute mba nile, ọ dịwo mkpa imepụta akwụkwọ nke a n’ọtụtụ asụsụ. Olee otú o siworo kwe omume ịsụgharị Bible na akwụkwọ dị iche iche e ji amụ Akwụkwọ Nsọ gaa n’ihe karịrị 200 asụsụ? Ntụle dị mkpirikpi nke otu ihe atụ, Albania, na-egosi otú òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nke nwekwara uche siworo nwee ike ịkwalite ozi ọma ahụ n’agbanyeghị oké ihe isi ike nakwa n’enweghị Pentikọst nke oge a iji nye ikike nke ịsụ asụsụ dị iche iche ozugbo.​—⁠Ọrụ 2:​1-⁠11.

20 Nanị afọ ole na ole gara aga, a ka nọ na-ele Albania anya dị ka nanị mba ọchịchị ndị Kọmụnist nke na-ekweghị na Chineke ma ọlị. Magazin bụ́ National Geographic kwuru n’afọ 1980, sị: “Albania machibidoro [okpukpe], na-akpọ onwe ya na 1967 ‘mba mbụ n’ụwa nke na-ekweghị na Chineke.’ . . . Ọgbọ ọhụrụ nke Albania maara nanị ekweghị na Chineke.” Ugbu a ọchịchị ndị Kọmunist dakpọworo, ndị Albania matara mkpa ime mmụọ ha na-azaghachi ná nkwusa nke Ndịàmà Jehova na-eme. E guzobere otu ìgwè nsụgharị dị nta na Tiranë na 1992 nke ndị mejupụtara ya bụ Ndịàmà na-eto eto ndị maara asụsụ Italian na Bekee. Ụmụnna ndị ruru eru bụ́ ndị si n’ala ndị ọzọ bịa kụziiri ha otú e si eji ígwè kọmputa ndị a pụrụ ịtụkwasị n’apata ụkwụ ede ihe n’asụsụ Albanian. Ha malitere ịsụgharị traktị dị iche iche na magazin Ụlọ Nche. Ka ha na-enwetakwu ahụmahụ, ha na-arụ ọrụ n’ịsụgharị mbipụta ndị ọzọ bara uru ndị dabeere na Bible. Ka ọ dị ugbu a, e nwere ihe dị ka 200 Ndịàmà na-arụsi ọrụ ike ná ntakịrị mba ahụ (nwere ọnụ ọgụgụ mmadụ 3,262,000), 1,948 mmadụ bịakwara Ememe Ncheta na 1994.

Anyị Nile Nwere Ibu Ọrụ

21. N’ụdị oge dị aṅaa ka anyị na-ebi n’ime ya?

21 Ihe ndị na-eme n’ụwa na-eru n’ọtụtụ ya kasị elu. N’ihi ịrị elu nke mpụ na ime ihe ike, igbu mmadụ na ndina n’ike n’agha dị iche iche nke obodo, ọdịda nke ụkpụrụ omume ọma nke jupụtara ebe nile na mkpụrụ ọ na-amịpụta nke ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, enweghị nkwanye ùgwù maka ịchịisi iwu kwadoro, ụwa yiri ka ọ na-aghọ nke na-adịghị n’usoro, nke a na-apụghị ịchị achị. Anyị nọ n’oge yiri oge ndị dị tupu Iju Mmiri ahụ a kọwara na Jenesis: “Jehova wee hụ na ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa, Ọ hụkwa na nchepụta nile ọ bụla nke echiche obi ya bụ nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile. Jehova wee chegharịa na O mere mmadụ n’ụwa, o wee wute Ya n’obi Ya.”​—⁠Jenesis 6:​5, 6; Matiu 24:​37-⁠39.

22. Olee ibu ọrụ ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova nile nwere?

22 Dị ka ọ dị n’ụbọchị Noa, Jehova ga-eme ihe. Ma n’ikpe ziri ezi na ịhụnanya ya, ọ chọrọ ka e buru ụzọ kwusaara mba nile ozi ọma na ozi ịdọ aka ná ntị ahụ. (Mak 13:10) N’akụkụ nke a Ndịàmà Jehova nwere ibu ọrụ​—⁠ịchọta ndị ahụ ruru eru inweta udo nke Chineke na ịkụziri ha ụzọ udo ya nile. N’isi nso, n’oge nke Chineke, a ga-arụzu ọrụ ime nkwusa ahụ n’ụzọ gara nke ọma. “Mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-eru.”​—⁠Matiu 10:12, 13; 24:14; 28:19, 20.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ndị Jentaịl, lee isiokwu bụ́ “Nations” (Mba Dị Iche Iche) n’akwụkwọ Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke Abụọ, peji nke 472-⁠474, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

b Maka aro ndị bara uru n’ozi ndị Kraịst, lee Ụlọ Nche, August 15, 1985, peji nke 15, “Ụzọ A Ga-esi Bụrụ Ndị Ozi Dị Irè,” na peji nke 21, “Ozi Dị Irè Na-eduga n’Inwetakwu Ndị Na-eso Ụzọ.”

Ị̀ Na-echeta?

◻ Olee ihe ịga nke ọma Ndịàmà nke oge a nweworo n’ozi ha?

◻ N’ihi gịnị ka ọtụtụ ji ajụ ozi ndị Kraịst?

◻ Olee ụzọ isi mee nkwusa nke ndị ozi nke Ndịàmà ji na-eme ihe?

◻ Ngwá ọrụ dịgasị aṅaa ka anyị nwere maka ozi dị irè?

◻ Gịnị ka anyị nile na-aghaghị ime n’ikwekọ na Mak 13:10?

[Igbe dị na peeji nke 19]

MBA NDỊÀMÀ NA-ARỤSI ỌRỤ IKE NA 1943 NA 1993

Argentina 374 102,043

Brazil 430 366,297

Chile 72 44,668

Colombia ?? 60,854

France Agha Ụwa nke Abụọ—e nweghị ihe ndekọ 122,254

Ireland 150 4,224

Italy Agha Ụwa nke Abụọ—e nweghị ihe ndekọ 201,440

Mexico 1,565 380,201

Peru E nweghị ihe ndekọ nke ihe a rụrụ 45,363

Philippines Agha Ụwa nke Abụọ—e nweghị ihe ndekọ 116,576

Poland E nweghị ihe ndekọ nke ihe a rụrụ 113,551

Portugal E nweghị ihe ndekọ nke ihe a rụrụ 41,842

Spain E nweghị ihe ndekọ nke ihe a rụrụ 97,595

Uruguay 22 9,144

Venezuela E nweghị ihe ndekọ nke ihe a rụrụ 64,081

[Foto dị na peeji nke 17]

Ndịàmà Jehova na-amụba n’ọtụtụ mba nke ndị Katọlik, dị ka Spain

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ndịàmà Jehova na-arụsi ọrụ ike ná mba ndị dị gburugburu ụwa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya