Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 6/15 p. 17-21
  • Nzukọ Jehova Na-akwado Ozi Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Jehova Na-akwado Ozi Gị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịdịgide n’Agbanyeghị Mmegide Zuru Ụwa Ọnụ
  • Jehova Na-agọzi Nkwusa E Ji Ịnụ Ọkụ n’Obi Eme
  • Ime Mgbanwe Iji Kwekọọ ná Mkpa Ndị Mmadụ
  • Gịnị Na-akwali Ndịàmà Jehova?
  • Ịnụ Ọkụ n’Obi Anyị Iji Gbazuo Àmà Ahụ
  • Ịgbara “Mba Nile” Àmà
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • “Gaanụ Mee Ndị Mba Niile Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ M”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • A Ghaghịkwa Ibu Ụzọ Kwusaa Ozi Ọma nke A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Olee Otú E Si Na-ekwusa Ozi Ọma?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 6/15 p. 17-21

Nzukọ Jehova Na-akwado Ozi Gị

‘M wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efe n’etiti eluigwe, na-enwe ozi ọma ebighị ebi izisa.’—MKPUGHE 14:6.

1. Olee otú e siworo nwaa Ndịàmà Jehova, n’ihi gịnịkwa ka ha jiworo nọgide?

N’IHI gịnị ka o ji dị oké mkpa ịmata òkè nzukọ eluigwe Jehova na-ekere n’ịkwado ozi ndị Kraịst? Ndịàmà Jehova hà gaara enwewo ike ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke gburugburu ụwa nke na-enweghị omume enyi n’enweghị nkwado nke usuu ndị agha Jehova nọ n’eluigwe? Ndịàmà emewo nkwusa dị otú ahụ n’ime narị afọ nke ịhụ mba n’anya gafere ókè, usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị aka ike, agha ụwa, na ahụhụ ndị ọzọ. N’enweghị enyemaka Jehova, Ndịàmà hà pụrụ ịlanarịwo ọtụtụ ajọ mbunobi, ịkpọasị, na mkpagbu dị njọ a kpagbuworo ha mgbe mgbe?—Abụ Ọma 34:7.

Ịdịgide n’Agbanyeghị Mmegide Zuru Ụwa Ọnụ

2. Myirita dị aṅaa dị n’etiti ezi ndị Kraịst nke narị afọ mbụ na ndị nke taa?

2 Na narị afọ nke 20 a, ndị iro, ma ndị okpukpe ma ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ewepụtawo ihe mgbochi nile ha pụrụ, nke iwu na ndị ọzọ, iji gbalịa igbochi ma ọ bụ ịbịanyụ ọrụ Jehova. A kpagbuwo, kwuo ihe na-abụghị eziokwu banyere, kwuluo, ma kwutọọ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị Kraịst—ọbụna e gbuwo ọtụtụ—nke na-esitekarị ná nkwali ndị ụkọchukwu nke Babilọn Ukwu ahụ. A pụrụ ikwu, dị ka e kwuru banyere ndị Kraịst oge mbụ, na “ihe banyere ịrọ òtù a, anyị mazuru na a na-ekwugide ya ebe nile.” Dị nnọọ ka ndị ụkọchukwu ndị Juu n’oge Kraịst lụrụ ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ iji kwụsị ozi ya, otú ahụ ndị ụkọchukwu na ndị si n’ezi ofufe dapụ, ná njikọ aka ha na enyi ha bụ́ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, anwawo ịkwụsị oké ọrụ ịgba àmà na-akụzi ihe nke ndị Jehova.—Ọrụ 28:22; Matiu 26:59, 65-67.

3. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’iguzosi ike n’ezi ihe nke Henryka Żur?

3 Were dị ka ihe atụ ihe mere na Poland na March 1, 1946. Henryka Żur, nwa agbọghọ bụ́ Onyeàmà dị afọ 15 nke sitere nso nso Chelm, sonyeere Onyeàmà ọzọ, bụ́ nwanna nwoke, ije leta ndị nwere mmasị n’obodo nta dị nso. Ndị òtù nke otu usuu ndị agha Katọlik a na-akpọ Narodowe Siły Zbrojne (Òtù Ndị Agha Mba) jidere ha. A kụrụ nwanna nwoke ahụ isi aba okpu, ma ọ zọọrọ isi ya. Ọ dịghị otú ahụ n’ebe Henryka nọ. E mekpọrọ ya ọnụ n’ụzọ dị egwu ruo ọtụtụ hour ka ha na-agbalị ịmanye ya ka o mee akara nke obe ndị Katọlik. Otu n’ime ndị na-emekpa ya ahụ sịrị: “Kwenye n’ihe ọ bụla ị chọrọ ikwenye, nanị mee akara nke obe Katọlik. Ma ọ bụghị otú ahụ, otu mgbọ na-echere gị!” Ọ̀ dara mbà n’iguzosi ike n’ezi ihe ya? Ee e. Ndị okpukpe ahụ tụgburu onwe ha n’ụjọ dọkpụụrụ ya baa n’otu ọhịa dị nso ma gbagbuo ya. N’agbanyeghị nke ahụ, o meriri! Ha enweghị ike imebi iguzosi ike n’ezi ihe ya.a—Ndị Rom 8:35-39.

4. Olee otú ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na okpukpe siworo gbalịa ịkwụsị ọrụ nkwusa Alaeze ahụ?

4 Ruo ihe karịrị otu narị afọ, e mesowo ndị ohu Chineke nke oge a ihe n’ụzọ obi ọjọọ na n’ụzọ enweghị nkwanye ùgwù. N’ihi na Ndịàmà Jehova abụghị, ha achọghịkwa ịbụ, akụkụ nke okpukpe ndị bụ́ isi nke Setan, a na-ele ha anya dị ka anụ oriri nye onye nkatọ obi ọjọọ ma ọ bụ onye mmegide ọ bụla bu okpukpe n’isi. Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị awakpowo ha n’ụzọ dị njọ nke ukwuu. E gbuwo ọtụtụ Ndịàmà n’ihi okwukwe ha. Ọbụna ihe a sị na ọ bụ ọchịchị onye kwuo uche ya anwawo igbochi nkwusa ozi ọma ahụ. Laarị azụ na 1917 na Canada na United States, ndị ụkọchukwu welitere ebubo nke ịgba ọchịchị mgba okpuru megide Ndị Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà mgbe ahụ. A tụrụ ndị isi ọrụ nke Watch Tower Society mkpọrọ n’ụzọ na-ezighị ezi, nanị na e mesịrị kachapụ ebubo e boro ha.—Mkpughe 11:7-9; 12:17.

5. Olee okwu ndị gbaworo ndị ohu Jehova ume?

5 Setan ejiwo ohere ọ bụla o nwere nwaa ịkwụsị ọrụ ịgba àmà nke ụmụnna Kraịst na ndị enyi ha na-eguzosi ike n’ihe. Ma, dị ka ọtụtụ ahụmahụ na-egosi, ọbụnadị iyi egwu, mmaja, iti ihe, mkpọrọ, ogige ịta ahụhụ, ma ọ bụ ọbụna ọnwụ emebeghị ka Ndịàmà Jehova mechie ọnụ. Nke a abụwokwa eziokwu n’akụkọ ihe mere eme nile. Ugboro ugboro, okwu Elaịsha abụrụwo ihe agbamume: “Atụla egwu: n’ihi na ndị anyị na ha nọ dị ọtụtụ karịa ndị ha na ha nọ.” Otu ihe kpatara ya bụ na ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi karịrị usuu ndị agha nke Ekwensu!—2 Ndị Eze 6:16; Ọrụ 5:27-32, 41, 42.

Jehova Na-agọzi Nkwusa E Ji Ịnụ Ọkụ n’Obi Eme

6, 7. (a) Mgbalị ndị mbụ dị aṅaa ka e mere iji kwusaa ozi ọma ahụ? (b) Olee mgbanwe bara uru weere ọnọdụ malite na 1943?

6 Ka narị afọ nke 20 na-aga n’ihu, Ndịàmà Jehova ejiwo ọtụtụ ọganihu na nkà na ụzụ mee ihe iji mee ka a gbasaa ma mee ka oké ọrụ ịgba àmà ahụ gaa ngwa ngwa tupu oge ọgwụgwụ ahụ eruo. Laa azụ na 1914, Pastọ Russell, bụ́ onyeisi oche mbụ nke Watch Tower Bible and Tract Society, kwalitere ojiji mbụ e ji ihe nkiri slide na sinima ndị e mere ka ha na okwu dabeere na Bible a gụbanyere na phonograph na-agakọ mee ihe, n’ihe ngosi Bible na-ewe hour asatọ a kpọrọ “Foto Ihe Nkiri nke Okike.” Ọ tụrụ ndị na-ekiri ya n’ọtụtụ mba n’anya n’oge ahụ. Ka oge na-aga, n’afọ ndị 1930 na 1940, a bịara mara Ndịàmà maka ojiji ha na-eji obere phonograph na-eme nkwusa ụlọ n’ụlọ, na-eji okwu Bible ndị J. F. Rutherford, bụ́ onyeisi oche nke abụọ nke Society, kwubanyere na tepụ, eme ihe.

7 Na 1943, e weere nzọụkwụ n’atụghị egwu n’okpuru nduzi nke Nathan H. Knorr, bụ́ onyeisi oche nke atọ nke Society, mgbe e kpebiri iguzobe ụlọ akwụkwọ maka ndị ozi n’ọgbakọ ọ bụla. A ga-azụ Ndịàmà ime nkwusa na izi ihe site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’ejighị tepụ phonograph eme ihe. Kemgbe ahụ, a haziwo ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ iji nye ndị ozi ala ọzọ, ndị ozi ọsụ ụzọ oge nile, ndị okenye ọgbakọ, na ndị nlekọta nwere ibu ọrụ n’alaka dị iche iche nke Watch Tower Society ọzụzụ. Gịnị ka ọ rụpụtaworo?

8. Olee otú Ndịàmà si gosi okwukwe dị ukwuu na 1943?

8 Laa azụ na 1943, n’etiti Agha Ụwa nke Abụọ, e nwere nanị Ndịàmà 129,000 na-arụsi ọrụ ike n’ala 54. Ma, ha nwere okwukwe na mkpebisi ike na Matiu 24:14 ga-emezu tupu ọgwụgwụ ahụ eruo. Ha kwenyere na Jehova ga-eme ka e buru ụzọ kwusaa ozi ịdọ aka ná ntị ahụ dị mkpa tupu e nwee usoro ihe omume ndị ga-eweta usoro ihe nke a rụrụ arụ ná njedebe. (Matiu 24:21; Mkpughe 16:16; 19:11-16, 19-21; 20:1-3) À kwụghachiwo mgbalị ha ụgwọ ọrụ?

9. Eziokwu ndị dị aṅaa na-egosi na ọrụ ime nkwusa ahụ enwewo ihe ịga nke ọma?

9 E nwere ugbu a ọ dịkarịa ala mba 13 nwere ihe karịrị Ndịàmà 100,000 na-arụsi ọrụ ike ná nke ọ bụla. Ụfọdụ n’ime ndị a bụ́ ala ebe ndị ka n’ọnụ ọgụgụ na-ekpe Chọọchị Katọlik. Otú ọ dị, leenụ ọnọdụ dịnụ. Brazil nwere ihe dị ka ndị nkwusa 450,000 nke ozi ọma ahụ, ihe karịkwara 1,200,000 bịara Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst na 1997. Mexico bụ ihe atụ ọzọ, na-enwe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Ndịàmà 500,000 na ihe karịrị 1,600,000 n’Ememe Ncheta. Mba Katọlik ndị ọzọ bụ Itali (ihe dị ka Ndịàmà 225,000), France (ihe dị ka 125,000), Spain (ihe karịrị 105,000), na Argentina (ihe karịrị 115,000). Na United States, bụ́ ebe ndị ka n’ọnụ ọgụgụ na-ekpe okpukpe Protestant, Katọlik, na okpukpe ndị Juu, e nwere ihe dị ka Ndịàmà 975,000, ihe karịkwara 2,000,000 bịara Ememe Ncheta. N’ezie, oké ìgwè mmadụ na-enupụta site na Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, ya na ozizi ya ndị dị omimi ma na-echigharịkwuru nkwa Chineke ndị dị mfe ma bụrụ ndị e ji n’aka banyere “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.”—2 Pita 3:13; Aịsaịa 2:3, 4; 65:17; Mkpughe 18:4, 5; 21:1-4.

Ime Mgbanwe Iji Kwekọọ ná Mkpa Ndị Mmadụ

10. Olee otú ọnọdụ siworo gbanwee n’ebe ụfọdụ?

10 A chọtara ọtụtụ n’ime ndị ahụ siteworo na Kraịst Jisọs chigharịkwuru Jehova site n’ụlọ n’ụlọ. (Jọn 3:16; Ọrụ 20:20) Ma e jiriwo ụzọ ndị ọzọ mee ihe. Oge agbanwewo, ọnọdụ akụ̀ na ụba emewo ka ọtụtụ ndị inyom na-arụzi ọrụ n’èzí. Mgbe mgbe, n’ime izu, ọ bụ mmadụ ole na ole ka a pụrụ ịhụ n’ụlọ. N’ihi ya, Ndịàmà Jehova emewo mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ ahụ. Dị ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nke oge mbụ, ha na-eje n’ebe na mgbe a ga-ahụ ndị mmadụ.—Matiu 5:1, 2; 9:35; Mak 6:34; 10:1; Ọrụ 2:14; 17:16, 17.

11. Olee ebe Ndịàmà Jehova na-eme nkwusa taa, gịnịkwa ka ọ rụpụtaworo?

11 Ndịàmà na-ebute ụzọ ma na-eji ụzọ akọ na-eme nkwusa nye ndị mmadụ n’ebe ndọba ụgbọala, ụlọ azụmahịa, ụlọ mmepụta ihe, ọfịs na ógbè achụmnta ego, ụlọ akwụkwọ, ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, ebe a na-agbara mmanụ ụgbọala, họtel na ụlọ nri, nakwa n’okporo ámá ndị buru ibu. N’ezie, ha na-eme nkwusa n’ebe ọ bụla a pụrụ ịhụ ndị mmadụ. Mgbe ndị mmadụ nọkwa n’ụlọ, mgbe ahụ Ndịàmà na-anọgide na-akpọtụrụ ha n’ebe ahụ. Ụzọ a nke ime mgbanwe na ịdị irè na-eme ka e nwee mmụba nke nkesa akwụkwọ e ji amụ Bible. A na-achọta ndị yiri atụrụ. A na-amalite ọmụmụ Bible ndị ọhụrụ. Ihe karịrị nde ndị ozi afọ ofufo ise na ọkara ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ nkụzi kasị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ! Ì nwere ihe ùgwù nke ịbụ otu n’ime ha?—2 Ndị Kọrint 2:14-17; 3:5, 6.

Gịnị Na-akwali Ndịàmà Jehova?

12. (a) Olee otú Jehova si ezi ndị ya ihe? (b) Mmetụta dị aṅaa ka ozizi a na-enwe?

12 Olee otú nzukọ eluigwe ahụ si bata n’ihe a nile? Aịsaịa buru amụma, sị: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova; udo nke ụmụ gị ga-abakwa ụba.” (Aịsaịa 54:13) Jehova na-ezi òtù ụmụnna a zuru ụwa ọnụ ihe site ná nzukọ ya a na-ahụ anya n’ụwa—n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na ná mgbakọ dị iche iche. Ihe na-esi na ya apụta bụ ịdị n’otu na udo. Nkụzi Jehova emepụtawo ndị bụ ọpụrụiche, ndị e ziri ịhụ ibe ha na onye agbata obi ha n’anya dị ka onwe ha, ọ bụghị ịkpọ ndị agbata obi ha asị, n’ebe ọ bụla ha pụrụ ibi n’ụwa nke a na-adịghị n’otu, kewakwara ekewa.—Matiu 22:36-40.

13. Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na nduzi ndị mmụọ ozi dị n’ọrụ ime nkwusa?

13 Ịhụnanya bụ ihe na-akwali Ndịàmà Jehova ịnọgide na-eme nkwusa n’agbanyeghị enweghị mmasị ma ọ bụ mkpagbu. (1 Ndị Kọrint 13:1-8) Ha maara na a na-atụzi ọrụ ịzọpụta ndụ ha site n’eluigwe, dị ka Mkpughe 14:6 na-ekwu. Gịnị bụ ozi ahụ a na-ekwusa n’okpuru nduzi ndị mmụọ ozi? “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa Ya otuto; n’ihi na oge hour nke ikpe Ya abịawo: kpọọkwanụ isiala nye Ya, bụ́ Onye kere eluigwe na ala na oké osimiri na isi iyi nile nke mmiri nile.” Nkwusa nke ozi ọma Alaeze ahụ na-ebuli aha Jehova elu. A na-akpọ ndị mmadụ òkù ịbịa nye Onye Okike ahụ, bụ́ Chineke, otuto, ọ bụghị nye ihe ndị e kere eke na evolushọn kpuru ìsì. Gịnịkwa mere ọrụ nkwusa ahụ ji dị oké ngwa? N’ihi na oge hour nke ikpe abịawo—ikpe megide Babilọn Ukwu ahụ na akụkụ ndị ọzọ nke usoro ihe a na-ahụ anya nke Setan.—Mkpughe 14:7; 18:8-10.

14. Olee ndị so n’ọrụ nkụzi a dị ukwuu?

14 Ọ dịghị onye Kraịst ọ bụla e mere baptism a na-agụpụ site n’ọrụ nkwusa a. Ndị okenye ime mmụọ na-ebute ụzọ n’isoro ọgbakọ na-eme nkwusa. Ndị ọsụ ụzọ e nyere ọzụzụ na-anọ n’ọrụ ahụ mgbe dum. Ndị nkwusa na-anụ ọkụ n’obi nke ozi ọma Alaeze ahụ, ma hà nwere ike ime nkwusa nanị hour ole na ole n’ọnwa ma ọ bụ ọtụtụ hour, na-agbasa ozi ahụ n’akụkụ nile nke ụwa.—Matiu 28:19, 20; Ndị Hibru 13:7, 17.

15. Gịnị bụ ihe na-egosi mmetụta nke ime nkwusa Ndịàmà Jehova na-enwe?

15 Mgbalị a nile hà enwewo mmetụta n’ụwa? Otu ihe dị mfe na-anwapụta na o nwewo bụ ugboro ole a na-ekwu banyere Ndịàmà Jehova n’usoro ihe omume TV nakwa ná nkebi akụkọ dị iche iche. Ndị a na-emekarị ka nnọgidesi ike na mkpebisi ike anyị iru mmadụ nile pụta ìhè. Ee, ịnụ ọkụ n’obi anyị na ọnụnọ anyị na-anọ ya mgbe nile na-enwe mmetụta miri emi, ọ bụrụgodị na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ajụ ozi ahụ na ndị na-ezi ya!

Ịnụ Ọkụ n’Obi Anyị Iji Gbazuo Àmà Ahụ

16. Àgwà dị aṅaa ka e kwesịrị igosipụta ugbu a n’oge nta fọdụrụnụ?

16 Anyị amaghị otú oge fọdụrụnụ maka usoro ihe ndị a hà, ọ dịghịkwa anyị mkpa ịma, ọ bụrụhaala na ebumnobi anyị n’ijere Jehova ozi dị ọcha. (Matiu 24:36; 1 Ndị Kọrint 13:1-3) Ma anyị maara na iji mee ka ịhụnanya, ike, na ikpe ziri ezi nke Jehova pụta ìhè, a ghaghị “ibu ụzọ” kwusaa ozi ọma ahụ. (Mak 13:10) N’ihi ya, n’agbanyeghị afọ ole anyị jiworo oké atụmanya chere ọgwụgwụ nke ajọ ụwa, nke ikpe na-ezighị ezi, na nke ime ihe ike nke a, anyị aghaghị iji ịnụ ọkụ n’obi na-adị ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nraranye anyị dị ka ọnọdụ anyị si dị. Anyị pụrụ ịbụ ndị agadi ma ọ bụ na-arịa ọrịa, ma anyị ka pụrụ ijere Jehova ozi na-eji ịnụ ọkụ n’obi ahụ anyị nwere n’oge ntorobịa ma ọ bụ n’oge anyị nwere ahụ ike karị. Ma e leghị anya anyị apụkwaghị ịnọgide na-etinye oge dị nnọọ ukwuu n’ozi dị ka anyị na-emebu, ma n’ezie anyị pụrụ ijigide ọdịdị nke àjà otuto anyị nye Jehova.—Ndị Hibru 13:15.

17. Kọọ otu ahụmahụ na-agba ume nke pụrụ inyere anyị nile aka.

17 Ya mere, mà anyị na-eto eto ma anyị emewo agadi, ka anyị gosi ịnụ ọkụ n’obi ma soro ndị nile anyị na-ezute kerịta ozi ụwa ọhụrụ anyị dị mma. Ka anyị dị ka nwa agbọghọ ahụ dị afọ asaa na-eme ihere bi n’Australia bụ́ onye so nne ya gaa n’ụlọ ahịa. Ọ nụwo n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mkpa ọ dị ka mmadụ nile mee nkwusa, n’ihi ya o tinyere broshuọ Bible abụọ n’akpa ya. Ka nne ya nọ na-azụta ihe n’ebe a na-akwasa ngwá ahịa, nwata nwanyị ahụ pụrụ n’anya. Mgbe nne ya chọrọ ya, lee ya ka ọ nọ na-enyefe otu nwanyị otu broshuọ! Nne ya jere ebe ahụ iji rịọ mgbaghara maka mkpasu iwe nwa ya nwanyị pụrụ ịkpataworo nwanyị ahụ. Ma nwanyị ahụ anaraworị broshuọ ahụ n’obiọma. Mgbe nne ahụ na nwa ya nwanyị nọ nanị ha ọzọ, ọ jụrụ ya otú o si nweta obi ike ijekwuru onye ọ na-amabughị. “Nanị ihe m kwuru bụ, Ngwa, Jikere, Gawa! M wee gaa!”

18. Olee otú anyị pụrụ isi gosi mmụọ na-adọrọ mmasị?

18 Mmụọ dị ka nke nwa agbọghọ Australia ahụ dị anyị nile mkpa, karịsịa iji were ozi ọma ahụ jekwuru ndị anyị na-amabughị ma ọ bụ ọbụna ndị ọchịchị. Anyị pụrụ ịtụ ụjọ ịbụ ndị a jụrụ. Ka anyị ghara ichezọ ihe Jisọs kwuru: “Unu echegbula onwe unu otú unu ga-agọpụ onwe unu ma ọ bụ ihe unu ga-eji gọpụ onwe unu, ma ọ bụ ihe unu ga-ekwu: n’ihi na Mmụọ Nsọ ga-ezi unu n’oge hour ahụ ihe unu na-aghaghị ikwu.”—Luk 12:11, 12.

19. Olee otú i si ele ozi gị anya?

19 Ya mere, tụkwasị obi n’enyemaka nke mmụọ Chineke ka ị na-eji ozi ọma ahụ na-ejekwuru ndị mmadụ n’ụzọ obiọma. Ọtụtụ nde na-atụkwasịkarị ndị ikom na ndị inyom na-abaghị n’ihe obi bụ́ ndị na-apụta taa ma laa echi. Anyị na-atụkwasị Jehova na nzukọ eluigwe ya—Kraịst Jisọs, ndị mmụọ ozi dị nsọ, na ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị a kpọliteworo n’ọnwụ—bụ́ ndị na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi obi! Ya mere, cheta: “Ndị anyị na ha nọ dị ọtụtụ karịa ndị ha na ha nọ”!—2 Ndị Eze 6:16.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Iji nwetakwuo ihe atụ ndị ọzọ, lee 1994 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peji nke 217-220.

Olee Otú I Si Aza?

◻ Òkè dị aṅaa ka nzukọ eluigwe Chineke kerewooro ná nnọgide nke ndị Jehova?

◻ Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị okpukpe dị aṅaa wakpoworo Ndịàmà Jehova na narị afọ nke 20?

◻ Olee otú Ndịàmà Jehova siworo gbanwee ozi ha ikwekọ ná mkpa nke oge ndị a?

◻ Gịnị na-akwali gị ime nkwusa?

[Foto dị na peeji nke 17]

Henryka Żur

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ndịàmà Jehova na-eme nkwusa mgbe na ebe ọ bụla a ga-ahụ ndị mmadụ

Japan

Martinique

United States

Kenya

United States

[Foto dị na peeji nke 20]

Ná mmalite narị afọ a, e ji “phonograph” mee ihe iji gbasaa ozi Alaeze ahụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya