Ndị Gụsịrị Akwụkwọ na Gilead—“Ezi Ndị Ozi Ala Ọzọ!”
“GỊNỊ bụ onye ozi ala ọzọ?” Otu uche akwụkwọ akụkọ jụrụ ajụjụ a ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ anọ gara aga. Onye dere ya tụgharịrị uche na ezi ndị ozi ala ọzọ bụ ngwá ọrụ nke mgbanwe ọha mmadụ na akụ̀ na ụba. Otú ọ dị, na Sunday, March 5, 1995, na Jersey City Assembly Hall of Jehovah’s Witnesses, e nyere azịza dị nnọọ iche n’ụzọ doro anya. Gịnị ka a na-eme? Ọ bụ ngụsị akwụkwọ nke klas nke 98 nke Watchtower Bible School of Gilead—ụlọ akwụkwọ nke zipụworo ndị ozi ala ọzọ n’elu ụwa nile!
Mgbe abụ mmeghe na ekpere gasịrị, Albert D. Schroeder nke Òtù Na-achị Isi ji obi ụtọ nabata 6,430 nile ndị bịaranụ. N’okwu mmeghe ya, Nwanna Schroeder mere ka o doo anya ihe mere ndị gụsịrị akwụkwọ na Gilead ji dị iche n’ebe ndị ọzọ ndị kpọworo onwe ha ndị ozi ala ọzọ nọ. Ọ sịrị: “Bible bụ akwụkwọ ọgụgụ bụ isi maka Gilead.” A zụghị ndị gụsịrị akwụkwọ na Gilead ịbụ ndị ọrụ ebere, kama ndị nkụzi nke Okwu Chineke. Ha si otú a bụrụ ndị ruru eru n’ụzọ pụrụ iche ilekọta mkpa ime mmụọ nke ndị nọ n’ubi ala ọzọ.
Ndị ọkà okwu ndị ọzọ sochirinụ rụtụrụ aka n’ọtụtụ akụkụ ndị ọzọ ebe ndị gụsịrị akwụkwọ na Gilead nyere ihe nnwapụta nke ịbụ “ezi” ndị ozi ala ọzọ. Charles Molohan gwara ha okwu n’isiokwu bụ́ “Gaa n’Ihu Na-amị Mkpụrụ Ọma Dị Ka Ndị Ozi Ala Ọzọ.” N’ịdabere n’okwu Pọl onyeozi ná Ndị Kọlọsi 1:9, 10, Nwanna Molohan chetaara ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ na ọnwa ise gara aga ha nọrọ na Gilead enyeworo ha aka ịmụba “ná mmazu nke Chineke.” Nke a ga-enyere ha aka ịmị mkpụrụ n’ụzọ abụọ: site n’igosipụta mkpụrụ nke mmụọ Chineke na site n’isoro ndị ọzọ kerịta eziokwu Bible.
Daniel Sydlik nke Òtù Na-achị Isi sochiri n’isiokwu na-akpali echiche bụ́ “Ejila Ndụ Gị Gwurie Egwu.” O hotara ajụjụ Jisọs: “Ihe mgbanwe gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwere ndụ ya?” (Matiu 16:26) Nwanna Sydlik kwuru, sị: “Ndị mmadụ ejiwo ndụ dị mfe, nke na-esichaghị ike gbanwere mkpụrụ obi ha.” Otú ọ dị, ndị nwere okwukwe dị ndụ apụghị imebi okwukwe ha mgbe ọnwụnwa na ule dị iche iche chere ha ihu. Okwu Jisọs na-egosi na mmadụ aghaghị ịdị njikere ‘ime mgbanwere,’ ya bụ, ịchụ àjà, iji nweta mkpụrụ obi, ma ọ bụ ndụ mmadụ. A gbara ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ ume inye Jehova ihe nile ha nwere, ihe kasị mma ha pụrụ inye, n’ozi ya!
Ọzọ, William Van de Wall nke Kọmitii Ngalaba Ije Ozi kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Pọl Onyeozi—Ihe Nlereanya E Kwesịrị Iṅomi.” Nwanna Van de Wall kọwara, sị: “Pọl butere ụzọ n’ọrụ ozi ala ọzọ ahụ na narị afọ mbụ.” Mgbe ahụ, n’ụzọ kwesịrị ekwesị e mere ka akụkụ anọ ebe Pọl onyeozi setịpụrụ ezi ihe nlereanya maka ndị ozi ala ọzọ taa pụta ìhè: (1) ezi nchegbu na ịhụnanya Pọl nwere maka ndị mmadụ, (2) ịdị irè ya n’ozi ahụ, (3) iji umeala jụ ibuli onwe ya elu, (4) ntụkwasị obi a na-adịghị agbagha agbagha o nwere n’ebe Jehova nọ.
“Kwee Ka Jehova Gwupụta Ala Obi Gị n’Ọrụ Ọhụrụ Gị” bụ isiokwu nke Lyman A. Swingle nke Òtù Na-achị Isi kwuru okwu na ya. N’iji ihe mmụta dịịri ụbọchị ahụ, Abụ Ọma 139:16 mee ihe, Nwanna Swingle kwetara na, dị ka ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ, ha ga-ezute nsogbu dị iche iche n’ọrụ ha nakwa na Jehova maara ngwọta ha. “Gakwuru ya,” ka ọ gbara ume, “gwa ya okwu mgbe ị nwere nsogbu. Chọpụta ihe bụ uche ya.”
John E. Barr nke Òtù Na-achị Isi kwuziri okwu n’isiokwu bụ́ “Okwukwe Unu Na-aba Ụba nke Ukwuu.” (2 Ndị Tesalọnaịka 1:3) Na Luk 17:1, anyị na-agụ na Jisọs sịrị: “Ọ bụ ihe na-aghaghị ime na ihe dị iche iche na-eme ka mmadụ ma n’ọnyà ga-abịa.” Ụfọdụ asụwo ngọngọ n’ihi ọdịdị mmadụ nke ndị ozi ala ọzọ ibe ha. Ma Nwanna Barr gbara ndị ozi ala ọzọ ahụ ume inwe okwukwe dị mkpa iji na-agbaghara. N’ezie, ọ bụ n’okwu a ka ndị na-eso ụzọ Jisọs rịọrọ: “Tụkwasịrị anyị okwukwe.” (Luk 17:2-5) Mgbanwe dị iche iche nke nzukọ pụkwara itinye okwukwe ndị ozi ala ọzọ n’ule. “Ànyị enwetawo okwukwe ịnabata ndị a,” ka Nwanna Barr jụrụ, “ka ha ga-aghọ ihe mgbochi ndị dị ka ugwu?”
Ihe ọzọ bịara bụ ndụmọdụ nke ndị nkụzi abụọ nke Gilead. Jack Redford gbara ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ ume ijigide àgwà ziri ezi. Ọ kọrọ banyere onye ozi ala ọzọ hapụrụ ọrụ ya n’ihi ụfọdụ njakịrị ndị ozi ala ọzọ ibe ya mara ya. Otú ọ dị, Akwụkwọ Nsọ na-adọ anyị aka ná ntị megide ịbụ ndị a kpasuru iwe n’ụzọ na-adịghị mkpa. (Eklisiastis 7:9) “Nwee ezi àgwà,” ka ọ gbara ume ya. “Na-agbaghara njehie na ezughị okè nke ndị ọzọ nọ gị gburugburu.”
U. V. Glass, onye na-edeba aha na Gilead, ajụzie, sị: “Ùnu dị njikere ịnagide ‘mgbe na ihe ndapụta’”? (Eklisiastis 9:11) “Ụzọ ndụ anyị na-agbanwe mgbe nile,” ka Nwanna Glass kwuru, “ụfọdụkwa pụrụ nnọọ ịkpata oké nchegbu.” Ụfọdụ ndị ozi ala ọzọ echewo ahụ ike na-adakpọ adakpọ, ọrịa, na nsogbu ezinụlọ ndị ha na-atụghị anya ha ihu, na-amanye ụfọdụ ịhapụ ọrụ ha. “N’agbanyeghị ihe ọ bụla ihe ndabara ahụ pụrụ ibụ,” ka Nwanna Glass kwuru, “anyị maara na Jehova maara ya, ọ na-echekwa banyere anyị. Ọ bụrụ na anyị adabere n’ebe ọ nọ, anyị maara na anyị ga-enwe mmeri!”
Okwu ihu ọha nke isiokwu ya bụ “Ndị E Doro Iche Maka Ije Ozi Ala Ọzọ” wetara usoro okwu ihu ọha nke ụtụtụ ahụ ná njedebe. Theodore Jaracz nke Òtù Na-achị Isi tụlere ajụjụ ahụ a jụrụ ná mmalite, ya bụ, “Gịnị bụ onye ozi ala ọzọ?” N’azịza, ọ tụlere Ọrụ Ndị Ozi isi 13 na 14 banyere ọrụ ozi ala ọzọ nke Pọl na Banabas. N’ụzọ doro anya, ọrụ ahụ lekwasịrị anya, ọ bụghị n’ịgwọ nsogbu nke ọha mmadụ, kama ‘n’izisa ozi ọma ahụ.’ (Ọrụ 13:32) Nwanna Jaracz jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ na unu ekwetaghị na Pọl na Banabas gosiri ihe ezi onye ozi ala ọzọ kwesịrị ịdị ka ya?” Mgbe ahụ a kpọrọ aka ochie n’ozi ala ọzọ bụ́ Robert Tracy nke Mexico ka ọ kọọ ụfọdụ n’ime ahụmahụ ya ndị na-ekpo obi ọkụ dị ka onye na-ezisa ozi ọma.
Usoro ihe omume nke ụtụtụ bịara ná njedebe ya ka Nwanna Schroeder kenyesịrị 48 ndị gụsịrị akwụkwọ diploma ha. Ndị na-ege ntị nwere aṅụrị ịnụ aha nke 21 ala ebe e kenyeworo ndị ozi ala ọzọ ahụ ọrụ: Barbados, Benin, Bolivia, Central African Republic, Costa Rica, Côte d’Ivoire, Ecuador, Equatorial Guinea, Estonia, Guinea-Bissau, Honduras, Latvia, Leeward Islands, Mauritius, Mozambique, Nicaragua, Paraguay, Peru, Senegal, Taiwan, na Venezuela.
Mgbe e nwesịrị nkwụsịtụ nwa oge maka nri ehihie, ndị na-ege ntị zukọghachiri ma nwee ọmụmụ ihe Ụlọ Nche kporo ọkụ, nke Robert P. Johnson nke Ngalaba Ije Ozi duziri. Ndị òtù nke klas nke 98 zara ajụjụ nile. Usoro ịgba ajụjụ ọnụ na-eme obi ụtọ nke ndị òtù ọrụ Gilead duziri sochiri. A gbara ndị na-ege ntị ume nke ukwuu ka ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ kerịtara ahụmahụ ndị ha nwere n’ubi ma kwupụta mmetụta ha banyere ọrụ mba ọzọ ha.
Ruo afọ isii na ọkara, Gilead dị n’ụlọ ọrụ Watchtower Society dị na Wallkill, New York. Otú ọ dị, n’April 1995, e bugara ụlọ akwụkwọ ahụ n’Ebe Agụmakwụkwọ nke Watchtower na Patterson, New York. Olee mmetụta ndị ezinụlọ Betel nọ na Wallkill nwere banyere mgbanwe nke a? Ná ngụsị akwụkwọ nke a, a gbara ọtụtụ ndị sitere Wallkill ajụjụ ọnụ. Okwu ha ndị na-emetụ n’ahụ mere ka o doo anya na ụmụ akwụkwọ Gilead emetụtawo ha n’ụzọ na-adịgide adịgide. N’ụzọ doro anya, ndị ikom na ndị inyom ndị a dị njikere bụ ezi ndị ozi ala ọzọ—dị umeala n’obi, na-eji onwe ha achụ àjà, nwee nchegbu miri emi banyere inyere ndị ọzọ aka.
Ka ngụsị akwụkwọ ahụ na-abịaru nso ná njedebe, mmadụ nile bịaranụ nwere obi ike na Ụlọ Akwụkwọ Gilead ga-anọgide na-eme nke ọma n’ime ihe o meworo ruo ihe karịrị 50 afọ—ịzụpụta ezi ndị ozi ala ọzọ!
[Igbe dị na peeji nke 18]
Ihe Banyere Klas Ahụ:
Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 8
Ọnụ ọgụg̣ụ mba e zijere ha: 21
Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 48
Nkezi afọ ndụ: 32.72
Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 15.48
Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 10.91
[Foto dị na peeji nke 18]
Ndị Na-agụsị Akwụkwọ na Klas nke 98 nke Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.
(1) Eszlinger, A.; Mann, T.; Rivera, G.; Baruero, M.; Vaz, M.; Durga, K.; Silweryx, H.; Alvarado, D. (2) Toth, B.; Segarra, S.; Hart, R.; Rooryck, I.; Escobar, P.; Ejstrup, J.; Sligh, L.; Rivera, E. (3) Archard, D.; Snaith, S.; Marciel, P.; Koljonen, D.; Waddell, S.; Blackburn, L.; Escobar, M.; Archard, K. (4) Hart, M.; Toth, S.; Koljonen, J.; Bergman, H.; Mann, D.; Blackburn, J.; Park, D.; Vaz, F. (5) Segarra, S.; Sligh, L.; Leslie, L.; Bergman, B.; Baruero, W.; Alvarado, J.; Leslie, D.; Park, D. (6) Silweryx, K.; Eszlinger, R.; Waddell, J.; Snaith, K.; Durga, A.; Rooryck, F.; Ejstrup, C.: Marciel, D.