E Nwekwuo Ndị Ozi Ala Ọzọ Maka Owuwe Ihe Ubi Zuru Ụwa Ọnụ
SEPTEMBER bụ ọnwa nke owuwe ihe ubi nye ọtụtụ ndị ọrụ ubi, ma ọrụ owuwe ihe ubi dị mkpa karị dọọrọ ìgwè mmadụ gaa n’Ụlọ Mgbakọ nke Ndịàmà Jehova dị na Jersey City, n’ofe nke ọzọ nke Osimiri Hudson site New York City, na September 8, 1991. Klasị nke 91 nke ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead na-agụsị akwụkwọ ha. Ihe ruru 4,263 ndị so n’ezinụlọ Betel na ndị ọbịa a kpọrọ òkù nọ n’ebe ahụ, e jikwa usoro nzipụ ozi nke ígwè telifonu mee ka 1,151 ndị ọzọ nọ n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn nakwa n’ebe ndị e nwere ugbo na Wallkill nakwa Patterson nụrụ ihe omume ahụ.
Onye isi oche nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead bụ́ Frederick W. Franz, onye ọ fọrọ nke nta ka ọ gbaruo 98 afọ ji ekpere na-emetụ n’obi na nke na-egosi nsọpụrụ n’ụzọ dị omimi mepee ihe omume ahụ. Albert D. Schroeder, onye so n’Òtù Na-achi Isi nakwa onye bụbu onye na-edeba aha ụmụ akwụkwọ na onye nkụzi nke ụlọ akwụkwọ ahụ, jere ozi dị ka onye isi oche nke usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ ahụ. O chetaara ndị na-ege ntị banyere Abụ Ọma 2:1, 2 na amụma ndị ọzọ yiri ya, bụ́ ndị buru amụma banyere oge a nke ịma jijiji na ọgba aghara n’etiti mba dị iche iche. Ọnọdụ ọgba aghara nke a emewo ka e mepee ọtụtụ ubi ọhụrụ maka ọrụ owuwe ihe ubi.
George M. Couch, onye so na Kọmitii Betel kwuru okwu mbụ nke ụbọchị ahụ. Isiokwu ya bụ “Gụkọọnụ Ngọzị Unu.” O chetaara ụmụ akwụkwọ Gilead na ọ bụghị ihe dị oké ngwa ịmalite ime omume a. O kwuru na ụmụ akwụkwọ ahụ n’onwe ha bụ ndị a gọziri agọzi n’ezie kama na ngọzi ndị a pụtara nanị mgbe a rụsiworo ọrụ ike. N’otu aka ahụ Jekọb onye gbara 97 afọ gbasoro otu mmụọ ozi mgba ogologo abalị nile—nani maka iji nata ngọzi. (Jenesis 32:24-32) Nwanna Couch gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume ka ha hapụ ịdị na-eche echiche na-ezighi ezi kama ka ha bụrụ ngọzi nye ndị ọzọ site n’ịzụlite udo nke uche site n’ekpere na ime mkpebi siri ike.
John E. Barr, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, bụ onye ọzọ nke kwuru okwu n’isiokwu bụ ‘Nwerịtanụ Ịhụnanya n’Ebe Ibe Unu Nọ.’ Ndị na-eso ụzọ Jisọs dị njikere ịnwụ n’ihi ibe ha. “Ùnu na-enwe mmetụta nke ụdị ịhụnanya dị otú a ijupụta n’ime obi unu?” ka ọ jụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ. ‘Ma ịhụnanya dị otú a adịghị’ ka o kwuru, ‘ọ dịghị ihe ọ bụla anyị bụ. Nke ahụ bụ eziokwu doro anya banyere okwu a.’ (1 Ndị Kọrint 13:3) Nwanna Barr kwupụtara ụfọdụ ụzọ dị irè isi gosipụta ịhụnanya. Ọ gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume ịkwanyere ndị na-eje ozi ala ọzọ ibe ha ùgwù, na-achọ ụzọ isi jiri akọ na-ekwu okwu mgbe nile. ‘Legharanụ obere nghọtahie anya,’ ka ọ dụrụ ha ọdụ, na-ehota 1 Pita 4:8. Ọ rịbara ama na ọbụna ụbọchị e kenyere onye ozi ala ọzọ isi nri bụ oge ha pụrụ igosi ịhụnanya site n’ile ọrụ ahụ anya dị ka ihe karịrị imezu iwu. O chetaghachiri ụmụ akwụkwọ ahụ: “Anyị adịghị akwụsị iji ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ụgwọ ịhụnanya.”—Ndị Rom 13:8.
“Ùnu Nwere Obi Ike?” bụ isiokwu na-akpali akpali nke David A. Olson nke Ngalaba Kọmitii Ije Ozi mere ka ọ saa mbara. O mere ka akụkụ abụọ nke inwe obi ike pụta ìhè: n’ebe Jehova na ọgbakọ ya nọ, nke anyị nwere ọtụtụ ihe kpatara anyị ga-eji mee nke ahụ (Ilu 14:6; Jeremiah 17:8); nakwa n’onwe onye. Ndị ozi ala ọzọ nwere ihe mere ha ga-eji nwee obi ike nke onwe onye, dị ka ọnọdụ ha dị ka ndị na-eje ozi na obi nke Jehova na ọgbakọ ya tụkwasiworo ha. Pọl onyeozi gosipụtara ụdị obi ike dị otú ahụ n’ihi otu ụdị ihe ndị dị otú ahụ. (1 Ndị Kọrint 16:13; Ndị Filipai 4:13) Otú ọ dị, Nwanna Olson dọrọ aka ná ntị megide inwe obi ike gabiga ókè bụ́ nke ụwa na-akwalite, dị ka otu onye na-ede akwụkwọ a ma ama mere ihe atụ ya, bụ́ onye a kọrọ na o kwuru, sị: “M na-ehotakarị onwe m. Ọ na-etinye ihe ụtọ ná mkparịta ụka m.” Otú ọ dị, obi ike nke a haziri nke ọma site n’ịdị umeala n’obi pụrụ ime ka ndị ọzọ nwee obi ike. Nke a n’ezie bụ eziokwu banyere Pọl.—Ndị Filipaị 1:12-14.
Lyman A. Swingle, onye so n’Òtù Na-achi Isi gara n’ihu ịgba ụmụ akwụkwọ ahụ ume: “Gaanụ n’Ubi nke A Gaje Iwe Ihe Ubi n’Ime Ya, Unu Ndị Gụsịworo Akwụkwọ na Gilead!” O kwuru na ụbọchị a bụ ụbọchị owuwe ihe ubi maka Ụlọ Akwụkwọ Gilead nakwa maka òtù ụmụnna zuru uwa ọnụ, ka ndị a gụsịworo akwụkwọ ga-apụ wee sonyere ọtụtụ puku ndị gụsịworo akwụkwọ n’oge gara aga bụ́ ndị ka nọ n’ọrụ ije ozi ala ọzọ—ụfọdụ site na klasi nke mbụ, nke abụọ, na nke atọ nke afọ ndị 1940! Nwanna Swingle kwuru na mgbe ahụ o nweghị onye mara na ọrụ ije ozi ala ọzọ pụrụ ịgakwu n’ihu ruo 50 afọ ọzọ, ma ọ bụ na ọchịchị ndị Nazi, ndị Fascist, na ihe mgbochi ndị ọzọ nke ndị ọchịchị nye ọrụ ikwusa ozi ọma pụrụ ịda. “Ọ bụrụ na ihe Jehova meworo n’oge gara aga bụụrụ anyị ihe ịtụnanya,” ka ọ jụrụ, “gịnị banyere ọdịnihu?” O mechiri okwu ya site n’ịkpọ ụmụ akwụkwọ ahụ òkù n’ụzọ na-akpali mmụọ, sị: “Gaanụ n’ubi!”
Mgbe ahụ ndị nkụzi abụọ bụ isi maka Ụlọ Akwụkwọ Gilead gwara klasi nke 91 okwu ikpeazụ. Jack D. Redford kwuru okwu n’isiokwu bụ “Nwetanụ Amamihe.” Ọ gwara ụmụ akwụkwọ na Ụlọ Akwụkwọ Gilead na-akụzi ihe ọmụma na nghọta, ma ha aghaghị inweta amamihe, ike nke iji ihe ọmụma ha eme ihe n’ụzọ ziri ezi. Ọ kpọkuru ụmụ akwụkwọ ahụ ka ha jụ echiche na-ezighị ezi, na ha amụtawo ihe nile e kwesịrị ịma na Gilead. “Ọ bụ ihe unu mụtara mgbe ọzụzụ ụlọ akwụkwọ a gasịrị bụ ihe kasị mkpa.” Ihe so n’ihe ha ka gaje ịmụta: imeso ndị mmadụ ihe n’udo, inwe ike isi “Ihe m mere wutere m” nye di ma ọ bụ nwunye, nye onye ozi ala ọzọ ibe ha, na nye ụmụnna nwoke na nwanyị n’ókèala ha; mụta ụzọ e si akpachapụ anya banyere ịtụkwasị obi n’ihe mbụ batara mmadụ n’uche na ịghọta na nsogbu ọ bụla siri ike, na-achọ nghọta dị omimi nke ọnọdụ nile tupu e nye ndụmọdụ amamihe dị na ya; na ịkwanyekwara ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ùgwù maka inwe ike ịchọta ihe e ji ebi ndụ n’ime ọnọdụ ihe isi ike dị iche iche.—Ilu 15:28; 16:23; Jemes 1:19.
Ulysses V. Glass, bụ́ onye na-edeba aha ụmụ akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, mere Ndị Filipaị 3:16 isiokwu nke okwu ya. Ọ jara klasị ahụ mma maka ọganihu ha nweworo ma gbaa ha ume ka ha nọgide na-agbaso akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ. Ebe ụmụ akwụkwọ ahụ kwesịrị ịnọgide na-enweta ezi ihe ọmụma, o kwuru na ha apụghị ịmatacha ihe nile. O ji klọkụ na-eji akara ọnụ ọgụgụ egosi oge mee ihe atụ nke isi ihe a. Onye nwe ya pụrụ ịma ụzọ ọ pụrụ isi mee ka ọ rụọ ọrụ n’amaghị ụzọ o si arụ ọrụ n’ezie. N’otu aka ahụ, ndị ozi ala ọzọ ekwesịghị inwe nleda anya n’ebe ndị, ọ bụ ezie na ha enwerụghị ókè ihe ọmụma dị omimi ha nwere, maara ihe dị mkpa—ụzọ e si atụ egwu Jehova. (Ilu 1:7) O chetaara klasị ahụ mkpa ọ dị inwe ‘anya na-ele otu ebe.’ (Matiu 6:22) A pụrụ iwetara anya ime mmụọ ihe mgbochi dịkwa ka a pụrụ ime anya nke anụ ahụ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ adịghị aghọtacha ótú ihe si mee—na-elekwasị anya n’ụzọ gabigara ókè n’ihe ole na ole iji mata otú ihe nile si mee—ebe ndị ọzọ, n’ụzọ dị iche, na-ahụ ihe nanị n’elu n’elu, wee bụrụkwa ndị a na-adọrọ uche ha pụọ n’isi ihe ndị dị mkpa, ndị ha kwesịrị ilebara anya.
Okwu ikpeazụ e kwuru n’ụtụtụ ahụ bụ nke isiokwu ya bụ “Ịmata na Isoro Ọgbakọ Jehova Na-arụkọ Ọrụ,” bụ́ nke Theodore Jaracz, onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru. Nwanna Jaracz sịrị na ọ bụ ezie na e nwere ọtụtụ puku nzukọ na òtù dị iche iche n’ụwa, nanị otu n’ime ndị a nile bụ nke na-esiteghị n’ụwa. Olee otú a pụrụ isi mata nke na-anọchi anya Jehova? Okwu Chineke na-enye akara ndị e ji amata ya. Bible na-egosi na ihe o kere eke dị n’eluigwe bụ nke a haziri nke ọma. (Abụ Ọma 103:20, 21; Aịsaịa 40:26) Ọgbakọ Jehova nke elu ala bụkwa nke a pụrụ ịmata site n’ime ihe n’usoro ya nakwa site ná nguzopụ iche ya site n’ụwa, nrapagidesi ike ya n’ụkpụrụ Bible, ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke ịdị ọcha n’omume ya, nakwa ịhụnanya dị n’etiti ndị nọ n’ime ya. Nwanna Jaracz kpọkuru ụmụ akwụkwọ Gilead ka ha nyere ọtụtụ ndị mmadụ aka dị ka o kwere mee n’ebe e kenyere ha ọrụ ka ha wee mata ọgbakọ Jehova site n’Akwụkwọ nsọ. N’ihe banyere nke ahụ, ọ mara ọkwa na-akpali akpali: Ụlọ akwụkwọ Gilead n’oge na-adịghị anya ga-amụba okpukpu abụọ, ruo ihe dị ka 50 ụmụ akwụkwọ na klasị nke 93 ya! Ọzọkwa, klasị Gilead Extension School dị na Germany ga-amalite n’ihe dị ka n’otu oge ahụ. Ịkụ aka e ji nabata nke a dara ụda ma dịkwa ogologo!
Dị ka ihe ikpeazụ n’ụtụtụ ahụ, ụmụ akwụkwọ Gilead dị 24 natachara diplọma ha. N’oge na-adịghị anya ha ga-amalite ije na mba 12 dị iche iche gburugburu ụwa. Klasị ahụ kwupụtara mkpebi ha sitere n’ala obi, na-ekele Òtù Na-achị Isi na ezinụlọ Betel. Mgbe nri ehihie gasịrị, Nwanna Charles J. Rice nke Kọmitii Watchtower Farms duziri Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche e mere ka ọ dị mkpirikpi. Mgbe nke ahụ gasịrị ụmụ akwụkwọ ahụ gụsịrị akwụkwọ mere ihe omume na-ekpo ọkụ, na-egosi ahụmahụ ụfọdụ ha nwere n’ozi ubi n’oge ọzụzụ ha were ọnwa ise na Wallkill, New York. Mgbe nke ahụ gasịrị, ndị nkwusa na-anọchi anya ọtụtụ ọgbakọ ndị dị n’ebe ahụ mere ihe nkiri isiokwu ya bụ Ndị Ntorobia, Ndị Na-echeta Onye Kere Ha Ugbu a.
Iji mechie usoro ihe omume a, Nwanna George Gangas, onye so n’Òtù Na-achị Isi gbaworo 95 afọ kpekuru Jehova ụdị ekpere ya a ma ama n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Ndị bịara ememe ahụ ji mmụọ dị elu laa, nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ha nile n’otu n’otu bụ ndị a kpaliri ikere òkè dị ukwuu karị n’ọrụ owuwe ihe ubi nke zuru ụwa ọnụ.
[Igbe dị na peeji nke 22]
Ihe Banyere Klasị Ahụ
Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 6
Ọnụ ọgụgụ mba e zijere ha: 12
Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 24
Ọnụ ọgụgụ ndị di na nwunye: 12
Nkezi afọ ndụ: 33.4
Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 16.13
Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 11.3
[Foto dị na peeji nke 23]
Ndị Na-agụsị Akwụkwọ na Klasị nke 91 nke Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahiri nke ọ bụla. (1) McDowell, A.; Youngquist, L.; Skokan, B.; Wargnier, N.; Miller, Y.; Muñoz, M. (2) Bales, M.; Perez, D.; Attick, E.; Vainikainen, A.; Mostberg, K. (3) DePriest, D.; DePriest, T.; Perez, R.; Wargnier, J.; Muñoz, J.; Miller, J. (4) McDowell, S.; Bales, D.; Skokan, M.; Attick, C.; Youngquist, W.; Vainikainen, J.; Mostberg, S.