Ngọzi nke Agụmakwụkwọ Gilead Na-agbasa n’Ụwa Nile
AGỤMAKWỤKWỌ n’ụwa ochie nke a bara nanị uru a kpaara ókè. Ebe ọ bụ na ọ dabeere karịsịa n’echiche nile nke mmadụ kama ịdabere n’eziokwu nke Chineke, ọ PỤghị ịkụnye ezi nzube ná ndụ. Ma Ụlọ Akwụkwọ Gilead dị iche. N’okwu mmeghe ya ná ngụsị akwụkwọ nke klasị nke 93 nke Gilead, Theodore Jaracz nke Òtù Na-achị Isi kwupụtara na ụlọ akwụkwọ nke a na-enye agụmakwụkwọ nke nwere ezi isi ihe dị na ya. Dị ka Abụ Ọma 119:160 na-asị, “isi ihe nke okwu [Chineke] bụ eziokwu.” Ya mere Ọ bụ site n’obi ụtọ dị ukwuu ka ndị na-ege ntị ruru ihe dị ka 6,000 ji gee ntị n’usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ e mere na September 13, 1992.
Okwu mbụ e kwuru n’ụtụtụ ahụ, nke Lon Schilling so na Kọmitii Ugbo nke Watchtower kwuru, bụ n’isiokwu bụ́ “Nọgidenụ Na-emeri Ụwa na Onye Ọchịchị Ya.” Nwanna Schilling lekwasịrị anya ná Mkpughe 12:11 wee kwuo na amaokwu ahụ na-egosi ụzọ atọ isi nwee mmeri: (1) site n’ọbara nke Nwa Atụrụ ahụ, (2) site n’ịgba àmà, na (3) site n’inwe mmụọ nke iji onwe onye achụ àjà. O chetaara ụmụ akwụkwọ ahụ na ọtụtụ n’ime ndị ohu Jehova egosiwo ụdị mmụọ dị otú ahụ, dịkwa njikere ọbụna ịnwụ iji wee chebe ịnọgidesi ike n’ihe na iguzosi ike n’ezi ihe ha.
“Na-echenụ Ihe Ọma E Nyere Unu n’Aka Idebe Nche” bụ isiokwu nke John E. Barr so n’Òtù Na-achị Isi wulitere. N’ụda olu na-ekpo ọkụ nke e ji mara ya, o ji ntụkwasị obi dị n’etiti Jehova na ndi ohu ya tụnyere ntụkwasị obi ahụ a na-azụlite n’alụmdi na nwunye dị mma. N’iji isi ihe ndị sitere na 2 Timoti 1:12, 13 mee ihe, ọ gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume iche ihe e nyere ha n’aka idebe nche site n’ịhụ “okwu na-enye ezi ndụ” nke dị na Bible n’anya. O kwusiri okwu ike n’ime ka ọmụmụ ihe onwe onye bụrụ akụkụ dị mkpa n’usoro ime ihe nke ụbọchị ọ bụla ma jiri obi ọma nye ụmụ akwụkwọ ahụ ndụmọdụ ka ha ghara ikwe ka ịza ajụjụ ná nzukọ dị iche iche bụrụ imezu iwu kama ka ọ bụrụ nke nwere ihe mmụta mgbe nile.
William Van De Wall nke so ná Ngalaba Kọmitii Ije Ozi kwuru okwu na-esonụ, “Gosipụta Nchegbu Ịhụnanya Maka Ndị Yiri Atụrụ.” Ọ jụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ ụdị onye ha ga-achọ ka dọkịta ezinụlọ ha bụrụ wee gbaa ha ume ịzụlite otu ụdị nchebara echiche, ọmịiko, na obi ebere dị otú ahụ nke ha ga-ewere dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa.
Daniel Sydlik nke so n’Òtù Na-achị Isi kwuru okwu n’isiokwu na-akpali akpali bụ́ “Ihe Nile Ga-ekwe Omume Site na Chineke.” O chetaara ụmụ akwụkwọ ahụ na Abraham na Sera achịwo ọchị n’ihi olileanya yiri nke na-agaghị ekwe omume nke ịmụta nwa nwoke n’afọ ndụ agadi ha. Ọtụtụ n’ime nkwa Chineke yiri ihe na-agaghị ekwe omume n’ụzọ mmadụ si ele ihe anya; ma dị ka mmụọ ozi ahụ jụrụ Abraham, “ọ̀ dị ihe karịrị Jehova ime?” (Jenesis 18:14) Nwanna Sydlik gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume igosipụta okwukwe n’ike Chineke nwere ime ihe na-agaghị ekwe omume, ghara ikwe ka okwukwe ha nwụọ ma ọ bụ daa mbà, n’agbanyeghị ọnwụnwa ọ bụla ha pụrụ izute.
Ndị Nkụzi Enye Ndụmọdụ
Ndị nkụzi abụọ nke Gilead bụ ndị ọzọ kwuru okwu. Onye mbụ, Jack D. Redford, wulitere isiokwu ahụ bụ́ “Ime Aha Ọma n’Ebe Chineke Nọ.” Ihe na-eme ka aha bụrụ nke ọma ma ọ bụ nke ọjọọ, ka ọ tụgharịrị uche, bụ onye na-aza ya. O gosipụtara ọdịiche dị n’etiti aha ndị dị ka Adam, Nimrọd, Jezebel, Sọl, na Judas nakwa aha ndị dị ka Noa, Abraham, Rut, Pọl, na Timoti. Aha nke ọ bụla nwere ọtụtụ ihe e jikọtara ha na ya n’ihi ụzọ ndụ nke onye zara ya. Ọ jụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ ụdị aha ha ga-enwe na 10, 100, ma ọ bụ ọbụna 1,000 afọ n’ọdịnihu—ọ̀ bụ nke onye gbahapụrụ ọrụ ya ka ọ̀ bụ onye na-eme mkpesa ka ọ̀ bụ nke onye ozi ala ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi? Lekwasịnụ anya n’ihe ngwọta na nzube nile kama ilekwasị anya ná nsogbu, ka o nyere ha ndụmọdụ.
“Olee Otú I Si Eche Okwukwe Gị Nche nke Ọma?” bụ isiokwu na-akpali iche echiche nke Ulysses V. Glass wulitere. O ji okwukwe siri ike tụnyere ihe dị mma e ji achọta ụzọ nke na-egosikarị ụzọ nke ziri ezi. Ihe ndị nwere ike ndọta e wezụga nke elu, pụrụ inwe mmetụta n’ebe ihe na-achọta ụzọ dị nke dị n’ụgbọ nwere injin, ọ dịkwa mkpa ime ka ihe ndị dị otú ahụ ghara ịrụ ọrụ. N’otu aka ahụ, ụwa ochie nke a na-ewepụta ọtụtụ mmetụta ndị pụrụ ime ka okwukwe anyị kpafuo ma ọ bụ daa mbà ma ọ bụrụ na anyị enye ha ohere. Ka ọ na-adọ klasị ahụ aka ná ntị megide mmetụta ndi dị otú ahụ, Nwanna Glass jakwara ha mma maka inwe nghọta dị nkọ banyere àgwà na mmetụta nke ndị ọzọ.
Okwu ikpeazụ e kwuru n’ụtụtụ ahụ bụ nke Albert D. Schroeder kwuru, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi. Ọ gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume “Ịnọgide Na-enwe Mmụọ Ozi Ala Ọzọ,” na-aja ha mma maka igosipụta ụdị mmụọ ozi ala ọzọ ahụ dị ka klasị mbụ mere laa azụ na 1943, mgbe ọ na-eje ozi dị ka onye na-edeba aha ụmụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Ọ rịbara ama na ha bụ ndị ihe mmadụ ibe ha na-amasị, ndị ime nkwusa marawooro ahụ, bụ́ ndị nwere mmasị ịbụ ndị e duziri site na mmụọ Chineke. Nọgidenụ na-ewulite mmụọ ahụ, na-eji New World Translation na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu n’ọmụmụ ihe onwe onye, ka ọ gbara ume. O mechiri okwu ya site ná ntụle amaokwu ruo n’amaokwu nke Abụ Ọma 24 dị ka ihe atụ.
Ihe ọzọ na-esonụ, ụmụ akwụkwọ Gilead ahụ ghọrọ ndị gụsịworo akwụkwọ na Gilead! E nyefere ha diplọma ha ka a gụpụtara ebe e kenyere ha ọrụ ije ozi ala ọzọ, nke mere ka ndị na-ege ntị kụọ aka nke ukwuu.
N’oge ehihie, Calvin Chyke nke so na Kọmitii Ụlọ Obibi Akwụkwọ duziri Ọmụmụ Ihe ỤIỌ Nche. Otu ihe omume na-enye obi ụtọ nke ụmụ akwụkwọ mere sochiri, bụ́ nke metụtara ahụmahụ ụmụ akwụkwọ ahụ nwere n’ubi n’oge ọzụzụ ahụ were ọnwa ise, o gosikwara ihe nkiri slide nke ụfọdụ n’ime mba ebe ndị e kenyere ha ọrụ. Tụkwasị na nke ahụ, a gbara otu di na nwunye meworo agadi ajụjụ ọnụ, ha kerịtakwara ụfọdụ n’ime amamihe na ahụmahụ ndị ha nwetara site n’ọtụtụ afọ nke ije ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ. Oge ehihie ahụ mechiri site n’ihe nkiri bịara n’ezi oge nke a kpọrọ Unu Ekwela Ka E Duhie Unu ma ọ bụ, Kwaa Chineke Emo.
Ndị gere ntị lara na-enwe oké ọṅụ na obi ụtọ ịhụ ihe agụmakwụkwọ n’eziokwu nke Chineke pụrụ ime, nweekwa obi ụtọ ịmara na abamuru nke agụmakwụkwọ dị otú ahụ ga-anọgide na-abụ nke a na-enwe mmetụta ya n’ụwa nile. Ka 48 ndị ozi ala ọzọ a gawara n’ebe e kenyere ha ọrụ, ọtụtụ ekpere so ha n’azụ, na-ekwupụta olileanya na obi ike sitere n’ala ala obi na ndị a na-ekwesị ntụkwasị obi ga-abụ ngọzi dịịrị ndị Chineke n’ebe ọ bụla ha na-aga.
[Igbe dị na peeji nke 19]
Ihe Banyere Klasị Ahụ
Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 7
Ọnụ ọgụgụ mba e zijere ha: 18
Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 48
Ọnụ ọgụgụ di na nwunye: 24
Nkezi afọ ndụ: 32.8
Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 15.3
Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 10.4
[Igbe dị na peeji nke 20]
NDỊ GỤSỊRỊ AKWỤKWỌ NA KLASỊ NGALABA NKE GILEAD
Na June 21, 1992, otu ìgwè 24 ndị ozi ala ọzọ gụsịrị akwụkwọ na klasị nke anọ nke Ngalaba nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead dị na Selters/Taunus, Germany. Klasị ahụ, nke ndị di na nwunye 11 nakwa ụmụnna nwanyị 2 na-alụbeghị di sitere ná mba asaa mejupụtara, dị nkezi nke 32 afọ, nwee nkezi nke 14 afọ kemgbe baptism, na 8.5 afọ nke ije ozi n’ọrụ izisa ozi ọma n’oge nile. Ihe karịrị 2,000 mmadụ bịara ngụsị akwụkwọ ahụ.
Nwanna Jaracz mepere ihe omume ahụ site ná ntụle nke llu 11:24, bụ́ nke na-asị: “O nwere onye na-aghasa aghasa, ma a nọ na-atụkwasịrị ya ihe karị.” Ọ rịbara ama na a gaje ịghasa ụmụ akwụkwọ ahụ, ha ga-akwalitekwa mmụba n’ezie.
E kwuru okwu ndị na-agba ume nke dabeere n’akwụkwọ nsọ site n’ọnụ Richard Kelsey, bụ́ onye nhazi Kọmitii Alaka Germany; Wolfgang Gruppe nke Ngalaba Ije Ozi; Werner Rudtke na Edmund Anstadt, ndị sokwa na Kọmitii Alaka; na ndị nkụzi abụọ, bụ́ Dietrich Förster na Lothar Kaemmer. Albert Schroeder nke so n’Òtù Na-achị Isi kwuru okwu bụ isi na-akpali mmasị nke a kpọrọ “Nọgidenụ Na-abụ Ndị Na-achọ Uru Ihe Ime Mmụọ.” Ihe ikpeazụ e mere n’ihe omume ahụ bụ inyefe ọrụ e kenyere ha gaa ná mba 11 dị n’Africa, Etiti Ọwụwa Anyanwụ America, na Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, mgbe nke ahụ gasịrị otu onye gụsịrị akwụkwọ gụpụtara otu akwụkwọ ozi nke klasị ahụ degaara Òtù Na-achị Isi na-ekwupụta obi ekele sitere n’ala ala obi.
[Foto dị na peeji nke 18]
Ndị Na-agụsị Akwụkwọ na Klasị nke 93 nke Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.
(1) Hitesman, C.; West, P.; Evans, D.; Hipps, M.; Simonelli, N.; Wood, S.; Corkle, M.; Flores, C.; Thomas, J. (2) Jones, M.; Nissinen, J.; Sponenberg, M.; Zachary, K.; Ravn, G.; Backman, M.; Wettergren, A.; Evans, D.; Flores, R.; Caporale, G. (3) Simonelli, N.; Rechsteiner, M.; Rechsteiner, M.; Ruiz-Esparza, L.; Gerbig, B.; Simpson, C.; Zanewich, C.; Zachary, B.; Ricketts, L.; (4) Simpson, J.; Backman, J.; Corkle, G.; Gerbig, M.; Ricketts, B.; Bagger-Hansen, L.; Jones, A.; Zanewich, K.; Ravn, J.; Hipps, C. (5) Sponenberg, S.; Hitesman, A.; Caporale, L.; Ruiz-Esparza, S.; Thomas, R.; Bagger-Hansen, B.; Wood, M.; West, M.; Wettergren, C.; Nissinen, E.