Site n’Ụmụ Akwụkwọ Nwere Ihe Ịga nke Ọma Gaa ná Ndị Ozi Ala Ọzọ Nwere Ihe Ịga nke Ọma
“Ọ KA siiri m ike ikwere na anyị enwewo ihe ùgwù a!” ka Will tiri ná mkpu, na-ezo aka n’ọzụzụ nke ya na nwunye ya, Patsy, ka nwesịworo dị ka ụmụ akwụkwọ nke klas nke 103 nke Watchtower Bible School of Gilead. Zahid na Jeni kwenyere. “Ọ bụụrụ anyị ihe ùgwù ịnọ n’ebe a,” ka ha kwuru. Ụmụ akwụkwọ ahụ nile arụsiwo ọrụ ike n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Ugbu a ọ dị ha ọkụ n’obi ịmalite ọrụ ha dị ka ndị ozi ala ọzọ. Ma tupu nke ahụ, n’usoro ihe omume ngụsi akwụkwọ na September 6, 1997, ha natara ndụmọdụ ịhụnanya nke ga-enyere ha aka inwe ihe ịga nke ọma n’ọrụ ozi ala ọzọ ha.
Onye isi oche nke usoro ihe omume ahụ bụ Theodore Jaracz, onye so n’Òtù Na-achị Isi. Ọ kọwapụtara na—tinyere ezinụlọ Betel na ndị nnọchiteanya nke alaka Watch Tower Society 48—ndị enyi na ndị ikwu sitere Canada, Europe, Puerto Rico, na United States nọ ya iji mesie ụmụ akwụkwọ ahụ obi ike banyere nkwado na ịhụnanya ha. Nwanna Jaracz kwuru na ndị ozi ala ọzọ chọọchị Krisendọm zipụrụ ọtụtụ mgbe abụrụwo ndị a dọpụrụ uche ha n’ọrụ ozi ala ọzọ ma malite ịchụso nkà mmụta ma ọ bụ ọbụna tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’ụzọ dị iche, ndị gụsịrị akwụkwọ na Gilead na-eme ihe e nyeworo ha ọzụzụ ime. Ha na-ezi ndị mmadụ Bible.
Mgbe ahụ Robert Butler sitere n’ọfịs Society dị na Brooklyn kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Meenụ Ka Ụzọ Unu Gaa nke Ọma.” Ọ kọwara na ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-eji ego ma ọ bụ ihe nrite onwe onye ọzọ na-atụ ihe ịga nke ọma n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, ihe dị mkpa n’ezie bụ otú Chineke si atụ ihe ịga nke ọma n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Ozi Jisọs gara nke ọma, ọ bụghị n’ihi na ọ tọghatara ọnụ ọgụgụ buru ibu, kama n’ihi na o kwesịrị ntụkwasị obi n’ọrụ ya. Jisọs wetaara Jehova otuto, ọ nọgidekwara bụrụ onye ụwa na-emetọghị. (Jọn 16:33; 17:4) Ndị a bụ ihe onye Kraịst ọ bụla pụrụ ime.
“Bụrụnụ Ohu Nye Mmadụ Nile,” ka Robert Pevy, onye bụbu onye ozi ala ọzọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa dụrụ n’ọdụ. Pọl onyeozi bụ onye ozi ala ọzọ nwere ihe ịga nke ọma. Gịnị bụ isi ihe kpatara ya? O mere onwe ya ohu nye mmadụ nile. (1 Ndị Kọrint 9:19-23) Ọkà okwu ahụ kọwara: “Onye gụsịrị akwụkwọ na Gilead nke nwere àgwà ahụ agaghị ahụ ozi ala ọzọ dị ka otu ụdị nke mbuli n’ọkwá, ihe na-eduga n’ọkwá ka ukwuu n’ime nzukọ a. Onye ozi ala ọzọ na-eji nanị otu nzube aga n’ebe e zijere ya—ije ozi, n’ihi na nke ahụ bụ ihe ndị ohu na-eme.”
Na-adabere ndụmọdụ ya n’ụzọ bụ isi ná 2 Ndị Kọrint isi nke 3 na nke 4, Gerrit Lösch nke Òtù Na-achị Isi gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume ka ha “Na-egbukepụ Ebube Jehova Dị Ka Enyo.” O chetaara ha na ihe ọmụma Chineke dị ka ìhè nke na-achakwasị onye Kraịst mgbe o meghere obi ya ịnara ya. Anyị na-egbukepụ ìhè ahụ site n’ikwusa ozi ọma na ijigide ezi àgwà. “Mgbe ụfọdụ ị pụrụ iche na i rughị eru,” ka o kwetara. “Mgbe ụdị mmetụta ahụ bilitere, dabere na Jehova, ‘ka ọkịka nke ike ahụ wee bụrụ nke Chineke.’” (2 Ndị Kọrint 4:7) N’ikwughachi okwu Pọl ndị e dekọrọ ná 2 Ndị Kọrint 4:1, Nwanna Lösch rịọrọ ụmụ akwụkwọ ahụ, sị: “Unu ahapụkwala ozi ala ọzọ unu. Nọgidenụ na-ehicha enyo unu!”
Karl Adams, onye so ná ndị nkụzi Gilead, kwuru okwu n’isiokwu na-akpali mmasị bụ́ “Ebee Ka Jehova Nọ?” Ajụjụ ahụ na-ezo aka, ọ bụghị n’ebe Chineke nọ n’eluigwe na ala, kama ná mkpa ọ dị ịtụle echiche Jehova na ihe ndị na-egosi nduzi ya. “N’okpuru nrụgide,” ka o kwuru, “ọbụna onye nwere ogologo ihe ndekọ n’ozi Jehova pụrụ ichefu nke ahụ.” (Job 35:10) Gịnị banyere oge anyị a? Na 1942, ndị Chineke nwere mkpa nke nduzi. Ọrụ nkwusa ahụ ọ̀ na-abịa ná njedebe, ka a ka nwere ọrụ a ga-arụ? Gịnị bụ uche Jehova maka ndị ya? Ka ha na-amụ Okwu Chineke, azịza ya doro anya. “Tupu afọ ahụ agwụ,” ka Nwanna Adams kwuru, “e mewo atụmatụ maka Watchtower Bible School of Gilead.” N’ezie Jehova agọziwo ọrụ nke ndị ozi ala ọzọ ụlọ akwụkwọ ahụ zipụrụ.
Mark Noumair bụ onye nkụzi nke abụọ kwuru okwu. N’okwu ya, nke isiokwu ya bụ “Olee Otú Unu Ga-esi Jiri Talent Unu Mee Ihe?,” ọ gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume itinye ọzụzụ ha nataworo na Gilead n’ọrụ ngwa ngwa ha ruru n’ebe ọhụrụ e zijere ha. “Nweenụ mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ,” ka o kwuru. “Mikpuonụ onwe unu. Chọsienụ ike ịmụta omenala, akụkọ ihe mere eme, ihe na-atọ ọchị nke mba ahụ. Ngwa ngwa unu mụtara asụsụ ha, ọ ga-akara unu mma.”
Ụmụ Akwụkwọ Na-anụ Ọkụ n’Obi Na-achọta Ọṅụ n’Ozi
Tinyere imikpu onwe ha n’ọmụmụ ihe ha mgbe ha nọ na Gilead, e kenyere ụmụ akwụkwọ ahụ n’ọgbakọ 11 n’ógbè ahụ. Ná ngwụsị izu, ha ji ịnụ ọkụ n’obi kere òkè n’ọrụ nkwusa. Wallace Liverance so ná ndị nkụzi Gilead kpọrọ ụfọdụ n’ime ha òkù ka ha soro ndị na-ege ntị kerịta ahụmahụ ha. Ọṅụ ha pụtara ìhè ka ha na-akọ ahụmahụ ha nwere mgbe ha na-agba àmà n’ụlọ ahịa, n’ebe a na-adọsa ụgbọala, n’ógbè azụmahịa, n’okporo ámá, na site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ụfọdụ n’ime ha chọrọ ụzọ isi ruo ndị na-asụ asụsụ ndị mba ọzọ bụ́ ndị bi ma na-arụ ọrụ n’ókèala ọgbakọ ha. Ọ dịkarịa ala ndị òtù nke klas nke 103 malitere ma duzie ọmụmụ Bible ebe obibi iri n’oge ọnwa ise nke ọzụzụ ha.
Ndị Nọworo Ogologo Oge n’Ozi Ala Ọzọ Ekerịta Isi Ihe Ndị Na-eweta Ihe Ịga nke Ọma
Mgbe akụkụ a dị ụtọ nke usoro ihe omume ahụ gasịrị, Patrick Lafranca na William Van de Wall kpọrọ mmadụ asaa so na Kọmitii Alaka òkù ka ha kwuo ihe ndị ha mụtaworo n’ọrụ ozi ala ọzọ ha maka abamuru nke klas ahụ. Ha dụrụ ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ ọdụ ka ha were ọrụ ozi ala ọzọ ha dị ka ihe si n’aka Jehova ma kpebisie ike ịrapara n’ọrụ ha. Ha kwuru banyere mmetụta dị mma nke ndị ozi ala ọzọ Gilead nyere ọzụzụ nweworo n’ọrụ ahụ n’ala ndị ọzọ.
Gịnị nyeere ndị òtù Kọmitii Alaka ndị a aka ije ozi ruo ọtụtụ iri afọ dị ka ndị ozi ala ọzọ nwere obi ụtọ, na-amị mkpụrụ? Ha sooro ụmụnna nọ ná mba ndị ahụ rụkọọ ọrụ n’ụzọ chiri anya ma mụta ihe n’aka ha. Ha tinyere uchu n’ịmụ asụsụ ha ngwa ngwa ha rutere n’ebe e zijere ha. Ha mụtara ịdị na-agbanwe agbanwe na ikwekọ n’omenala ógbè. Charles Eisenhower, onye gụsịrị akwụkwọ na klas mbụ nke Gilead nakwa onye ozi ala ọzọ ruo afọ 54, kerịtara “isi ihe” ise ndị ozi ala ọzọ nwere ihe ịga nke ọma mụtaworo: (1) Mụchie Bible anya, (2) mụọ asụsụ ha, (3) na-arụsi ọrụ ike n’ozi, (4) rụọ ọrụ maka udo n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ, na (5) kpegara Jehova ekpere mgbe nile. Ụmụ akwụkwọ ahụ nwere obi ụtọ ọ bụghị nanị site na ndụmọdụ dị irè ha natara kama site n’ọṅụ doro anya ndị ozi ala ọzọ a nwere ahụmahụ na-enwe n’ozi Jehova. Dị ka Armando na Lupe si tinye ya, “obi dị ha ụtọ mgbe ha na-ekwu banyere ndụ ha.”
Mgbe ajụjụ ọnụ ahụ gasịrị, otu okwu fọrọ. Albert Schroeder, onye so n’Òtù Na-achị Isi, họọrọ dị ka isiokwu ya “Iji Okwu Chineke Na-eme Ihe n’Ikwesị Ntụkwasị Obi Na-ekpughe Akụ̀ Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa nke Eziokwu.” Ebe Bible bụ akwụkwọ ọgụgụ bụ isi nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead, ụmụ akwụkwọ ahụ nwere mmasị n’ihe ọ ga-ekwu. Nwanna Schroeder rụtụrụ aka na mgbe ọrụ malitere na New World Translation of the Holy Scriptures afọ 50 gara aga, ndị e tere mmanụ so na Kọmitii Nsụgharị Bible Ụwa Ọhụrụ achọghị nnwapụta nke ndị mmadụ kama ha dabeere ná nduzi nke mmụọ nsọ. (Jeremaịa 17:5-8) Otú ọ dị, n’oge na-adịbeghị anya, ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n’okwu amatawo ụkpụrụ dị elu nke New World Translation setịpụrụ. N’otu akwụkwọ ozi o degaara Society, otu onye ọkà mmụta dere: “M na-ama mbipụta dị mma mgbe m hụrụ ya, ‘Kọmitii Nsụgharị Bible Ụwa Ọhụrụ’ unu arụwokwa ọrụ ya nke ọma.”
Mgbe okwu a gasịrị, ụmụ akwụkwọ ahụ natara diplọma ha, a gwakwara ndị na-ege ntị ebe e zijere ha. Ọ bụ oge na-emetụ n’ahụ nye ndị klas ahụ. Ka onye nnọchiteanya klas gụrụ akwụkwọ ozi ekele, anya mmiri gbara ọtụtụ. Ụfọdụ n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ anọwo na-eme nkwado maka ọrụ ozi ala ọzọ ruo ọtụtụ afọ. N’ịghọta na a ga-eduzi ihe ọmụmụ Gilead na Bekee, ole na ole gafere n’ọgbakọ ndị na-asụ Bekee iji na-eme nke ọma karị n’otú ha si asụ asụsụ ahụ. Ndị ọzọ akwagawo n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ná mba nke ha ma ọ bụ n’ofesi. Ndị ọzọkwa akwadebewo site n’ịgụ ahụmahụ dị iche iche, na-eme nnyocha, ma ọ bụ na-ekiri kaseti vidio Society bụ́ To the Ends of the Earth ọtụtụ ugboro.
Will na Patsy, ndị a kpọtụrụ aha ná mmalite, bụ ndị mmasị onwe onye e gosiri ụmụ akwụkwọ ahụ riri ọnụ. “Ndị na-amadịghị anyị na-amakụ anyị ma na-ese anyị foto. Onye so n’Òtù Na-achị Isi kwere anyị n’aka ma sị, ‘Anyị ji unu eme ọnụ!’” Obi abụọ ọ bụla adịghị ya, a hụrụ ụmụ akwụkwọ nke klas nke 103 n’anya nke ukwuu. A zụwo ha nke ọma. Ọzụzụ ha nataworo na Gilead ga-eme ka ha nwee ike isite n’ụmụ akwụkwọ nwere ihe ịga nke ọma gaa ná ndị ozi ala ọzọ nwere ihe ịga nke ọma.
[Igbe dị na peeji nke 22]
Ndekọ Ọnụ Ọgụgụ Klas
Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 9
Ọnụ ọgụgụ mba e zijere ha: 18
Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 48
Ọnụ ọgụgụ ndị di na nwunye: 24
Nkezi afọ ndụ: 33
Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 16
Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 12
[Foto dị na peeji nke 23]
Klas nke 103 Na-agụsị Akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.
(1) Bunn, A.; Dahlstedt, M.; Campaña, Z.; Boyacioglu, R.; Ogando, G.; Nikonchuk, T.; Melvin, S. (2) May, M.; Mapula, M.; Lwin, J.; Hietamaa, D.; Hernandez, C.; Boyacioglu, N.; Sturm, A.; Melvin, K. (3) Thom, J.; Mapula, E.; Nault, M.; Teasdale, P.; Wright, P.; Pérez, L.; Shenefelt, M.; Pak, H. (4) Murphy, M.; Campaña, J.; Stewart, S.; Cereda, M.; Reed, M.; Pérez, A.; Teasdale, W.; Pak, J. (5) Stewart, D.; Wright, A.; Cereda, P.; Nikonchuk, F.; Reed, J.; Hietamaa, K.; Ogando, C.; Shenefelt, R. (6) Murphy, T.; Hernandez, J.; Nault, M.; Bunn, B.; Thom, R.; Dahlstedt, T.; Lwin, Z.; May, R.; Sturm, A.
[Foto dị na peeji nke 24]
Ebee ka anyị na-aga?